Isi 15
“Ọgwụgwụ Ụwa” Ọ̀ Dị Nso?
1-3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị ‘n’ọgwụgwụ ụwa’?
“Ị̀ DỊ Njikere Maka Ọgwụgwụ Ụwa?” ka akwụkwọ Star nke Toronto jụrụ. Ajụjụ ahụ ga-eme ka ụfọdụ ndị chee echiche banyere akụkọ ndị dị ka nke a:
“Sydney, Australia—N’ime ọhịa nke Australia, otu ìgwè nke 100 mmadụ ndị bi n’obodo ukwu, bụ́ ndị si n’ebe obibi ha gbapụ ma hapụ ihe okomoko nile nke ndụ ugbu a na-ejikere maka ihe ha kwere na ọ bụ ‘ọgwụgwụ ụwa’ nke dị nso.”
2 Ma ọtụtụ ndị taa na-echegbu onwe ha na “ọgwụgwụ” ahụ pụrụ ịbịa site n’agha nuklia, mmetọ ma ọ bụ ihe ize ndụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ:
“Onye na-ede ihe odide sayensị bụ́ Isaac Asimov agụtawo 20 ụzọ nke ndụ pụrụ isi ghọọ ihe e kpochapụrụ kpam kpam n’ụwa, na-amalite n’anyanwụ ịnyụ ruo n’ụkọ nri.”—Star nke Toronto.
3 Otú ọ dị, anyị nwere ihe siri ike karị nke mere anyị ga-eji nwee nchegbu na-adabere n’Okwu Chineke nke kwesịrị ndabere. Ọtụtụ ndị agụwo na Bible banyere “ọgwụgwụ ụwa.” (Matiu 13:39, 40; 24:3, Authorized Version, New American Bible) N’ịmara na ihe ọ bụla Chineke kwere ná nkwa ga-emezu, anyị kwesịrị ịchọ ịhụ ihe Bible na-ekwu banyere nke a na ụzọ ọ pụrụ isi metụta ndụ anyị ugbu a na n’ọdịnihu.
ỌGWỤGWỤ—NKE GỊNỊ, ÒLE MGBEKWA?
4. Dị ka Bible si kwuo, gịnị gaje ịgwụ?
4 Akwụkwọ Nsọ na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-ebibi ndị na-akwalite ime ihe ọjọọ na ahụhụ. (Abụ Ọma 37:28; 145:20) Ma Jisọs Kraịst ma Pita onyeozi ji mmezu ihe e kpere n’ikpe nke a na-abịanụ tụnyere mbibi a họrọ ahọ nke ndị mmadụ nke Chineke kpatara n’oge Noa. E bibighị ụwa n’onwe ya. Ma e ji iju mmiri zuru ụwa ọnụ bibie ndị na-emebi iwu. Chineke chebere Noa na ezinụlọ ya; ha ghọrọ ọha mmadụ nke na-eme ezi omume n’elu ụwa e mere ka ọ dị ọcha. Mgbe o zosịrị aka na nke ahụ, Chineke nyere Pita mmụọ nsọ ibu amụma banyere ọbịbịa nke “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” “Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ndị “ezi omume bi n’ime ha” ga-esochi nke ahụ.—2 Pita 3:5-7, 13; Eklisiastis 1:4; Aịsaịa 45:18.
5, 6. Olee ihe mere anyị pụrụ iji jiri n’aka na “ọgwụgwụ” ga-abịa?
5 Dị ka o kwesịrị, anyị chọrọ ịmara mgbe ọgwụgwụ mbibi ahụ nke usoro ihe dị ugbu a ga-abịa. Jisọs kwuru na ọ bụ nanị Nna ya maara “ụbọchị na oge hour ahụ.” (Matiu 24:36) Ma nke ahụ ọ̀ na-eme ka anyị nọrọ n’ọchịchịrị kpam kpam? Ee e, n’ihi na Chineke ji obi ebere tinye ihe ọmụma n’Okwu ya ka ndị na-efe ya wee nwee ike ịmara mgbe oge ahụ dị nso.—Tụlee Emọs 3:7.
6 Bible na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike n’ikike Chineke nwere ibu amụma banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, na Daniel 9:24-27, o dekọrọ otu amụma iji gosi mgbe Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst, ga-abịa. Onye dibịa narị afọ mbụ bụ́ Luk na-akọ na n’afọ 29 O.A., ndị Juu, ebe ha matara banyere amụma Daniel, nọ na-echere Mesaịa ahụ. (Luk 3:1, 2, 15) Ọkà mmụta bụ́ onye Juu bụ́ Abba Hillel Silver kwetara, na-ede, sị: “E lere anya Mesaịa ahụ n’ihe dị ka n’akụkụ nke abụọ ná nkebi anọ nke narị afọ mbụ O.A.” E mere Jisọs baptism, ọ ghọọkwa Kraịst ahụ na 29 O.A., bụ́ afọ ahụ amụma Daniel gosipụtara.
7-10. Gịnị ka Jisọs buru n’amụma banyere usoro ihe ndị Juu? Gịnịkwa mere?
7 Otu amụma ahụ dị na Daniel kwuru na mgbe ọnwụ Mesaịa gasịrị, ‘a ga-ebibi obodo na ebe nsọ ahụ.’ Ee, Chineke bu ụzọ kwuo na a ga-ebibi Jerusalem na ụlọ nsọ ya, na-eweta usoro ihe ndị Juu nke dị na mgbe ahụ ná ngwụsị.—Daniel 9:26.
8 Nwa oge nta tupu ọnwụ ya na 33 O.A., Jisọs mere ka nke a doo anya. O kwuru na Chineke na-ahapụ Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Ọzọ, ọ sịrị na ya na-apụ apụ, na ya ga-alọghachitekwa n’oge dị n’ihu. (Matiu 23:37–24:2) Ma ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, sị:
“Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a [ma ọ bụ, ‘ọgwụgwụ ụwa’]?”—Matiu 24:3, NW.
9 Azịza ya ga-apụta ndụ ma ọ bụ ọnwụ nye ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Ọ dịkwa mkpa otú ahụ nye anyị, n’ihi na, dị ka anyị ga-ahụ, nzaghachi Jisọs pụtara ihe karịrị ihe ndị ozi ahụ jụrụ banyere ya ma ọ bụ ihe ha pụrụ ịghọta.—Jọn 16:4, 12, 13.
10 Jisọs zoro aka n’amụma Daniel. (Matiu 24:15) Nke ahụ ekwughị kpọmkwem afọ a ga-ebibi Jerusalem, Jisọs ekwughịkwa. Ma ọ kọrọ ihe ndị ga-abụ “ihe ịrịba ama” na usoro ihe ndị Juu nọ na mgbe ikpeazụ ya. Ị pụrụ ịgụ okwu ya ndị ahụ na Matiu 24:4-21 na Luk 21:10-24. O buru amụma banyere Mesaịa (Kraịst) ụgha, agha, oké ụnwụ, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, mkpagbu nke ndị Kraịst na nkwusa n’ụzọ sara mbara. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ihe ndị ahụ mere n’ime ọgbọ nke dịgidere ruo mgbe ndị Rom bibiri Jerusalem na 70 O.A.
KRAỊST NDỊ NKE ỤGHA: Josephus, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ, kpọtụrụ mmadụ atọ kwuru na ha bụ Mesaịa aha
AGHA: E nwere agha ndị Parthia na ndịda ọdịda anyanwụ Esia; nnupụisi na Gaul nakwa Spain; mbili nke ndị Juu n’akụkụ ụfọdụ nke Alaeze Ukwu ahụ; mbili nke ndị Siria na Sameria megide ndị Juu
ỤNWỤ NRI: Ụnwụ nri weere ọnọdụ na Rom, Gris na Judia, bụ́ nke a kọrọ banyere otu n’ime ha n’Ọrụ 11:28
ALA ỌMA JIJIJI: Nke a mere na Krit, na Smụana, Hierapọlis, Kọlọsi, Kaịọs, Militọs, Samọs, Rom na Judia
A KPAGBURU NDỊ KRAỊST ma ha KWUSARA OZI ỌMA N’EBE NILE: Lee ihe ndekọ dị n’Ọrụ 8:1, 14; 9:1, 2; 24:5; 28:22
11, 12. Ruo ókè ha aṅaa ka ọ dị mkpa ịghọta “ihe ịrịba ama” ahụ?
11 N’ihi na ndị Kraịst tụkwasịrị obi n’amụma Jisọs, ha pụrụ ime ihe iji chebe ndụ. Kraịst adọwo aka ná ntị, sị: ‘Mgbe unu hụrụ Jerusalem ka ndị agha gbara ya gburugburu, gbalaganụ.’ (Luk 21:20-24) Dị ka e buru ya n’amụma, ndị Rom n’okpuru Ọchịagha Gallus gbara Jerusalem gburugburu n’October nke 66 O.A. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi gbalaga? Na mberede, ndị agha ahụ laghachiri azụ. Ndị Kraịst, n’iji ịdọ aka ná ntị Jisọs mee ihe, si n’obodo ahụ gbapụ. Na 70 O.A., ndị Rom n’okpuru Ọchịagha Taịtọs lọghachitere. Ha bibiri obodo ahụ, na-egbu ihe karịrị otu nde ndị Juu. Ọ bụrụ na ị gaa Rom, ị pụrụ ịhụ ihe ncheta nke a ka a tụrụ ya n’elu Ogidi nke Taịtọs.
12 Ihe mere n’ụbọchị ndị ikpeazụ nke usoro ihe ndị Juu gosipụtara ikwesị ndabere n’ụzọ zuru ezu nke “ihe ịrịba ama” Jisọs nyere. Nke a dị anyị mkpa n’ihi na amụma Jisọs banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a” pụtara ọbụna ihe dị ukwuu taa karị.
MMEZU ỌZỌ NKE AMỤMA JISỌS
13-16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji lee anya maka mmezu ọzọ nke “ihe ịrịba ama” ahụ, oleekwa otú ọ ga-esi dị iche ná mmezu nke mbụ?
13 Ihe Jisọs buru n’amụma banyere Kraịst ụgha, agha, ụnwụ nri na ala ọma jijiji, na mkpagbu nke ndị Kraịst, mezuru tupu 70 O.A. Otú ọ dị, o bukwara amụma banyere ihe ndị ọzọ ndị na-aghaghị ịbịa n’ọdịnihu. O kwuru na a ga-amanye “ebo nile nke ụwa” ịmata banyere ọnụnọ ya n’ebube nke eluigwe. (Matiu 24:30) Ọzọ, o kwuru na a ga-ekewa ụmụ mmadụ dị ka “atụrụ n’ụmụ ewu,” ndị dịkwa ka atụrụ ga-aba ná ndụ ebighị ebi. (Matiu 25:32, 46) Ihe ndị ahụ emeghị tupu ma ọ bụ na 70 O.A.
14 Ihe karịrị 25 afọ mgbe Jerusalem dasịrị, Chineke kpaliri Jọn onyeozi ide ná Mkpughe banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’isi nke isii, Jọn hụrụ “ndị ịnyịnya” bụ́ ndị ga-eweta ihe ndị jọgburu onwe ha n’ụwa. Site n’ịgụ Mkpughe 6:3-8, ị ga-ahụ na Jọn buru amụma banyere (1) agha, (2) “oké ụnwụ” na (3) “ajọ ọrịa.” (NW) Ndị a bụ ụfọdụ n’ime “ihe ịrịba àmà” ahụ Jisọs buru n’amụma. Otú a, anyị nwekwuru ihe àmà na a ga-enwe mmezu nke abụọ ma ọ bụ nke ka ukwuu nke ihe Jisọs buru n’amụma. Prọfesọ A. T. Robertson na-ekwu banyere nke a, sị:
“O zuru ezu maka nzube anyị iche na Jisọs ji mbibi nke ụlọ nsọ ahụ na nke Jerusalem, bụ́ nke mezuru n’ọgbọ ahụ, na 70 O.A. mee ihe, dịkwa ka ihe ịrịba ama nke ọbịbịa nke ugbo abụọ ya na nke ọgwụgwụ ụwa ma ọ bụ mmezu nke ọgbọ.”—Word Pictures in the New Testament, Mpịakọta nke 1, peji nke 188.
15 Ụfọdụ pụrụ ikwu, sị, ‘Ma e nwewo agha, ụnwụ nri na ọrịa na-efe efe n’oge nile. Ya mere olee otú mmadụ ga-esi mata mmezu nke abụọ nke “ihe ịrịba ama” ahụ?’
16 N’ụzọ doro anya, ọ ghaghị ịbụ ihe pụrụ iche, ihe dị iche pụọ n’agha ime obodo, ọrịa na-efe efe n’otu ebe ma ọ bụ otu ala ọma jijiji. Rịba ama na Mkpughe 6:4 na-asị na agha ahụ ‘ga-ewepụ udo [ọ bụghị site n’otu mba ma ọ bụ ógbè, kama] site n’ụwa.’ Tụkwasị, Jisọs gosiri na ọ ga-abụ ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara. Ya mere, tinyere agha nke gbasapụrụ ebe nile, a ga-enwe ụnwụ nri, ala ọma jijiji na ajọ ọrịa ndị dị ịrịba ama, ka a kpọtụ ole na ole aha. Ndị a nile ga-abịakwasị otu ọgbọ. (Matiu 24:32-34) Ịmata nke a, na ile anya laa azụ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ, ọtụtụ ndị na-amata n’ụzọ doro anya na ‘ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ nke usoro ihe a’ apụtawo ugbu a.
“IHE ỊRỊBA AMA” AHỤ N’OGE ANYỊ
17-19. Olee otú agha ahụ e buru n’amụma siworo mezuo n’oge anyị?
17 Mkpughe 6:4 gosiri na a ga-enwe agha zuru ụwa ọnụ. È nwewo? Ee, malite n’agha nke 1914-1918. Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Sydney J. Harris na-ede na ‘Agha Ụwa Mbụ gụnyere mba ndị mejupụtara ihe karịrị 90 pasent nke ndị bi n’ụwa.’ Dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopedia Americana si kwuo, e gburu ihe karịrị 8,000,000 ndị agha n’Agha Ụwa Mbụ, ihe karịrị 12,000,000 ndị nkịtị nwụkwara n’oké mgbukpọ, ịkwụ agụụ ma ọ bụ mkpughepụ.
18 Ụfọdụ na-anwa ikwu na ọ dịghị ihe nke a bụ site n’ịsị na ụmụ mmadụ na mbụ enweghị usoro njem na nkà na ụzụ maka agha ụwa. Ma nke ahụ na-emesi ịdị iche nke Agha Ụwa Mbụ ike.
“Ka oge gafeworo eri ụbọchị ndị ahụ nke August, 1914, ọ ghọwo ihe na-edo anya karị na ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ pụtara ọgwụgwụ nke otu ọgbọ.”—The Norton History of Modern Europe.
“Agha Ụwa Mbụ—nke bụ nnọọ Oké Agha Ahụ nye ndị lanarịrị—nọgidere na-abụ isi ihe nke akụkọ ihe mere eme ọgbara ọhụrụ n’uche ụmụ mmadụ. . . . E nwere ihe yiri eziokwu na nkwenkwe ahụ na-apụtachaghị ìhè nke ọtụtụ ndị nwere na oge Ọgbara Ọhụrụ ji Agha Ụwa Mbụ malite. Ọ bụ oge anyị na-abụkwaghị ndị aka ha dị ọcha.”—Gazette nke Montreal.
“Afọ 1918 ewetaghị otu puku afọ ahụ, o webatara ọkara narị afọ nke mbikọrịta isi—ọgba aghara, agha, mgbanwe, mbibi, na ịla n’iyi n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-anụtụbeghị mbụ ma ọ bụ ọbụna chee n’echiche.”—Prọfesọ H. S. Commager.
19 Ee, ‘e webatara agha n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-echetụbeghị n’echiche na mbụ,’ dị nnọọ ka Bible gosiworo. N’oge na-adịghị anya, e nwere agha ụwa nke abụọ bụ́ nke weere ihe dị n’agbata “35,000,000 na 60,000,000” ndụ.
“Agha Ụwa nke Abụọ gbasara ọnwụ na oké mbibi n’akụkụ ka ukwuu nke ụwa ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. . . . mgbalị iji kwuo ọnụ ego nke ihe onwunwe na ndụ ndị e bibiri enweghị isi: mgbakọta e nwetara dị nnọọ ukwuu gabiga ókè.”—The Encyclopedia Americana.
Ị makwaara na e wezụga ọtụtụ agha eri 1945, anyị nwere iyi egwu nke agha nuklia ugbu a.
20. Mmezu dị aṅaa werewooro ọnọdụ banyere ọrịa na-efe efe?
20 Ụdị ọrịa a na-ahụtụbeghị mbụ bụkwa ihe àmà ọzọ na mmezu ka ukwuu nke “ihe ịrịba ama” ahụ ji Agha Ụwa Mbụ malite. (Luk 21:11) Mgbe e kwetasịrị na ajọ ọrịa ndị bu ụzọ gburu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ime ọtụtụ iri afọ, magazin bụ́ Science Digest gosiri otú oké ahụ ọkụ Spain nke 1918 si dị nnọọ ukwuu karị:
“Agha ahụ egbuwo ihe karịrị 21 nde mmadụ n’afọ anọ nke agha kpụ ọkụ n’ọnụ; ntiwapụ nke ahụ ọkụ ahụ weere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ọnụ ọgụgụ ahụ n’ihe dị ka ọnwa anọ. N’akụkọ ihe mere eme nile, ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọnwụ bịakwutere mmadụ n’ụzọ dị njọ, dị ngwa karịa nke a. . . . Otu dọkịta kpọrọ ya ọdachi nkà mmụta ọgwụ nke kachasịnụ.”
“Ọnụ ọgụgụ a na-anụkarị n’ụwa bụ 21 nde ndị nwụrụ anwụ, ma ọ bụ ‘ma eleghị anya oké mgbubilata nke ọnụ ọgụgụ.’ Ihe dị ukwuu otú ahụ pụrụ ịnwụworị na nanị kọntinent nta bụ́ India; ndị nwụrụ n’ebe ahụ n’October nke 1918 ‘enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme nke ọrịa.’”—Scientific American.
Ndị ọkà mmụta sayensị akwụsịbeghịkwa ọnwụ ọrịa na-akpata. Mgbe o yiri ka “e meriela” otu ọrịa, ọzọ na-ebilite. Ụmụ mmadụ na-eziga rọket n’ọnwa, ma ha emeribeghị ịba, ọrịa cancer na ọrịa obi.
21-23. Ihe àmà ọzọ dị aṅaa ka ị pụrụ izo aka na ya, na-egosi na “ihe ịrịba ama” ahụ na-emezu?
21 Jisọs sịrị na ‘ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche’ ga-abụkwa akụkụ nke “ihe ịrịba ama” ahụ. (Matiu 24:7; Luk 21:11) E nwewo ala ọma jijiji n’akụkọ ihe mere eme nile. Ma, ná ntụnyere, olee otú ihe si dịrị eri oge malitere n’Agha Ụwa Mbụ? N’akwụkwọ bụ́ Il Piccolo, Geo Malagoli na-ekwu, sị:
“Ọgbọ anyị na-ebi n’oge dị ize ndụ nke oké ala ọma jijiji, dị ka ihe ndekọ na-egosi. N’ezie, n’oge nke 1,059 afọ (malite na 856 ruo 1914) ihe ndekọ ndị a pụrụ ịdabere na ha dekọrọ nanị 24 oké ala ọma jijiji ndị kpatara ọnwụ nke 1,973,000 mmadụ. Otú ọ dị, [n’]ọdachi ndị mere na nso nso a, anyị na-ahụ na 1,600,000 ndị mmadụ anwụwo na nanị 63 afọ, n’ihi 43 ala ọma jijiji ndị mere malite na 1915 ruo 1978. Ịrị elu nke a dị ịrịba ama gara n’ihu imesi eziokwu ọzọ nke a nabataworo ike—ọgbọ anyị bụ nke nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’ọtụtụ ụzọ.”
22 Ụmụ mmadụ pụrụ ikwu na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na ọ̀tụ̀tụ̀ ibu nke obodo ukwu ndị na-arịwanye elu bụ ihe kpatara ọnụ ọgụgụ ka elu n’ọnwụ ndị ala ọma jijiji kpatara eri Agha Ụwa Mbụ. Ọ bụrụgodi na nke a so n’ihe kpatara ya, ọ dịghị agbanwe ihe meworo. Ọ bụkwa otú a ka ọ dị n’ihe banyere ụnwụ nri. N’agbanyeghị ọganihu ndị e nwere ná mmepụta nke ihe oriri, dị ka Green Revolution, anyị na-agụ akụkọ ndị dị ka ndị a:
“Ọ dịkarịsịa ala otu n’ime mmadụ asatọ ọ bụla n’ụwa ka na-ata ahụhụ nke ụdị ụfọdụ nke enwetazughị ihe ahụ chọrọ.”
“Kansụl Nri Ụwa nke UN zukọtara n’Ottawa n’oge oyi a ma mee ka o doo anya na 50 nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi agụụ.”
“Òtù ụwa ndị na-ahụ maka nri na-eme atụmatụ na ihe karịrị otu ijeri mmadụ agaghị enweta ihe oriri ga-ezuru ha n’afọ a.”
23 ‘Ịba ụba nke ihe na-emebi iwu’ na ndalata n’ịhụnanya bụkwa ihe àmà ndị ga-aka “ọgwụgwụ oge a” akara. (Matiu 24:3, 12) Ma eleghị anya ọ dịghị gị mkpa ịhụ ihe ndekọ nke mpụ ma ọ bụ iyi egwu iji mee ka i kweta na nke a na-emezu n’oge a. Ma n’ọnọdụ nke a, gụọ nkọwa amụma banyere “mgbe ikpeazụ” ahụ na 2 Timoti 3:1-5. Lee ka o si kwesị nnọọ kpọmkwem n’ihe anyị na-eche ihu ugbu a.
GỊNỊ KA Ọ PỤTARA NYE GỊ?
24-26. Mmetụta dị aṅaa ka mmezu a na-enwe ugbu a nke “ihe ịrịba ama” ahụ na-enwe ná ndụ gị?
24 Jisọs buru amụma na ọtụtụ ndị ga-anọ n’obi erughị ala site ná mmezu nke “ihe ịrịba ama” ahụ. “Mmadụ [ga-atụbọ] site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi.” Otú ọ dị, ọ ga-adị iche n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ. Kraịst gwara ha, sị: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:26, 28, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Anyị apụghị ileghara ihe na-eme anya ma ọlị, ma ọ bụ jiri nzuzu wezụga ya n’akụkụ dị ka ihe ndabara. Ndị ahụ nọ na Jerusalem bụ́ ndị leghaara mmezu nke amụma Jisọs anya n’ụbọchị ha tụfuru ndụ ha. Jisọs na-agwa anyị, sị: “Mụrụnụ anya . . . ka unu wee ka n’ike ịgbanarị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Luk 21:34-36.
25 Ee, ọ ga-ekwe omume ịlanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla maara kpọmkwem “ụbọchị na oge hour” nke ọgwụgwụ ahụ na-abịanụ, ma ihe meworo n’ụwa n’oge ndụ anyị na-egosi na ọ dị ezi nso. Otu ọ dị, a chọrọ ihe dị ukwuu n’aka anyị karịa nanị ‘ịnọ na nche.’ (Matiu 24:36-42) O kwesịrị inwe mmetụta n’echiche na omume anyị. Pita na-ede, sị: “Ndụ unu kwesịrị ịdị nsọ ma bụrụ nke a raara nye Chineke, ka unu na-echere Ụbọchị nke Chineke. . . . Meenụ ihe nile unu pụrụ ime iji dị ọcha ma ghara inwe ntụpọ.”—2 Pita 3:11-14, Good News Bible.
26 Dị ka akụkụ nke “ihe ịrịba ama” ahụ, Jisọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ka anyị wee kere òkè nke kwesịrị ekwesị n’ozi ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmara ihe “alaeze” ahụ bụ na ihe mere o ji dị oké mkpa ugbu a ebe ọgwụgwụ dị nso. Ka anyị nyochaa nke a ugbu a.
Igbe dị na peeji nke 140]
“E buwo amụma dị iche iche banyere ọgwụgwụ ụwa eri oge ochie. . . . Otú ọ dị, taa e nwere ihe mgbaàmà jọgburu onwe ha ndị na-agaghị agabiga; ‘nsogbu nke ụmụ mmadụ’ ndị yiri ka ha enweghị ngwọta ọbụna site n’aka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kasị nwee amamihe; ìgwè ndị na-eme ka ndị ara n’ụwa nke nsí nuklia na mbibi nke mmadụ na-ebibi gburugburu ebe obibi ya a na-apụghị idochi edochi dị ka akịka si ebibi ihe.”—“The Spectator,” Ontario, Canada.
Igbe dị na peeji nke 147]
“Ọ dịtụbeghị mfe ịkọwa agha, Agha Ụwa Mbụ bụkwa ma eleghị anya nke kasị sie ike. E wezụga ihe ndekọ tọgbọ chakoo nke ịsọ mpi na njikọ aka dị iche iche nke ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme ji akọwa agha ahụ, e nwere echiche nke ihe dị ukwuu karị, echiche nke enweghị ezumike nke na-enye ụwa nsogbu. . . . Agha ahụ agafesịbeghị kpam kpam mgbe ụwa malitere ijikere maka ọzọ.”—Barry Renfrew nke Associated Press.
“Ihe omume ndị a malitere n’August 4, 1914 . . . bibiri ịdị n’usoro nke omume na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, tisasịa ezi nhazi nke ikike ná mba nile, weta ọrụ nke Europe dị ka ndị na-eme ka ihe na-akpọtụ n’ụwa ná ngwụsị, ma gbuo ọtụtụ iri nde ụmụ mmadụ ka ihe ndị ahụ na-eme. . . . na 1914 ụwa kwụsịrị inwe ihe njikọ bụ́ nke ọ na-enwebeghị ike inwetaghachi eri mgbe ahụ.”—London, “The Economist.”
Igbe dị na peeji nke 149]
ỌNWỤ N’IHI ALA ỌMA JIJIJI
(Atụmatụ nke dabeere na 1,122 afọ)
Ruo 1914—1,800 kwa afọ
Eri 1914—25,300 kwa afọ
[Foto dị na peeji nke 144]
N’iji ịdọ aka ná ntị Jisọs mee ihe, ndị Kraịst gbapụrụ na Jerusalem tupu ndị Rom ebibie ya