Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 99
  • N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ememe nke Metụtara Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Nri Anyasị Ikpeazụ Jizọs Riri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Icheta Jehova na Ọkpara Ya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 99
Nri anyasị ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi riri

AKỤKỌ NKE 99

N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

Ọ BỤ abalị Thursday ugbu a, ka ụbọchị abụọ gasịrịla. Jizọs na ndịozi iri na abụọ ya bara n’ime ụlọ elu ukwu a iri nri Ememe Ngabiga. Nwoke ahụ ị na-ahụ, nke na-apụ apụ, bụ Judas Iskarịọt. Ọ na-eje ịgwa ndị nchụàjà otú ha ga-esi jide Jizọs.

Ọ ka bụ nnọọ ụnyaahụ ya ka Judas jekwuuru ha wee jụọ ha, sị: ‘Gịnị ka unu ga-enye m ma m nyere unu aka jide Jizọs?’ Ha sịrị ya: ‘Mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.’ N’ihi ya, Judas na-eje ịhụ ha ka o wee duru ha bịakwute Jizọs. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe jọgburu onwe ya?

Ha erisịwo nri Ememe Ngabiga ahụ. Jizọs wee malite nri ọzọ pụrụ iche ugbu a. O nyere ndịozi ya ogbe achịcha, wee, sị: ‘Rienụ ya, n’ihi na nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu.’ O nyekwa ha iko mmanya, sị ha: ‘Ṅụọnụ ya, n’ihi na nke a pụtara ọbara m, nke a na-awụsị n’ihi unu.’ Bible na-akpọ nke a ‘nri anyasị nke Onyenwe anyị.’

Ụmụ Izrel riri nri Ememe Ngabiga iji chetara ha mgbe mmụọ ozi Chineke ‘gabigara’ ụlọ ha n’Ijipt, ma gbuo ụmụ e buru ụzọ mụọ n’ụlọ ndị Ijipt. Ma ugbu a, Jizọs chọrọ ka ụmụazụ ya na-echeta ya, na-echetakwa otú o si nye ndụ ya n’ihi ha. Ọ bụkwa ya mere o ji gwa ha ka ha na-eri nri a pụrụ iche kwa afọ.

Mgbe ha risịrị Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, Jizọs gwara ndịozi ya ka ha nwee obi ike ma dịkwa ike n’okwukwe. N’ikpeazụ, ha bụkuru Chineke abụ, wee pụọ. Chi ejimiela mgbe ahụ. Ka anyị lee ebe ha gara.

Matiu 26:14-30; Luk 22:1-39; Jọn isi 13 ruo isi 17; 1 Ndị Kọrint 11:20.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya