Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 9 p. 86-95
  • Ndị Ntorobịa—Olee Otú UNU Pụrụ Isi Nwee Obi Ụtọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ntorobịa—Olee Otú UNU Pụrụ Isi Nwee Obi Ụtọ?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ICHE ECHICHE BANYERE ONYE OKIKE AHỤ
  • NDỤ NKE NWERE NZUBE NA ÙGWÙ ONWE ONYE
  • OBI ỤTỌ EZINỤLỌ
  • NDỊ NNE NA NNA NA-ARỤ ỌRỤ DỊ MKPA
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ṅomie Jehova Mgbe Ị Na-enye Ụmụ Gị Ọzụzụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ndị Ntorobịa, Ùnu Na-eme Atụmatụ Maka Ọdịnihu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 9 p. 86-95

Isi 9

Ndị Ntorobịa​—⁠Olee Otú UNU Pụrụ Isi Nwee Obi Ụtọ?

1-4. N’ihi gịnị ka obi ụtọ ji bụrụ ihe ịma aka nye ndị na-eto eto?

OGE ntorobịa pụrụ ịbụ otu n’ime oge ndị kachasị akpali akpali ná ndụ. Ọdịnihu gị dị gị n’ihu. Ya mere nweta ihe kachasị mma site na ya. Chụsoo obi ụtọ.

2 Ma nke ahụ adịghị mfe. Dr. Robert S. Brown duziri ihe ọmụmụ nke ndị ka toruru ogo mmadụ ọhụrụ, bụ́ ndị kpebisiri ike n’afọ ole na ole gara aga ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’omume ọma ha bu n’uche maka ọha mmadụ na ọchịchị. Ọ kọrọ na ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha ghọrọ ndị nwere nkụda mmụọ, ịda mbà n’obi na nchegbu.

3 Mgbe mgbe ị na-anụ ka a na-ekwu ya na inweta ezi agụmakwụkwọ bụ azịza ya. Ma taa, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị mere otú ahụ ka nọgidere na-enwe nsogbu n’ịchọta ọrụ. Ndị ọzọ ọ gaara nke ọma n’ụzọ ego chọpụtara na ọrụ ha nke na-akwụ ụgwọ dị ukwuu na-eme ka ha ghara ịrụzu ihe dịịrị ha ná ndụ. Ihe ka ukwuu ná mkpakọrịta ịhụnanya nke ndị ntorobịa adịghịkwa eduje n’obi ụtọ. N’ebe ụfọdụ, 80 pasent nke alụmdi na nwunye ndị ka nọ n’afọ iri na ụma na-adakpọ n’ime afọ ise.

4 Gịnị ka ị pụrụ ime ka ọ ghara ịdị gị otú ahụ, ka i wee nwee ike inweta ọṅụ n’onwe gị ugbu a ma nwee ọdịnihu nke na-eju afọ? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị pụrụ isi nyere nwa gị aka inweta ihe mgbaru ọsọ ahụ?

ICHE ECHICHE BANYERE ONYE OKIKE AHỤ

5-8. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji chee echiche banyere Chineke?

5 Mgbe mgbe, ndị na-eto eto na-abụ ndị ndị ọgbọ ha na-enwe mmetụta n’ahụ ha, bụ́ ndị nwere ahụmahụ dị nta ná ndụ. Bible na-ekwu, sị:

“Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”​—⁠Ilu 22:3; 13:20.

Onye na-eto eto nke na-eche ihe bụ eziokwu ihu ga-ekweta na ọ bụ ole na ole n’ụmụ akwụkwọ ibe ya ma ọ bụ ndị enyi ya na-enwe mmasị miri emi banyere ọdịmma ya na-adịgide adịgide. Ị pụrụ ịjụ sị, ‘N’afọ ndị na-abịa, ọ̀ ga-emetụ ha n’obi mgbe ahụ ma ọ bụrụ na e bibie obi ụtọ m site n’ihe m mere ugbu a?’

6 Ma olee onye ọ na-emetụ n’obi n’ezie nke pụkwara inye gị ndụmọdụ kachasị mma? Ọ bụ Onye Okike gị. Ọ chọrọ ka ndị na-eto eto nwee ọṅụ ná ndụ. Ọ dịghị ele ihe nile na-amasị obi na anya ndị na-eto eto anya ọjọọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ekpuchi ndị ntorobịa pụọ n’ihe ilu ndị na-esite n’ibi ndụ a na-achịkwaghị achịkwa pụta, ọ na-eme ihe ị ga-ele anya ya n’aka onye nwere mmasị n’ezie n’ebe ị nọ: Ọ na-adọ gị aka ná ntị banyere ihe ndị ga-ewetara gị mwute na ọdachi, ọ na-adụkwa ọdụ banyere ụzọ ị pụrụ isi zere ọnyà ndị a. (Ilu 27:5; Abụ Ọma 119:9) Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere nke a, sị:

“Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ, jeekwa ije n’ụzọ nile nke obi gị, na n’ọhụhụ ụzọ nke anya gị abụọ: ma mara na n’ihi ihe ndị a nile Chineke ga-eme ka ị baa n’ikpe. Ma wezụga mkpasu iwe n’obi gị, meekwa ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ gị gabiga.”​—⁠Eklisiastis 11:​9, 10.

7 Otú ọ dị, e nwere ihe ka ukwuu mere a ga-eji chee echiche banyere Onye Okike ahụ karịa ya inwe mmasị n’ebe ị nọ. Dị ka ọ pụrụ ịbụ na ị rịbawo ama, ọtụtụ ndị na-eto eto yiri ndị ebili mmiri na-ebugharị ná ndụ. Ha enweghị ihe mgbaru ọsọ ọ bụla kpọmkwem, ha enweghịkwa ụkpụrụ ọ bụla siri ike nke ha ga-ewukwasị ndụ ha na ya. Mgbe mgbe ha na-echigharịkwuru ọgwụ ọjọọ, ise siga na ihe mkpali ndị dị ize ndụ iji mejuo ịtọgbọrọ n’efu nke ndụ ha ma ọ bụ iji nweta ihe mkpali ná ndụ nke na-agwụ ike. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na i mewo ihe ndị ahụ, ma ị̀ maara ihe ize ndụ ndị dị na ha ma ọ bụ na ị maghị. Ì nwere afọ ojuju ná ndụ gị ruo ugbu a nakwa n’ihe ị na-ahụ n’ọdịnihu? Ọ̀ bụ na oge erubeghị mgbe ị ga-akwụsịtụ ma chee echiche banyere ndụ gị?

8 Dị ka anyị tụleworo ná mmalite, ka ndụ mmadụ wee nwee nzube ma kwekọọ n’ihe ndị bụ eziokwu, ọ ghaghị ịmata na e nwere Onye Okike nke eluigwe na ala. Onye ahụ, bụ́ Onye Mere anyị, nwere ụkpụrụ. (Abụ Ọma 100:3) Ụkpụrụ ndị ahụ kwekọrọ n’ụzọ o mere ka anyị si na-adị ndụ. Ha na-arụ ọrụ ma zie ezie iji nwee obi ụtọ. Anyị ahụwo ihe àmà e nwere maka nke ahụ n’isiokwu ndị bu ụzọ ebe e kwuru okwu banyere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ịṅụbiga mmanya ókè na ịgba chaa chaa.a Ya mere ọ bụrụ na ị chọrọ ibi ndụ dị mma, ọ̀ bụ na amamihe adịghị na ya iche echiche banyere Onye Okike ahụ mgbe ị na-eche echiche banyere otú ị ga-esi bie ndụ, ụkpụrụ ndị ị ga-eji mee ihe na ebe ndụ gị na-eche ihu?

NDỤ NKE NWERE NZUBE NA ÙGWÙ ONWE ONYE

9, 10. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ziri ezi ka i chebara ihe bụ uche Chineke echiche? (Abụ Ọma 128:​1, 2)

9 N’Eklisiastis 11:​9, 10 anyị hụrụ okwu ụfọdụ nke Bible ndị e chere ihu n’ebe ndị na-eto eto nọ. Akwụkwọ Bible ahụ na-ekwubi, sị:

“Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”​—⁠Eklisiastis 12:13.

10 Gburugburu ụwa, e nwere ọtụtụ narị puku ndị na-eto eto, ndị chebasiworo echiche ike ná ndụ ha. Ha echewo echiche banyere Onye Okike ahụ ma mụọ Okwu ya. Ha ahụwokwa na otu n’ime ihe ndị bụ isi a chọrọ maka obi ụtọ bụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Onye Mere ha. Nke ahụ kwesịkwara ịbụ ọrụ na nzube gị ná ndụ. Ịdị ndụ n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ setịpụrụ abụghị ihe pụrụ iche, imebiga ihe ókè ma ọ bụ ihe na-adịghị enye ọṅụ. Kama nke ahụ, ọ bụ ụzọ ndụ nke a haziri nke ọma nke nwere nzube. Ọ na-eme ka mmadụ nwee ike ime ihe n’ụzọ amamihe na n’ụzọ ga-aga nke ọma n’ihe ndị metụtara ego, ọrụ, omume ọma, ndụ ezinụlọ, ntụrụndụ na ihe ndị ọzọ ndị ị na-eche ihu ugbu a ma ọ bụ ndị ị ka ga-eche ihu. Ahụmahụ nke Ndịàmà Jehova na-emesi ya ike na amamihe nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ

‘bụ osisi na-enye ndụ nye ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.’​—⁠Ilu 3:18.

Bible na-adụ ọdụ, sị: “Nwa m, echefula ihe m na-akụzi, ka obi gị chebe ụkpụrụ m nile, n’ihi na nke a ga-eme ka i nwee ụbọchị dị ọtụtụ karị, afọ ndụ toro ogologo karị, na obi ụtọ ka ukwuu.”​—⁠Ilu 3:​1, 2, Jerusalem Bible.

11-14. Ọ bụrụ na ịdị ndụ nke iburu Chineke n’uche emee ka ị dị iche, nke ahụ ọ̀ dị njọ?

11 Mgbe ị gbasoro okwu ndụmọdụ Bible, ị pụrụ iguzopụ iche n’ụzọ ụfọdụ n’ebe ihe ka ná ndị ntorobịa nọ. N’ezie, mmadụ ole na ole pụrụ ịbara gị mba n’ihi nke a. (1 Pita 2:20; 4:4) Ị̀ ga-ekwe ka nke ahụ dọghachi gị azụ n’ụzọ nke ga-eme ka ndụ gị dị mma karị?

12 E nwere ọtụtụ ndị ntorobịa na-ekwu banyere ichere onwe ha echiche, ma eziokwu na-egosi na egwu nke ịbụ ndị dị iche na-atụ ha. Otú ọ dị, Bible nwere ihe nlereanya ndị mara mma nke ndị na-eto eto bụ́ ndị na-agbasoghị ìgwè mmadụ. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị ntorobịa ahụ zuru okè, ndị nwere ihe ndị na-amasị ha, nchegbu na olileanya dịkwa ka gị, ha ji ndụmọdụ Chineke nke amamihe dị na ya duzie echiche ha na ihe ndị ha na-eme.

13 Ị pụrụ ịgụ otu ihe atụ na Daniel 1:6-⁠20; 3:1-⁠30. Ndị Hibru atọ ka na-eto eto bụ́ ndị enyi Daniel dị njikere ịdị iche pụọ ná ndị ka n’ọnụ ọgụgụ nọ ha gburugburu. Mgbe e nyere ha iwu ka ha kpọọ isiala nye ihe ahụ a kpụrụ akpụ, bụ́ ihe Okwu Chineke megidere, ha jụrụ. Ị̀ gaara enwe ike ime nke ahụ? Ọbụna na ndị ọzọ chọrọ igbu ha n’ihi nguzo ha. Ma ha nọgidesiri ike n’ụkpụrụ ha, ị ga-ahụkwa site n’ihe ndekọ ahụ na ihe ha dị Chineke ezi mma, o chebekwara ha. N’ikpeazụ, eze Babilọn kwanyeere ha ùgwù, na-emesi ike ihe Solomọn dere: “Mụ onwe m maara n’ezie na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma.”​—⁠Eklisiastis 8:12; Ọpụpụ 20:​4, 5.

14 Ndị ikom ahụ na-eto eto nwetara nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ, ma ha nwekwara ùgwù onwe onye. Ọ dịwokwa otú ahụ n’ọnọdụ nke ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà Jehova n’oge a. Ụmụ akwụkwọ ibe ha ekwupụtawo mmasị maka ihe ndị ha kwere na ya na eziokwu ahụ bụ na ndị Kraịst ndị a maara ebe ha na-aga ná ndụ. Ọ̀ bụ na i kweghị na ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù na inwe ùgwù onwe onye na-eme ka ndụ nwee nzube karị?

OBI ỤTỌ EZINỤLỌ

15-20. Olee ihe ndị mere ị ga-eji gbasoo Akwụkwọ Nsọ n’ime ezinụlọ gị?

15 Ndụmọdụ Bible na-enyekwa aka ime ka ndị na-eto eto nwee ndụ na-akwụghachi ụgwọ karị site n’ime ka e nwee ihe nkekọ ezinụlọ ndị ka chie anya.

16 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara ezinụlọ ebe ndị mụrụ ụmụ na ụmụ na-adịghị enwe nkwurịta okwu, ma ndị a hà bụ ndị dị nta nke ukwuu ma ọ bụ ndị nọ n’afọ iri na ụma. Mgbe mgbe, enweghị nkwurịta okwu a na-amalite mgbe ndị nne na nna gbalịrị iduzi nwa ha, bụ́ onye ọ na-ewute ịbụ onye a na-agwa ihe ọ ga-eme ma ọ bụ ihe ọ na-agaghị eme.

17 Bible na-enye aka iji merie nsogbu nke a site n’inye ma ndị ntorobịa ma ndị nne na nna nduzi guzoziri eguzozi, dị ka:

“Ụmụ, ọ bụ ọrụ dịịrị unu dị ka ndị Kraịst irubere ndị nne na nna unu isi, n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi ime. ‘Kwanyere nne na nna gị ùgwù’ bụ iwu mbụ nke a tụkwasịrị nkwa na ya: ‘ka ihe nile wee gaara gị nke ọma, ka i wee dịakwa ogologo ndụ n’ala ahụ.’ Ndị nne na nna, unu emesola ụmụ unu n’ụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama nke ahụ, jirinụ ọzụzụ na ntụziaka ndị Kraịst zụlite ha.”​—⁠Ndị Efesọs 6:​1-⁠4, Good News Bible.

18 N’ezie, ọ dịghị nne na nna zuru okè. Ma ọ ka bụkwa “ihe ziri ezi” ndị na-eto eto ịkwanyere ndị nne na nna ha ùgwù. N’ihi gịnị? N’otu akụkụ, ọ bụ n’ihi na ndị nne na nna anyị emeworo anyị ihe dị ukwuu​—⁠inye anyị nri, ilekọta anyị mgbe anyị na-arịa ọrịa, ịrụ ọrụ iji mee ka e nwee ebe obibi na imeju mkpa anyị. Anyị apụghị ịzụtawo onye ọ bụla ka o meere anyị ihe ndị ahụ nile ha meworo, na-ejikwa mmasị ịhụnanya ha gosipụtaworo mee ha. Ya mere ọ bụ ihe ziri ezi n’ụkpụrụ omume ịkwanyere ha ùgwù, ọbụna dị ka ọ ga-amasị anyị inweta nkwanye ùgwù site n’aka ụmụ ndị anyị pụrụ imesị nwee.

19 Ndị na-eto eto bụ́ ndị ji obi eziokwu na-agbalị itinye okwu ndụmọdụ dị otú ahụ nke Bible n’ọrụ gaje inweta mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi karị. Ha ga na-atụnye ụtụ n’inwe ezinụlọ nke dị n’otu karị, bụ́ nke ga-eme ka ndụ ha nwee udo na obi ụtọ karị. A ga-echebekwa ha pụọ ná nsogbu ndị nne na nna pụrụ ibu ụzọ hụ n’ihi ahụmahụ ka ukwuu ha nweworo ná ndụ. (Ilu 30:17) A gaghịkwa eleghara afọ ojuju ndị ka na-eto eto pụrụ inweta site n’ịmara na ha na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nzube nke Onye Okike ha anya.

20 Ịnabata ndụmọdụ Bible na-abara ndị na-eto eto uru n’ụzọ ndị ọzọ. N’ihi ịmata uru nke ịkwado na ịkwanyere ịbụisi ùgwù, ọ na-adịrị ha mfe karị ime ihe n’enweghị nsogbu n’ụlọ akwụkwọ, ná mmekọrịta nke onye were mmadụ n’ọrụ na onye e were n’ọrụ n’ọdịnihu nakwa mgbe a na-emeso ndị isi ihe. (Matiu 5:41) Ọzọ, iburu ndụmọdụ Bible n’obi na-eme ka e nwee obi ụtọ mgbe ha nwere di ma ọ bụ nwunye na ụmụ nke onwe ha.

NDỊ NNE NA NNA NA-ARỤ ỌRỤ DỊ MKPA

21. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịgbaso ụzọ nke amamihe?

21 N’icheba echiche n’ụzọ ndị ka na-eto eto pụrụ isi nwee obi ụtọ, anyị apụghị ileghara ọrụ dị mkpa ndị nne na nna na-arụ anya. Ọtụtụ ndị nne na nna na-amata ibu ọrụ ha nke ịgbalị inye ụmụ ha ezi ihe oriri, uwe na ebe obibi dị mma. Ma ka ndị na-eto eto wee ghọọ ezi mmadụ, ntụziaka, mgbazi olu na nduzi nke ndị nne na nna n’ụzọ omume dị ha mkpa. Bible aghọwo ebe ndabere kachasị mma maka nke a. (Matiu 11:19) Deuterọnọmi 6:​6, 7 na-akọwa na ụdị ntụziaka dị otú ahụ kwesịrị ịbụ akụkụ e ji eme ihe mgbe nile ná ndụ ezinụlọ, ọ bụghị ihe a na-ekwu nanị ma a nọkata. Ọzọ, ntụziaka dị otú a pụrụ, kwesịkwa, ịmalite n’oge a ka dị na nwata.​—⁠2 Timoti 3:15; Mak 10:​13-⁠16.

22-24. Ọzụzụ dị aṅaa ka ndị nne na nna kwesịrị inye?

22 Ọ bụ ndị nne na nna ole na ole nwere ụmụ ka ọ ga-eju anya ịgụ, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata; ma mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.” (Ilu 22:15) Ma gịnị ka nke ahụ pụtara? Ụfọdụ ndị nne na nna na-emebiga ihe ókè nke na ha na-eji iti ihe merụọ ụmụ ha ahụ. Ndị ọzọ na-asị na e kwesịrị ịhapụ ụmụaka ka ha tolite n’onwe ha. Ọ dịghị nke dị mma n’akụkụ abụọ ndị ahụ.

23 Anyị gụrụ ná mmalite na ndị nne na nna ‘ga-eji ọzụzụ na ntụziaka ndị Kraịst zụlite ụmụ ha.’ (Ndị Efesọs 6:4, Good News Bible) Oké iti ihe abụghị ọzụzụ ndị Kraịst. (Ilu 16:32; 25:28) A pụrụ iji okwu siri ike nye ọzụzụ n’ịhụnanya. Nke ahụ dị otú ahụ karịsịa ma ọ bụrụ na ndị nne na nna emee ka ọ pụta ìhè bụ́ ihe mere ha ji nye iwu ahụ nakwa ma ọ bụrụ na ha anọgide n’ihe ha kwuru. Mgbe nzuzu nke dị n’obi onye na-eto eto ka na-akpali ya inupụ isi​—⁠nke ahụ na-emekwa mgbe mgbe⁠—​ụdị inye ahụhụ ụfọdụ pụrụ ịkụba echiche ahụ n’obi ya. Ịnapụ ihe ùgwù pụrụ ịdị irè. Otú ọ dị, Okwu Chineke na-asị na mgbe ụfọdụ iti ihe​—⁠ịpịa ụtarị, bụ́ nke a na-ejighị iwe mee⁠—​pụrụ ịdị mkpa.​—⁠Ilu 23:13, 14; 13:24.

24 Ka ụmụaka na-emewanye okenye, ụzọ e si emeso ha ga-agbanwe. Ọ bụ eziokwu na ịpịa ụtarị pụrụ ịdịwo irè karịsịa n’ebe nwata nwoke nọ, ka ọ na-emewanye okenye ụzọ ndị ọzọ pụrụ ịka mma ma kwesị ekwesị karị. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị nne na nna kwesịrị iji nke nta nke nta na-enye nwa nwoke ma ọ bụ nwanyị nnwere onwe ka ukwuu nke ime ihe na ibu ọrụ.​—⁠1 Ndị Kọrint 13:11.

25-27. Olee otú ịhụnanya ezinụlọ ga-esi metụta nsogbu nke ndị ntorobịa?

25 Ịhụ ụmụ gị n’anya dị mkpa iji nyere ha aka ná nsogbu ha. O kwesịrị ịbụ nzube nke e ji enye ọzụzụ, ọ na-emekwa ka ọ dị mfe karị ịnabata mgbazi olu. Mmadụ ịghara inye ụmụ ya nduzi na ọzụzụ yiri ịgọnahụ ịbụ nne ma ọ bụ nna ya n’ebe ha nọ. A kọwara nke a ná Ndị Hibru 12:​5-⁠11, bụ́ nke na-eme ka ọ pụta ìhè na Jehova n’onwe ya na-enye ọzụzụ site n’ịhụnanya.

26 Ịhụnanya maka Chineke dịkwa mkpa. Nke a ga-akpali ndị nne na nna ịkpọ ihe Chineke mara ikpe asị, dị ka ịgha ụgha, anyaukwu, izu ohi, ndina ụdị onwe, nakwa ịkwa iko. (1 Ndị Kọrint 6:​9, 10; Abụ Ọma 97:10) Ndị nne na nna si otú a na-egosi ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ ga-esetịpụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị maka ụmụ ha, bụ́ nke dị mkpa. Tụkwasị na nke a, nne na nna kwesịrị ịzụlite n’ime ụmụ ha otu ịkpọasị ahụ maka ihe ọjọọ nakwa ịhụnanya maka Chineke na ihe ziri ezi.

27 Ebe ọ bụ na ezinụlọ bụ ụwa nke onye ka na-eto eto n’ụzọ bụ isi, ndị nne na nna kwesịrị ịrụ ọrụ iji mee ka ọ nọrọ ná ntụkwasị obi. E kwuwo ya na otu n’ime ihe ndị kasị ukwuu nna pụrụ imere ụmụ ya bụ ịhụ nne ha n’anya. Mgbe ndụ a na-adị n’ụlọ dabeere n’ịhụnanya na amamihe ndị Kraịst, ndị na-eto eto ga-enwe ntọala siri ike nke ha ga-eguzo n’elu ya. Ha ga-enwe ụkpụrụ ndị ziri ezi ma bụrụ ndị e nyeere aka iche echiche banyere Onye Okike ha site na mgbe ha bụ ndị ntorobịa gaa n’ihu.​—⁠Eklisiastis 12:​1, 13, 14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  N’ịdabere na Bible, a tụlere egwú, iyi oge mkpapụ, uwe, egwuregwu, agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ na-echegbu ndị na-eto eto n’akwụkwọ ahụ bụ́ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi​—⁠Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York Inc., bipụtara.

Igbe dị na peeji nke 89]

ỊCHỌTA NZUBE NÁ NDỤ

Otu ngalaba nke Ụlọ Ọrụ Praịm Minista mba Japan mere otu nnyocha n’ala dị iche iche. O nyochara ihe bụ echiche ndị na-eto eto banyere ihe bụ nzube nke ndụ na ọdịnihu. Mgbe ọ na-amụ ihe a chọpụtara, Prọfesọ Sanshiro Shirakashi kwubiri na “ndị ntorobịa bi n’ụwa nwere omume nke enweghị nchekwube” banyere ọdịnihu, bụ́ nke na-emetụta omume ha na ụzọ ha si ele ndụ anya. Ma nke ahụ pụrụ ịgbanwe.

Otu nwata akwụkwọ aha ya bụ Linda kọrọ, sị: “Site n’ihe ọmụmụ m na mahadum, apụrụ m ịhụ na ụzọ ndụ nke e ji zụlite m na-apụ n’anya. Ọnọdụ ndị e nwere n’ụwa nile na-akawanye njọ, enweghịkwa m azịza na echiche ọ bụla banyere ebe a ga-esi nweta azịza.”

Ka ọ lọtara ụlọ na California maka ezumike, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ọnụ ụzọ ya. O kwuru, sị: “Ha gwara m na a ga-ahụ azịza ndị ahụ n’ime Bible. Anyị kparịtara ụka banyere paradaịs elu ala nke Chineke ga-eguzobe n’okpuru usoro ihe ọhụrụ ya na nkwa ya iwepụ mmebi iwu. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla a kụziiri m na a ga-achọta eziokwu dị ebube ndị dị otú ahụ n’ime Bible.”

Mgbe Linda lọghachisịrị n’Arizona, ọ gakwuuru ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova e nwere n’ógbè ahụ, ma nakwere ọmụmụ Bible kwa izu a na-eduzi n’efu. Nke ahụ nyeere ya aka ịmụta ụkpụrụ ndị nyere ndụ ya ezi nguzosi ike. Ọzọ, o nwetara nzube ná ndụ, nke na taa ndụ ya ka nwee obi ụtọ ma bụrụ nke na-akwụghachi ụgwọ karị.

[Foto dị na peeji nke 92]

Olee ndị lekọtara gị mgbe ị na-arịa ọrịa?

[Foto dị na peeji nke 93]

Ịmụ Okwu Chineke na-enyere ndị ntorobịa aka inweta obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya