Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 11 p. 103-111
  • Ọrịa na Ọnwụ—n’Ihi Gịnị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrịa na Ọnwụ—n’Ihi Gịnị?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE KPATARA ỌRỊA NA ỌNWỤ
  • GỊNỊ BỤ “IHE MGBAPỤTA” AHỤ?
  • OLEE OTÚ A PỤRỤ ISI GBAGHARA MMEHIE ANYỊ?
  • GỊNỊ KA Ị GA-EME?
  • Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ihe Mgbapụta Kraịst—Ụzọ Nzọpụta nke Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Ka Ọnwụ Jisọs Pụtara nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 11 p. 103-111

Isi 11

Ọrịa na Ọnwụ​—⁠n’Ihi Gịnị?

1, 2. N’ihi gịnị ka ọrịa na ọnwụ ji bụrụ ihe ijuanya?

N’AGBANYEGHỊ ihe ndị mmadụ pụrụ ime iji lekọta ahụ ike ha, ha na-aka nká, na-ada ọrịa ma mesịa nwụọ. Ọ dịghị onye pụrụ izere ya. Ọbụna ndị raara onwe ha nye Chineke apụghị. (1 Ndị Eze 1:1; 2:1, 10; 1 Timoti 5:23) N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

2 Mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ anyị yiri ka ha nwere ikike idochi ndị ike gwụworo ruo ogologo oge karịa otú ha na-eme ugbu a, ụbụrụ anyị nwekwara ikike dị ukwuu karịa nke anyị pụrụ iji mee ihe n’ọtụtụ oge ndụ. N’ihi gịnị​—⁠ma ọ bụrụ na e meghị anyị ka anyị jiri ikike ndị a mee ihe? N’eziokwu, ndị ọkà mmụta sayensị apụghị ịkọwa ihe mere anyị ji aka nká, na-ada ọrịa, ma na-anwụ anwụ. Ma Bible na-akọwa.

IHE KPATARA ỌRỊA NA ỌNWỤ

3-5. Olee otú ọrịa na ọnwụ si malite inwe mmetụta n’ebe anyị nọ?

3 Pọl onyeozi na-atụrụ anyị aka n’ebe ziri ezi, na-asị: “Ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam.” (1 Ndị Kọrint 15:​21, 22) N’ebe a Pọl na-ezo aka n’ihe ndekọ Bible banyere Adam na Iv, bụ́ ihe ndekọ nke Jisọs kwadoro dị ka nke ziri ezi. (Mak 10:​6-⁠8) Onye Okike etinyewo di na nwunye mbụ ahụ n’ebe obibi bụ́ ubi, n’olileanya obi ụtọ nke ndụ na-adịghị agwụ agwụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya. Ha nwere nri zuru ezu nke na-enye ahụ ike site n’osisi dị iche iche na ihe ubi ndị ọzọ. Ọzọkwa, Adam na Iv bụ ụmụ mmadụ zuru okè. Uche ha na ahụ ha enweghị nkwarụ ọ bụla, e nweghịkwa ihe ọ bụla mere ihe ndị a ga-eji mebisịa, dị ka ọ na-eme ugbu a n’ebe ụmụ mmadụ nọ.​—⁠Deuterọnọmi 32:4; Jenesis 1:31.

4 Nanị otu iwu mgbochi ka e tinyeere mmadụ abụọ mbụ ahụ. Chineke kwuru, sị: “Ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) Site n’ikwenyekọ n’ókè nke a a kpara, ha ga-egosi nsọpụrụ n’ikike Chineke nwere ikpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi maka ụmụ mmadụ. Ka oge na-aga, ha guzobere ụkpụrụ nke onwe ha maka ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:​6, 7) Site n’inupụ isi n’iwu Chineke nke e mere ka o doo anya, ha mere ihe Bible kpọrọ “mmehie.” Ma na Hibru ma na Grik, “imehie” pụtara “ihie [ụzọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀].” Adam na Iv hiere ụzọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ma ọ bụ ghara inwe nrubeisi zuru okè. Ha adịkwaghị egosipụta izu okè Jehova, ha wetakwaara onwe ha ikpe ọmụma ziri ezi nke Chineke.​—⁠Luk 16:10.

5 Mmehie Adam na Iv metụtara ma ha onwe ha ma anyị. N’ihi gịnị ka o ji metụta anyị? Chineke egbughị ha ozugbo ahụ. Igosi nchebara echiche maka ihe nile o metụtara, Jehova kwere ka mmadụ abụọ mbụ ahụ mụta ụmụ. Ma Adam na Iv ezukwaghị okè; mgbe ha mehiere ha malitere imebi n’ụzọ anụ ahụ na n’uche. Ya mere, ha apụghị ịmụta ụmụ zuru okè. (Job 14:4) A pụrụ iji ọnọdụ ahụ tụnyere di na nwunye taa bụ́ ndị nwere ntụpọ ná mkpụrụ ndụ ihe nketa bụ́ nke ha bufeere ụmụ ha. Anyị ketara ntụpọ nke mmehie, n’ihi na anyị nile sitere na mmadụ abụọ mbụ na-ezughị okè. Pọl kọwara, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”​—⁠Ndị Rom 5:12; Abụ Ọma 51:5.

6, 7. N’ihi gịnị ka ihe ngwọta maka ọrịa na ọnwụ ji dịrị n’aka Chineke?

6 Ọnọdụ ahụ ọ̀ bụ nke olileanya na-adịghị na ya? Ma akụkọ ihe mere eme ma Bible na-emesi ya ike na a hapụ ya n’aka mmadụ, ọ gaara adị otú ahụ. Anyị enweghị ike ime onwe anyị ka anyị dị ọcha pụọ ná ntụpọ nke mmehie ma ọ bụ napụta onwe anyị pụọ n’ikpe ọmụma Chineke. Ọ bụrụ na a ga-enwe nnapụta, ọ bụ Chineke ga-enye ya. E mebiri iwu ya, ya mere ọ bụ ya bụ Onye ga-ekpebi otú a ga-esi nweta ikpe ziri ezi nke zuru okè ma nye nnapụta. Jehova Chineke gosiri amara ya nke na-erughịrị mmadụ site n’ime ndokwa maka ịnapụta ụmụ Adam na Iv, gụnyere anyị. Bible na-akọwa ihe ndokwa ahụ bụ na otú anyị pụrụ isi rite uru.

7 Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na-enye ihe ndabere maka ịghọta okwu ahụ:

“Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—⁠Jọn 3:16.

“Nwa nke mmadụ [Jisọs] Onwe ya abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”​—⁠Mak 10:45.

“Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke; a na-ewerekwa amara Ya na-agụ ha ná ndị ezi omume n’onyinye efu site ná mgbapụta ahụ nke dị n’ime Kraịst Jisọs: Onye Chineke chere n’ihu ọha mmadụ ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi [nke na-ekpuchi], site n’okwukwe e kwere n’ọbara Ya.”​—⁠Ndị Rom 3:​23-⁠25.

GỊNỊ BỤ “IHE MGBAPỤTA” AHỤ?

8-11. Olee otú e siworo nye ihe mgbapụta?

8 Abụọ n’ime ihe odide ndị ahụ kwuru okwu banyere “ihe mgbapụta.” Nke ahụ n’ụzọ bụ isi bụ ụgwọ a na-akwụ iji mee ka onye e ji eji nwere onwe ya. (Aịsaịa 43:⁠3) Mgbe mgbe anyị na-anụ ka e ji okwu ahụ eme ihe n’izo aka n’ebe ego maka ịnapụta onye e ji eji dị. N’ọnọdụ nke anyị, onye ahụ e ji eji bụ ihe a kpọrọ mmadụ. Adam renyere anyị n’ohu nke mmehie, ya na ọrịa na ọnwụ nke si na ya pụta. (Ndị Rom 7:14) Olee ihe bara uru nke pụrụ ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ ma megheere anyị olileanya ndụ nke nweere onwe ya pụọ ná mmetụta nile nke mmehie?

9 Cheta na Bible na-asị na Jisọs ‘nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta.’ (Mak 10:45) Anyị pụrụ ịhụ site na nke a na a chọrọ ndụ mmadụ. Site n’imehie, Adam tụfuru ndụ mmadụ zuru okè. Iji mepee ụzọ maka ihe a kpọrọ mmadụ inweteghachi ndụ n’izu okè, a chọrọ ndụ mmadụ ọzọ zuru okè iji kwekọọ n’ihe Adam tụfuru ma ọ bụ zụtaghachi ya. Nke a na-eme ka ọ pụta ìhè bụ́ ihe mere na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị na-ezughị okè Adam mụrụ nke pụrụ inye ihe mgbapụta ahụ. Dị ka Abụ Ọma 49:​7, 8 na-ekwu: “Mmadụ apụghị ịgbapụta onwe ya ma ọlị ma ọ bụ kwụọ ụgwọ mgbapụta nye Chineke: ọ dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu ịgbapụta ndụ ya, ọ karịrị ya.”​—⁠Jerusalem Bible.

10 Iji kwụọ ụgwọ mgbapụta ahụ, Chineke zitere Ọkpara ya bụ mmụọ nke zuru okè site n’eluigwe ka a mụọ ya dị ka mmadụ. Otu mmụọ ozi kọwaara nwa agbọghọ ahụ dị ọcha n’omume nke na-amaghị nwoke bụ́ Meri otú Chineke ga-esi hụ na Jisọs zuru okè n’ọmụmụ, sị: “Ike nke Onye kachasị ihe nile elu ga-ekpuchikwa gị: n’ihi nke a Ihe dị nsọ nke ị dị ime Ya, a ga-akpọ Ya Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35; Ndị Galetia 4:4) Jisọs, ebe ọ na-enweghị nna bụ mmadụ nke na-ezughị okè, nweere onwe ya pụọ ná mmehie e ketara eketa.​—⁠1 Pita 2:22; Ndị Hibru 7:26.

11 Mgbe ọ dịsịrị ndụ dị ka mmadụ n’ụzọ kwekọrọ kpọmkwem n’uche Chineke, Kraịst nyere ndụ mmadụ ya zuru okè. Ọ bụ ụdị ndụ ahụ ka Adam nwere mgbe e kere ya, ya mere Jisọs ghọrọ “ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.” (1 Timoti 2:5, 6; 1 Ndị Kọrint 15:45) Ee, ọ bụ “n’ihi mmadụ nile” n’ihi na ọ kwụrụ ụgwọ ahụ iji zụta ezinụlọ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Bible na-asị na e werewo “ọnụ ahịa gbara” anyị. (1 Ndị Kọrint 6:20) Site n’ọnwụ Jisọs, Chineke si otú a guzobe ihe ndabere maka ịkagbu ihe Adam mere n’iwetara ihe a kpọrọ mmadụ mmehie, ọrịa na ọnwụ. Eziokwu nke a pụrụ inwe ezi mmetụta n’ime ka ndụ anyị bụrụ nke obi ụtọ.

OLEE OTÚ A PỤRỤ ISI GBAGHARA MMEHIE ANYỊ?

12-17. Olee ihe ndabere e nwere maka ịgbaghara mmehie anyị?

12 Ọ bụ ihe ọma ịmata site na Bible na Jisọs kwụrụ ụgwọ mgbapụta ahụ. Ma a ka nwekwara ihe pụrụ igbochi anyị inweta nnwapụta na ngọzi Chineke. Nke ahụ bụ eziokwu ahụ bụ na anyị bụ ndị mmehie n’onwe anyị. Anyị ‘na-ehie ụzọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ’ ọtụtụ mgbe. Pọl na-ede, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Gịnị ka a pụrụ ime banyere nke ahụ? Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị Chineke anyị nke ezi omume, bụ́ Jehova, na-anabata?

13 N’ezie, anyị agaghị ele anya ka Chineke lee anyị anya ọma ma ọ bụrụ na anyị anọgide n’ụzọ nke anyị maara na o megidere uche ya. Anyị aghaghị iji obi eziokwu chegharịa site n’ọchịchọ, okwu na omume ọjọọ anyị nile, mgbe ahụkwa gbalịsie ike ikwekọ n’ụkpụrụ ya ndị e depụtara na Bible. (Ọrụ 17:30) Ma mmehie anyị​—⁠ma ndị ochie ma ndị anyị na-eme ugbu a⁠—​dị mkpa ka e kpuchie ha. Àjà mgbapụta Jisọs na-ejere anyị ozi n’ebe a. Pọl na-enye ihe na-egosipụta nke a, na-ede na Chineke ‘chere Jisọs dị ka ihe ịjụrụ Ya obi site n’okwukwe e kwere n’ọbara Ya.’​—⁠Ndị Rom 3:​24, 25.

14 N’ebe a onyeozi ahụ na-ezo aka n’ihe Chineke dokwara eri ogologo oge gara aga nke ga-esekwa onyinyo ma ọ bụ tụọ aka n’ọdịnihu n’ebe Kraịst nọ. N’Israel oge ochie, a na-achụ àjà anụmanụ mgbe mgbe maka mmehie n’ihi ndị ahụ. Ụmụ mmadụ n’onwe ha pụkwara ịchụ àjà ikpe ọmụma maka mmehie pụrụ iche ha mere. (Levitikọs 16:1-⁠34; 5:1-⁠6, 17-⁠19) Chineke nabatara àjà ndị a e ji ọbara chụọ dị ka ihe na-ekpuchi ma ọ bụ na-akagbu mmehie mmadụ. Ma nke a ewetaghị nnwere onwe na-adịgide adịgide, n’ihi na Bible na-asị na “ọbara nke oké ehi na nke ewu apụghị iwepụ mmehie.” (Ndị Hibru 10:​3, 4) Otú ọ dị, akụkụ ndị a nke ofufe bụ́ ndị gụnyere ndị nchụàjà, ụlọ nsọ, ebe ịchụàjà na ihe ndị e ji achụ àjà bụ ‘ihe atụ’ ma ọ bụ “onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa,” nke gụnyere àjà Jisọs.​—⁠Ndị Hibru 9:6-⁠9, 11, 12; 10:1.

15 Bible na-egosi otú nke a si dị mkpa n’anyị inweta mgbaghara, na-asị: “Onye anyị sitere n’ọbara Ya [Jisọs] nwee mgbapụta anyị n’ime Ya, bụ́ mgbaghara nke ndahie nile anyị.” (Ndị Efesọs 1:​7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; 1 Pita 2:24) Ya mere, tụkwasị n’ọnwụ ya ịbụ ihe mgbapụta ahụ, ọ pụrụ ikpuchi mmehie anyị; a pụrụ ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ma ọ dị ihe a chọrọ n’aka anyị. Ebe ọ bụ na a zụtawo anyị, ee, “were ọnụ ahịa gbara” anyị site n’ihe mgbapụta Kraịst, anyị aghaghị ịdị njikere ịnabata Jisọs dị ka Onyenwe anyị ma ọ bụ Onye anyị bụ nke ya ma rubere ya isi. (1 Ndị Kọrint 6:​11, 20; Ndị Hibru 5:9) N’ihi nke a, ọ dị anyị mkpa ichegharị site ná mmehie anyị ma jikọọ nke a n’okwukwe e nwere n’àjà mgbapụta Jisọs Onyenwe anyị.

16 Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ dịghị anyị mkpa ichere maka mgbaghara ruo mgbe Chineke ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ mmetụta nile nke mmehie, na-eweta ọrịa na ọnwụ ná ngwụsị. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mgbaghara nke a dị ka ihe anyị pụrụ inweta ugbu a, nke na-arụpụta akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke.​—⁠1 Jọn 2:12.

17 Ya mere, àjà Jisọs kwesịrị inwe ihe ọ pụtara nye onye ọ bụla n’ime anyị kwa ụbọchị. Site na ya Chineke pụrụ ịgbaghara mmehie ndị anyị mere. Jọn onyeozi na-akọwa, sị: “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu Onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, Ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ezi omume.” (1 Jọn 2:1; Luk 11:​2-⁠4) Nke a bụ otu ozizi gbara ọkpụrụkpụ na Bible, ọ dịkwa mkpa maka obi ụtọ anyị na-adịgide adịgide.​—⁠1 Ndị Kọrint 15:⁠3.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

18-21. Olee otú i si azaghachi n’ihe Chineke na Jisọs meworo? (1 Jọn 4:​9-⁠11)

18 Olee otú i si emeghachi omume n’ihe Bible na-ekwu banyere ihe kpatara ọrịa na ọnwụ, ihe mgbapụta na ndokwa e mere maka mgbaghara mmehie site na Jisọs Kraịst? Mmadụ pụrụ ịmụta ihe ndị a nile ma ghara ikwe ka o metụta obi na ndụ ya. Ma a chọrọ ihe ka ukwuu n’aka anyị.

19 Ànyị na-enwe ekele maka ịhụnanya Chineke n’inye ihe mgbapụta ahụ? Jọn onyeozi dere, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya.” (Jọn 3:​16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Cheta na ụmụ mmadụ nke a metụtara bụ ndị mmehie, ndị e wezụgara n’ebe Chineke nọ. (Ndị Rom 5:10; Ndị Kọlọsi 1:21) Ị̀ ga-enyefe onye ị kasị hụ n’anya n’ihi ụmụ mmadụ ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-egosi mmasị dị nta ma ọ bụ ghara igosi mmasị ọ bụla n’ebe ị nọ? Ma Jehova mere ka Ọkpara ya dị ọcha ma kwesị ntụkwasị obi, bụ́ Nwa mbụ ya ọ hụrụ n’anya, bịa n’ụwa iche mkparị, ihere na ọnwụ ihu iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya. Nke ahụ kpaliri Pọl ide, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.”​—⁠Ndị Rom 5:8.

20 Ọkpara ahụ gosikwara ịhụnanya. Mgbe oge ruru, o ji ọchịchọ obi wedaa onwe ya ala ịghọ mmadụ. Ọ gbaara mmadụ na-ezughị okè ohu, na-ezi ha ihe ma na-agwọ ha ọrịa. Ọ bụkwarịị eziokwu na ọ dịghị ihe ọjọọ o mere, ọ naara mkparị, mmekpọ ọnụ na ọnwụ ihere n’aka ndị iro nke eziokwu ahụ. Dị ka ihe inyeaka iji ghọta nke a, wepụta oge iji gụọ ihe ndekọ nke nraranye, ikpe, mkparị na ogbugbu nke Jisọs, dị ka e dekọrọ ha na Luk 22:47 ruo 23:47.

21 Olee otú ị ga-esi zaghachi n’ihe ndị a nile? N’ezie, mmadụ ekwesịghị ikwere ka nnabata ya nke ndokwa ịhụnanya ahụ nke ihe mgbapụta ghọọ ihe ngọpụ maka omume ọjọọ. Nke ahụ ga-abụ aghọtaghị nzube ya, ọ pụkwara ọbụna ịkpata mmehie nke na-enweghị mgbaghara. (Ndị Hibru 10:​26, 29; Ọnụ Ọgụgụ 15:30) Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ibi ndụ n’ụzọ ga-ewetara Onye Okike anyị nsọpụrụ. Okwukwe n’onyinye ahụ dị ukwuu nke e nyere site n’Ọkpara ya kwesịrị ịkpali anyị ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ya, na-enyere ha aka ịghọta otú ha onwe ha pụkwara isi rite uru.​—⁠Ọrụ 4:12; Ndị Rom 10:​9, 10; Jemes 2:26; 2 Ndị Kọrint 5:​14, 15.

22. Mgbaghara nke mmehie anyị pụrụ ịgụnye olileanya dị aṅaa?

22 Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ sịrị na ya pụkwara ịgbaghara mmehie dị ka Chineke si agbaghara. Ndị iro ụfọdụ kọchara ya n’ihi nke ahụ. Ya mere, Jisọs gosipụtara nke a site n’ịgwọ nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. (Luk 5:​17-⁠26) N’ihi nke a, dị nnọọ ka mmehie rụpụtara mmetụta elu ahụ n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, mgbaghara nke mmehie pụkwara iweta uru dị iche iche. Ọ dị mkpa ịmara nke ahụ. Ihe Jisọs mere n’ụwa gosiri na Chineke pụrụ iweta ọrịa na ịnwụ anwụ ná ngwụsị. Nke ahụ kwekọrọ n’ihe Jisọs Kraịst n’onwe ya kwuru, ya bụ, na Jehova Chineke nyere Ọkpara ya ka ndị nwere okwukwe wee nwee ike inwe “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ma ọ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Olee mgbe? Oleekwa banyere ndị anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị nwụworonụ?

Igbe dị na peeji nke 103]

Onye na-ede ihe odide sayensị bụ́ Isaac Asimov kọwara na molecule RNA ndị dị n’ime ụbụrụ mmadụ na-enye “usoro ndekọ ihe nke nwere ikike zuru okè nke ịhụ maka ókè ọ bụla nke ịmụ ihe na icheta ihe, bụ́ nke o yiri ka mmadụ ọ ga-ebokwasị ya​—⁠otu ijeri ugboro karịakwa otú ahụ.”​—⁠“Times Magazine” nke New York.

[Foto dị na peeji nke 108]

Àjà ndị ahụ a chụrụ n’Israel tụrụ aka n’ọdịnihu n’ebe àjà mgbapụta Jisọs dị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya