Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 6
  • Ezi Nwa na Ajọ Nwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Nwa na Ajọ Nwa
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụmụnne Ndị Zụlitere Àgwà Dịrịtara Iche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • ‘Ọ Na-ekwu Okwu, Ọ Bụ Ezie na Ọ Nwụrụ Anwụ’
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 6
Ken ji ihe oriri nye Chineke onyinye, Ebel ejiri atụrụ nye onyinye nke ya

AKỤKỌ NKE 6

Ezi Nwa na Ajọ Nwa

LEENỤ Ken na Ebel ugbu a. Ha abụọ etoola. Ken bụ onye ọrụ ubi. Ọ na-akụ ihe ọkụkụ na mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri dị iche iche.

Ebel ghọrọ onye na-azụ atụrụ. O nwere mmasị n’ilekọta ụmụ atụrụ. Ha na-eto ghọọ atụrụ buru ibu. Ọ dịghị anya Ebel enwee ìgwè atụrụ nke ọ na-elekọta.

Otu ụbọchị, Ken na Ebel nyere Chineke onyinye. Ken nyere ihe oriri ọ kọtara n’ubi. Ebel nyere atụrụ kasị mma o nwere. Omume Ebel na onyinye o nyere dị Jehova mma. Ma omume Ken na onyinye o nyere adịghị Jehova mma. Ị̀ ma ihe kpatara ya?

Ọ bụghị nnọọ na onyinye Ebel ka nke Ken mma. Ọ bụ n’ihi na Ebel bụ ezigbo mmadụ. Ọ hụrụ Jehova na nwanne ya n’anya. Ma Ken dị njọ; ọ hụghị nwanne ya n’anya.

Mgbe Ken na-agbapụ ka o gbuchara Ebel

Chineke gwara Ken ka ọ gbanwee àgwà ya. Ken aṅaghị ntị. O were nnọọ iwe na Chineke hụrụ Ebel n’anya karịa ya. N’ihi ya, Ken wee sị Ebel, ‘Ka anyị gaa n’ọhịa.’ Mgbe naanị ha nọ n’ebe ahụ, Ken wee malite iti Ebel ihe. O tisiri ya ihe ike wee tigbuo ya. Ọ́ bụghị ihe jọgburu onwe ya ka Ken mere?

Ọ bụ ezie na Ebel nwụrụ, Chineke ka na-echeta ya. Ebel bụ ezigbo mmadụ, Jehova adịghịkwa echezọ onye dị ka ya. Otu ụbọchị, Jehova Chineke ga-eme ka Ebel dịghachi ndụ. N’oge ahụ, Ebel agaghị anwụkwa ọzọ. Ọ ga-enwe ike ibi n’ụwa ebe a ruo mgbe ebighị ebi. Ọ́ gaghị adị mma ịmata ụdị mmadụ ndị dị ka Ebel?

Mmadụ ndị dị ka Ken adịghị amasị Chineke. Mgbe Ken gbusịrị nwanne ya, Chineke nyere ya ahụhụ site n’isi n’etiti ndị ezinụlọ ya chụga ya ebe dị anya. Mgbe Ken jere ibi n’akụkụ ọzọ nke ụwa, ọ kpọọrọ otu n’ime ụmụnne ya ndị inyom ka ọ bụrụ nwunye ya.

Mgbe oge na-aga, Ken na nwunye ya mụrụ ụmụ. Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ nke Adam na Iv lụkwara di na nwunye, wee mụtakwa ụmụ. N’oge na-adịghị anya, a bịara nwee ọtụtụ mmadụ n’ụwa. Ka anyị mụọ ihe banyere ụfọdụ n’ime ha.

Jenesis 4:2-26; 1 Jọn 3:11, 12; Jọn 11:25.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya