Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 52
  • Gidiọn na Narị Ndị Ikom Atọ Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gidiọn na Narị Ndị Ikom Atọ Ya
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Mma Agha Dịịrị Jehova Dịkwara Gidiọn!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gidiọn Meriri Ndị Midian
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ndị Okenye, Mụtanụ Ihe n’Aka Gidiọn
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jehova Bụ Ezigbo Enyi Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 52
Gidiọn kewara ndị agha ya n’ìgwè n’ìgwè

AKỤKỌ NKE 52

Gidiọn Na Narị Ndị Ikom Atọ Ya

Ị̀ NA-AHỤ ihe na-eme n’ebe a? Ndị a bụ ndị ikom na-eburu Izrel agha. Ọ bụ mmiri ka ndị ikom ahụ hulatara ala na-aṅụ. Ọ bụ Onyeikpe bụ́ Gidiọn guzo ha n’akụkụ. Ọ na-ele otú ha si aṅụ mmiri.

Lee anya nke ọma ụzọ dị iche iche ndị ikom ahụ si na-aṅụ mmiri. Ụfọdụ kpudoro ihu ha ná mmiri ahụ. Ma otu onye ji aka ya na-akwọrọ mmiri, ka o wee nwee ike ịhụ ihe na-eme gburugburu ya. Nke a dị mkpa, n’ihi na Jehova gwara Gidiọn ka ọ họrọ naanị ndị na-elepụ anya mgbe ha na-aṅụ mmiri. Chineke gwara ya ka o zilaga ndị fọdụrụ n’ime ha. Ka anyị lee ihe mere o ji kwuo otú ahụ.

Izrel abanyekwala ná nnukwu nsogbu ọzọ. Ihe kpatara nke ahụ bụ na ha erubereghị Jehova isi. Ndị Midian akawo ụmụ Izrel ike, wee malite imegbu ha. N’ihi nke a, ụmụ Izrel kpọkuru Jehova maka enyemaka, Jehova wee gee ha ntị.

Jehova gwara Gidiọn ka ọ chọta ndị agha, Gidiọn wee kpọkọta puku ndị agha iri atọ na puku abụọ. Ma ndị agha na-emegide Izrel dị otu narị puku na puku iri atọ na puku ise. N’agbanyeghịkwa nke ahụ, Jehova gwara Gidiọn, sị: ‘Ndị agha gị karịrị akarị.’ Gịnị mere Jehova ji kwuo otú a?

Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na Izrel emerie n’agha ahụ, ha pụrụ iche na ha meriri n’ike ha. Ha pụrụ iche na enyemaka Jehova adịghị ha mkpa iji merie n’agha. N’ihi nke a, Jehova sịrị Gidiọn: ‘Gwa ndị ikom niile na-atụ egwu ka ha laa.’ Mgbe Gidiọn gwara ha otú ahụ, ndị agha ya dị puku iri abụọ na puku abụọ lara. Nke ahụ mere ka ndị agha ya fọdụ naanị puku ndị ikom iri bụ́ ndị ga-ebuso ndị agha dị otu narị puku na puku iri atọ na puku ise agha.

Ma gee ntị! Jehova sịrị: ‘Ndị agha gị ka karịrị akarị.’ Ọ gwara Gidiọn ka o mee ka ha ṅụọ mmiri site ná mmiri iyi nke a, ka o zilagakwa ndị niile na-ekpudo ihu n’ala na-aṅụ mmiri. ‘M ga-enye gị mmeri site n’aka narị ndị ikom atọ bụ́ ndị na-elepụ anya mgbe ha na-aṅụ mmiri,’ ka Jehova kwere ná nkwa.

Ndị agha Gidiọn ndị anya ruru ala na-elegharị anya gburugburu mgbe ha na-aṅụ mmiri

Oge agha ahụ wee ruo. Gidiọn wee kee narị ndị ikom atọ ya ụzọ atọ. O weere opi ike na ite nke ọwa dị n’ime ya nye onye ọ bụla n’ime ha. Mgbe o ruru n’etiti abalị, ha niile wee gbaa ebe ndị iro ha wuru ụlọ ntu ha gburugburu. N’otu mgbe ahụ, ha niile fụrụ opi ha, tiwaa ite ha, wee tie mkpu, sị: ‘Mma agha Jehova na nke Gidiọn!’ Mgbe ndị agha bụ́ ndị iro ha tetara n’ụra, ha nwere mgbagwoju anya ma gbasasịa n’egwu. Ha niile malitere ịgba ọsọ, ụmụ Izrel wee merie n’agha ahụ.

Ndị Ikpe isi 6 ruo 8.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya