Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 6 p. 12-13
  • Azụ̀ Clown Dị́ Ịtụnanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Azụ̀ Clown Dị́ Ịtụnanya
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘AGAGHỊ M ADỊ NDỤ MA E WEZỤGA GỊ’
  • Ọ NA-AGA EBE AZỤ̀ NDỊ ỌZỌ NA-ATỤ ỤJỌ ỊGA
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2016
  • Gaa Leta Ahịa Azụ̀ Kasị Ukwuu n’Ụwa
    Teta!—2004
  • Gịnị Ka Oké Ụgbụ na Azụ ahụ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Teta!—2016
g16 nke 6 p. 12-13

Azụ̀ Clown Dị́ Ịtụnanya

Azụ̀ clown na-acha odo odo

Azụ̀ clown na-acha odo odo

AZỤ̀ clown pụrụ iche n’azụ̀ ndị ọzọ. O nwere ike ịbụ na ihe na-adọrọ mmasị ndị mmadụ n’ebe azụ̀ a nọ bụ n’ihi ọmarịcha àgwà dị iche iche ọ tụrụ n’ahụ́ ya, ma ọ bụ n’ihi ụdị ebe ọ na-ebi. Ọ na-aga biri n’etiti ihe ndị na-agba agba n’ahụ́ otu ihe yiri okoko osisi a na-akpọ anemone. Anemone a na-anọ n’ime osimiri. Ọ bụ ya mere e ji na-akpọkwa ya azụ̀ anemone.

Azụ̀ clown anaghị atụ ụjọ ịbịa mmadụ nso. Ọ bụ ya mere o ji dị mfe ise ya foto. Ndị na-egwu mmiri na-atụkarị anya ka azụ̀ a nọzie ka ha see ya foto ebe ọ bụ na ọ naghị esikarị n’ebe o bi aga ebe dị anya ma ọ bụ gbaa ọsọ ma ọ hụ mmadụ.

Ma ihe kacha mee ka azụ̀ a dị itụnanya bụ ebe dị ize ndụ ọ na-ebi. Ọ na-ebi n’etiti ihe ndị ahụ na-agba agba n’anemone. Ma, azụ̀ a na anemone ahụ na-agba agba na-abịa bụrụ enyi. Olee ihe mere azụ̀ a na anemone a ji nwee ike ibikọtali n’enweghị nsogbu?

‘AGAGHỊ M ADỊ NDỤ MA E WEZỤGA GỊ’

Azụ̀ clown tụrụ àgwà ogologo abụọ

Azụ̀ clown tụrụ àgwà ogologo abụọ

Azụ̀ a na anemone na-egboro ibe ha mkpa, otú ahụ mmadụ abụọ na-emekọ ihe ọnụ si enyere ibe ha aka. Mkpa anemone na-egboro azụ̀ a abụghị obere mkpa. Ndị sayensị na-amụ banyere ihe ndị dị ná mmiri kwuru na azụ̀ a agaghị anọli n’ebe anemone na-adịghị n’ihi na ọ naghị egwu mmiri nke ọma. Ọ bụrụ na ọ nọrọ n’ebe anemone na-adịghị, azụ̀ ndị ọzọ ga-eri ya ozugbo. Ma, ebe ọ bụ na azụ̀ a nwere ebe o nwere ike ịgbaba ma azụ̀ ndị ọzọ chọwa iri ya, ọ na-anọru ihe dị ka afọ iri.

Ọ bụkwa n’ime anemone a ka azụ̀ a na-eyi àkwá ya. Nke oké na nke nne ga-anọ na-eche àkwá ahụ nche. Mgbe e mechara, ha na ụmụ ha egwugharịwazie gburugburu ebe anemone ahụ nọ.

Ma, olee uru anemone a na-erite n’aka azụ̀ a? Azụ̀ a na-achụ ụmụ irighiri azụ̀ ndị na-abịa eri ọnụ ọnụ ihe ahụ na-agba agba n’anemone a. Ma énweghị ihe ọzọ, e nwere otu ụdị anemone na-agaghị anọli ma azụ̀ a anọghị. Mgbe ndị na-eme nchọpụta wepụrụ azụ̀ a n’ime anemone ndị ahụ naanị otu ụbọchị, e riri ha. Ọ ga-abụ na ụmụ irighiri azụ̀ ndị ahụ erichapụla ha.

O nwekwara ike ịbụ na azụ̀ a na-abakwara anemone ụdị uru ọzọ. Ihe a na-akpọ amonium dị na nsị azụ̀ a na-enyere anemone a aka ito. Ihe ọzọ bụkwa na ka azụ̀ ndị ahụ na-egwugharị n’etiti ihe ahụ na-agba agba, ha na-eme ka ikuku oxygen juru ná mmiri na-agazu anemone ahụ gburugburu.

Ọ NA-AGA EBE AZỤ̀ NDỊ ỌZỌ NA-ATỤ ỤJỌ ỊGA

Azụ̀ clown na-acha pịnk pịnk

Azụ̀ clown na-acha pịnk pịnk

O nwere ihe ụfọdụ mere azụ̀ a ji enwe ike ịnọ n’ime anemone a n’enweghị ihe na-eme ya. Azụ̀ a nwere ihe na-alọ alọ kpuchiri ahụ́ ya na-eme ka anemone a ghara ịna-agba ya. Ọ ga-abụ na ihe ahụ kpuchiri azụ̀ a mere ka anemone a chee na ọ bụ anemone ibe ya. Ihe a mere ka otu onye na-amụ gbasara ihe ndị dị n’osimiri kwuo na azụ̀ a bụ “azụ̀ dị n’ụdị anemone.”

Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ bụrụ na azụ̀ a achọwa anemone ọhụrụ ọ ga-anọ na ya, ọ na-ebu ụzọ na-aga emetụ anemone ahụ ahụ́ ruo awa ole na ole ka ọ mara otú ọ ga-esi gbanwetụ ihe ahụ na-alọ alọ dị n’ahụ́ ya ka nsí anemone ahụ nwee ike mara ya ahụ́. O nwere ike ịbụ na anemone na-agba ya n’oge ahụ. Ma, ka oge na-aga, ha abụọ ga-adịzi ná mma.

O nwere ihe magburu onwe ya anyị ga-amụta n’otú azụ a na anemone a si na-emekọrịta ihe. N’ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ na-eme, ọ bụrụ na ha ejiri ihe ndị ha nwere gbakọọ aka ọnụ rụọ ọrụ, ha na-arụpụta ezigbo ihe. Ma, o nwere ike iwe anyị obere oge ịmụta otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-emekọ ihe otú ahụ ọ dị azụ̀ a. Mana mgbe e mechara, anyị ga-ahụ na mgbalị anyị bara ezigbo uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya