Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/15 p. 16
  • Akụkọ Gbasara Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụkọ Gbasara Ezinụlọ
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Afrịka
  • Kanada
  • Nedalandz
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 11/15 p. 16
Ebe nwatakịrị na-ebe ákwá ka mama ya kuru ya, mama ya agbachi ya nkịtị na-arụ ọrụ na kọmputa

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Akụkọ Gbasara Ezinụlọ

E nwere ọtụtụ nsogbu ezinụlọ dị iche iche na-enwe taa, ma ihe Baịbụl kwuru ga-enyeliri ha aka ka nsogbu ndị ahụ ghara ịnyịgbu ha.

Afrịka

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ndị nne kwesịrị ịmalite ihe dị ka otu awa ha mụturu nwa nyewe ya ara nakwa na ha kwesịrị inyegide ya naanị ara ruo ọnwa isii. Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụmụaka kwuru na n’agbanyeghị aro a a tụrụ, ọtụtụ ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-ekwu na nri nwa a na-azụta n’ahịa dịkwa mma ka mmiri ara.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

Kanada

Ndị ọkachamara nọ n’otu obodo dị na Kanada kwuru na ụmụaka ndị nne na nna ha na-anaghị ekwe megharịa ahụ́ nwere ike ibu oké ibu karịa ụmụaka ndị nne na nna ha na-emere ihe gosiri na ha hụrụ ha n’anya ma na-enye ha ọzụzụ.

IHE Ị GA-EBURU N’OBI. Ihe e dere kemgbe ọtụtụ narị afọ na Baịbụl gosiri otú kacha mma ndị nne na nna ga-esi na-azụ ụmụ.—Ndị Kọlọsi 3:21.

Nedalandz

N’obodo a, e mere nchọpụta n’ezinụlọ ndị ma di ma nwunye na-arụ ọrụ. Ihe a chọpụtara bụ na ndị nne na nna na-anaghị etinye oge ha niile n’ọrụ na ụmụ ha na-aka anọrị karịa ndị nke na-etinye oge ha niile n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’ụlọ na-eme ihe ụfọdụ gbasara ọrụ ya, o nwere ike ime ka ọ ghara inwe ohere ka ya na ụmụ ya na-akpa.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.”—Ekliziastis 3:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya