Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 109
  • Pita Agaa Ịhụ Kọniliọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Pita Agaa Ịhụ Kọniliọs
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 109
Mgbe Pita onyeozi na-agwa ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọniliọs ka ọ ghara ịkpọrọ ya isi ala

AKỤKỌ NKE 109

Pita Agaa Ịhụ Kọniliọs

Ọ BỤ Pita onyeozi guzo n’ebe a, ndị ahụ nọ ya n’azụ bụ ndị enyi ya. N’ihi gịnị ka nwoke ahụ ji akpọ isi ala enye Pita? Ò kwesịrị ime nke a? Ị̀ ma onye ọ bụ?

Nwoke ahụ bụ Kọniliọs. Ọ bụ ọchịagha ndị Rom. Kọniliọs amaghị onye Pita bụ, ma a gwara ya ka ọ kpọta ya n’ụlọ ya. Ka anyị chọpụta ihe kpatara nke a.

Ndị mbụ na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị Juu, ma Kọniliọs abụghị onye Juu. Ma ọ hụrụ Chineke n’anya, ọ na-ekpegara ya ekpere, na-emere ndị mmadụ ọtụtụ ihe ọma. N’otu ehihie, otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ya, sị ya: ‘Omume gị dị Chineke mma, ọ ga-azakwa ekpere gị. Ziga ndị ikom ka ha kpọta nwoke a na-akpọ Pita. Ọ nọ na Jọpa, n’ụlọ Saịmọn, onye bi n’akụkụ oké osimiri.’

Kọniliọs zigara ndị ikom ozugbo ịchọ Pita. N’echi ya, mgbe ha na-eru Jọpa nso, Pita nọ n’elu ụlọ Saịmọn. N’ebe ahụ, Chineke mere ka Pita chee na ya na-ahụ ákwà sara mbara nke si n’eluigwe na-arịdata. Ụmụ anụmanụ dị iche iche dị n’ime ya. Dị ka iwu Chineke si dị, ụmụ anụmanụ ndị ahụ adịghị ọcha oriri, ma n’agbanyeghị nke ahụ, otu olu sịrị ya: ‘Bilie, Pita. Gbuo, rie.’

Pita zara, sị: ‘Ee e! Eritụbeghị m ihe rụrụ arụ.’ Ma olu ahụ sịrị Pita: ‘Kwụsị ịkpọ ihe ndị Chineke sịrị ugbu a na ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.’ Ihe a mere ugboro atọ. Ka Pita na-eche ihe ọ pụtara, ndị ikom ahụ Kọniliọs zitere bịaruru ụlọ ahụ, wee jụọ maka Pita.

Pita gbadatara wee sị ha: ‘Ọ bụ m ka unu na-achọ. Gịnị mere unu ji bịa?’ Mgbe ha kwuru na otu mmụọ ozi gwara Kọniliọs ka ọ kpọta Pita n’ụlọ ya, Pita kwere iso ha jee. N’echi ya, Pita na ndị enyi ya wee jee ịhụ Kọniliọs na Sesaria.

Kọniliọs akpọkọtawo ndị ikwu ya na ndị enyi ya. Mgbe Pita bịarutere, Kọniliọs kelere ya. Ọ dara n’ala kpọọ isi ala n’ụkwụ Pita, dị ka ị na-ahụ n’ebe a. Ma Pita sịrị ya: ‘Bilie; mụ onwe m bụ mmadụ nkịtị.’ N’ezie, Bible na-egosi na o zighị ezi ịkpọrọ mmadụ isi ala. Anyị kwesịrị ife naanị Jehova.

Pita kwusaara ndị ahụ zukọtaranụ ozi ọma. ‘Ahụrụ m na Chineke na-anara ndị niile na-achọ ife ya ofufe,’ ka ọ sịrị ha. Ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Chineke zitere mmụọ nsọ ya, ndị ahụ wee malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Nke a juru ndị Juu ahụ na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị so Pita bịa anya, n’ihi na ha chere na Chineke na-anabata naanị ndị Juu. Nke a kụziiri ha na Chineke adịghị ewere ndị si n’otu agbụrụ dị ka ndị ka agbụrụ ọzọ mma ma ọ bụ dị ka agbụrụ dị Chineke mkpa karịa agbụrụ ọzọ. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe dị mma nke anyị niile kwesịrị ịdị na-echeta?

Ọrụ 10:1-48; 11:1-18; Mkpughe 19:10.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya