Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 5 p. 8-9
  • Kụziere Ụmụ Gị Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Ụmụ Gị Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • IHE I KWESỊRỊ ỊMA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Na-agwa Ụmụ Gị Okwu Banyere Mmekọahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Kụziere Ụmụ Gị Omume Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Olee Otú Ndị Nne na Nna Ga-esi Akụziri Ụmụ Ha Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mmekọahụ—Olee Ndụmọdụ nke Dị Irè n’Ezie?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 5 p. 8-9
Ebe otu nne na-agbasa ákwà ọ sụrụ mmiri n’eriri, na-agwakwa nwa ya nwaanyị okwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Kụziere Ụmụ Gị Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ebe otu nwata nwoke na-ele otú dị iche iche e si anata ozi​—⁠Baịbụl, akwụkwọ, na ngwá elektrọniks

N’afọ ndị gara aga, ọ na-abụkarị ndị nne na nna na-ebu ụzọ agwa ụmụ ha gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Ha na-eji nwayọọ nwayọọ na-akụziri ha ya ka ha na-eto.

Ma n’oge anyị a, ọ dịghịzi otú ahụ. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Lolita Effect kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụaka taa na-ebido mgbe ha ka dị ezigbo ntakịrị matawa ihe ndị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Ụdị ihe ndị ahụ na-ejupụtazi n’ihe ndị a na-emepụta maka ụmụaka.” Ihe ndị a hà ga-enyere ụmụaka aka ka hà ga-emebi ha?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọ ahụ́ juru ebe niile. Deborah Roffman dere n’akwụkwọ ya a na-akpọ Talk to Me First na ‘ihe ndị na-akpali agụụ mmekọ ahụ́ na-ejupụtazi ná mkparịta ụka, vidio na egwú ndị e ji akpọsa ngwá ahịa, fim, akwụkwọ, egwú, tiivi, ekwentị nakwa kọmputa. Ihe ndị a na-emezi ka ọtụtụ [ụmụaka] na-eche na mmekọ nwoke na nwaanyị bụ ihe kacha mkpa ná ndụ.’

Ndị na-akpọsa ngwá ahịa sokwa na-akpata nsogbu a. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-eme ka ọhaneze kweta na efe ụmụaka ndị na-egosi ahụ́ ha magburu onwe ya. Ndị na-ere ahịa na-eresịkwa ọhaneze ụdị efe ndị ahụ. Ha si otú ahụ na-akụziri ụmụaka na ụdị efe ndị ahụ bụ ebe a nọ. Otu akwụkwọ a na-akpọ So Sexy So Soon kwuru, sị: “Ndị na-akpọsa ngwá ahịa ma na ihe na-ewu ewu na-amasị ụmụaka. Ha na-ejikwa ihe ndị ahụ arata ha. Ma, o doro anya na ihe bụ́ mkpa ndị na-ere ahịa abụghị ime ka ụmụaka ndị a mebie,” kama ọ bụ “ka ha repụ ahịa ha.”

Ịkọrọ ụmụ gị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị abụghị ebe okwu biri. O nwere ihe dị iche n’ịma otú ụgbọala si arụ ọrụ na ịbụ ọkwọ ụgbọala aka siri ike. N’otu aka ahụ, o nwere ihe dị iche n’ịma gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na iji ihe ahụ ị ma eme ezigbo mkpebi.

Ihe ị ga-eburu n’obi bụ: Ọ bụ n’oge anyị a ka ọ kacha mkpa inyere ụmụ gị aka ka ha zụọ “ikike nghọta” ha ka ha nwee ike “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”​—⁠Ndị Hibru 5:⁠14.

IHE I NWERE IKE IME

Bido rụwa ọrụ dịịrị gị. Ọ bụ eziokwu na o nwetụrụ otú ọ dị ịgwawa nwa gị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị, ma ọ bụ ọrụ dịịrị gị. Gbalịa rụọ ya.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 22:⁠6.

Akọrọla ya ihe niile otu mgbe. Kama, iwepụta otu oge ị ga-eji kọọrọ nwa gị ihe niile, i nwere ike iji oge ụfọdụ gị na ya nọ kọọrọ ya ihe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ mgbe unu na-aga ihe ma ọ bụ mgbe unu na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. I nwere ike ịjụ ya ajụjụ ndị ga-eme ka o kwuo ihe dị ya n’obi. Dị ka ihe atụ, kama ịjụ ya, sị: “Ihe ndị a ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-egosi hà na-amasị gị?” i nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee ihe i chere mere ndị na-akpọsa ngwá ahịa ji egosi ụdị ihe ndị a?” Ọ zachaa, i nweziri ike ịjụ ya, sị: “Gịnịkwanụ ka gịnwa chere?”​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Diuterọnọmi 6:​6, 7.

Kụziere ya ihe ya na ya hà. I nwere ike ịkụziri nwa gị na-ebidobeghị akwụkwọ ihe a na-akpọ ahú nwoke ya ma ọ bụ ahụ́ nwaanyị ya, nakwa ihe ọ ga-eme ma mmadụ chọọ imetọ ya. Ka ọ na-eto, i nweziri ike ịgwa ya ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịma gbasara ahụ́ ya. O kwesịrị ịbụ na ọ matala ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị tupu ya aghọọ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, matakwa otú Chineke si ele ya anya.

Kụziere ya àgwà ọma. I kwesịrị ibido mgbe ọ ka dị obere kụziwere ya ịna-ekwu eziokwu, ịna-akpa àgwà ọma nakwa ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù. Ọ ga-emezi ka ịkụziri ya gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị dị mfe. Meekwa ka ihe ị na-akụziri ya doo ya anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị ma na inwe mmekọahụ tupu alụọ dị na nwunye adịghị mma, gwa ya ya hoo haa. Gwakwa ya ihe mere na ọ dịghị mma, nakwa nsogbu ọ ga-akpata. Otu akwụkwọ aha ya bụ Beyond the Big Talk kwuru, sị: “Ọ ga-esi ike ka ndị na-eto eto ma na ndị mụrụ ha kpọrọ ịkwa iko asị kwaa iko.”

Na-eme ihe ị na-ekwu. Na-eme ihe ị na-akụziri nwa gị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-atọ gị ụtọ ma e jiri ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na-eme ihe ọchị? Ị̀ na-eji ejiji na-adịghị mma? Ị̀ na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị? Nwa gị hụ ka ị na-eme ihe ndị a, o nwere ike ime ka ọ ghara ịmụta ihe ndị ahụ ị na-akụziri ya.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Rom 2:⁠21.

Emela ka o yie ihe ọjọọ. Mmekọ nwoke na nwaanyị bụ onyinye si n’aka Chineke. Ọ bụkwa ihe na-enye obi ụtọ ma ndị kwesịrị ime ya mee ya, ya bụ, ndị lụrụ di na nwunye. (Ilu 5:​18, 19) Mee ka nwa gị mata na o nwere ike ime ya mgbe oge ruru, ya bụ, mgbe ọ na-agaghị na-amapụ ya obi ma ọ bụkwanụ na-echegbu onwe ya maka ibute ọrịa.​—⁠1 Timoti 1:​18, 19.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”​—⁠Ilu 22:⁠6.

  • “Kụnye [iwu Chineke] n’ime ụmụ gị.”​—⁠Diuterọnọmi 6:​6, 7.

  • “Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?”​—⁠Ndị Rom 2:⁠21.

ỌRỤ DỊỊRỊ NNE MA Ọ BỤ NNA

N’agbanyeghị ihe ọtụtụ ndị na-ekwu, nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụaka na-akacha amụta ihe n’aka nne na nna ha karịa n’aka ndị ọzọ. Akwụkwọ aha ya bụ Talk to Me First kwuru, sị: “Ụmụaka na-ebu ụzọ esi n’aka ndị mụrụ ha na ndị ọzọ toro eto nọ ha nso amata ihe ha ga na-eme. Ha na-esikwa n’aka ha aghọta ihe ndị ha na-amaghị. Mgbe ha na-achọwa ebe ọzọ ha ga-esi mata ihe ha na-amaghị bụ ma ha chọpụta na ndị mụrụ ha achọghị ịgwa ha. . . . Nchọpụta e ji ọtụtụ afọ mee gosiri na ụmụaka ndị nne na nna ha kọọrọ gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na-aka akpa àgwà ọma. Ha na-aka enwe ike ikpebiri onwe ha ihe. Ma, nke kachanụ bụ na ha na-ezere àgwà ọjọọ ndị nwere ike ime ka ha daba ná nsogbu.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya