Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 2 p. 10-20
  • Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Ikwere na Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Ikwere na Chineke?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỤ GỊ​—⁠Ò SITERE N’IHE NDABARA?
  • MKPỤRỤ NDỤ GỊ​—⁠ỤBỤRỤ GỊ​—⁠GỊ
  • “ISI IYI” NKE ELUIGWE NA ALA
  • Otú Anyị Pụrụ Isi Mara na Chineke Dị
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Ònye Pụrụ Ịgwa Anyị?
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 2 p. 10-20

Isi 2

Ezi Uche Ọ̀ Dị n’Ikwere na Chineke?

1-3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụlee, ‘Chineke ọ̀ dị adị?’

OTU n’ime ajụjụ ndị kasị mkpa ị pụrụ iche ihu mgbe ọ bụla bụ, ‘Chineke ọ̀ dị adị?’ Nkwubi okwu i rutere na ya pụrụ imetụta ụzọ i si ele ezinụlọ, ọrụ, ego, ụkpụrụ omume na ọbụna ndụ gị n’onwe ya anya.

2 Ọ bụrụ na a jụọ, ‘Chineke ọ̀ dị adị?’ ọtụtụ ndị ga-aza site n’ikwughachi ihe ha gụworo ma ọ bụ nụ ka ndị ọzọ kwuru. Otú ọ dị, gị onwe gị kwesịrị ichebara ajụjụ ahụ echiche. N’akwụkwọ ya bụ́ Man, God and Magic, Dr. Ivar Lissner kwuru na “ọdịiche bụ isi e nwere n’etiti mmadụ na anụmanụ” bụ na “afọ adịghị eju mmadụ nanị n’ihi ụra, iri nri na ime ka ahụ kpoo ọkụ.” Mmadụ nwere “mkpali dị mgbagwoju anya nke ebumpụta ụwa” a pụrụ ịkpọ “ọnọdụ ime mmụọ.” Dr. Lissner kwukwara na ‘mmepeanya nile nke ihe a kpọrọ mmadụ agbanyewo mkpọrọgwụ n’ọchịchọ a na-achọ Chineke.’ Ya mere gị ichebasi echiche ike n’ajụjụ ahụ bụ́ ‘Chineke ọ̀ dị adị?’ bụ ihe àmà na i legharabeghị otu àgwà dị oké mkpa anya​—⁠bụ́ ọnọdụ ime mmụọ gị.

3 Olee otú ị pụrụ isi chọpụta ma è nwere ‘onye mere na onye na-achị elu na ala, Onye Kachasị Elu,’ dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kọwaa “Chineke”? Ezi echiche na-egosi na ọ bụrụ na e nwere ‘onye mere elu na ala,’ e kwesịrị inwe ihe ndị na-egosi mmalite ya, tinyere ihe àmà nke nhazi na usoro. Ná ntụle gị ma è nwere ihe ndị dị otú ahụ, anyị na-akpọ gị òkù ịtụle ihe ndị ọkà mmụta banyere ihe ndị dị ndụ chọpụtaworo banyere ndụ na ihe ndị ọkà n’ihe ọmụmụ physics na ndị na-enyocha mbara igwe mụtaworo banyere mbara igwe na ala anyị site n’iji ígwè telescope na ụgbọ mbara igwe mee ihe.

NDỤ GỊ​—⁠Ò SITERE N’IHE NDABARA?

4-9. Na gịnị ka ndụ n’elu ala na-ezo aka?

4 Gịnị ma ị malite n’ebe onwe gị nọ? Ebee ka ndụ gị si bịa? N’eziokwu, ọ bụ ndị mụrụ gị nyefere gị ya. Ma olee otú ndụ si malite n’elu ala?

5 Ná mgbalị iji mepụta ndụ n’ụlọ ọrụ ime nnyocha, na isi otú ahụ kọwaa otú o si malite, ndị ọkà mmụta mmiri ọgwụ emewo ka ụmụ ire ọkụ gabiga n’ebe e nwere ngwakọrịta nke ikuku ndị pụrụ iche. Otu ihe si na nke a pụta abụwo ụfọdụ amino acid (ụdị ihe ndị dị nta ndị bụ ‘ihe e ji ewulite’ ahụ nke ihe ndị dị ndụ). Ma, amino acid ndị ahụ adịghị ndụ. Ọzọkwa, ha abụghị ihe ndị sitere na nanị ndapụta; ọ bụ ndị ọkà mmụta sayensị a zụrụ nke ọma mepụtara ha n’okpuru ọnọdụ ndị a chịkwara achịkwa n’ime ụlọ ọrụ nnyocha ọgbara ọhụrụ.

6 E nwere ihe karịrị 200 amino acid ndị sitere n’okike, ma ọ bụ nanị 20 ndị pụrụ iche ka e nwere na protein nke ihe ndị dị ndụ. Ọbụna ọ bụrụ na a pụrụ inweta amino acid ụfọdụ site n’àmụ̀mà, ònye họpụtara nanị 20 ndị ahụ kwesịrị ekwesị bụ́ ndị a na-achọta n’ihe ndị dị ndụ? Oleekwa otú e si dozie ha kpọmkwem n’usoro nke a chọrọ n’ime protein? Onye nkọwa nnyocha bụ́ Dr. J. F. Coppedge mere ngụkọ na ‘ikwe omume nke inweta nanị otu akụkụ kasị nta nke protein site ná nhazi mere ná ndabara nke amino acid bụ 1 n’ime 10287.’ (Nke ahụ bụ ọnụ ọgụgụ nwere nọọtụ 287 n’azụ ya.) Tụkwasịkwa, o mere ka ọ pụta ìhè na, ọ bụghị otu, kama ‘ọ dịkarịsịa ala 239 akụkụ ndị kasị nta nke protein ka a chọrọ maka ụdị ndụ kasị ala nke mmadụ pụrụ ichepụta.’ Ị̀ na-eche na ihe àmà dị otú ahụ na-ezo aka n’ebe ndụ dị dị ka ihe sitere n’ihe ndabara efu, ka ò sitere ná nhazi nke e ji ọgụgụ isi mee?

7 Tụleekwa ụdị nchọpụta ọzọ e mere n’ụlọ ọrụ ime nnyocha nke e bipụtaworo n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche dị ka “ike ndụ.” Site n’ígwè ọrụ ndị dị mgbagwoju anya, ndị ọkà mmụta sayensị ewerewo nje virus sitere n’ahụ ihe dị ndụ, wee kewapụtasịa ihe ndị mejupụtara ya. E mesịa ha wetara ihe ndị a mejupụtara ya ma jikọọ ha n’otu ịbụ nje virus. Otú ọ dị, onye ọkà mmụta banyere ihe ndị dị ndụ bụ́ René Dubos kọwara n’akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na ọ bụ ngahie n’ezie ịkpọ oké ihe omume a “ike ndụ.” Ma ndị ọkà mmụta sayensị a ma ndị ọzọ enweghị ike imepụta ndụ ọhụrụ site n’ihe na-adịghị ndụ. Kama ikwu na ndụ sitere n’ihe ndabara, nchọpụta nke a gosiri na “ígwè ọrụ nile nke nkà mmụta ihe ndị dị ndụ” bụ́ ndị dị mkpa maka ndụ “bụ ndị ndụ dịbu adị na-aghaghị inye.”

8 Ọ bụrụgodị na ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ imepụta protein dị ndụ site n’ihe na-adịghị ndụ, nanị ihe ọ ga-egosi bụ na a chọrọ ndụ dịbu adị nke nwere ọgụgụ isi dị ka ike nduzi. O doro anya na ụmụ mmadụ anọghị ebe a iji malite ndụ n’ụwa. Ma e kere ndụ eke, tinyere ndụ mmadụ. Ònye kere ya? Ndị dere Bible ogologo oge gara aga bịarutere ná nkwubi okwu nke kwesịrị ezi ntụle. Otu kwuru: “Ume nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nyere m ndụ.” Onye ọzọ kwukwara: “[Chineke] n’onwe ya bụ onye na-enye ihe nile ndụ.”a

9 Ilebakwu anya n’ahụ gị ga-enyere gị aka ichebakwu echiche na nke a.

MKPỤRỤ NDỤ GỊ​—⁠ỤBỤRỤ GỊ​—⁠GỊ

10-14. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere mkpụrụ ndụ anyị nke na-enye aka mgbe a na-atụle banyere ịdị adị nke Chineke?

10 Ndụ jupụtara n’ime ahụ gị, bụrụ nke ihe dị ka 100,000,000,000,000 mkpụrụ ndụ ndị dị nta mejupụtara. Mkpụrụ ndụ bụ akụkụ bụ isi nke ihe ọ bụla dị ndụ n’ụwa. Ka e ji nlezianya na-amụkwu maka ya, otú ahụ ka a na-ahụkwu ya dị ka ihe dị mgbagwoju anya.

11 A pụrụ iji nke ọ bụla ná mkpụrụ ndụ ahụ gị tụnyere obodo anya nkịtị na-adịghị ahụ nke a gbara mgbidi. Mkpụrụ ndụ nwere akụkụ ndị dị ka ígwè mmepụta ike eletrik iji mepụta ikike. “Ụlọ ọrụ mmepụta ihe” ndị dị n’ime mkpụrụ ndụ na-emepụta protein nakwa hormone maka ibuga ha n’akụkụ ndị ọzọ nke ahụ. E nwere usoro mbugharị dị mgbagwoju anya iji buba mmiri ọgwụ n’ime mkpụrụ ndụ ma bupụta ha. “Ndị nche” na-eche nche iji chịkwaa ihe e webatara na ịlụso ndị mwakpo ọgụ. Ihe bụ isi n’ihe a nile bụ nucleus, bụ́ “ụlọ nzukọ obodo” nke mkpụrụ ndụ. Ọ na-eduzi ihe omume nile nke mkpụrụ ndụ ma nwee ụkpụrụ mkpụrụ ndụ ihe nketa. Ụfọdụ akụkụ ahụ nke mkpụrụ ndụ dị nta nke ukwuu nke na a pụghị ịhụchazi ha nke ọma ọbụna ma e jiri ígwè ọrụ e ji ahụ ihe anya nkịtị na-adịghị ahụ nke ịdị ike ya dị 200,000 okpukpu mee ihe. (Ahụhụ e mere ka o buo ibu ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ga-adị ọkara mile, ma ọ bụ 0.8 kilomita, n’ogologo.) Gịnị pụrụ ịkọwa ụdị ịdị mgbagwoju anya na nhazi dị ịtụnanya e nwere na nke ọ bụla n’ime 100,000,000,000,000 mkpụrụ ndụ gị ndị dị nta?

12 N’otu oge ị bụ otu mkpụrụ ndụ na-achọ ịghọ nwa n’ime akpa nwa nne gị. Mkpụrụ ndụ ahụ kewara ịghọ mkpụrụ ndụ abụọ, e mesịa anọ, na-agakwa n’ihu. E mesịa, ụfọdụ mkpụrụ ndụ ndị ahụ ghọrọ uru ahụ. Ndị ọzọ ghọrọ anya gị, ọkpụkpụ na obi. Ò si aṅaa mee na mkpụrụ ndụ ndị ahụ ghọrọ akụkụ ọ bụla nke ahụ gị n’oge na n’akụkụ kwesịrịnụ? Dị ka ihe atụ, gịnị mere mkpụrụ ndụ ji ghọọ ntị n’ebe ha dị, n’abụghị n’ikpere gị ma ọ bụ n’aka gị?

13 Lerukwuo anya. Ná mkpụrụ ndụ nke ọ bụla i nwere ọtụtụ iri puku mkpụrụ ndụ ihe nketa nakwa DNA dị oké mkpa, nke na-agwa mkpụrụ ndụ otú ọ ga-esi rụọ ọrụ ma mụbaa. A sịrị na DNA nke dị ná mkpụrụ ndụ nke ọ bụla nwere ihe ọmụma zuru ezu ga-eju akwụkwọ nkà ihe ọmụma nke nwere 1,000 mpịakọta. O kpebiri ụcha ntutu gị, ịdị ngwa nke uto gị, obosara nke ọnụ ọchị gị na ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere gị. ‘E deturu’ ihe ahụ nile na DNA nke otu mkpụrụ ndụ dị n’akpa nwa nne gị.

14 N’ịdabere ọbụna n’isi ihe ole na ole ndị a banyere mkpụrụ ndụ, anyị na-ajụ, sị: Ebe ọ bụ na ndị mụrụ anyị amaghị ụma tụọ ụkpụrụ a dị ịtụnanya nke ihe nketa ma ọ bụ mkpụrụ ndụ ahụ, ònye tụrụ ya? À pụrụ ịkọwa ya n’ezi uche n’akpọtụghị Onye Omenkà nwere ọgụgụ isi aha?

15-17. Olee otú ụbụrụ mmadụ si enye ihe àmà nke ọrụ nkà?

15 N’akụkụ ahụ gị nile, ma eleghị anya nke kachasị dị ịtụnanya bụ nke ị na-agaghị ahụ ma ọlị​—⁠ụbụrụ gị. Ihe dị ka 10,000,000,000 mkpụrụ ndụ nke akwara, ihe dị ka okpukpu abụọ nke ụba mmadụ bi n’ụwa mejupụtara ya. Nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ndụ ndị a kwa pụrụ inwe ọtụtụ puku njikọ ya na mkpụrụ ndụ ndị ọzọ nke akwara. Ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke njikọ ndị ahụ karịrị ihe a pụrụ iche n’echiche!

16 I chebewo ọtụtụ narị nde ihe ọmụma na onyoonyo n’ụbụrụ gị, ma ọ bụghị nanị ebe nchekwa ihe ọmụma. Ị pụrụ iji ya mụta ụzọ e si ama ákpụ̀, asụ asụsụ ọzọ, eme bred ma ọ bụ afụ mkpọrọhịhị. Ị pụrụ iche echiche​—⁠otú oge ezumike gị ga-adị ma ọ bụ otú mkpụrụ osisi nke nwere mmiri na-atọ. Ị pụrụ ịtụle ma mepụta ihe. Ị pụkwara ịme atụmatụ, mata uru ihe, nwee ịhụnanya ma jikọọ echiche gị gaa n’oge gara aga, oge dị ugbu a na ọdịnihu. O doro anya na Onye mere ụbụrụ nwere amamihe karịrị nke mmadụ ọ bụla nke ukwuu, n’ihi na ndị ọkà mmụta sayensị kwetara, sị:

“Otú ígwè ọrụ nke a a haziri n’ụzọ dị ebube, nke dị n’usoro ma dịkwa oké mgbagwoju anya si arụ ọrụ ndị a bụ nnọọ ihe a na-apụghị ịghọta. . . . Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe ụmụ mmadụ ga-enweta azịza nye ihe ijuanya ndị ụbụrụ na-ewepụta n’otu n’otu.”​—⁠Scientific American.

17 N’ịtụle ma e nwere Onye Okike nke bụ Onye Kachasị Elu, echefula akụkụ ahụ gị ndị fọdụrụ. Anya gị​—⁠nke na-ahụ ihe kpọmkwem ma na-ekwekọ n’ọnọdụ ọ bụla karịa kamera ọ bụla. Ntị gị​—⁠nke nwere ike ịmata ụda olu dị iche iche ma nye gị echiche nke nduzi na nguzozi. Obi gị​—⁠pọmpụ dị ebube nke nwere ikike ọrụ nke ndị injinia kasị ibe ha na-enwebeghị ike ịrụpụta ihe yiri ya. Ire, usoro mgbari nri na aka gị, ka a kpọtụkwuo nanị ole na ole aha. Otu injinia e goro ọrụ ịhazi na iwu otu nnukwu kọmputa tụgharịrị uche, sị:

“Ọ bụrụ na kọmputa m chọrọ omenkà, ọ́ gaghị adị otú ahụ nke ukwuu karị banyere ígwè ọrụ ahụ dị mgbagwoju anya nke akụkụ ahụ dị iche iche, usoro mmiri ọgwụ, na usoro ndụ, nke bụ ahụ mmadụ m​—⁠nke bụ n’aka nke ọzọ, akụkụ dị nta nke ukwuu nke usoro mbara igwe na ala fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o nweghị nsọtụ?”

“ISI IYI” NKE ELUIGWE NA ALA

18-24. Gịnị na-eduje ọtụtụ ndị n’ikwubi na ọ bụ Chineke kere mbara igwe na ala?

18 Ihe dị ka 3,000 afọ gara aga, otu nwoke onye Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ aha ya bụ Elaịhu kwuru, sị: “Lee anya n’eluigwe ma tụlee.”b

19 Ì mewo otú ahụ n’abalị gbara ọchịchịrị mgbe ihu igwe na-enwu zaa? Onye ọ bụla kwesịrị. Nanị ihe dị ka 5,000 kpakpando ka a pụrụ iji anya nkịtị hụ. Ma, ụyọkọ kpakpando Milky Way anyị nwere ihe karịrị 100,000,000,000 kpakpando. Ụyọkọ kpakpando olekwa ka e nwere? Ndị na-enyocha mbara igwe na-asị na e nwere ọtụtụ puku nde​—⁠ọ bụghị kpakpando, kama ụyọkọ kpakpando, nke ọ bụla nwekwara ọtụtụ ijeri kpakpando! Lee ka mmadụ si bụrụ ihe dị nta ma e jiri ha tụnyere nke a dum! Ebee ka ha nile si bịa?

20 Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na ụyọkọ kpakpando yiri ka ha si n’otu ebe dị n’etiti na-efepụ. Nchepụta nke ọtụtụ ndị na-enyocha mbara igwe bụ na n’ọtụtụ puku nde afọ gara aga, otu oké mgbawa, “oké ntiwapụ,” mere ka ike na ihe malite ịgbasapụ iji ghọọ mbara igwe na ala dị ka anyị si mara ya. Nchepụta ha akọwaghị ihe mere nke ahụ ji mee. Ma ọ na-egosipụta otu ihe na-akpali mmasị, ya bụ, e nwere oge mmalite, bụ́ oge mgbe a mụpụtara mbara igwe na ala.

“Taa mmadụ pụrụ ịhụ ka ụwa nke mmụta sayensị na-ama jijiji n’ihi ihe àmà na-ehiwanye nne maka mmalite nke mbara igwe na ala site ‘n’oké ntiwapụ.’ Ọ na-ewelite ajụjụ banyere ihe bu ụzọ, ha iche ihu n’enweghị ike ha ịza ajụjụ kasị mkpa na-emekwa ka okwukwe bụ isi nke ndị ọkà mmụta sayensị maa jijiji.”​—⁠The Wall Street Journal.

21 Ee, nye ndị na-ekweghị na Chineke, e nwere ajụjụ ndị siri ike ịza: Gịnị ma ọ bụ ònye tinyere ihe n’ime mbara igwe na ala? È sitere n’ihe na-adịghị adị kee mbara igwe na ala? Ebe e lere ihe anya dị ka ụdị nke ike, ebee ka ike ahụ si bịa?

22 Dr. Robert Jastrow, bụ́ onye nduzi nke Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Mbara Igwe nke Goddard nke òtù NASA, kwuru, sị: “N’ihu ihe àmà dị otú a, echiche nke na e nwere Chineke kere mbara igwe na ala bụ ihe kwekọrọ na nkà mmụta sayensị dịkwa ka ọtụtụ echiche ndị ọzọ.”

23 Ndị maara nke a na-akọ n’ọgbọ ọ bụla ekwubiwo na a ghaghị inwe Isi Iyi nke nwere ọgụgụ isi, onye okike bụ Onye Kachasị Elu. Bible na-akọwa ụdị mmetụta ha nwere, mgbe ọ na-asị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.”c

24 Ma ì kpebiwo ugbu a na Chineke dị ma ọ bụ na i kpebighị, ihe anyị tụleworo banyere ndụ, banyere onwe anyị, na banyere mbara igwe na ala kwesịrị inye aka ịkọwa ihe mere ọtụtụ ndị na-eche echiche ji kwenyesie ike na Chineke dị. Nke ahụ na-eduje anyị n’ihe metụtara ya: Ọ bụrụ na Onye Okike dị adị n’ezie, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na ọ ga-agwa ihe ndị o kere eke okwu, ma zaa ajụjụ anyị ndị bụ: N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? N’ihi gịnị ka ajọ omume ji jupụta? Gịnị ka ọdịnihu ga-eweta? Olee otú anyị pụrụ isi nweta obi ụtọ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Job 33:4; Ọrụ 17:25, New English Bible.

b  Job 35:5, New English Bible.

c  Abụ Ọma 19:⁠1.

Igbe dị na peeji nke 13]

“Taa, ọ dịkarịsịa ala, 80% ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ banyere ihe ndị dị ndụ ma eleghị anya ga-ekwere na e nwere ikike ka elu na-eduzi ihe ndị dị ndụ na ndụ.

“Ịdị n’usoro magburu onwe ya na nduzi e nwere ná ngosipụta dị iche iche nke ndụ na n’usoro ndị bụ isi e nwere n’ogo nke mkpụrụ ndụ na molecule nwere mmetụta siri ike na nkwenkwe ahụ bụ na e nwere ikike ka elu.”​—⁠“Journal of the American Medical Association.”

Igbe dị na peeji nke 19]

USORO Ò SITERE N’EBEE?

Dr. Paul Davies, bụ́ onye nkụzi ná mmụta mgbakọ na mwepụ na King’s College, London, dere n’akwụkwọ bụ “New Scientist,” sị:

“Ebe ọ bụla anyị lere anya n’Eluigwe na Ala, site n’ụyọkọ kpakpando ndị ahụ gbasapụrụ nke ukwuu ruo n’akụkụ kasị dị n’ime ime nke atọm, anyị na-ahụ usoro. . . . Ọ bụrụ na ihe ọmụma na usoro na-apụ n’anya mgbe nile dị ka usoro okike si dị, ebee ka ihe ọmụma ahụ nke mere ka ụwa bụrụ ụdị ebe pụrụ iche otú a si bịa ná mmalite?”

Sir Bernard Lovell, nke ụlọ ọrụ England a ma ama bụ́ Jodrell Bank Observatory, dere na echiche ya kwekọrọ nnọọ na nke Albert Einstein:

“Oké ihe mgbagwoju anya na nkwekọrịta e nwere n’iwu na-achị ihe e kere eke, bụ́ nke na-egosipụta ọgụgụ isi dị elu nke ukwuu nke na, a tụọ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, usoro nile nke iche echiche na ime ihe nke mmadụ bụ ngosipụta dị nta nke ukwuu.”​—⁠“Centre of Immensities.”

[Foto dị na peeji nke 13]

MKPỤRỤ NDỤ GỊ

MITOCHONDRIA na-emepụta mmiri ọgwụ iji mepụta ikike

NUCLEUS na-eduzi ọrụ nile nke mkpụrụ ndụ

USORO MBUGHARỊ na-ebuba mmiri ọgwụ n’ime mkpụrụ ndụ ma na-ebupụta ha

RIBOSOME na-emepụta protein na mmiri hormone maka ibuga ha n’akụkụ ahụ ndị ọzọ

MEMBRANE na PROTEIN na-achịkwa ihe a ga-ebubata ma na-ebuso ndị mwakpo agha

[Foto dị na peeji nke 15]

ỤBỤRỤ YA

na-enyere ya aka​—⁠

Ime ka ịnyịnya ígwè ahụ guzozie

Ịnụ mkpọtụ nke ụgbọ ala ndị na-abịa

Ịnụ ísì okooko osisi

Ịmata na ikuku na-eku

Izere nkịta

Icheta ụzọ ụla

[Foto dị na peeji nke 17]

ÒNYE TỤRỤ ỤKPỤRỤ NKE AHỤ MMADỤ?

ỤBỤRỤ: Ọ karịrị nnọọ kọmputa, na-enwe ikike nke e lere anya na o ji otu ijeri okpukpu karịa ókè e ji eme ihe ugbu a n’oge ndụ mmadụ.

ANYA: Oké kamera nke na-arụ ọrụ n’onwe ya, na-ahaziri onwe ya ụzọ o si ahụ ihe, na-eseta ihe na-emegharị ahụ nke ọma n’àgwà dị iche iche.

OBI: Pọmpụ nke dị irè nke ukwuu karịa ígwè ọrụ ọ bụla mmadụ mepụtaworo. Ọ na-ekesasị 1,500 galọn (5,700 L) ma ọ bụ karịa kwa ụbọchị.

IMEJU: Ụlọ ọrụ a na-emepụta mmiri ọgwụ nke na-arụ ihe karịrị 500 ọrụ. Ọ na-emepụta ihe karịrị 1,000 enzyme.

ỌKPỤKPỤ: Usoro ntọala ọrụ nke ịdị arọ ya dị nanị 20 pound (9 kg), ma sie ike dị ka okporo ígwè.

USORO AKWARA: Usoro nke na-ebu ozi, bụ́ nke na-anata ma/ma ọ bụ na-eme ihe banyere 100,000,000 mkpali kwa kịmkịm.

[Foto dị na peeji nke 20]

Olee otú mbara igwe na ala na ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ya si malite ịdị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya