Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 2 p. 7-9
  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Ụmụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Ụmụ Gị?
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Ụmụaka Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka—Nke Mbụ: Nwa M Ò Kwesịrị Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka?
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Kpachara Anya n’Ịntanet
    Teta!—2014
  • Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Ụmụaka na Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet—Nke 1: M̀ Kwesịrị Ịhapụ Nwa M Ka Ọ Na-aga Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet?
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 2 p. 7-9
Ebe ụmụaka dị iche iche na-apị ekwentị na ihe ndị yiri ya kama ịna-agbagharị n’èzí ma ọ bụ jiri ihe ụmụaka ji egwu egwu na-egwurị egwu.

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Ụmụ Gị?

O nwere ike isiri ndị dimkpa na ndị agadi ike ịpị ekwentị na ihe ndị yiri ya. Ma, ọ naghị esiri ụmụaka ndị a na-amụ n’oge a ike.

Ma, ụfọdụ ndị ekwuola na ụmụaka ndị na-ejikarị oge buru ibu apị ekwentị nwere ike . . .

  • ịghọ ndị aka na-atọ n’ekwentị.

  • ịna-achọ ndị ọzọ okwu n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ ana-achọ ha okwu.

  • ịhụ foto ma ọ bụ vidio ndị gba ọtọ ma hà chọrọ ya ma ha achọghị ya.

IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA

Ebe otu nwata nwoke ji ekwentị ya n’aka ma jiri ụjọ na-emechi ọnụ ụzọ ya mgbe mama ya na-agafe.

AKA ỊTỌ MMADỤ N’EKWENTỊ

Ihe ụfọdụ a na-eme n’Ịntanet, dị ka ịgba gem, anaghị ara ahụ́ ya erie mmadụ ahụ́. Otu akwụkwọ aha ya bụ Reclaiming Conversation kwuru, sị: “A haziri ihe ndị dị n’ekwentị anyị ka ha mee ka aka ghara ịpụ anyị apụ n’ekwentị.” Ka anyị na-ele ngwá ahịa ndị a na-akpọsa n’ihe ndị ahụ, ka ndị na-akpọsa ha na-enwetakwu ego.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Aka ọ̀ na-atọkarị ụmụ gị n’ekwentị? Olee otú ị ga-esi nyere ha aka ka ha jiri oge ha na-eme ihe bara uru?​—NDỊ EFESỌS 5:​15, 16.

ỊCHỌ NDỊ ỌZỌ OKWU N’ỊNTANET

Ụfọdụ ndị nọrọ n’Ịntanet, ha na-ejikarị iwe ekwu okwu, na-ekwu okwu rụrụ arụ, na-agwakwa ndị ọzọ okwu ọjọọ. Ndị na-eme ihe ndị a na-aghọkarị ndị ọchọ okwu.

Ihe mere ụfọdụ ndị ji eme ihe ndị a bụ ka a mara ndị ha bụ ma na-anụ aha ha. Mmadụ nwekwara ike ịna-ewe iwe ma na-eche na ndị ọzọ kpọrọ ya asị n’ihi na ha akpọghị ya ka o soro ha n’oriri ha mere.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ụmụ gị hà na-akparị ndị mmadụ ma ha nọrọ n’Ịntanet? (Ndị Efesọs 4:31) Obi ọ̀ na-ajọ ha njọ n’ihi na ndị ọzọ akpọghị ha ka ha soro ha mee ihe ha na-eme?

ILE NDỊ GBA ỌTỌ

Ịntanet emeela ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịna-ele foto ndị gba ọtọ. E nwere ihe ndị nne na nna nwere ike itinye n’ekwentị ụmụ ha nke ga-eme ka ha ghara ịhụ foto ma ọ bụ vidio ndị gba ọtọ. Ma, ndị nne na nna kwesịrị icheta na ihe ndị a nwere ike ịgharịpụ.

N’obodo ụfọdụ, iji ekwentị ezigara ndị ọzọ foto ndị gba ọtọ ma ọ bụ ile ụdị ozi ndị ahụ megidere iwu. Dabere n’iwu obodo ụfọdụ, nakwa afọ ole ndị mere ụdị ihe a dị, e nwere ike ikpe ha ikpe n’ihi na ha na-egosi ụmụaka foto ndị gba ọtọ.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha ghara izigara ndị ọzọ foto ndị gba ọtọ n’Ịntanet ma ọ bụ lee ụdị foto ndị ahụ?​—NDỊ EFESỌS 5:​3, 4.

IHE I NWERE IKE IME

ZỤỌ ỤMỤ GỊ NKE ỌMA

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ụmụaka ndị a mụrụ n’oge a ma otú e si apị ekwentị nke ọma, ma ọ ka dị mkpa ka a na-eduzi ha. Otu akwụkwọ aha ya bụ Indistractable kwuru na inye ụmụaka ekwentị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya mgbe ha na-amatabeghị otú ha ga-esi zere nsogbu ndị dị na ya “dị ka ịhapụ ụmụaka ka ha maba n’ime mmiri mgbe ha na-amabeghị mmiri egwu.”

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso. Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.”​—ILU 22:6.

Họrọ ihe ndị dị n’okpuru ebe a ị ga-achọ ime ma ọ bụkwanụ gị edee ihe ndị gịnwa chọrọ ime.

  • Mụ na nwa m ga-ekwurịta otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ọma ma ọ nọrọ n’Ịntanet

  • M ga-enyere nwa m aka ma obi jọwa ya njọ n’ihi na ndị ọzọ akpọghị ya ka o soro n’ihe ha na-eme

  • M ga-agbalị igbochi nwa m ịhụ ihe ndị na-adịghị mma n’Ịntanet ruo otú m nwere ike

  • M ga na-eme m gụrụ gụrụ, mụ elee ekwentị nwa m mara ihe ndị o ji ya na-eme

  • M ga-ekpebi awa ole nwa m ga-eji na-apị ekwentị n’ụbọchị

  • Agaghị m ekwe ka nwa m jiri ekwentị ya laba ụra

  • M ga-eme iwu na e nweghị onye ga na-apị ekwentị mgbe anyị na-eri nri

IHE NDỊ NNE NA NNA GA-EKWURỊTA

  • Ànyị na-enye nwa anyị ekwentị ma ọ bụ ihe yiri ya ka ọ na-apị ka ọ ghara ịna-enye anyị nsogbu?

  • Ọ̀ dị mkpa ka nwa anyị nwee ekwentị na-aga n’Ịntanet? Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ọ̀ bụ maka gịnị?

  • Ànyị nwere ego anyị ga-eji zụtara nwa anyị ekwentị na-aga n’Ịntanet?

  • Olee otú nwa anyị sirila gosi na ọ na-eme mkpebi dị mma?

  • Nwa anyị ọ̀ na-ekweta ma o mejọọ ihe, dịkwa njikere imezi ihe ahụ?

  • Olee iwu ndị anyị ga-enye nwa anyị?

  • Olee otú anyị ga-esi enyere nwa anyị aka ka ọ ghara ịna-eji oge ya niile na-apị ekwentị?

    AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Ndị tozuru etozu . . . na-echebara ihe echiche nke ọma. Ha na-esi otú a azụ onwe ha ka ha mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.”​—NDỊ HIBRU 5:14.

Laureta na David.

“Gịnị mere ụmụ gị ji chọọ inwe ekwentị? Gịnị ka ha na-eji ekwentị nke gịnwa eme? Olee ebe ndị ha na-eji ya emepe n’Ịntanet? Olee ụdị gem ndị ha na-eji ya agba? Awa ole ka ha na-eji apị ya? Chọpụta ma ụmụ gị hà na-akpa àgwà ka ndị maara ihe ma na-eme mkpebi dị mma tupu gị enyewe ha ekwentị.”​—LAURETA, NA DAVID DI YA

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya