Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 3 p. 12-13
  • Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwukwe
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị bụ okwukwe?
  • Gịnị mere anyị ji kwesị inwe okwukwe?
  • Gịnị ga-enyere anyị aka inwe okwukwe?
  • Ndị Hibru 11:1 “Okwukwe Bụ Inwe Ntụkwasi Obi Na Ihe Anyị Na-ele Anya Ya Ga-Emezu”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ezi Okwukwe—Gịnị Ka Ọ Bụ?
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 3 p. 12-13

IHE BAỊBỤL KWURU

Okwukwe

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke, ma, ha amaghị ihe bụ́ “okwukwe.” Gịnị bụ okwukwe? Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ya?

Gịnị bụ okwukwe?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-eche na onye nwere okwukwe bụ onye na-ekwere ihe a gwara ya, n’achọwaghị ịma ma ihe ahụ ọ̀ bụkwa eziokwu. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ikwu na ya kwere na Chineke, ma, a jụọ ya ihe mere o ji kwere, ya asị na ọ bụ maka na a na-akụziri ya kemgbe ya dị obere na Chineke dị. E lewe okwukwe anya otú a ụfọdụ ndị si ele ya, ọ pụtara na ịghọgbu onye nwere okwukwe araghị ahụ́.

IHE BAỊBỤL KWURU

“Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Ndị Hibru 11:1) A ga-enwerịrị ihe mmadụ ji n’aka ga-eme ka obi sie ya ike na ya ga-enweta ihe ọ na-atụ anya ya. Okwu e si sụgharịta okwu bụ́ “atụmanya e ji n’aka” apụtaghị naanị mmadụ iji obi ya niile kwere ihe, kama, ọ pụtara na e nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ onye ahụ ji n’aka mere obi ji sie ya ezigbo ike n’ihe ahụ.

“Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya.”—Ndị Rom 1:20.

Gịnị mere anyị ji kwesị inwe okwukwe?

IHE BAỊBỤL KWURU

‘Ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.’—Ndị Hibru 11:6.

Dị ka anyị kwuru na mbụ, ihe mere ọtụtụ ndị ji kwere na Chineke bụ naanị na a kụziiri ha na Chineke dị. Ha nwere ike ịna-ekwu na ọ bụ ihe ahụ ka a kụziiri ha kemgbe ha dị obere. Ma, Chineke chọrọ ka obi sie ndị na-efe ya ike na ọ dị adị nakwa na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na anyị kwesịrị ịchọsi ya ike, ka anyị nwee ike ịmata ya nke ọma.

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Gịnị ga-enyere anyị aka inwe okwukwe?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na “a na-esi n’ihe a nụrụ enwe okwukwe.” (Ndị Rom 10:17) Ọ pụtara na ihe mbụ ga-enyere mmadụ aka inwe okwukwe na Chineke bụ onye ahụ ‘ịnụ’ ihe ndị Baịbụl na-akụzi banyere ya. (2 Timoti 3:16) Ịmụ Baịbụl ga-enyere gị aka ịmata ihe bụ́ azịza nke ajụjụ ndị dị́ ezigbo mkpa. Ụfọdụ n’ime ha bụ: Ònye bụ Chineke? Gịnị na-egosi na ọ dị adị? Ihe gbasara m ọ̀ na-emetụ ya n’obi? Olee otú Chineke chọrọ ka ihe dịrị anyị n’ọdịnihu?

Ebe otu nwoke na-ekiri urukurubụba

Ọtụtụ ihe gbara anyị gburugburu na-egosi na Chineke dị adị

Ndịàmà Jehova ga-enwe mmasị ka gị na ha mụwa Baịbụl. Anyị kwuru n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, sị: “Ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ. Ma anyị anaghị agwa mmadụ na ọ ga-abụrịrị Onyeàmà Jehova. Kama, anyị na-emeda obi kọwaara onye ahụ ihe Baịbụl kwuru, hapụzie ya ka o jiri aka ya kpebie ma ọ̀ ga-ekweta ihe anyị kụziiri ya ma ọ̀ bụ na ọ gaghị ekweta.”

N’eziokwu, ọ bụ mgbe mmadụ gụrụ Baịbụl, ma chọpụta otú ihe ndị ọ gụtara na ya si bụrụ eziokwu, ka ọ ga-enwe ike inwe okwukwe. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-eyi ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị “ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ Ndịozi 17:11.

“Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya