Isi 14
Ajọ Omume—n’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwe Ka Ọ Dịrị?
1-3. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya inyocha ihe Bible na-ekwu banyere mmebi iwu?
ỌBỤRỤ na enyi gị abụrụ onye e zuru ohi, dinaa n’ike ma ọ bụ gbuo, e wee hapụkwa omekome ahụ, ọ̀ bụ na ị gaghị enwe mmetụta nke obi nkoropụ, iwe na ọnụma? Ụdị mpụ na ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ bụ nnọọ ntakịrị ngosipụta nke ihe dakwasịworo ihe a kpọrọ mmadụ.
2 Akụkọ ihe mere eme bụ ogologo ihe ndekọ nke agha ọjọọ dị iche iche, oké ịda ogbenye, mpụ na mmegbu. N’ihi nke a, ụfọdụ amalitewo inwe obi abụọ banyere ịdị adị Chineke. Anyị maara na e nwere ihe àmà na-eju afọ na Onye Okike ahụ dị adị. (Ndị Hibru 3:4; Ndị Rom 1:20) Ma e nwekwara ajọ omume. N’ihi nke a, ọbụna ọtụtụ ndị kwere na Chineke na-ajụ, sị, ‘Ọ̀ na-eche banyere anyị n’ezie?’ Ha na-ajụ, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke na-eche banyere anyị, gịnị mere o jiworo kwere ka ajọ omume dịruo ogologo oge otú a?’
3 Ndị ọkà ihe ọmụma na ndị ụkọchukwu atụlewo isiokwu a mgbe mgbe, ma ha enweghị azịza ndị na-eju afọ. Gịnị ka Chineke n’onwe ya na-ekwu?
CHINEKE NA-AZA, SỊ: ‘Ọ NA-EMETỤ M N’OBI’
4-8. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka Habakuk n’okwu a?
4 N’ịdabere n’ahụmahụ anyị, anyị pụrụ ịghọta mmeghachi omume nke onye amụma Hibru ahụ bụ́ Habakuk n’ebe ime ihe ike na ikpe na-ezighị ezi dị. Ọ dịrị ndụ n’oge mgbe ndị Juu dabaworo n’ọtụtụ omume ọjọọ, bụ́ nke nyere Habakuk nsogbu nke ukwuu ma kpalie ya ịjụ Chineke, sị:
“N’ihi gịnị ka i ji eme ka m na-ele ikpe na-ezighị ezi anya? N’ihi gịnị ka i ji agbachi ihe ọjọọ nkịtị? Mbibi na ime ihe ike dị n’ihu m; ịlụ ọgụ dị, esemokwu jupụtakwara. N’ihi ya iwu adịghị arụkwa ọrụ, ikpe ziri ezi adịghịkwa emeri. Onye na-emebi iwu na-egechibido onye ezi omume, nke mere na e wezụgawo ikpe ziri ezi.”—Habakuk 1:3, 4, New International Version.
Ọ bụ ezie na obi siri ya ike banyere ezi omume Jehova, ime ihe ike na ikpe na-ezighị ezi dị n’etiti ndị ya nyere Habakuk nsogbu n’obi. Ọzọ, n’oge ahụ ndị Babilọn nọ na-awakwasị, na-eme ihe ike ma na-akwakọrọ ihe ndị mba ọzọ n’ike. O yiri ka mmebi iwu ò jupụtara ebe nile. Onye amụma ahụ bụ́ Habakuk chere ihe mere Chineke, bụ́ onye pụrụ ịhụ ihe na-emenụ, ji yie ka ọ dịghị ihe ọ na-eme.—Habakuk 1:13.
5 N’ọhụụ, Jehova mesiri Habakuk obi ike na ihe ahụ yiri ka ọ̀ bụ ọganihu nke ndị mmebi iwu ga-adị nanị nwa oge. Ọ bụghị nanị na Chineke hụrụ ihe na-eme, kama o metụkwara ya n’obi. O nwere “mgbe a kara aka” maka imezu ikpe ziri ezi nke Chineke. Ọ bụrụgodi na ụmụ mmadụ echee na nke a na-egbu oge, e mesiri Habakuk obi ike, sị, “Ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.
6 N’igosikwu nchegbu Chineke, o mere ka Habakuk mata ihe ịma aka nke na-eche ụmụ mmadụ ihu ka ọ dị ugbu a. Jehova sịrị: “Ma onye ezi omume ga-eji okwukwe ya dị ndụ.” (Habakuk 2:4) Habakuk ọ̀ ga-emeri ihe ịma aka ahụ, na-eme ihe ziri ezi ma dị mma n’agbanyeghị ihe ndị nọ ya gburugburu na-eme? Ọ dị ya mkpa igosipụta okwukwe na Chineke ga-elebara okwu anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ‘mgbe ya a kara aka.’
7 Akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị ihe merenụ. Mgbe oge ruru, Chineke mere ihe iji kwụsị ime ihe ike na ikpe na-ezighị ezi n’akụkụ nke ndị Juu. E meriri ala ahụ ma dọrọ ọtụtụ ndị laa n’agha. Ka e mesịrị, Chineke mere ka Babilọn zaa ajụjụ ihe ha mere. Dị ka Jehova kwuru site n’ọnụ ndị amụma ya, ndị Midia na ndị Peasia n’okpuru Saịrọs meriri Alaeze Ukwu Babilọn ahụ yiri ka ọ bụ ya kasị ike.—Jeremaịa 51:11, 12; Aịsaịa 45:1; Daniel 5:22-31.
8 Ihe atụ a dị nta na-egosi na Onye Okike anyị adịghị emechi anya ya n’ebe ajọ omume dị. Ọ maara banyere ya, ọ na-emetụkwa ya n’obi. (Tụlee Jenesis 18:20, 21; 19:13.) Ebe ọ dị otú ahụ, n’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwe ka ajọ omume nọgide ruo ugbu a? Iji ghọta nkọwa ezi uche dị na ya nke Bible na-enye, ọ dị anyị mkpa ịlaghachi azụ gaa na mgbe nsogbu ụmụ mmadụ malitere.
IHE ISEOKWU NDỊ METỤTARA ELUIGWE NA ALA EBILITE
9-12. Olee otú ihe iseokwu ndị metụtara eluigwe na ala si bilite n’Iden? Gịnị ka ha bụ?
9 Dị ka a kọrọ na Jenesis isi nke atọ, Ekwensu jụrụ Iv banyere nrubeisi ya nye iwu Chineke ka ọ ghara iri site n’otu osisi a họpụtara iche. Iv zara na nnupụisi ga-eweta amamikpe ọnwụ. Ma Setan zaghachiri, sị:
“Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 3:1-5.
N’ebe a, Setan welitere ihe ịma aka ma ọ bụ ihe iseokwu ndị metụtara ihe nile Chineke kere eke, ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.
10 Nke mbụ, Ekwensu mara ịkwụwa aka ọtọ nke Chineke aka. Chee echiche banyere ihe nke a pụtara. Ọ bụrụ na Chineke abụghị onye eziokwu n’okwu a, à pụrụ ịtụkwasị ya obi n’ihe ọ bụla ọzọ? Ihe o kere eke ndị nọ n’ụwa ma ọ bụ n’eluigwe hà ga na-enyo ihe Chineke kwuru enyo mgbe nile? Anyị maara taa banyere otú ụmụ mmadụ si enyo ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị jị okwu ụgha na-eme ihe n’ọchịchị enyo.—Tụlee Abụ Ọma 5:9.
11 Ihe Setan kwuru nke bụ na Chineke na-aghọ aghụghọ ma na-anapụ ihe ndị o kere ihe ndị dị mma welitekwara ihe iseokwu bụ́, Chineke ò kwesịrị ịchị achị? Obi abụọ banyere izi ezi nke otú Chineke si achị ọchịchị metụtara ma eluigwe ma ala.
12 Ọzọkwa, Setan na-asị na ụmụ mmadụ pụrụ ịga n’ihu n’adabereghị na Chineke, na ha pụrụ ma kwesị ịchị onwe ha. E chere ajụjụ ahụ n’ihu ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi sị, Ụmụ mmadụ hà pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ihe ndị ha na-eme n’adabereghị n’ebe Chineke nọ?
13-15. N’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi dozie ihe iseokwu ndị ahụ?
13 Oké ihe iseokwu ndị ahụ metụtara omume chọrọ ka e dozie ha kpam kpam. Ụzọ Chineke họọrọ isi mee nke ahụ na-egosi amamihe na mmasị ya n’ụzọ pụtara ìhè n’ọdịmma anyị, ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Chineke kwere ka oge gafee, bụ́ oge nke ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi pụrụ iji hụ ihe àmà ahụ. Iji ghọta nke a, tụlee otú ị ga-esi mee ihe ma ọ bụrụ na mmadụ ekwupụta n’ihu ọha na ị bụghị ezi onye òtù nke ezinụlọ, na ị na-agha ụgha ma jiri ike na-eme ihe site n’imenye ndị ọzọ egwu. Onye ahụ na-erughị ala pụrụ ime mkpesa n’ụzọ dara ụda ma ọ bụ ọbụna lụsoo onye ahụ na-ebo ya ebubo ọgụ. Ma n’ịtụsara ahụ n’ihi ịmata na ebubo ahụ bụ ụgha, ị pụrụ iwezụga obi abụọ nile site n’inye oge ka mmadụ nile wee hụ ụzọ gị nile na ezi ihe ndị ọ rụpụtara n’ezinụlọ gị.—Matiu 12:33.
14 Olee ihe àmà nke oge kpugheworo n’ihe iseokwu ndị ahụ a kpalitere n’Iden? Dị ka Chineke buru ụzọ dọọ aka ná ntị, nnupụisi mmadụ akpatawo ọnwụ, nke ihe na-ebutere ya ụzọ bụ ọrịa na ịka nká. Ya mere Chineke aghaghị ụgha n’ịdọ aka ná ntị ya, e nweghịkwa ebe mgbakwasị ụkwụ ọ bụla na nke a iji maa izi ezi nke ịchịisi ya aka. E nwekwara ihe àmà na-egosi na mmadụ apụghị iguzobe ụkpụrụ ndị nke ya, na-achị onwe ya n’adabereghị na Chineke. Ọ dịghị ụdị ọ bụla nke ọchịchị mmadụ nke nweworo ike igbochi agha, aghụghọ, mmegbu, mpụ na ikpe na-ezighị ezi. Nke a na-akwado ihe Bible na-ekwu: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọzọkwa, oge egosipụtawo na mmadụ apụghị ịkwụsị ahụhụ; kama, na ha na-akpata ya mgbe mgbe.
15 Ndị obi ha ziri ezi dị njikere ịnabata ịchịisi Chineke na ụkpụrụ ya nile na-anụ ụfụ nke ịta ahụhụ ahụ. N’iburu ha n’uche, Chineke gaje ime ihe megide ndị na-emebi iwu, ọbụna dị ka o mere n’ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ dị nta nke e kwuru n’akwụkwọ Habakuk. Jehova ga-ewepụ ndị nile bi n’eluigwe na n’elu ala bụ́ ndị na-akpata mmebi iwu na ahụhụ. Dị nnọọ ka Chineke gwara Habakuk, e nwere “mgbe a kara aka” maka nke a. Anyị pụrụ ijide n’aka na “ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.
IRITE URU SITE N’OGE AHỤ E NYERE
16-20. Olee otú anyị si soro n’ihe iseokwu ọzọ nke chọrọ ndozi?
16 N’ihe banyere Chineke ikwe ka ihe ọjọọ dịrị, ọtụtụ ndị na-eche echiche nanị banyere ahụhụ nke mmadụ. Ha adịghị aghọta ịdị mkpa nke ihe iseokwu ndị a na-edozi. Ọzọkwa, ha pụrụ ileghara uru ndị ha pụrụ inweta n’ihi na Chineke nyere oge maka iji dozie ya anya.—2 Pita 3:9.
17 Oge Chineke nyeworo maka iji dozie okwu ndị a adịwo ogologo n’ụzọ zuru ezu ka e wee mụọ anyị. Ụdị ihe ụtọ ọ bụla nke anyị nweworo, ọ bụ n’ihi oge nke Chineke nyeworo. Ọzọkwa, e nyewo anyị ohere nke igosipụta ịhụnanya na nguzosi ike n’ihe anyị nye Chineke. Dị ka ịhe ịma aka, Setan rụrụ ụka na ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, ọbụna otu onye nke Chineke pụrụ ikwu banyere ya sị, “Ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” Anyị na-ahụ nke a site n’akwụkwọ Bible bụ́ Job, isi 1 na nke 2. Banyere nwoke ahụ zuru okè bụ́ Job, Ekwensu sịrị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” Setan sịrị na Job mere ya n’ihi uru onwe onye, n’ihi na Chineke nyere ya akụ̀ na ụba, ma na ọ bụrụ na nke ahụ efunahụ Job, ọ ga-akọcha Chineke. (Job 1:7-12) Setan ọ̀ pụrụ ichigharị mmadụ nile ihu pụọ n’ebe Chineke nọ?
18 Chineke kwere ka Ekwensu wetara Job ọtụtụ nsogbu. Akụ̀ na ụba Job funahụrụ ya. E gburu ụmụ ya. E ji ọrịa jọgburu onwe ya tie ya ihe otiti. Ọ bụ ezie na ọ maghị na Setan na-eme ya ebe bụ isi nke mwakpo pụrụ iche, Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. (Job 27:5) Obi siri ya ike na Jehova agaghị echefu ya nakwa na Onye Okike ahụ ga-akpọlite ya ọbụna a sị na ọ nwụọ. (Job 14:13-15) Jehova adịghị ahapụ ndị ya na-eguzosi ike n’ihe. Ka oge na-aga, o mere ihe ma mezie mmebi ihe ahụ nke Setan kpataworo. E weghachiri ahụ ike Job. Ọ bịara nwee ụmụ iri mara mma karị, tinyere akụ̀ na ụba dị ukwuu na ogologo ndụ. Ị pụrụ ịgụ ihe ndekọ ahụ na-agba ume na Job 42:10-17.
19 Ihe ndekọ a na-enyekwara anyị aka ịhụ ihe mere Chineke ji kwe ka ajọ omume dịrị. N’ụzọ dị otú a, e gosipụtara na mmadụ ụfọdụ ga-ahụ Chineke n’anya n’agbanyeghị nsogbu nile nke ndụ ma guzosie ike n’ihe nye ya n’okpuru ule ọ bụla. Anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị sị, ‘Nke ahụ ọ̀ bụ ụzọ anyị siworo meghachi omume n’agbanyeghị ahụhụ? Ọ̀ bụ otú anyị chọrọ ịdị, si otú a na-enye aka n’ịzaghachi ihe ịma aka ahụ Setan kpalitere?’ (Ilu 27:11) Akwụkwọ Job na-enyekwa anyị ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na Chineke pụrụ iwepụ ahụhụ ọ bụla ụmụ mmadụ na-eche ihu n’oge nile e kwere ka ajọ omume dịgide.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 4:16, 17.
20 Dị ka Chineke hụrụ ma nwapụta Job na Habakuk, Ọ na-arịba ụmụ mmadụ na-eguzosi ike n’ihe nye ya n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị njọ ama ugbu a, ọ gaghịkwa ahapụ ịkwụghachi ha ụgwọ.—Malakaị 3:16-18.
Ị̀ CHỌRỌ ỊDỊ NDỤ MGBE AJỌ OMUME NA-ADỊKWAGHỊ?
21-23. Olileanya dị aṅaa ka Bible na-esetipụ? Na-apụta gịnị nye anyị?
21 Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke na-ezube iweghachi ụwa n’ọnọdụ paradaịs, ụdị nke Adam na Iv biri na ya tupu ha aghọọ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe. (Luk 23:43; Mkpughe 21:4, 5) Mgbe ahụ a ga-enwe mmezu zuru ezu nke nkwa Bible ndị dị ka:
“Ndị na-emebi iwu ga-apụ n’anya; ị pụrụ ilegharị anya maka ha, ma ị gaghị ahụ ha; ma ndị dị umeala [ma ọ bụ, ndị dị nwayọọ n’obi] ga-enweta ala ma nwee ọganihu na udo.”—Abụ Ọma 37:10, 11, Good News Bible; Ilu 24:1, 20.
22 Ọtụtụ ndị na-eme mkpesa banyere ihe ọjọọ na ahụhụ, ọbụna na-ata Chineke ụta maka ihe ndị a. Ma hà chọrọ mwepụ nke ajọ omume n’ezie, ka ọ̀ bụ nanị ntaramahụhụ ọ na-eweta? Ọ bụ mmadụ na-ewetara onwe ya ihe ka ukwuu n’ahụhụ ndị ọ na-ata; ọ na-ewe ihe ndị ọ kụrụ n’ubi. (Ndị Galetia 6:7; Ilu 19:3) Omume rụrụ arụ na-arụpụta ọrịa mmekọahụ, isikwopụ ime, ịgba alụkwaghịm. Ise siga na-eduje n’ọrịa cancer akpa ume. Ịṅụbiga mmanya ókè na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-ebibi imeju na ụbụrụ. Imebi iwu okporo ụzọ na-akpata ihe ọghọm ndị na-eweta ọnwụ. Ndị ahụ na-asị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke ji kwe ka ajọ omume dịrị? Olee mgbe ọ ga-akwụsị ya?’ hà chọrọ n’ezie ka Chineke mee otú ahụ? Ọ bụrụ na o mee otú ahụ ugbu a, site n’igbochi omume ndị a, ọtụtụ ndị ga-eme mkpesa na ọ na-egbochi ha ime ihe.
23 N’ihi ya, Chineke ikwe ka ajọ omume dịrị na-enyere anyị aka igosi ebe anyị guzo, ihe dị n’obi anyị. Chineke gwara Habakuk, sị: “Onye ezi omume ga-eji okwukwe ya dị ndụ.” Nke ahụ chọrọ ịzụlite ịkpọasị maka ihe Chineke na-egosi na ọ bụ ihe na-adịghị mma ma ọ bụ ajọ ihe. (Habakuk 2:4; Abụ Ọma 97:10) Ibi ndụ n’ụzọ dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị ghara ịbụ ndị ihe ha dị ụfọdụ ndị agbata obi na ndị enyi mma. (1 Pita 4:3-5) Job na Habakuk dị njikere ịdị iche ka ha wee guzosie ike n’ihe nye Chineke ma nweta nnwapụta ya. N’otu aka ahụkwa, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova taa na-egosipụtakwa na a pụrụ ime ya, ha na-ebikwa ndụ ka mma, nke na-enye afọ ojuju karị.
24-26. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru na-adịgide adịgide site na Chineke ikwe ka ajọ omume dịrị?
24 Ndị na-agbaso ụzọ nke a na-atụkwasị ihe n’ihe àmà ahụ bụ na Setan bụ ajọ onye ụgha. Ha na-egosipụta na ụmụ mmadụ pụrụ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke, na-enwe obi ike n’izi ezi na ezi omume nke ụzọ o si achị ọchịchị ya. N’aka nke ya Chineke maara na a pụrụ itinye n’aka ndị dị otú a nlekọta nke paradaịs e weghachiri n’ụwa. Ndụ a ga-adị mgbe ahụ ga-abụ nke na-enye ọṅụ nke ukwuu nke na mwute na ihe ọjọọ nke oge gara aga agaghị abata n’obi. A ga-echefu ha dị ka anyị chefuworo ihe mgbu na mwute ndị anyị nwere ọtụtụ afọ gara aga mgbe, dị ka ụmụntakịrị, ọ pụrụ ịbụ na anyị merụworo ahụ n’ikpere.—Aịsaịa 65:17; Jọn 16:21.
25 Nke ahụ bụ olileanya na-enye ọṅụ, ọ na-enyekwara anyị aka ịhụ na nkwere Chineke kwere ka ajọ omume dịrị bụ nanị ihe na-ewere ọnọdụ nwa oge ná mmezu nke nzube ebighị ebi ya. Ihe iseokwu ndị ahụ metụtara okwu iwu na omume bụ́ ndị kpatara ya ga-abụ ndị e doziri ruo mgbe nile ebighi ebi.
26 Ma ọbụna mgbe anyị ghọtasịrị ihe mere Chineke ji kwe ka ajọ omume dịrị, n’ụzọ ziri ezi, anyị ga-achọ ịmara: Olee mgbe ọ ga-akwụsị? Olee mgbe bụ “mgbe a kara aka” ahụ mgbe Chineke ga-akwụsị ajọ omume n’ụwa nile? Ugbu a ka anyị lee.
Igbe dị na peeji nke 131]
Dr. W. R. Inge, bụ́ onye isi nke St. Paul’s Cathedral, London, n’afọ ole na ole gara aga kwuru, sị:
“Eri ndụ m nile, emewo m mgbalị ịchọta nzube nke ịdị ndụ. Agbalịwo m inweta azịza nye nsogbu atọ, bụ́ ndị na-adị m mgbe nile ka hà bụ ndị bụ isi: nsogbu nke mgbe ebighị ebi; nsogbu nke ọdịdị mmadụ; na nsogbu nke ihe ọjọọ. Adawo m. Enwebeghị m azịza maka nke ọ bụla.”
[Foto dị na peeji nke 137]
Ahụhụ emeghị ka Job chigharịa megide Chineke; ọ tachiri obi ma bụrụ onye a gọziri