Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 1 p. 8-13
  • Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echegbula Onwe Gị Maka Echi
  • Atụla Anya na Ị Ga-emetacha Ihe Niile
  • Mara Ihe Ndị Na-akpatara Gị Nchegbu
  • Gbalịa Na-ahazi Ihe Ahazi
  • Arụgbula Onwe Gị n’Ọrụ
  • Na-elekọta Ahụ́ Gị
  • Na-ebu Ụzọ Eme Ihe Ndị Ka Mkpa
  • Na-achọ Enyemaka
  • Na-eme Ihe Ndị Gbasara Ofufe Chineke
  • Nrụgide Dị Mma, Nrụgide Dị Njọ
    Teta!—1998
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Ihe Na-esiri M Ike n’Ụlọ Akwụkwọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Nchegbu—Ihe Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe
    Teta!—2005
  • Ndị Nchegbu Na-akpa Aka Ọjọọ!
    Teta!—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 1 p. 8-13
Nwaanyị obi siri ike, nke na-enwekwa obi ụtọ n’obodo mepere emepe.

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU

Ihe Ị Ga-eme ma I Chegbuwe Onwe Gị

Ọ bụrụ na ị chọghị ịna-echegbukarị onwe gị, i kwesịrị iche echiche gbasara otú ahụ́ ga-esi esi gị ike, otú gị na ndị ọzọ si emekọrịta ihe, ihe ndị ị chọrọ iji ndụ gị eme, na ihe ndị kacha gị mkpa ná ndụ. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ma i chegbuwe onwe gị, nakwa otú i nwere ike isi belata nchegbu.

Echegbula Onwe Gị Maka Echi

Nwaanyị obi siri ike, nke na-enwekwa obi ụtọ n’obodo mepere emepe.

“Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi.”​—MATIU 6:34.

Ihe Ọ Pụtara: Ọ dịghị njọ mmadụ iche maka ụbọchị nke ọ bụla. Ma, i kwesịghị iwere nsogbu nke echi tinye na nke taa n’ihi na ọ ga-eme ka i chegbuwe onwe gị. Gbalịa ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị maka echi.

  • Ichegbu onwe gị maka echi nwere ike ime ka obi koro gị n’elu. N’ihi ya, megodị ihe a: Nke mbụ, buru n’obi na onye ọ bụla dị ndụ ga-enwerịrị ihe ga-eche ya uche. Ma, ichegbuwe onwe gị maka ihe ndị ị na-enweghị ike ime ihe ọ bụla gbasara ha nwere ike ime ka obi koro gị n’elu. Nke abụọ, cheta na ọ bụghị mgbe niile ka ihe anyị na-atụ ụjọ ya na-emecha mee.

Atụla Anya na Ị Ga-emetacha Ihe Niile

‘‘Amamihe nke si n’eluigwe na-eme ka mmadụ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.’​—JEMS 3:17.

Ihe Ọ Pụtara: Atụkwala anya na gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ ga na-emetecha ihe niile. Atụkwala anya ime ihe ị na-agaghị emeli ma ọ bụ ka ndị ọzọ mee ihe ha na-agaghị emeli.

  • Mara ebe ike gị ruru, na-atụ anya ime ihe ndị ị ga-emeli, marakwa ihe gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ na-agaghị emeli. I mee ihe a, ọ ga-eme ka gị na ndị gị na ha na-emekọ ihe ghara ịna-echegbu onwe unu, meekwa ka unu na-emekwu nke ọma. Na-achịtụ ọchị, na-akpakwa ndị ọzọ ọchị. Ị chịa ọchị, ma mgbe ihe na-agachaghị nke ọma, ọ ga-eme ka iwe ghara ịna-ewekarị gị, obi ana-atọkwa gị ụtọ.

Mara Ihe Ndị Na-akpatara Gị Nchegbu

‘Onye na-aghọta ihe na-anọ jụụ.’​—ILU 17:27.

Ihe Ọ Pụtara: Obi ikoro gị n’elu nwere ike ime ka ị ghara iche echiche nke ọma. N’ihi ya, gbalịa na-anọ jụụ.

  • Mara ihe ndị na-akpatara gị nchegbu, matakwa ihe ị na-eme ma ha mee. Dị ka ihe atụ, i chegbuwe onwe gị, gbalịa chọpụta ụdị ihe na-echegbu gị, otú obi dị gị, na àgwà ị na-akpa n’ihi ihe ahụ. I nwedịrị ike ide ha ede. Ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ndị a, o nwere ike inyere gị aka ịma ihe ị ga-eme iji belata nchegbu gị. Cheekwa ihe ndị i nwere ike ime iji wepụ ihe ndị na-akpatara gị nchegbu. Ọ bụrụ na ị gaghị ewepụli ha, gbalịa belata nsogbu ha na-akpatara gị. I nwere ike ịchọ ụzọ ka mma ị ga-esi eme ihe ndị ị na-eme ma ọ bụ ịchọ oge ka mma ị ga-eji eme ha.

  • Gbalịa isi n’ụzọ ọzọ lee ihe merenụ anya. Ihe na-echegbu gị nwere ike ọ gaghị echegbu onye ọzọ. Ihe mere o ji echegbu gị nwere ike ịbụ otú i si ele ihe anya. Chebara aro atọ a echiche:

    1. Adịla ngwa ikpebi na mmadụ bu ihe ọjọọ n’obi mee ihe o mere. Mmadụ nwere ike ịgafe gị n’ebe ị kwụ n’ahịrị, gaa nọrọ gị n’ihu. Ọ bụrụ na i were ya na ihe a o mere jọgburu onwe ya, o nwere ike ime ka iwe jide gị. Kama iwewe iwe, ọ ga-aka mma ma i were ya na e nwere ezigbo ihe mere o ji mee ya. N’eziokwu, e nwere ike inwe.

    2. Na-ahụ ihe ọma n’ihe ọ bụla merenụ. Ọ bụrụ na ị ga-anọ ogologo oge n’ebe ị na-eche dọkịta ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọelu, oge ahụ i ji na-eche agaghị ewutecha gị ma i jiri ya na-agụ akwụkwọ ma ọ bụ iimel gị.

    3. Buru ihe ga-emecha mee n’obi. Jụọ onwe gị, sị, ‘Nsogbu a ọ̀ ga-aka njọ echi ma ọ bụ n’izu na-abịa abịa?’ Mara nsogbu ndị nke na-esighị ike na ndị nke siri oké ike.

Gbalịa Na-ahazi Ihe Ahazi

Ebe otu nwaanyị ji ekwentị ya na-ele ebe ọ haziri ihe ndị ọ ga-eme n’ụbọchị.

“Na-emenụ ihe niile otú kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”​—1 NDỊ KỌRỊNT 14:40.

Ihe Ọ Pụtara: Gbalịa na-ahazi ihe ndị ị na-eme ná ndụ gị ahazi.

  • Ịhazi ihe ahazị na-adị anyị mma. Otu ihe nwere ike iso akpata ahazighị ihe ahazi nakwa nchegbu bụ ịna-eyigharị ihe a chọrọ ime. O nwekwara ike ime ka anyị nwee ọtụtụ ọrụ anyị na-arụchaghị arụcha. Ọ ga-adị mma ma i mee ihe abụọ a:

    1. Nwee ebe i depụtara ihe ndị ị chọrọ ime, gbalịakwa na-eme ha.

    2. Chọpụta ihe ndị na-eme ka ị na-eyigharị ihe ị chọrọ ime, gbalịakwa mee ihe banyere ha.

Arụgbula Onwe Gị n’Ọrụ

“Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.”​—EKLIZIASTIS 4:6.

Ihe Ọ Pụtara: Ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ nwere ike ịnapụ onwe ha uru ha kwesịrị irite n’ọrụ ha na-arụ. O nwere ike ha agaghịzi enwe oge na ume ha ga-eji nụ ụtọ ihe ndị ha rụtara.

  • Na-ele ọrụ na ego anya otú kwesịrị ekwesị. Mmadụ inwekwu ego apụtaghị na ọ ga-enwekwu obi ụtọ ma ọ bụkwanụ na nchegbu ya ga-ebelata. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ inwetakwu ego nwere ike ịkpatakwuru ya obi ọjọọ na nchegbu. Ekliziastis 5:12 kwuru na “ọtụtụ ihe ọgaranya nwere anaghị ekwe ya rahụ ụra.” N’ihi ya, gbalịa na-ekowe akpa gị ebe aka gị ga-eru.

  • Wepụta oge na-ezu ike. Ime ihe ndị na-amasị gị ga-eme ka nchegbu gị belata. Mana, o nwere ike ihe ndị e ji atụrụ ndụ ndị na-eme ka mmadụ nọrọ otu ebe, dị ka ile tiivi, agaghị enyecha aka.

  • Na-ahapụtụ ekwentị na ihe ndị yiri ya. Anọla na-agụ ozi iimel, ozi ekwentị, na ozi ndị na-abịara gị n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet mgbe niile. Agụla ozi iimel ndị e ziteere gị gbasara ọrụ n’oge ị na-anọghị n’ọrụ, ọ gwụkwala ma ọ̀ dị ezigbo mkpa.

Na-elekọta Ahụ́ Gị

Ebe otu nwa okorobịa na-amụmụ ọnụ ọchị ka ọ na-agba ọsọ n’èzí.

“Mmadụ ịzụ ahụ́ ya bara . . . uru.”​—1 TIMOTI 4:8.

Ihe Ọ Pụtara: Imega ahụ́ mgbe niile na-eme ka ahụ́ gbasie mmadụ ike.

  • Na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike. Mmega ahụ́ nwere ike ime ka obi na-adị gị mma ma mee ka nchegbu gị belata. Na-eri nri ndị na-edozi ahụ́, ahapụkwala iri nri mgbe i kwesịrị iri ya. Na-ezu ike nke ọma.

  • Ejikwala ihe ndị nwere ike imerụ gị ahụ́ achọ ịgbara nchegbu ọsọ, dị ka ịṅụ sịga, ịṅụ ọgwụ ike, na ịṅụ oké mmanya. Ha ga-emecha mee ka nchegbu gị ka njọ n’ihi na ha nwere ike ịkpatara gị ọrịa, richaakwa ego ị tara ahụhụ kpata.

  • Ọ bụrụ na nchegbu gị karịziri akarị, gaa hụ dọkịta. Ekwela ka ihere gbochie gị ịga ka dọkịta nyere gị aka.

    “INWE OBIỌMA NWERE IKE IME KA NCHEGBU GỊ BELATA”

    “Nwoke obiọma na-abara onwe ya uru, ma onye obi tara mmiri na-etinye onwe ya ná nsogbu.”​—ILU 11:17.

    Otu akwụkwọ bụ́ Overcoming Stress nwere isiokwu bụ́ “Inwe Obiọma Nwere Ike Ime Ka Nchegbu Gị Belata.” Dr. Tim Cantopher, onye dere akwụkwọ ahụ, kwuru na inwere ndị ọzọ obiọma nwere ike ime ka mmadụ nwee obi ụtọ, ahụ́ adịkwa ya mma. Ma, onye na-anaghị enwe obiọma anaghị enwe obi ụtọ n’ihi na ndị ọzọ ga na-agbara ya ọsọ.

    Mmadụ itinyere ụwa ya obiọma nwekwara ike inyere ya aka ibelata nchegbu. Dị ka ihe atụ, anyị ekwesịghị ịchọ ịna-eme ihe anyị na-agaghị emeli. Anyị ekwesịghịkwanụ ịna-ele onwe anyị anya ka ndị na-abaghị uru. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”​—Mak 12:31.

Na-ebu Ụzọ Eme Ihe Ndị Ka Mkpa

“Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—NDỊ FILIPAỊ 1:10.

Ihe Ọ Pụtara: Leruo ihe ndị i weere ka ihe kacha mkpa anya.

  • Depụta ihe ndị i nwere ime n’usoro. Ọ ga-eme ka ị mara ndị ị ga-ebu ụzọ eme, ndị ị ga-ahapụtụgodị, ndị nke ị ga-enyefe onye ọzọ, ma ọ bụdị ndị nke ị ga-ahapụ kpamkpam.

  • N’ime otu izu, depụta ihe ndị i ji oge gị mee. Gbalịzie chọpụta otú ị ga-esi jiri oge gị na-eme ihe bara uru. Ị gbalịa na-eme ya, ọ ga-eme ka nchegbu gị belata.

  • Wepụta oge ị ga-eji na-ezu ike. Iwepụta naanị ntakịrị oge zurutụ ike ga-eme ka i nwetaghachi ume, meekwa ka nchegbu gị belata.

Ebe otu di na nwunye na ụmụ ha nọkọrọ ọnụ.

Na-achọ Enyemaka

“Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ, ma okwu ọma na-eme ka obi dị ya ụtọ.”​—ILU 12:25.

Ihe Ọ Pụtara: Okwu ọma ndị ọzọ gwara gị nwere ike ime ka obi dị gị mma.

  • Gị na onye ga-aghọta gị nke ọma kwurịta ihe ụfọdụ. Onye ahụ nwere ike inyere gị aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma ọ bụdị gwa gị ihe ị na-amabughị nwere ike igboro gị mkpa gị. Naanị ịkọrọ onye ahụ ihe ndị a nwedịrị ike ime ka nchegbu gị belata.

  • Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. I nwere ike inyefe ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ma ọ bụ gwa ha ka ha nyere gị aka.

  • Ọ bụrụ na onye gị na ya na-arụ ọrụ na-enye gị nsogbu, chọọ ụzọ ndị ị ga-esi mee ka ihe ka mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iji akọ gwa ya na ihe ọ na-eme na-ewute gị. (Ilu 17:27) Ọ bụrụ na ime ihe a emeghị ka ihe ka mma, i nwere ike ibelata oge gị na ya ji anọ.

Na-eme Ihe Ndị Gbasara Ofufe Chineke

Ebe otu nwoke bụ́ ọchụnta ego nọ n’ọfis ya na-ekpe ekpere.

“Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.”​—MATIU 5:3.

Ihe Ọ Pụtara: Ọ bụghị naanị nri, uwe, na ebe obibi dị anyị mkpa. Ihe gbasara ofufe Chineke dịkwa anyị mkpa. Anyị chọọ ịna-enwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịma na ife Chineke dị mkpa, meekwa ihe maka ya.

  • Ekpere ga-enyere gị ezigbo aka. Chineke sị gị ‘na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu gị, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Ikpe ekpere na ichebara ihe ndị dị mma echiche nwere ike ime ka obi ruo gị ala.​—Ndị Filipaị 4:6, 7.

  • Na-agụ akwụkwọ ndị ga-eme ka ị bịarukwuo Chineke nso. Ihe ndị e dere na magazin a si na Baịbụl, e dekwara Baịbụl iji nyere anyị aka ịbịaru Chineke nso. Ha na-eme ka mmadụ nwee “ezigbo amamihe . . . na-echebakwara ihe echiche nke ọma.” (Ilu 3:21) Jisie ike malite ịgụ Baịbụl. I nwere ike iji akwụkwọ Ilu malite.

ỊGBAGHARA NDỊ ỌZỌ NA-ABA EZIGBO URU

“Ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, a ga-ajakwa ya mma ma o leghara ihe ọjọọ e mere ya anya.”​—ILU 19:11.

Loren Toussaint dere n’akwụkwọ bụ́ Journal of Health Psychology, sị: “Nchegbu na-akpata nsogbu [ọrịa]. Ma, ịgbaghara ndị ọzọ na-eme ka ahụ́ sie mmadụ ike.” O dekwara, sị: “Ị gbaghara onye mejọrọ gị, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-ewe iwe ma na-echegbu onwe gị. Ọ ga-emekwa ka i jiri obiọma na-emeso onye ahụ ihe.” Mgbe ọ na-apịachi okwu ya, ọ sịrị na ịgbaghara ndị ọzọ “nwere ike ime ka nsogbu nchegbu na-akpata belata.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya