Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 42
  • Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jakị Belam Kwuru Okwu
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jizọs Abịa Dị Ka Eze
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 42
Mgbe ịnyịnya ibu na-agwa Belam okwu n’ihi na mmụọ ozi nọchiri ụzọ

AKỤKỌ NKE 42

Ịnyịnya Ibu Ekwuo Okwu

Ọ̀ DỊTỤWO mgbe ị nụrụ na ịnyịnya ibu kwuru okwu? Ị pụrụ ịza ‘Ee e. Anụmanụ apụghị ikwu okwu.’ Ma Bible kwuru banyere otu ịnyịnya ibu nke kwuru okwu. Ka anyị hụ otú o si mee.

Ụmụ Izrel na-ejikere ịba n’ala Kenan. Belak, bụ́ eze Moab, tụrụ egwu ụmụ Izrel. O wee zie ozi ka otu nwoke dị ike nke aha ya bụ Belam bịa kọchaa ụmụ Izrel. Belak kwere nkwa inye Belam nnukwu ego, n’ihi ya, Belam nọkwasịrị n’ịnyịnya ibu ya, wee na-eje ịhụ Belak.

Jehova achọghị ka Belam kọchaa ndị Ya. N’ihi ya, o zigara otu mmụọ ozi nke ji ogologo mma agha ka ọ gaa guzoro n’ụzọ ma kwụsị Belam. Belam apụghị ịhụ mmụọ ozi ahụ, ma ịnyịnya ibu ya hụrụ ya. Ịnyịnya ibu ya nọgidere na-achọ izere mmụọ ozi ahụ, n’ikpeazụ, ọ makpuuru ala n’ụzọ. Belam were iwe nke ukwuu wee were osisi na-eti ịnyịnya ibu ya.

Mgbe ahụ, Jehova mere ka Belam nụ ka ịnyịnya ibu ya na-agwa ya okwu. Ịnyịnya ibu ahụ jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka m mere gị iji na-eti m ihe?’

Belam wee sị ya: ‘I mewo ka m yie onye nzuzu. A sị na m ji mma agha, m gaara egbu gị!’

Ịnyịnya ibu ahụ wee jụọ ya, sị: ‘Èmetụwo m gị otú a mbụ?’

Belam wee zaa ya ‘Ee e.’

Jehova wee mee ka Belam hụ mmụọ ozi ahụ nke ji ogologo mma agha ka o guzo n’ụzọ. Mmụọ ozi ahụ wee sị: ‘Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe? Abịara m ịnọchiri gị ụzọ, n’ihi na ị gaghị eje ịkọcha Izrel. A sị na ịnyịnya ibu gị ezereghị m, m gaara egbu gị, agaraghị m eme ịnyịnya ịbụ gị ihe ọ bụla.’

Belam wee sị ya: ‘Emehiewo m. Amaghị m na i guzo n’ụzọ.’ Mmụọ ozi ahụ wee hapụ Belam ka ọ laa, Belam wee gawa ịhụ Belak. Ọ nwakwara ịkọcha Izrel, ma kama nke ahụ, Jehova mere ka ọ gọzie Izrel ugboro atọ.

Ọnụ Ọgụgụ 21:21-35; 22:1-40; 23:1-30; 24:1-25.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya