Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 3
  • Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Kere Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ọ Bụrụ na Adam Zuru Okè, Oleezi Otú O Si Mee Mmehie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Anyị Pụrụ Iji Di na Nwunye Mbụ Mụta Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 3
Mgbe Adam na Iv nọ n’ime Ogige Iden

AKỤKỌ NKE 3

Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

OLEE ihe dị iche na foto nke a na nke dị n’akụkọ bu ụzọ? Ọ bụ mmadụ ndị nọ n’ime ya. Ha bụ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ. Ònye kere ha? Ọ bụ Chineke. Ị̀ ma aha Ya? Ọ bụ Jehova. Ma, a kpọrọ nwoke na nwaanyị ahụ Adam na Iv.

Nke a bụ otú Jehova Chineke si kee Adam. O weere ájá n’ala ma jiri ya kpụọ otu ahụ́ zuru okè, ahụ́ mmadụ. Mgbe o mesịrị, ya ekunye ume ndụ n’imi mmadụ ahụ, Adam wee ghọọ onye dị ndụ.

Jehova Chineke nyere Adam ọrụ. Ọ gwara Adam ka ọ gụọ anụmanụ dị iche iche aha. O nwere ike bụrụ na Adam ekiriwo anụmanụ ndị a ruo ogologo oge, n’ihi ya, ọ raghị ya ahụ́ ịgụ ha niile aha kwesịrị ha. Ka Adam na-agụ anụmanụ niile ahụ aha, ọ dị ihe ọ malitere ịhụ. Ị̀ ma ihe ọ bụ?

Anụmanụ niile ahụ nwechara oké na nne. E nwere oké enyí na nne enyí, e nwekwara oké ọdụm na nne ọdụm. Ma Adam enweghị onye ibe. N’ihi nke a, Jehova mere ka oké ụra buru Adam, o wee wepụta otu ọgịrịga n’akụkụ ahụ́ ya. O weere ọgịrịga nke a meere Adam otu nwaanyị, o wee bụrụ nwunye ya.

Obi tọgburu Adam atọgbu! Cheekwa echiche ụdị obi ụtọ Iv nwere n’ihi ịbụ onye e debere ibi n’ogige a mara oké mma! Ugbu a, ha pụrụ ịmụ ụmụ na ibikọ n’obi ụtọ.

Jehova chọrọ ka Adam na Iv dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ chọrọ ka ha mee ka ụwa dum maa mma dị ka ogige Iden. Obi tọrọ Adam na Iv ezigbo ụtọ mgbe ha chere echiche banyere ime nke a! A sị na ị nọ n’ebe ahụ, ọ̀ gaara amasị gị iso mee ka ụwa bụrụ ebe mara mma? Ma Adam na Iv anọgideghị na-enwe obi ụtọ. Ka anyị chọpụta ihe kpatara ya.

Abụ Ọma 83:18; Jenesis 1:26-31; 2:7-25.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya