Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 16
  • Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Achọrọ M Iso Ya Laa”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ribeka—Nwanyị Dị Uchu nke Na-atụ Egwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ribeka Dị Njikere Ime Ihe Dị Jehova Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ribeka Chọrọ Ime Ka Obi Dị Jehova Ụtọ
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 16
Mgbe mbụ Aịzik hụrụ Ribeka

AKỤKỌ NKE 16

Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye

Ị̀ MA onye nwaanyị a nke nọ na foto a bụ? Aha ya bụ Ribeka. Nwoke ahụ ọ na-ejekwuru bụ Aịzik. Ọ na-aga ịghọ nwunye ya. Olee otú nke a si mee?

Ebreham nna Aịzik chọrọ ịlụtara nwa ya ezigbo nwunye. Ọ chọghị ka Aịzik lụrụ otu n’ime ndị inyom Kenan, n’ihi na ndị ahụ na-efe chi ụgha. Ebreham wee kpọọ ohu ya sị ya: ‘M chọrọ ka i jee n’ebe ndị ikwu m bi na Heran, lụtara Aịzik nwa m nwunye.’

Ozugbo ahụ, ohu Ebreham chịịrị kamel iri ma malite njem ahụ dị anya. Mgbe o ruru nso n’ebe ndị ikwu Ebreham bi, ọ kwụsịrị n’akụkụ otu olulu mmiri. Ọ bụ n’oge mgbede, bụ́ mgbe ndị inyom obodo ahụ na-abịa esere mmiri n’olulu mmiri ahụ. Ohu Ebreham wee kpegara Jehova ekpere, sị: ‘Biko, ka nwaanyị nke ga-enye mụ na kamel ndị a niile mmiri bụrụ onye ị họpụtara ịbụ nwunye Aịzik.’

Ọ dịghị anya, Ribeka abịa isere mmiri. Mgbe ohu ahụ rịọrọ ya mmiri, o nyere ya. O jekwara kute mmiri nke zuru kamel niile ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Ọ bụ ọrụ siri ike, n’ihi na kamel na-aṅụ mmiri nke ukwuu.

Mgbe Ribeka mesịrị nke a, ohu Ebreham ahụ jụrụ ya aha nna ya. Ọ jụkwara ya ma ya pụrụ ịrahụ n’ụlọ ha. Ọ sị ya: ‘Aha nna m bụ Betuel, e nwekwara ebe ị ga-arahụ n’ụlọ anyị.’ Ohu Ebreham maara na Betuel bụ nwa nwanne Ebreham, bụ́ Nehọ. O gbuo ikpere n’ala kelee Jehova maka idute ya na nke ndị ikwu Ebreham.

N’abalị ahụ, ohu Ebreham gwara Betuel na Leban nwanne Ribeka isi ije ya. Ha kwere na Ribeka ga-esoro ya jee ka Aịzik lụọ ya. Gịnị ka Ribeka kwuru mgbe a jụrụ ya? Ọ zara ‘Ee,’ na ya chọrọ ije. N’echi ya, ha nọkwasịrị n’elu kamel, wee malite ogologo njem ahụ ịlaghachi Kenan.

Mgbe ha ruru, ọ bụ n’oge anyasị. Ribeka wee hụ nwoke nke na-ejegharị n’ubi. Ọ bụ Aịzik. Obi tọrọ ya ụtọ ịhụ Ribeka. Sera nne ya anwụwo kemgbe afọ atọ gara aga, ọ nọkwa na-eru újú ya. Ma ugbu a, Aịzik bịara hụ Ribeka n’anya nke ukwuu, obi wee dị ya ụtọ ọzọ.

Jenesis 24:1-67.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya