Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 3 p. 16
  • Olu Ndanda

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olu Ndanda
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nwa Ahụhụ A Na-akpọ Silver Ant Na-eji Egbochi Okpomọkụ
    Teta!—2017
  • Otú Ahụhụ A Na-akpọ Carpenter Ant Si Eme Ka Mpi Ya Dị ọcha
    È Kere Ya Eke?
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 3 p. 16

È KERE YA EKE?

Olu Ndanda

Ebe ndanda kpụ ahịhịa n’ọnụ

NDANDA na-adị ebu ihe na-anyị ezigbo arọ karịa ya. Ụdị ike a ọ na-akpa na-eju ndị njinia anya. Ọ bụ ya mere ndị njinia na-arụ n’otu mahadum dị́ n’Amerịka ji kpebie na ha ga-agbarịrị mbọ ka ha chọpụta ihe mere ndanda ji enwe ike ibuli ihe na-anyị arọ otú ahụ. Ha ji ngwá ọrụ dị iche iche dị́ na kọmputa nyochaa ihe ndị dị n’ahụ́ ndanda ma chọpụta otú ha si arụ ọrụ. Ha jizi kọmputa see ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ, rụọkwa ha na kọmputa.

Otu n’ime ihe ndị dị́ ịtụnanya dị́ n’ahụ́ ndanda bụ olu ya. Ihe ndị njinia ahụ chọpụtara gosiri na ike ọ na-eji ebu ihe karịrị ya dị ya n’olu. Ọ bụ olu ya na-enyere ya aka ijigide ihe ọ bụla ọ kpụ n’ọnụ. E nwere ihe ndị dị gịrịgịrị dị n’olu ya jikọrọ isi ya na ahụ́ ya, ha sikwara ezigbo ike. Otu n’ime ndị njinia mere nchọpụta ahụ kwuru na ọ bụ otú e si hazie ihe ndị ahụ dị́ n’olu ya na-eme ka o nwee ike ịna-emegharị olu ya otú ọ bụla ọ chọrọ. O kwukwara na ọ ga-abụrịrị na ihe na-eme ka ndanda nwee ike ịna-ebu ihe karịrị ya bụ na ihe ndị ahụ dị́ n’olu ya siri ezigbo ike. Ndị ọkachamara kwuru na ha nwere ike ịrụpụta ígwè ọrụ ndị ka mma a ga-eji na-ebu ihe ndị na-anyị ezigbo arọ, ma ha ghọtachaa otú olu ndanda si arụ ọrụ.

Gịnị ka i chere? Otú a olu ndanda si sie ike na otú a o si ebu ihe karịrị ya ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya