Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g22 nke 1 p. 10-12
  • 3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya
  • Teta!—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • Ihe I Kwesịrị Ịma
  • Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A
  • Ezi Ndị Enyi—Ajọ Ndị Enyi
    Teta!—2004
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyi
    Teta!—2004
  • Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2022
g22 nke 1 p. 10-12
Ebe di na nwunye katarala ahụ́ obi dị ụtọ na-amakụ ibe ha.

N’ỤWA A NSOGBU JURU

3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Otú nsogbu si akakwu njọ n’ụwa na-eme ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha, ya emezie ka ha kwụsị ịna-ahụ ndị ha na ha dị ná mma n’anya. Ha nwere ike ime ya n’amaghị ụma.

  • Ndị mmadụ na-ahapụ ndị enyi ha gaa nọrọ naanị ha.

  • Di na nwunye na-esekarị okwu karịa otú ha na-emebu.

  • Ndị mụrụ ụmụ anaghị elebachara ihe ndị na-enye ụmụ ha nsogbu n’obi anya, ụfọdụ anaghị elebatụdịrị ha anya.

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Inwe ezigbo ndị enyi na-eme ka ahụ́ sie anyị ike, na-emekwa ka obi ruo anyị ala, karịchaa, n’oge nsogbu.

  • Nsogbu juru n’ụwa nwere ike ikowe unu obi n’elu ma kpaghasịa ezinụlọ unu otú unu na-atụghị anya ya.

  • Akụkọ ọjọọ ndị a na-agbasa na tivii ma ọ bụ na redio nwere ike imenye ụmụ gị ụjọ karịa otú i chere.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Baịbụl sịrị: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

Ndị enyi anyị nwere ike inyere anyị aka ma nye anyị ezigbo ndụmọdụ. Naanị ịmara na e nwere ndị hụrụ gị n’anya nwere ike ime ka i kpebisikwuo ike na ị ga-edi nsogbu ndị bịaara gị.

OTÚ Ị GA-ESI DIE NSOGBU​—Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka

N’oge nsogbu, na-eme ihe ndị a ka gị na ndị ị hụrụ n’anya na-adị ná mma

NA-EME KA GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ BỤRỤ NNU NA MMANỤ

Ebe di na nwunye katarala ahụ́ obi dị ụtọ na-amakụ ibe ha.

Na-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị bụrụ nnu na mmanụ

Baịbụl sịrị: “Abụọ dị mma karịa otu . . . N’ihi na ọ bụrụ na otu onye n’ime ha adaa, onye nke ọzọ ga-enyere ya aka ka o bilie.” (Ekliziastis 4:9, 10) Di na nwunye kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ otú onye na-anya ụgbọelu na onye na-enyere ya aka si arụkọ ọrụ, ọ bụghị ka ndị agha abụọ bucha ụgbọelu ha ji akwarịta mgbọ.

  • Kpebisienụ ike na nsogbu unu na ya na-alụ agaghị eme ka unu na-emeso ibe unu ihe otú na-adịghị mma. Gbalịa ka ị na-enwe ndidi.

  • Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ugboro n’izu, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta nsogbu unu nwere. Unu kwuwe ya, cheta na unu kwesịrị ịlekwasị anya n’otú unu ga-esi edozi nsogbu unu nwere, ọ bụghị ịchọwa igosi onye ikpe mara.

  • Na-ewepụtanụ oge unu ga-eji eme ihe ndị na-atọ unu abụọ ụtọ.

  • Na-echetanụ oge ndị gara aga unu abụọ nwere obi ụtọ. Otú unu nwere ike isi mee ya bụ ile foto agbamakwụkwọ unu ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ga-echetara unu ihe ndị tọrọ unu ụtọ n’oge gara aga.

“Ọ bụghị n’ihe niile ka di na nwunye na-enwe otu olu, ma ọ pụtaghị na ha enweghị ike inwe otu obi. Di na nwunye nwere ike ikpebi ihe ha chọrọ ime ma rụkọọ ọrụ ọnụ ka ihe ahụ nwee isi.”​—David.

GỊ NA NDỊ ENYI GỊ NA-AKPARỊTA

  • Ebe ụmụ nwannyị ndị si n’ebe dị iche iche n’ụwa bịakọtara ọnụ na-achị ọchị ma na-enwe obi ụtọ.

    Gị na ndị enyi gị na-akparịta

    Chee echiche otú gịnwa ga-esi na-enyere ndị enyi gị aka, ọ bụghị naanị hanwa ga na-enyere gị aka. Mgbe ị na-agba ndị ọzọ ume, ị na-agbakwa onwe gị.

  • Kwa ụbọchị, na-akpọtụ ndị enyi gị ụfọdụ ka ị mara otú ha na-eme.

  • Jụọ ndị enyi gị ihe ndị ha mere ka ha nwee ike die ụdị nsogbu ndị gị na ha na-alụ ugbu a.

“Nsogbu zowere gị ka mmiri, ọ bụ ndị enyi gị ga-enyere gị aka ka ị mara ihe i kwesịrị ime. Ma é nweghị ihe ọzọ, ha nwere ike ichetara gị ihe i chefuru echefu. Ihe banyere gị na-emetụ ndị enyi gị n’obi, ha makwa na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi.”​—Nicole.

NA-ENYERE ỤMỤ GỊ AKA

Ebe di na nwunye na ụmụ ha nọ ọdụ n’ihe a rụrụ n’elu mmiri, na-ele ihe ndị mara mma dị gburugburu ebe ahụ.

Na-enyere ụmụ gị aka

Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Ná mmalite, o nwere ike isitụrụ ụmụ gị ike ịkọrọ gị ihe na-enye ha nsogbu na ihe na-atụ ha ụjọ, ma i nweere ha ndidi ma gee ha ntị nke ọma, ha ga-agwa gị ihe dị ha n’obi.

  • Mee ka obi na-eru ụmụ gị ala ịkọrọ gị ihe dị ha n’obi. Ọ na-akara ụmụaka ụfọdụ mfe ikwu ihe dị ha n’obi mgbe ahụ́ ruru ha ala, dị ka mgbe ha na ndị mụrụ ha nọ n’ụgbọala ma ọ bụ mgbe ha na-aga ije n’okporo ụzọ, ọ bụghị mgbe ha na ndị mụrụ ha nọ ọdụ otu ebe ihu na ihu.

  • Ekwela ka ụmụ gị na-anụkarị akụkọ ọjọọ ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-agbasa.

  • Mee ka ụmụ gị mara ihe ndị i merela iji chebe ndị ezinụlọ gị.

  • Kpebienụ otú unu ga-esi agbapụ ma ihe gbata gbata mee. Gị na ụmụ gị mụgharịa ihe ha kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee.

“Na-agwa ụmụ gị okwu, hapụkwa ha ka ha kwuo ihe dị ha n’obi. O nwere ike ịbụ na ha achọghị ịkọrọ gị ihe na-echu ha ụra, ihe na-atụ ha ụjọ, ma ọ bụ ihe na-ewute ha. Mee ka ha mara na e nwere mgbe obi na-adị gị otú ahụ, gwakwa ha otú i si merie nsogbu a.”​—Bethany.

Foto si na vidio bụ́ “Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu.” Ebe di na nwunye obi dị ụtọ jidere ibe ha aka na-aga n’okporo ụzọ.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ. Lee vidio bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya