Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 7
  • Nwoke nke Nwere Obi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwoke nke Nwere Obi Ike
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Inọk—Atụghị Egwu n’Ihu Nsogbu Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Soro Chineke Na-eje Ije n’Oge Ọgba Aghara Ndị A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 7
Inọk

AKỤKỌ NKE 7

Nwoke nke Nwere Obi Ike

KA ỌNỤ ọgụgụ ndị mmadụ na-aba ụba n’ụwa, ihe ka ọtụtụ n’ime ha mere ihe ọjọọ dị ka Ken. Ma ọ dị otu nwoke pụrụ iche. Ọ bụ nwoke nke a a na-akpọ Inọk. Inọk bụ nwoke nke nwere obi ike. Ndị nọ ya gburugburu nọ na-eme ihe ndị jọrọ nnọọ njọ, ma Inọk nọgidere na-efe Chineke.

Ebe onye ohi gburu otu nwoke n’oge Inọk

Ị̀ ma ihe mere ndị oge ahụ ji mee ọtụtụ ihe ọjọọ? Chee echiche banyere nke a: Ònye mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi wee rie mkpụrụ osisi Chineke sịrị ha erila? Ọ bụ otu ajọ mmụọ ozi. Bible na-akpọ ya Setan. Ọ chọkwara ime ka mmadụ niile bụrụ ndị ọjọọ.

Otu ụbọchị, Jehova Chineke mere ka Inọk gwa ụmụ mmadụ ihe ha na-achọghị ịnụ. Lee ihe ọ gwara ha: ‘Otu ụbọchị, Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile.’ Eleghị anya, ha were oké iwe mgbe ha nụrụ nke a. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na ha nwara igbu Inọk. N’ihi ya, ọ dị Inọk mkpa inwe obi ike iji gwa ha ihe Chineke gaje ime.

Ndị ajọ mmadụ na-ebi ndụ otú o si masị ha n’oge Inọk

Chineke ekweghị ka Inọk dị ogologo ndụ n’etiti ndị ọjọọ ahụ. Inọk dịrị ndụ nanị narị afọ atọ na iri afọ isii na ise. Gịnị mere anyị ji sị “nanị narị afọ atọ na iri afọ isii na ise”? Ọ bụ n’ihi na ndị oge ahụ dị ike karịa ndị oge a, ha dịkwara ogologo ndụ karịa ndị oge a. Leenụ, Metusela nwa Inọk dịrị ndụ ruo narị afọ itoolu, iri afọ isii na itoolu!

Mgbe Inọk nwụrụ, ụmụ mmadụ jọrọ njọ gabiga ókè. Bible na-ekwu na ‘ihe niile nke ha na-eche n’echiche bụ nanị ihe ọjọọ mgbe niile,’ nakwa na ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike.’

Ị̀ ma otu n’ime ihe ndị mere nnukwu nsogbu ji jupụta n’ụwa n’oge ahụ? Ọ bụ n’ihi na Setan nwere ụzọ ọhụrụ o si eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ. Anyị ga-amụ banyere nke a n’akụkọ na-esonụ.

Jenesis 5:21-24, 27; 6:5; Ndị Hibru 11:5; Jud 14, 15.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya