Isi 4
Ịmụ Banyere Ihe Ị Na-apụghị Ịhụ Anya
1-3. Ò si aṅaa bụrụ ihe kwere omume ịmụ banyere Chineke nke a na-adịghị ahụ anya?
ANYỊ apụghị ịhụ ọtụtụ n’ihe ndị kasị adọrọ mmasị. Dị ka ihe atụ, n’ihi na ihe ịtụnanya nke nwa ọhụrụ na-etolite n’ime akpa nwa bụ “ọrụ ebube” anya na-adịghị ahụ ruo ogologo oge, foto ndị mbụ e sere banyere ya bụ oké ihe ịtụnanya.
2 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, dị ka ike ndọta ihe na ike ndọda. Ma ha dị adị n’ezie. Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu banyere ha site n’ịhụ mmetụta ndị ha na-enwe. Ọ dịkwa otú ahụ n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị nwere mmasị n’ịmụ banyere Onye Okike anyị—bụ́ nke anyị kwesịrị inwe—anyị aghaghị itinye uche anyị na ya.—Tụlee Jọn 3:12.
3 N’ụzọ bụ isi, e nwere ụzọ abụọ e si amụ ihe banyere Chineke, bụ́ onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Pọl, bụ́ onyeozi nke Jisọs Kraịst, kwuru otu, na-ede, sị: “Ihe ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi ya na ụdị Chineke ya.” (Ndị Rom 1:20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ihe e kere eke na-agba àmà banyere ịdị adị nke otu Onye Kachasị Elu. Tụkwasịkwa, ọ na-enye ihe ngosi banyere àgwà ya dị iche iche, ihe ọ dị ka ya. Ụzọ nke abụọ dị mkpa nke ukwuu karị, n’ihi na ọ na-enye ihe ọmụma ka zie ezi banyere Chineke. Ọ bụ mkpughe e dere ede nke dị na Bible.
GỊNỊ KA Ọ DỊ KA YA?
4-8. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji jide ike dị ukwuu nke Chineke na ikike o nwere iji ya mee ihe n’aka?
4 Dị ka e dekọrọ na Bible, Jisọs sịrị na “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Nke ahụ pụtara na Onye Okike ahụ enweghị anụ ahụ nkịtị dị ka anyị nwere. Nke a ekwesịghị isi ike ịnakwere nye ndị maara banyere ihe ndị ahụ dị adị n’ezie anya na-adịghị ahụ dị ka ike ndọda, ike ndọta ihe na ụzarị ikuku redio. Otú ọ dị, ọdịiche gbara ọkpụrụkpụ e nwere n’ebe Chineke nọ bụ na ọ bụ Onye dị ndụ nke nwere ọgụgụ isi, na-enwe àgwà ndị anyị pụrụ ịghọta. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a?
5 Ọ̀ dịtụwo mgbe ị hụrụ oké ebili mmiri ka ha na-etikwasị oké nkume ndị dị n’ụsọ osimiri? Ma ọ bụ ị̀ hụtụwo ikike dị ukwuu nke ugwu ndị na-agbawa agbawa? Ndị a bụ ihe ngosi ndị dị nta nke ike Onye Okike ahụ na-aghaghị inwe, n’ihi na o mere ụwa na ike nile dị na ya.
6 N’iji ụzọ mgbakọ a ma ama nke Einstein, bụ́ E=mc2 mee ihe, ndị ọkà mmụta sayensị na-akọwa na ihe nile dị adị abụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ikike nke a kpọchiri n’ime atọm ndị bụ isi. Ụmụ mmadụ egosiwo nke a ịbụ eziokwu site ná mgbawa nke bọmbụ atọm ha. Ma ị̀ maara na oké mgbawa ndị dị otú ahụ na-ekupụ ihe dị ala karịa otu pasent nke ikike ime ihe nke atọm ndị ahụ nwere? Chee echiche banyere ikike dị egwu nke Onye Okike ahụ nwere, bụ́ onye jikọtara atọm nile dị na mbara igwe na ala. Ọtụtụ puku afọ tupu a mụọ Einstein, Akwụkwọ Nsọ mere ka a mara na Onye Kachasị Elu bụ isi iyi nke ikike dị ukwuu. (Aịsaịa 40:29) N’ihi ihe ndị ziri ezi, Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ya ugboro ugboro “Chineke onye pụrụ ime ihe nile.”—Jenesis 17:1; Mkpughe 11:17.
7 Chineke ejiriwo ike ya mee ihe mgbe mgbe n’ụzọ metụtara ụmụ mmadụ kpọmkwem. Ihe atụ e nwere bụ Ọpụpụ ahụ, mgbe Chineke napụtara Mosis na ndị Israel site n’Ijipt. Ị pụrụ ịchọ ịgụpụta ihe ndekọ ahụ dị mkpirikpi n’Ọpụpụ 13:21–14:31. Lee onwe gị anya dị ka onye so n’etiti ndị ahụ e ji ogidi igwe ojii duzie n’ehihie ma jiri ogidi ọkụ ahụ na-egbuke egbuke duzie n’abalị. Olee otú ọ pụrụ isiworị metụta gị mgbe o yiri ka ndị agha ahụ na-achụso unu n’azụ hà gaala ijide unu n’Osimiri Uhie ahụ? Otú ọ dị, chee echiche banyere ikiri ka Chineke ji ike ya mee ka mmiri ahụ ghọọ mgbidi toro ogo n’akụkụ abụọ ka unu wee lanarị. Lee aha Chineke ọ bụ!—Ọpụpụ 15:1, 2, 11; Daniel 4:35.
8 Ọpụpụ ahụ gosikwara ike Chineke nwere imezu ihe site n’ebe dị anya. Iji mee nke a, o ji ike ọrụ ya anya na-adịghị ahụ, bụ́ mmụọ ya, ma ọ bụ mmụọ nsọ, mee ihe. Ọ bụ ezie na ike ọrụ nke a abụghị onye, ọ pụrụ ịrụsi ọrụ ike dị ka nkupụ ume nke dị ike. Chineke ji mmụọ ya kee eluigwe na ala nke anya na-ahụ. (Abụ Ọma 33:6; Jenesis 1:2) Ma ọ pụkwara iji ya wusie ndị mmadụ ike ma nyere ha aka.—Ndị Ikpe 14:5, 6; Abụ Ọma 143:10.
9-11. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmata banyere Chineke n’ihe metụtara ihe ọmụma? Na amamihe?
9 Onye na-ahazi ma na-eme ígwè ọrụ ụfọdụ aghaghị inwe ihe ọmụma nke otú e si rụọ ya na otú o si arụ ọrụ. N’ihi ya, ọ̀ bụ na ihe anyị na-ahụ n’elu ala na n’eluigwe adịghị emesi anyị obi ike na Chineke nwere ihe ọmụma dị ukwuu? Ndị ọkà n’ihe banyere ọgwụ na-etinye oge ndụ ha iji ghọta ọdịdị nke ihe ndị dị n’okike. Lee amamihe Onye kere ihe ndị a nile na-aghaghị inweworị! Ọzọ, ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ ihe banyere mkpụrụ ndụ na ụdị ihe ndị dị ndụ anya efu na-apụghị ịhụ. Onye Okike ahụ aghaghị ịmara akụkụ ndị ahụ nke ọma iji wee mepụta ndụ na nke mbụ ya!
10 Ihe ọmụma Chineke na-agbasazu eluigwe na ala nile. Ọ pụrụ ịkpọ ijeri kpakpando nile ndị o kere n’aha ha. (Aịsaịa 40:26) Mgbe a kọrọ nanị ụfọdụ n’ime ihe ọmụma dị ukwuu nke Chineke, otu nwoke aha ya bụ Job ji obi umeala kwupụta, sị: “Amawo m na ị pụrụ ime ihe nile, amawokwa m na a dịghị egbochi nzube ọ bụla nke sitere n’aka gị.” (Job 42:2) Ọ̀ bụ na anyị enweghị ihe zuru ezu iji chee otú ahụ?
11 Chineke bụkwa amamihe n’onwe ya, n’ihi na ọ na-enwe ihe ịga nke ọma n’itinye ihe ọmụma ya n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, o mere osisi dị iche iche ka ha wee nwee ike ijikọta mmiri na carbon dioxide nke sitere n’ikuku iji mepụta shuga na starch, bụ́ nke dị mmadụ na anụmanụ mkpa dị ka ihe oriri. Osisi pụkwara imepụta abụba, protein na vitamin ndị ọtụtụ ihe mejupụtara bụ́ ndị anyị ji eme ihe iji nọgide na-enwe ahụ ike. Nri anyị nile na-adabere n’usoro ọrụ dị ịtụnanya nke gụnyere anyanwụ, mmiri ozuzo, àmụ̀ma na nje bacterium ndị bi n’ájá. (Jeremaịa 10:12; Aịsaịa 40:12-15) Ka mmadụ na-amụta banyere mmeso Chineke, ọ na-amalite ịghọta n’ime obi ya ihe mere otu onye dere Bible ji tie mkpu, sị: “Aa! omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke!” (Ndị Rom 11:33) Nke ahụ ọ́ bụghị mmetụta ị ga-achọ inwe banyere Chineke nke na-anara ofufe gị?
ỤDỊ ONYE NKE NA-ADỌRỌ MMASỊ
12-14. Olee otú i si erite uru ná ngosipụta nke ụdị onye Chineke bụ?
12 Ọ dị mfe ịhụ na Onye Okike ahụ bụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-enye ihe n’ụba. Anyị ekwuworị ihe ụfọdụ banyere ndokwa ọ na-eme maka nri. Ma otu onye so dee abụ ọma nke Bible na-asị:
“Ị na-eme ka isi iyi sọba na ndagwurugwu, na-asọda n’etiti ugwu dị iche iche, na-enye ụmụ anụ ọhịa mmiri, . . . Ị na-eme ka ahịhịa ọhụrụ tolite maka ehi na ihe ọkụkụ ndị ahụ mmadụ ji eme ihe, ka ha wee nweta nri site n’ájá: mmanya ime ka obi ha ṅụrịa, mmanụ ime ha obi ụtọ na achịcha iji mee ka ahụ sie ha ike.”—Abụ Ọma 104:10-15, Jerusalem Bible.
Chineke kwadebere ụwa n’ụzọ nke na a ga-enwe nri zuru ezu gabiga ókè maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. Oké ọdachi ụkọ nri ndị na-akpata oké nhụjuanya na-esitekarị n’anyaukwu ma ọ bụ achịkwaghị ihe nke ọma nke mmadụ.
13 Onye Okike anyị na-eme ihe karịrị inye ihe dị mkpa n’ụba iji kwagide ndụ. Ọ na-emekwa ka ọ na-atọ ụtọ. Chineke gaara enyeworị nri na-edozi ahụ nke na-enweghị ụtọ ọ bụla. Kama nke ahụ, anyị nwere ụdị ụtọ nri na-enweghị ọgwụgwụ bụ́ ndị dị nnọọ mma n’ime nri ndị na-enye ahụ ike. Ọzọ, ka anyị ghara ichefu na Chineke mere anyị ka anyị nwee ike ịṅụrị n’ịma mma nke àgwà dị iche iche, dị ka nke okooko osisi na mkpụrụ osisi dị iche iche. O nyekwara anyị ikike nke inweta ọṅụ n’ụda egwú. Olee ụdị mmetụta ihe ndị a nile na-eme ka i nwee banyere Chineke?
14 N’iche echiche banyere nke a, a kpaliwo ọtụtụ ndị ikwubi na ọ ghaghị ịbụ na Chineke bụ onye na-ahụ n’anya nke ukwuu. Obi siri ha ike na ọ bụ. Bible na-ekwere, n’ihi na Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Onye Okike ahụ bụ ịhụnanya n’onwe ya; ọ bụ àgwà bụ isi o nwere. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ihe Chineke dị ka ya, o yikarịrị ka nke ahụ ọ ga-abụ nzaghachi mbụ gị. O ji ịhụnanya na-egosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Chineke abụghị ihe efu e chepụtara echepụta ma ọ bụ chi nke nọpụrụ n’ebe dị anya. Ọ bụ onye na-ekpo ọkụ nke anyị pụrụ isoro nwee mmekọrịta ịhụnanya. Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ikpegara Chineke ekpere dị ka Nna ha, onye dị ha nso ma nwee mmasị n’ebe ha nọ.—Matiu 6:9.
15-17. Olee otú Chineke si egosipụta mmasị ịhụnanya ya n’ebe ị nọ? Olee mmetụta ị na-enwe banyere nke a? (Abụ Ọma 30:4, 5)
15 Ọ bụrụ n’ezie na ị hụrụ mmadụ n’anya, ị na-achọ ka ihe ọma bịara onye ahụ. Chineke na-eche otú ahụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’ihi ịhụnanya ọ na-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe ndị ga-emerụ anyị ahụ. Ịdọ aka ná ntị ndị a bụ ihe nchebe. Ọzọ, ha na-enyere anyị aka ịghọta ụkpụrụ nile nke Chineke na ụzọ ọ ga-esi mee ihe ma ọ bụ meghachi omume. Dị ka ihe atụ, Bible na-agwa anyị na ọ kpọrọ ịgha ụgha asị. (Ilu 6:16-19; 8:13; Zekaraịa 8:17) Nke a na-emesi anyị obi ike na Chineke n’onwe ya apụghị ịgha ụgha; anyị pụrụ ikwere ihe nile ọ na-ekwu kpam kpam. (Taịtọs 1:2; Ndị Hibru 6:18) Ya mere mgbe anyị zutere okwu Bible ndị mmadụ pụrụ ile anya dị ka ihe mgbochi, anyị kwesịrị ịghọta ha dị ka ndị na-egosipụta ọdịdị ịhụnanya na ezi omume Chineke na mmasị o nwere n’ebe anyị nọ.
16 N’inyekwuru anyị aka ile Chineke anya dị ka onye anyị na ya pụrụ imekọ ihe, Bible na-egosi na o nwere mmetụta tụkwasịkwa n’ịhụnanya. Dị ka ihe atụ, o ‘wutere’ ya mgbe mmadụ nupụrụ isi megide ụzọ ezi omume ya. (Abụ Ọma 78:8-12, 32, 41) Ọ ‘na-aṅụrị ọṅụ’ mgbe ụmụ mmadụ mere ihe dị mma. (Ilu 27:11; Luk 15:10) Mgbe anyị hiere ụzọ, ọ na-egosi ọmịiko, obi ebere na nghọta. Ọ ga-abụrụ gị ihe agbamume ịgụ banyere nke a n’Abụ Ọma 103:8-14. Onye Okike ahụ bụkwa onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, na-enye mmadụ nile anwụ na mmiri ozuzo, na-anabatakwa ofufe site n’aka ụmụ mmadụ n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ mba ha.—Ọrụ 14:16, 17; 10:34, 35.
17 Obi ụtọ bụ ihe ihe ka ọtụtụ n’ime anyị chọrọ. N’ihi ya, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji bịa mara Onye Kachasị Ihe Nile Elu. Bible kọwara ya dị ka “Chineke nke obi ụtọ,” ọ na-egosikwa na ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ. (1 Timoti 1:11, NW; Deuterọnọmi 12:7) Ọ bụ mgbe nile onye na-enyeghachi ndị na-egosi okwukwe n’ebe ọ nọ ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 11:6; 13:5) Chineke emewokwa ụzọ ka ụmụ mmadụ nwee ahụ ike na obi ụtọ na-adịghị agwụ agwụ, dị ka anyị ga-akọwa n’isiokwu ndị ka dị n’ihu.
CHINEKE “AHỤ”
18, 19. Gịnị ka anyị pụrụ ịmara banyere aha Chineke na ogologo oge ndụ ya?
18 Ihe ọzọ dị mkpa nke Bible na-ekpughe banyere Onye Okike bụ na o nwere aha aka. N’asụsụ Hibru, e dere ya na mgbochiume anọ, otú a: יהוה. Ihe ka ọtụtụ n’asụsụ ndị e nwere n’oge a nwere ụzọ onye ọ bụla maara e si ede aha nke a pụrụ iche. N’Igbo ọ bụ Jehova. Abụ Ọma 83:18 na-agwa anyị na ụmụ mmadụ kwesịrị ‘ịmara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.’ (Tụlee Jọn 17:6.) Rịba ama na nanị ya bụ Onye Kachasị Ihe Nile Elu. E nwere nanị otu Onye Kachasị Elu. Ndị Israel oge ochie kwupụtara ya mgbe mgbe n’ụzọ dị otú a: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu: ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Deuterọnọmi 6:4, 5; tụlee Jọn 17:3.
19 Chineke anyị, bụ́ Jehova, enweghị mmalite na ọgwụgwụ, dị ka ihe àmà ndị e nwere ga-egosi. Ndị ọkà mmụta sayensị na-asị na eluigwe na ala adịwo ọtụtụ puku nde afọ. Ya mere o doro anya na Onye Okike nke eluigwe na ala aghaghị ịdịworị tupu nke ahụ. Nke a kwekọrọ n’ọkpụkpọ Bible kpọrọ ya “Eze nke mgbe nile,” onye na-enweghị mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ. (1 Timoti 1:17; Mkpughe 4:11; 10:6) Puku afọ ole na ole nke mmadụ nọworo n’ụwa bụ nnọọ nwa ntakịrị oge ma e jiri ya tụnyere enweghị mmalite na ọgwụgwụ nke Jehova.—Abụ Ọma 90:2, 4.
NDỊ ỌZỌ ANYỊ NA-APỤGHỊ ỊHỤ
20, 21. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na Chineke anọghị nanị ya n’eluigwe?
20 Bible na-ekpughe na e nwekwara ndị ọzọ e kere eke bụ mmụọ. Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Nile dịworo nanị ya ruo ogologo oge, ọ họọrọ ike ndị ọzọ bụ mmụọ. Na mbụ, o kere “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke” na “Isi nke ihe nile Chineke kere.” (Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14) Onye mbụ a a mụrụ sooro Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile dịrị ná mmalite nke okike. Jehova ga-emesịkwa jiri ya mee ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya, ma ọ bụ Okwu, n’isoro ndị ọzọ kwurịta okwu. (Jọn 1:1-3; Ndị Kọlọsi 1:16, 17) E mesịa, e zitere Ọkpara nke a e bu ụzọ mụọ n’ụwa ịghọ mmadụ. A matara ya dị ka Jisọs Kraịst.—Ndị Galetia 4:4; Luk 1:30-35.
21 N’isite n’aka Ọkpara nke a o bu ụzọ kee rụọ ọrụ, Chineke mere ndị mmụọ ọzọ e kere eke, bụ́ ndị a maara ebe nile dị ka ndị mmụọ ozi. Ndị a na-ejere Chineke ozi dị ka ndị ozi ma na-arụ ọrụ n’eluigwe na ala, tinyekwara ozi dị iche iche n’ihi ụmụ mmadụ.—2 Pita 2:11; Ndị Hibru 2:6, 7; Abụ Ọma 34:7; 103:20.
22, 23. Gịnị bụ mmekọrịta dị n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ya?
22 Ma ezi uche ma Bible na-egosi na Ọkpara ahụ e bu ụzọ mụọ nke bụ onye Chineke kere eke ma zite n’ụwa na Nna ya agaghị aha nhata. Ụfọdụ ndị na-asị na ha kwere na Bible na-akụzi na Jisọs na Nna ya bụ akụkụ ndị hà nhata nke otu chi nke chi dị iche iche mejupụtara. Nke a abụghị echiche ọhụrụ, n’ihi na ọtụtụ okpukpe ndị oge ochie fere ọtụtụ ìgwè chi. Ma n’ụzọ megidere nke a, Bible na-ekwu n’ụzọ pụtara ìhè na Jisọs, dị ka onye dị nnọọ iche, natara ike site n’aka Nna ya nke pụrụ ime ihe nile. Ọ na-emesi anyị obi ike na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile maara ihe ndị Jisọs na-amaghị, nakwa ma n’oge ọ nọ n’ụwa ma n’oge nke ahụ gafesịrị, ọ dịghị mgbe Jisọs Kraịst na Nna ya ji hara nhata.—Jọn 5:30; 8:28; 14:10, 28; Mak 13:32.
23 Ruo ọtụtụ puku afọ n’eluigwe, Ọkpara ahụ nwere mmekọrịta chiri anya nke ya na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nke na ọ pụrụ ịmụta ihe site n’aka Chineke ma na-eṅomi ụzọ ya nile. Otú a, mgbe otu onye na-eso ụzọ rịọrọ ya sị, “gosi anyị Nna ahụ,” Jisọs zaghachiri, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:8, 9; 1:18) Site n’anyị ịmụ ihe ndekọ Bible banyere ndụ Jisọs n’elu ala, anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu banyere Nna ahụ, dị ka ihe mere Chineke ji eme ihe ndị ọ na-eme na otú ọ chọrọ ka anyị dị. N’otu mgbe, Jisọs kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.” (Jọn 14:6) Ọ dị mkpa ka anyị bịa mara ya nke ọma karị, ma sikwa otú a mara Nna ahụ. Ịgụ Oziọma Jọn bụ ihe enyemaka mara oké mma. N’ime otú ahụ, etinyela uche gị nile nanị n’ihe ndị mere eme ma ọ bụ ihe ndị e kwuru, kama gbaa mbọ ịghọta mmụọ nke ihe Kraịst dị ka ya. Ọ bụ mmadụ kachasị mkpa nke ị pụrụ ịmụ banyere ya.
CHINEKE DỊ ANYỊ MKPA
24, 25. N’ihi gịnị ka Chineke kwesịrị iji dị mkpa ná ndụ gị?
24 Ka anyị na-amụ banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Nile site n’anyị ịhụ ihe okike na ịgụ Bible, ọ na-apụta ìhè na e keghị ụmụ mmadụ ịdị ndụ n’adabereghị n’ebe ọ nọ. E kere anyị inwe mmekọrịta nke anyị na Chineke, bụ́ onye anyị sitere n’aka ya nata ndụ, bụ́kwa onye ihe ndị ọ na-enye kwa ụbọchị na-eme ka anyị nọgide na-adị ndụ. Ịnwa ịnọrọ n’adabereghị na ya na Okwu ya, bụ́ Bible, bụ nke a pụrụ iji tụnyere mmadụ ịnwa ịchọta ụzọ n’ime ọzara nke mmadụ na-amaghị n’ejighị maapụ. Ka oge na-aga, ọ pụrụ ifu kpam kpam ma nwụọ n’ihi enweghị ihe ndị ga-ejigide ndụ. Ọ dịkwa otú ahụ mgbe ụmụ mmadu wezụgara Chineke na nduzi ya ná ndụ ha. Bible na akụkọ ihe mere eme na-emesi anyị obi ike na iji bie ndụ kachasị mma, ihe karịrị nri, ákwà na ebe obibi dị anyị mkpa. Ka anyị wee nwee obi ụtọ n’ezie, nduzi na enyemaka sitere n’aka Onye Mere anyị dị anyị mkpa.—Matiu 4:4; Jọn 4:34.
25 Ọtụtụ ndị ọzọ maara ihe dị nnọọ nta banyere Onye Okike ahụ. Ka ị na-ezute ndị dị otú ahụ nakwa ka ị na-enwe ohere maka ya, gịnị ma ị gwa ha ụfọdụ n’ime ezi ihe ndị a anyị tụleworo n’ebe a? Ọ bụ ihe dị mma mgbe a na-akpali ụmụ mmadụ isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ndị dị mkpa ha mụtaworo banyere Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya.—Abụ Ọma 40:5.
[Foto dị na peeji nke 33]
Ike Chineke kewara Osimiri Uhie ahụ
[Foto dị na peeji nke 36]
Gịnị ka anyanwụ, mmiri ozuzo na ájá nke na-emepụta nri na-egosi banyere Chineke?
Ọ̀ bụ na ọ bụghị Onye Na-enye Ihe n’ụba nakwa n’ịhụnanya?