Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 3 p. 6-7
  • Mmadụ Ijide Onwe Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmadụ Ijide Onwe Ya
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IWE IWE
  • ỊNA-EKELE NDỊ MEERE GỊ IHE
  • IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • “Nghọta Mmadụ Nwere Na-eme Ka Ọ Ghara Iwe Iwe Ọsọ Ọsọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Na-achịkwa Mmetụta M?
    Teta!—2005
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 3 p. 6-7
Ebe iwe ji ndị kwụ n’ahịrị na-akwụ ụgwọ n’ụlọ ahịa, ma otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị nọ jụụ

Mmadụ Ijide Onwe Ya

Baịbụl gwara anyị ka anyị na-ejide onwe anyị ma gbalịa na-eme ihe ndị ga-abara anyị uru.

IWE IWE

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”—Ilu 16:32.

IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụrụ na anyị ejisie ike na-ejide onwe anyị, ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ ga-abara anyị uru. Mgbe ụfọdụ, e nwere ezigbo ihe mere mmadụ nwere ike iji wee iwe. Ma, oké iwe ga-akpatara anyị nsogbu. Ndị na-eme nchọpụta n’oge a kwuru na mmadụ anaghị eche echiche nke ọma ma iwe jide ya nakwa na onye iwe ji na-ekwukarị ma ọ bụ na-emekarị ihe ọ ga-emecha kwaara mmakwaara.

IHE I NWERE IKE IME: Tupu iwe emee ka i mee ihe na-adịghị mma, gbalịa jide onwe gị. Ụfọdụ ndị chere na mmadụ iwe oké iwe na-egosi na onye ahụ siri ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na onye ahụ adịghị ike. Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka obodo e tidara etida nke na-enweghị mgbidi, otú ahụ ka onye na-adịghị ejide mmụọ ya dị.” (Ilu 25:28) Otu ihe ga-enyere anyị aka ịghara iwe oké iwe bụ ibu ụzọ chọpụta ihe merenụ tupu anyị ekwuo ma ọ bụ mee ihe ọ bụla. Baịbụl kwuru, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) N’ihi ya, esemokwu bilite, anyị kwesịrị ige onye nke ọ bụla ntị nke ọma. O nwere ike mee ka anyị ghara iwe oké iwe n’ihi na anyị aghọtala ihe merenụ.

ỊNA-EKELE NDỊ MEERE GỊ IHE

IHE BAỊBỤL KWURU: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.”—Ndị Kọlọsi 3:15.

IHE Ọ PỤTARA: Ndị mmadụ ekwuola na ọ bụ naanị ndị na-ekele ndị ọzọ maka ihe e meere ha na-enwe obi ụtọ. Ndị mmadụ nwụnahụtụrụla ma ọ bụ ndị ezigbo ihe funahụtụrụla ga-ekweta na ihe a bụ eziokwu. Ha kwuru na ihe nyeere ha aka mgbe ụdị ihe a mere ha bụ ilekwasị anya n’ihe ndị ha nwere, ọ bụghị n’ihe ndị fụnahụrụ ha.

IHE I NWERE IKE IME: N’ụbọchị ọ bụla, chee banyere ihe ndị ị ga-ekele Chineke maka ha ma ọ bụkwanụ gị edee ha n’akwụkwọ. Ọ bụghị iwu na ihe ndị ahụ ga-abụ oké ihe. Chee banyere ihe ndị yiri ihe na-adịchaghị mkpa, dị ka ọmarịcha anyanwụ na-awa n’ígwé, mkparịta ụka gị na onye ị hụrụ n’anya nwere, ma ọ bụkwanụ ndụ ị dị. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka ị na-enwe obi ụtọ.

Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ iche banyere ihe mere obi ji dị gị ụtọ maka ezinụlọ gị na ndị enyi gị. Ị chọpụta ihe na-amasị gị n’ebe ndị ọzọ nọ, gwa ha ya ihu na ihu ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi, n’ozi iimel, ma ọ bụkwanụ n’ozi ekwentị. Ime ihe a ga-eme ka gị na ha na-adịkwu ná mma, gị ana-enwekwa obi ụtọ n’ihi ihe ọma ị na-emere ha.—Ọrụ Ndịozi 20:35.

IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU

Ebe otu nwaanyị na-egere Baịbụl a na-egere egere mgbe ọ na-apịakọta ákwà nwa ya nwaanyị

I nwere ike isi na jw.org danloduo Baịbụl a na-egere egere n’asụsụ 40

ARỤMỤKA BIDO, SI EBE AHỤ PỤỌ.

“Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”—ILU 17:14.

KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ BANYERE ỌDỊNIHU.

“Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”—MATIU 6:34.

TUPU GỊ EMEE IHE, CHEE YA NKE ỌMA. EMELA IHE N’IHI OTÚ O SI DỊ GỊ N’OBI.

“Ikike iche echiche ga-echekwa gị nche, nghọta ga-echebekwa gị.”—ILU 2:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya