ỤWA ANYỊ A Ọ̀ GA-ADỊGIDE?
EZIGBO MMIRI
O NWEGHỊ ihe gaara adị ndụ n’ụwa ma a sị na mmiri adịghị, karịchaa, ezigbo mmiri. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe kachanụ n’ahụ́ ihe niile dị ndụ bụ mmiri. Ọ bụ n’ọdọ mmiri, osimiri, ala mmiri, nakwa ná mmiri dị n’ime ala ka ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ si enweta mmiri ọṅụṅụ na mmiri anyị na-agba n’ihe ndị anyị kụrụ.
Ihe Ndị Na-eme Ka Ezigbo Mmiri Na-akọ Ụkọ
Mmiri juru eju bara abara n’ụwa. Ma, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihu Igwe kwuru na “ọ bụ naanị ntakịrị mmiri n’ime mmiri niile dị n’ụwa bụ ezigbo mmiri e nwere ike iji mee ihe bara uru.” Ọ bụ eziokwu na ntakịrị mmiri a kwesịrị izuru ihe niile dị ndụ n’ụwa, ma a na-emetọ ihe ka ukwuu na ya, ọ naghịkwa erucha ndị mmadụ aka n’ihi na ọtụtụ ndị na-achọ ya. Ihe ọzọ abụrụ na ụwa na-ekpokwu ọkụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na n’ime afọ iri atọ na-abịanụ, ihe dị ka ijeri mmadụ ise (5,000,000,000) agaghịzi na-enweta ezigbo mmiri.
E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide
Ụwa anyị a nwere ihe dị iche iche na-eme ka ezigbo mmiri ghara ịkọ anyị. Ihe ọzọ bụ na ájá, ihe ndị dị n’ime osimiri, nakwa anyanwụ na-agbakọ aka eme ka mmiri anyị na-adị ọcha. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ na-egosi na e kere ụwa anyị a ka ọ dịgide.
A chọpụtala na ájá nwere ike iwepụ ọtụtụ ihe na-emetọ mmiri. N’ala mmiri, e nwere ụfọdụ osisi ndị a ma na ha na-ewepụ ikuku naịtrojin (nitrogen), na-ewepụkwa fosforọs (phosphorus) na ọgwụ ndị e ji egbu ụmụ ahụhụ.
Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na e nwere ihe ndị dị ndụ na ihe ndị na-adịghị ndụ na-eme ka mmiri na-adị ọcha. Mmiri na-asọ asọ na-ede ihe ndị ahụ na-emebi mmiri, ụmụ irighiri ihe dị ndụ agbarizie ha.
Akịrịkọ na ihe ndị ọzọ yiri ya nwere ike isi ná mmiri wepụ ụfọdụ kemikal ndị na-adịghị mma n’ime ụbọchị ole na ole. Ha nwedịrị ike ime ka mmiri dị ezigbo mma karịa otú ìgwè e ji eme ka mmiri dị ọcha ga-emeli.
Ụwa anyị a na-echekwa mmiri dị na ya. Otú o si eme ya bụ na ọ na-eme ka mmiri dị n’ala nakwa n’osimiri laghachi n’ígwé ojii, e mechaakwa ya esi n’ebe ahụ zoo ma banyeghachi n’ala nakwa n’osimiri. Ihe a na ihe ndị ọzọ na-eme ka mmiri ghara isi n’ụwa anyị a pụọ ma ọ bụkwanụ takpọọ.
Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị
Ọ bụrụ na anyị ana-edozi ụgbọala anyị ka ọ ghara ịna-ehi mmanụ ma na-ewega ihe ndị nwere kemikal ọjọọ n’ebe kwesịrị ekwesị, anyị na-eme ka ebe anyị si enweta ezigbo mmiri na-adị ọcha
Ndị ọkachamara na-ekwu na anyị kwesịrị ịgbalị na-echekwa mmiri. Ha kwuru na ihe anyị ga-eme iji belata mmetọ a na-emetọ mmiri bụ idozi ụgbọala anyị ka ọ ghara ịna-ehi mmanụ. Ihe ọzọ bụ ka anyị hapụ ịna-awụnye ọgwụ ndị a na-aṅụghị aṅụ n’ebe a na-aga mposi, hapụkwa ịwụnye kemikal ọjọọ n’ebe mmiri si agbapụ.
Ndị njinia achọpụtala ụzọ ọhụrụ dị iche iche e si eme ka mmiri nnu dị mma ọṅụṅụ (ya bụ, iwepụ nnu dị na ya). Ihe mere ha ji eme ya bụ ka e nwekwuo mmiri e nwere ike ịṅụ aṅụ.
Ma, ihe na-ebenụ ka na-ebe. Ime ka mmiri nnu dị mma ọṅụṅụ otú ọ ga-ezuru ọtụtụ ndị adịghị mfe n’ihi na ego na ikike ọ ga-ewe iji mee ya karịrị akarị. N’afọ 2021, ozi si n’aka Òtù Mba Ụwa gbasara otú a ga-esi na-echekwa mmiri kwuru, sị: “N’ụwa niile, mbọ a gbarala kwesịrị ka a gbakwuo ya okpukpu abụọ.”
Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike—Ihe Baịbụl Kwuru
“Chineke . . . na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala. Ha na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ. Ha na-esizi n’ígwé ojii zoo. Ha na-ezo, onye ọ bụla enweta mmiri.—Job 36:26-28.
Chineke kere mmiri otú ọ ga na-alaghachi n’ígwé ojii, mechaakwa zoo. O mere ihe a iji chekwaa mmiri dị n’ụwa—Ekliziastis 1:7.
Chegodị ihe a: Ọ bụrụ na Onye kere ihe niile mere ka e nwee ihe ndị ga na-eme ka mmiri na-adị ọcha, ọ̀ bụ na ọ gaghị edozili ihe ndị ụmụ mmadụ mebisịrị? Ọ́ gaghịkwa amasị ya idozi ha? Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide.” Ọ dị na peeji nke 15.