Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/15 p. 8-9
  • Di na Nwunye Ịrịọ Ibe Ha Mgbaghara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Di na Nwunye Ịrịọ Ibe Ha Mgbaghara
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NA-EMEKARỊ
  • Ọ̀ Dị Gị Mkpa N’ezie Ịrịọ Mgbaghara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịrịọ Mgbaghara—Ụzọ Dị Irè E Si Eme Udo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Gịnị Mere O Ji Esi Nnọọ Ike Ịrịọ Mgbaghara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ihe Ga-enyere Di na Nwunye Aka Ịna-agbaghara Ibe Ha
    Teta!—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 11/15 p. 8-9
Nwoke a na-agwa nwunye ya okwu, ya agbakụta ya azụ

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Di na Nwunye Ịrịọ Ibe Ha Mgbaghara

IHE NA-EMEKARỊ

Ka e were ya na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị sere okwu, gị ekwuo n’obi gị na ị gaghị arịọ ya mgbaghara maka na o nweghị ihe i mere ya.

Ka i kwuchara ya, gị agbachi nkịtị. Ma ihe na-ebenụ ka na-ebe. Ọ na-emetụ gị n’obi ka ị rịọ ya mgbaghara, ma ya ana-esiri gị ike.

IHE MERE ỊRỊỌ MGBAGHARA JI ARA AHỤ́

Ịdị mpako. Otu nwoke aha ya bụ Uchendua kwuru na mgbe ụfọdụ, ịrịọ nwunye ya mgbaghara na-ara ya ahụ́ n’ihi na ịrịọ mgbaghara bụ dimkpa ịkparị onwe ya. Ihe a o kwuru gosiri na ọ na-esiri onye mpako ike ikweta na o nwere ihe o mejọrọ.

Otú mmadụ si ele ya anya. I nwere ike ịna-eche na naanị mgbe i kwesịrị ịrịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara bụ mgbe i mejọrọ ya. Otu nwaanyị aha ya bụ Chidimma kwuru na ọ bụ naanị mgbe o doro ya anya na ya mejọrọ di ya ka ya na-arịọ ya mgbaghara. Ma, o kwuru na ọ na-esiri ya ike ịrịọ di ya mgbaghara ma ọ bụrụ na di ya gwara ya okwu ọjọọ, ya agwagwara ya. Ọ sịrị na ya ekwesịghị ịrịọ ya mgbaghara ma ha abụọ mejọọ ibe ha.

Mmadụ nwere ike ịna-eche na ya ekwesịghị ịrịọ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbaghara ma ọ bụrụ na ọ bụghị yanwa chọrọ okwu. Otu nwoke aha ya bụ Ikenna kwuru, sị: “Ọ bụrụ na obi siri gị ike na o nweghị ihe i mere, otú ị ga-esi mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara bụ ịjụ ịrịọ ya mgbaghara.

Otú e si zụọ mmadụ. N’ezinụlọ ụfọdụ, ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịrịọ ibe ha mgbaghara. Ọ bụrụ na i toro n’ụdị ezinụlọ a, o nwere ike ịbụ na ị mụtaghị ịrịọ mgbaghara. N’ihi ya, o nwere ike ịna-esiri gị ike ịrịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara ebe ọ bụ na e jighị aka ahụ zụọ gị.

IHE I NWERE IKE IME

Di na nwunye a bu bọket mmiri na-emenyụ ọkụ

Otú ahụ e si eji mmiri emenyụ ọkụ ka ịrịọ mgbaghara si eme ka obi onye a kpasuru iwe dajụọ

Buru ọdịmma di gị ma ọ bụ nwunye gị n’obi. Ọ bụrụ na o nwere mgbe mmadụ mejọrọ gị, mechaakwa rịọ gị mgbaghara, o doro anya na obi tọrọ gị ụtọ. I nwere ike ime ka obi dị di gị ma ọ bụ nwunye gị ụtọ otú ahụ. Ọ bụrụgodị na i chere na i mejọghị ya, ọ ga-adị mma ka ị rịọ ya mgbaghara ka obi jụrụ ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 6:31.

Buru ọdịmma ezinụlọ gị n’obi. Mmadụ ịrịọ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbaghara apụtaghị na onye ahụ na-eweda onwe ya ala. Kama, ọ na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. A sị ka e kwuwe, onye e mejọrọ ya eburu iwe n’obi “karịrị obodo siri ike.” (Ilu 18:19) Ị manụ na di na nwunye na-ebu iwe n’obi, ha agaghị na-ebi n’udo. Ma, ị na-arịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara, ụmụ obere ihe agaghị abụrụ unu nsogbu. Ime otú a na-egosi na ọdịmma ezinụlọ gị dị gị mkpa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 2:3.

Na-arịọ mgbaghara n’egbughị oge. Ọ bụ eziokwu na ọ bụrụ na i mejọghị di gị ma ọ bụ nwunye gị, ịrịọ ya mgbaghara nwere ike ịra gị ahụ́, ma ọ pụtaghị na ị ga-eji maka ya ghara ime ihe dị mma. Gbalịa rịọ ya mgbaghara. Cheta na ihe agaghị aka mma ma ị gba nkịtị. Ọ bụrụ na ị na-arịọ ya mgbaghara, yanwa ga na-arịọkwa gị, ọ gaghịkwa na-esiri unu ike ịrịọ ibe unu mgbaghara.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 5:25.

Gosi na o si gị n’obi. Mmadụ ekwesịghị ịnọ ebe ọ na-arịọ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbaghara gosiwe ya otú ihe o mere si dị mma. O kwesịghịkwa ikwu na ya amaghị na obere ihe ahụ o mere ga-ewe ya iwe. O kwesịrị ikweta na ya mejọrọ ya, rịọkwa ya mgbaghara a sịgodị na o chere na ihe ahụ ekwesịghị iwute ya.

Cheta na i zughị okè. Echefula na o nwere mgbe ị ga-emejọ ihe n’ihi na o nweghị onye zuru okè. Ọ bụrụgodị na i chere na o nweghị ihe i mere di gị ma ọ bụ nwunye gị, yanwa nwere ike iche na i mejọrọ ya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye bu ụzọ n’okwu ikpe ya bụ onye ezi omume; onye nke ọzọ na-abata ma mee ka a chọpụta ihe bụ́ eziokwu banyere onye ahụ.” (Ilu 18:17) Ọ bụrụ na i cheta na i zughị okè, ọ ga-eme ka ị na-arịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.”​—Luk 6:31.

  • “N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.”​—Ndị Filipaị 2:3.

  • ‘Na-edozi okwu ọsọ ọsọ.’​—Matiu 5:25.

Jason na Alexandra

JASON NA ALEXANDRA

“Ọ bụrụ na di na nwunye ana-arịọ ibe ha mgbaghara, ha ga-enwe ike ịna-edozi ụmụ irighiri ihe ndị gaara aghọrọ ha nnukwu okwu. Ọ bụrụkwa na ha hụrụ ibe ha n’anya, ha ga na-arịọ ibe ha mgbaghara.”

Kai na Julia

KAI NA JULIA

“Di na nwunye ekwesịghị iji oge ha na-arịọ ibe ha mgbaghara kwuwe onye nke mejọrọ ibe ya. Kama, ha kwesịrị iji oge ahụ kpezie. N’ihi ya, ọ bụrụ na o nwere ihe mere ka di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ewe iwe, gbaa mbọ ka obi dịghachi ya mma.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya