Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g23 nke 1 p. 9-11
  • Oké Ọhịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ọhịa
  • Teta!—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Na-emebi Oké Ọhịa
  • E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị
  • Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike​—Ihe Baịbụl Kwuru
  • Ọrụ Oké Ọhịa Na-arụ—Olee Otú Ọ Baruru Uru?
    Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2023
Teta!—2023
g23 nke 1 p. 9-11
Ebe otu nwaanyị na-aga ije n’elu àkwà mmiri dị n’oké ọhịa.

ỤWA ANYỊ A Ọ̀ GA-ADỊGIDE?

OKÉ ỌHỊA

E KWUOLA na ọ bụ ọhịa ji ihe ndị dị n’ụwa ndụ, e nwekwaranụ ezigbo ihe mere e ji kwuo otú ahụ. Osisi na-amịkọrọ ikuku kabọn dayọgzaịd (carbon dioxide). A sị na ọ bụghị ya, ikuku a gaara akpatara anyị nsogbu. Osisi na-ewepụtakwa ikuku ọksijin (oxygen). Ikuku a so n’ihe dị mkpa dị n’ezigbo ikuku anyị na-ekuru. E kee ahịhịa na anụmanụ niile e nwere n’ụwa a ụzọ iri, ebe a ga-ahụ ụzọ asatọ n’ime ha bụ n’oké ọhịa. Ọ bụrụ na oké ọhịa adịghị, anyị agaghị adịli ndụ.

Ihe Ndị Na-emebi Oké Ọhịa

Kwa afọ, a na-egbutu ọtụtụ nde osisi. Isi ihe mere e ji egbutu ha bụ ka a hụ ebe a ga-akọ nri. Kemgbe ihe dị ka afọ iri asaa na ise gara aga, a sụọla ọkara oké ọhịa ndị e nwere n’ụwa.

A sụọ oké ọhịa, a na-egbu ahịhịa na anụmanụ niile bi na ya.

E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide

E nweela ụfọdụ oké ọhịa ndị a sụchara, ha ejiri aka ha ruteghachi. Ndị ọkachamara chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya otú oké ọhịa ndị a sụkpọrọ si toghachi n’onwe ha, bụrụkwa ezigbo oké ọhịa. Ihe a ha chọpụtara tụrụ ha n’anya. Legodị ihe atụ ndị a:

  • E nwere oké ọhịa ndị a sụchara ka a kọọ ugbo na ha, mana e mechaa hapụ ha, ha atọgbọrọzie nkịtị. Ndị na-eme nchọpụta tinyere anya n’ebe ndị ahụ ka ha mara ihe ga-emenụ. Ala ndị ha mere nchọpụta a dị puku abụọ na narị abụọ (2,200) n’Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ihe ha chọpụtara gosiri na ala nwere ike ịbụrụghachi oké ọhịa n’ime afọ iri.

  • Otu magazin aha ya bụ Science kwuru na ndị na-eme nchọpụta ekwuola na n’ime otu narị (100) afọ, ala a sụchara ọhịa dị na ya nwere ike inwe ụdị osisi dị iche iche na ihe ndị ọzọ dị ndụ na-adị n’ezigbo oké ọhịa.

  • Na nso nso a, ndị ọkà mmụta sayensị e nwere na Brazil mụrụ gbasara otú ala si eji aka ya aghọ oké ọhịa nakwa otú ala ndị mmadụ dọrọ osisi na ha si aghọ oké ọhịa.

  • Akụkọ si n’aka National Geographic kwuru ihe ndị ọkà mmụta ahụ chọpụtara. Ọ sịrị: “Obi tọrọ ha ụtọ ịchọpụta na ọ dịghị mkpa ịdọ osisi ọ bụla.” Naanị n’ime afọ ise, “osisi ndị e nwere n’obodo ahụ juru” n’ala ndị ahụ n’enweghị onye dọrọ ha.

    Ị̀ MAARA?

    Ala Ndị A Sụchara Maka Ịkọ Ugbo Bụzi Oké Ọhịa

    Foto na-egosi ala a sụchara ka e jiri ya kọọ ugbo mana e mechaa hapụ iji ya akọ ugbo. Mgbe afọ iri gafere, ọhịa towere na ya. A na-atụ anya na otu narị afọ ma ọ bụ karịa gafee, ọ ga-abụzi ezigbo oké ọhịa.

    Oké ọhịa ndị a sụchara ka e jiri ha kọọ ugbo mana e mechaa hapụ iji ha akọ ugbo na-eji aka ha aghọ oké ọhịa. Otú ahụ ka ọ dịkwa oké ọhịa ndị otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ lara n’iyi.

Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị

N’ụwa niile, ndị mmadụ agbaala mbọ ka e chekwaa oké ọhịa ndị dị adị nakwa ka e mee ka ndị nke a na-achọ ịsụkpọ dịghachi otú ha dịbu. Ozi si n’aka Òtù Mba Ụwa kwuru na n’ihi mbọ a a na-agba, “mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa n’ụwa niile ejirila pasent iri ise belata” kemgbe afọ iri abụọ na ise gara aga.

Ma, mbọ ndị a a na-agba ezubeghị iji chebe oké ọhịa anyị. Nchọpụta otu ụlọ ọrụ aha ya bụ Global Forest Watch bipụtara kwuru, sị: “Oké ọhịa ole a na-egbukpọ kemgbe afọ ole na ole ugbu a ebelatabeghị.”

Ịwa osisi n’anataghị gọọmenti ikike bụ ihe ọtụtụ ndị ji akpa ezigbo ego. Ọ ka bụkwa isi ihe na-akpata mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa.

Ebe onye na-elekọta oké ọhịa na-elebara osisi ndị dị n’ọhịa anya.

Ebe ndị na-elekọta oké ọhịa na-arụ ọrụ ka ha mara osisi ndị kara aka e kwesịrị igbutu na ebe ndị e kwesịrị ịdọ osisi ndị ọhụrụ

Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike​—Ihe Baịbụl Kwuru

“Jehovaa Chineke wee mee ka osisi ọ bụla nke dị mma ile anya, nke mkpụrụ ya dịkwa mma oriri, puo n’ala.​—Jenesis 2:9.

Onye kere ọhịa niile kere ha ka ha nwee ike iji aka ha pụteghachi ma mmadụ si na ha gburu osisi ọ ga-eji mee ihe bara uru. Chineke chọrọ ka oké ọhịa niile na ihe ndị dị ịtụnanya dị na ha dịgide.

Baịbụl gosiri na Chineke ga-eme ka mmebi a na-emebisị ụwa na ihe ndị dị n’ime ya kwụsị. Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide.” Ọ dị na peeji nke 15.

a  Jehova bụ ezigbo aha Chineke​—Abụ Ọma 83:18.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

Ebe otu di na nwunye na-enwe obi ụtọ na paradaịs.

Gịnị mere obi ji sie anyị ike na mmebisị a na-emebisị ihe ndị dị n’ụwa agaghị eme ka ụwa anyị a laa n’iyi? Lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa? Ọ dị na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya