Isi 16
Ọchịchị nke Ga-eweta Udo Zuru Ụwa Ọnụ
1, 2. Ihe ndị dị aṅaa a na-achọsi ike ka ọchịchị mmadụ na-enwebeghị ike imezu?
ÈNWERE ọchịchị ọ bụla pụrụ iweta udo nke na-adịgide adịgide n’ụwa? nke pụrụ inye nchebe na nnwere onwe pụọ ná mpụ? nke pụrụ ime ka e nwee nri dị mma nye mmadụ dum n’ọ̀tụ̀tụ̀ bara ụba? nke pụrụ ime ka gburugburu ebe obibi dị ọcha ma merie ọrịa?
2 Tụlee ihe ndekọ nke mmadụ n’ihe banyere ọchịchị—ọchịchị ndị eze, ọchịchị ndị nke onye kwuo uche ya na ọchịchi socialist ma ọ bụ Kọmunist. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a ma ọ bụkwanụ ha nile ma e jikọọ ha ọnụ nke pụworo ime ezi ihe ndị ahụ a ka kpọtụsịrị uche; ha apụghị ime ha ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta, ma ya bụrụzie ime ya n’ụwa nile. Otú o sina dị, e nwere ihe mere ị ga-eji nwee olileanya.
CHINEKE NA-EZUBE OTU ỌCHỊCHỊ—ALAEZE AHỤ
3, 4. Olee otú anyị si mara na Chineke na-ezube ọchịchị nke ga-eweta udo?
3 Jehova Chineke n’onwe ya na-ekwe nkwa inye anyị ihe dị anyị mkpa. Olee otú anyị pụrụ isi jiri nke ahụ n’aka? Cheta na o zubere paradaịs zuru ụwa ọnụ na mbụ, bụ́ nke ndị mmadụ pụrụ inweta udo na obi ụtọ n’ime ya. (Jenesis 1:28; 2:8, 9) Mgbe ahụ e nwere nnupụisi n’ogige Iden. Ma ị̀ na-eche na Chineke ga-ekwe ka ihe e kere eke ndị na-enweghị ekele mebie nzube ya? Ọ dịghị ma ọlị. N’ezie, nwa oge mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi, Jehova buru amụma banyere onye nnapụta nke na-abịa, otu “mkpụrụ,” onye ga-azọpịa ndị na-egbochi udo n’eluigwe na n’elu ala. (Jenesis 3:15) Ị pụrụ iche, sị, ‘Ma ebee ka “ọchịchị” si bata na ya?’ “Mkpụrụ” ahụ ga-abụ Mesaịa ahụ, Onyeisi Udo, onye e nyere onye amụma bụ Aịsaịa ike mmụọ nsọ ide banyere ya, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla iba ụba nke ịbụ onyeisi ya na udo ya ga-agwụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-5.
4 Ee, nkwa Jehova bụ maka ịchịisi nke ga-eweta ikpe ziri ezi na udo. Bible na-akpọ ịchịisi nke a Alaeze Chineke. Ọtụtụ nde mmadụ ekpewo ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, . . . ka alaeze Gị bịa.” (Matiu 6:9, 10) Ọ bụrụ na i kpewo ekpere a, ị nọwo na-ekpe ekpere maka ọchịchị nke dị adị n’ezie—bụ́ Alaeze eluigwe ahụ—nke ga-eweta udo n’ụwa. (Abụ Ọma 72:1-8) Ma olee mgbe Chineke ga-eme ka ọchịchị ahụ banye n’ọrụ? Olee otú ọ ga-esi họrọ ndị ruru eru ịbụ ndị ọchịchị ya?
5, 6. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka Chineke weere n’iwepụta Alaeze ahụ?
5 Eri ọtụtụ narị afọ, nzube Chineke apụtawo ìhè. Dị ka ihe atụ, o gosiri na Mesaịa ahụ ga-abịa site n’Abraham, site na Jekọb, na ọ ga-esitekwa n’ebo Juda. (Jenesis 22:18; 49:10) Mgbe ahụ Jehova guzobere n’elu Israel otu alaeze nke bụ ihe atụ amụma nke ihe ndị na-abịa abịa. Israel bụ nke ọchịchị Chineke (ịchịisi Chineke). A sịrị na eze ha na-anọdụ n’elu “ocheeze Jehova.” (1 Ihe Emere 29:23) Jehova bụ onyeisi kachasịnụ; iwu na ụkpụrụ ya na-eduzi mba ahụ. Ka oge na-aga, Chineke gwara Eze Devid na a ga-esi n’ezinụlọ ya nwee onye ga-aghọ eze na-adịgide adịgide.—Abụ Ọma 89:20, 21, 29.
6 Ihe ndekọ ndị dị otú ahụ na ihe ọmụma ndị ọzọ nke Bible banyere akụkọ ihe mere eme nke Israel dị mkpa n’ihi na ha na-egosi anyị na Chineke na-atọ ezi ntọala kwesịrị ndabere maka Alaeze ahụ na-abịanụ. N’ikwekọ na nke a, Chineke mesịrị ziga otu mmụọ ozi gakwuru otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke sitere n’ezinụlọ Devid ịgwa ya, sị:
“[Ị ga-amụta] Nwa nwoke, kpọọ aha Ya Jisọs. Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu: Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: Ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.”—Luk 1:28-33.
7-10. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jisọs ga-abụ onye ọchịchị nke pụrụ iche?
7 Nke a bụ Mesaịa ahụ e buru n’amụma, onye Chineke kwere nkwa inye ịchịisi na-adịgide adịgide n’isi ihe a kpọrọ mmadụ. Gịnị ka anyị pụrụ ile anya ya n’aka Jisọs dị ka onye ọchịchị? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ihe ndekọ ya.
8 Jisọs etinyewo onwe ya mgbe nile n’ịsọpụrụ Chineke na ime uche Ya kpam kpam. (Ndị Hibru 10:9; Aịsaịa 11:3) Otu ụzọ o si gosi iguzosi ike n’ihe ya nye Chineke bụ site n’ịjụ aka azụ nke akụ̀ na ụba ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama, nke dị nnọọ iche n’ebe ọtụtụ ndị ọchịchị bụ mmadụ nọ. (Luk 4:5-8) Ọ tụghị egwu n’ijigide eziokwu ahụ, ya mere ọ laghị azụ n’ikpughe ihu abụọ nke okpukpe.—Jọn 2:13-17; Mak 7:1-13.
9 Kraịst nwekwara ịhụnanya pụrụ iche maka ihe a kpọrọ mmadụ, dị ka e gosipụtara ya n’eziokwu ahụ nke bụ na o nyere ndụ ya n’ihi anyị. (Jọn 13:34; 15:12, 13) N’ịbụ onye a kpaliri site n’obi ebere, Jisọs gwọrọ ndị ọrịa, kpọlite ndị nwụrụ anwụ ma nye ndị nọ ná mkpa nri. (Luk 7:11-15, 22; 9:11-17) O nwekwara ike n’ebe ikike ndị sitere n’okike dị ma jiri ya mee ihe n’ụzọ ga-abara ụmụ mmadụ uru. (Matiu 8:23-27) Ma ọ bụkwa onye a pụrụ ịkwado; ọbụna ụmụntakịrị tụsaara ahụ n’ebe nwoke a dị umeala n’obi nọ.—Matiu 11:28-30; 19:13-15.
10 Chee echiche banyere ngọzi nke inwe ya dị ka Onye Ọchịchị, ya na àgwà ọma na ikike ya nile! Nke ahụ bụ olileanya dị ebube ndị na-efe Jehova nwere.
ỊCHỊISI NKE SITERE N’ELUIGWE
11, 12. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị nwere iji mara na Jisọs agaghị anọ n’ụwa chịa ọchịchị?
11 Mgbe otu onye ọchịchị Rom jụrụ Jisọs banyere ọbụbụeze ya, ọ zaghachiri, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” (Jọn 18:36) Jisọs nọgidesiri ike n’iguzopụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba nile, na-esetịpụ ihe ilereanya maka ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 6:15; 2 Ndị Kọrint 5:20) Ọzọkwa, ọ bụghị nzube Chineke ka Ọkpara ya chịa site n’ebe dị n’ụwa. Ọ ga-achị site n’eluigwe, ebe ọ ga-enwe ikike ọchịchị karịrị nke mmadụ, nke zuru eluigwe na ala.
12 N’iburu olileanya ahụ n’uche, mgbe Jisọs nwụsịrị n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke, Nna ya kpọlitere ya gaa ná ndụ dị ka mmụọ e kere eke nke na-adịghị anwụ anwụ. (Ọrụ 10:39-43; 1 Ndị Kọrint 15:45) Kraịst bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya ma mesie ha obi ike na ya dị ndụ ma na-arụ ọrụ. Mgbe ahụ Jisọs rịgoro n’eluigwe. Banyere nke a, Pita onyeozi dere, sị: “Onye nọ n’aka nri nke Chineke, ebe Ọ gara baa n’eluigwe; e dowokwa ndị mmụọ ozi na ndị na-achị isi na ndị dị ike n’okpuru Ya.”—1 Pita 3:22; Matiu 28:18.
13-16. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere banyere mgbe Kraịst malitere ịchị n’isi ihe a kpọrọ mmadụ?
13 Malite n’oge ahụ, na 33 O.A., Kraịst malitere ịchị achị n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst dị, ndị na-eso ụzọ ya jikwa obi ụtọ nakwere ịbụ onyenwenụ na ọnọdụ ya n’eluigwe. (Ndị Kọlọsi 1:13, 14) Ma ọ bụghị nzube Chineke ka Jisọs malite ịchị ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ nakwa eluigwe na ala na mgbe ahụ.
14 Chineke nọ na-enye ụmụ mmadụ ohere ịhụ n’onwe ha mkpụrụ nile nke ọchịchị mmadụ. N’ihi nke a, ọ dị mkpa ka Kraịst chere ruo oge a kara aka maka ọchịchị Alaeze ahụ n’ụwa. Pọl onyeozi dere, sị: “Onye ahụ, mgbe O chererịị otu àjà n’ihu Chineke n’ihi mmehie, O wee nọdụ n’aka nri Chineke mgbe nile; na-ele anya n’oge fọdụrụ ruo mgbe a ga-edo ndị iro Ya dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ nke ụkwụ Ya abụọ.”—Ndị Hibru 10:12, 13.
15 Ma ọ bụrụ na Jisọs bụ onye a na-adịghị ahụ anya nke nọ n’eluigwe, olee otú anyị pụrụ isi mara mgbe oge ahụ ruru maka ya ịmalite ọchịchị? Dị ka a tụlere n’isiokwu bu ụzọ, Jisọs nyere “ihe ịrịba ama” anya pụrụ ịhụ ka ndị na-eso ụzọ ya n’elu ụwa nwee ike ịmara mgbe oge ahụ ruru. (Matiu 24:3-31) Agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, mkpagbu nke ndị Kraịst na nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa dum bụ́ nke anyị hụworo eri Agha Ụwa Mbụ (1914-1918) na-emesi ya ike na anyị na-ebi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Ihe omume ndị a na-egosikwa na Kraịst na-achị achị ugbu a n’eluigwe, n’ihi na mgbe ọ kọwasịrị banyere agha n’eluigwe megide Setan, Bible na-asị:
“Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst Ya. . . . N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:7-12.
16 N’ihi nke a, Jisọs Kraịst na-achị achị ugbu a. Nke a pụtara na ọ ga-abụ “nanị nwa oge” ruo mgbe ọ ga-eji ike ya mee ihe n’iwepụ ihe nile na-eguzogide Alaeze ahụ, na-agụnye Ekwensu na ọchịchị nile nke mmadụ guzobere. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ, anyị ga-enwe ike ịṅụrị ọṅụ n’ọchịchị Alaeze Chineke nke ga-eweta udo na-adịgide adịgide.
NDỊ GA-ESO CHỊA N’ALAEZE AHỤ
17, 18. Olee ndị ga-eso Jisọs chịa n’Alaeze ahụ?
17 E kpughere akụkụ ọzọ na-akpali akpali nke Alaeze ahụ na Bible. Daniel 7:13, 14 na-akọwara anyị ka Ọkpara Chineke na-anara “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” Mgbe ahụ ọhụụ ahụ na-asị:
“Alaeze ahụ, na ọchịchị ahụ, na ịdị ukwuu nke alaeze nile n’okpuru eluigwe nile, ka a ga-enye ndị ahụ, bụ́ ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu: alaeze Ya bụ alaeze ebighị ebi, ọchịchị nile ga-efekwa Ya, nụ olu Ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Daniel 7:27.
Ya mere Chineke zubere ka Jisọs Kraịst nwee ndị ga-eso ya chịa. Nke ahụ pụtara na mmadụ ụfọdụ ga-eje eluigwe. Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ọ malitere ịhọpụta ndị ikom na ndị inyom ịghọ ndị ga-eso ya chịa. Ọ sịrị na ya na-aga eluigwe ịga dozie ebe maka ndị a.—Jọn 14:1-3.
18 Nke a na-enye aka ime ka a ghọta ihe ọtụtụ ndị gaworo chọọchị ná ndụ ha nile na-adịghị aghọta: N’otu akụkụ, Bible na-egosi na Chineke zubere ka ụmụ mmadụ dị ndụ n’ụwa; ma, n’aka nke ọzọ, Bible na-ekwu banyere ụmụ mmadụ ije eluigwe. Olee otú nke a ga-esi mee? Chineke ekwewo nkwa ịkpọrọ mmadụ ụfọdụ gaa eluigwe isonyere Ọkpara ya n’ọchịchị Alaeze ahụ. Ma ụwa na-aga ịghọ paradaịs nke jupụtara n’ụmụ mmadụ nwere obi ụtọ, ndị udo.—Lee Abụ Ọma 37:29; Aịsaịa 65:17, 20-25.
19-22. Mmadụ ole ga-eje eluigwe, n’ihi gịnịkwa ka ọ na-ejighị bụrụ ihe nile a kpọrọ mmadụ?
19 Mmadụ ole ga-eje eluigwe dị ka akụkụ nke ọchịchị Alaeze ahụ? Jisọs nyere ihe ngosi, na-asị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze Ya.” (Luk 12:32, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ọnụ ọgụgụ ahụ bụ nke a kpaara ókè. Mkpughe na-egosi na ndị “a gbatara n’etiti mmadụ” iso “Nwa atụrụ ahụ” (Jisọs Kraịst) chịa dị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 14:1-5) Nke ahụ esighị ike ịghọta. Ọbụna ọchịchị ụfọdụ nke mmadụ nwere ndị ikom na ndị inyom a họpụtara ahọpụta bụ́ ndị na-aga n’isi obodo dị ka akụkụ nke ọchịchị ahụ.
20 Ma Chineke ahapụghị ya n’aka ụmụ mmadụ ikpebi onye ga-aga eluigwe. Ọ na-ahọpụta ha. (1 Pita 2:4, 5, 9; Ndị Rom 8:28-30; 9:16) Mgbe Chineke họọrọ Pọl onyeozi, ọ wụsara mmụọ ya n’ahụ ya, na-emesi Pọl obi ike na ọ ga-abụ akụkụ nke “alaeze eluigwe” ahụ. (2 Timoti 4:18) Pọl dere, sị: “Mmụọ Nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ.”—Ndị Rom 8:16, 17; 2 Ndị Kọrint 1:22; 5:5.
21 Ọnụ ọgụgụ dị nta n’etiti ndị na-efe Chineke abụwo nke a họọrọ maka ndụ eluigwe, ebe nzube Chineke bụ ka ụmụ mmadụ biri n’obi ụtọ n’elu ala. Jisọs bụ onye mbụ e weere gaa eluigwe. (Ndị Hibru 6:19, 20; Matiu 11:11) Mgbe nke ahụ gasịrị Chineke nọgidere na-ahọrọ 144,000 mmadụ ọzọ. Gịnị ga-eme mgbe ọnụ ọgụgụ ahụ zuru?
22 Mgbe e nyesịrị ya ọhụụ nke ọnụ ọgụgụ ahụ a kpaara ókè (144,000) n’eluigwe ka ha na Kraịst nọ, e gosiri Jọn onyeozi “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ.” (Mkpughe 7:4, 9, 10) Chineke ga-echebe ndị a pụọ ná mbibi nke ga-eweta usoro ihe dị ugbu a ná njedebe. Ha nwere olileanya dị ebube nke ndụ ebighị ebi n’elu ala, bụ́ otu olileanya ahụ nke ndị ikom ahụ nwere okwukwe dị ka Noa, Abraham na Devid nwere, bụ́ ndị nwụrụ tupu Chineke emeghee ụzọ maka ndụ eluigwe nye 144,000 ahụ.—Ọrụ 2:34.
IHE NDỊ MERE A GA-EJI NWEE OBI IKE N’EBE NDỊ ỌCHỊCHỊ AHỤ NỌ
23, 24. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị nwere iji nwee obi ike ná ndị a ga-eso chịa?
23 Taa, ihe ka ukwuu n’ụmụ mmadụ nwere ntụkwasị obi dị nta n’ebe ndị ọchịchị ha nọ. Otú ọ dị, ndị ga-achị n’Alaeze Chineke dị nnọọ iche pụọ ná ndị ọchịchị nke ụwa. Eri ọtụtụ narị afọ, Chineke ahọrọwo ndị gosipụtara okwukwe ha. N’okpuru ụdị ule na ọnwụnwa nile, ha anọgidesiwo ike n’ihe ziri ezi. Ha enwetawo obi ike nke Chineke, ya mere ọ̀ bụ na anyị agaghị enwe obi ike n’ebe ha nọ?
24 Ọzọ, ebe ha bụtụworo mmadụ, ọ ga-enyere ha aka ịghọta ma nwee obi ebere n’ebe anyị nọ. (Tụlee Ndị Hibru 4:15, 16.) Ha maara ihe inwe ike ọgwụgwụ, nchegbu, na nkụda obi pụtara. Ha maara mgbalị inwe ndidi, obi ọma na inwe obi ebere karị na-ewe. Ụfọdụ n’ime ha bụkwa ndị inyom; ha ghọtara mmetụta na mkpa ndị pụrụ iche nke ndị inyom n’elu ala.—Ndị Galetia 3:28.
25-27. Olee otú anyị pụrụ isi gosi nkwado anyị maka Alaeze ahụ?
25 Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova taa na-egosipụta obi ike ha n’ebe Kraịst na ndị ga-eso ya chịa nọ ma na-egosipụta otú Alaeze ahụ si bụrụ ihe dị adị n’ezie nye ha. Ha na-eme nke a site n’ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nọ n’okpuru Alaeze Chineke. (Ilu 14:28) Ha na-anabata ma na-agwa ndị ọzọ banyere iwu ya ndị e dere na Bible, na-ekwere n’ezie na Iso Ụzọ Kraịst bụ ụzọ ndụ kachasị mma. Ha na-ekere òkè n’usoro izi ihe nke ọchịchị a. Bible bụ akwụkwọ ọgụgụ bụ isi, ha na-eji ya na akwụkwọ nkọwa ndị Kraịst na ndị na-enye aka n’ọmụmụ ihe na-eme ihe. Ná nzukọ ọgbakọ, ha na-amụtakwu ihe banyere Alaeze ahụ na ibi ndụ ndị Kraịst. Ha na-ewegakwara ndị ọzọ usoro izi ihe ahụ site n’izi ihe n’ihu ọha na n’ebe obibi dị iche iche.—Ọrụ 20:20.
26 Jisọs sịrị na otu akụkụ nke ihe ịrịba ama nke “mgbe ikpeazụ” ga-abụ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Tupu Jisọs arịgoo n’eluigwe, o mesiri mkpa ọ dị ike ka ndị na-eso ụzọ ya kere òkè dị ukwuu n’ọrụ nkwusa nke a.—Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8.
27 Ndị Kraịst taa matara na ikere òkè n’ọrụ nkwusa na izi ihe nke a bụ ụzọ dị mkpa ha pụrụ isi gosipụta ịhụnanya ha maka Chineke nakwa maka ndị agbata obi ha. (Mak 12:28-31) O metụtara ndụ, ya mere ọ bụ ibu ọrụ dị mkpa. (Ọrụ 20:26, 27; 1 Ndị Kọrint 9:16) Ọ bụkwa isi iyi nke obi ụtọ na afọ ojuju dị ukwuu. (Ọrụ 20:35) Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịkụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke nke na-achị achị.
Igbe dị na peeji nke 151]
“Ọdịda a dara n’imepụta ezi ihe mgbakwasị ụkwụ maka udo ụwa . . . bụ nke a pụrụ ịsị na ihe kpatara ya kpọmkwem bụ ọjụjụ mba dị iche iche, karịsịa mba ndị buru ibu karị, jụrụ ịnabata ike ọchịchị nke pụrụ ịgwa ha ihe ha ga-eme n’ọnọdụ metụtara mba nile.
“Mgbe ahụ, nke a bụ ihe ịma aka bụ isi e nwere taa—otú a ga-esi mepụta ike ọchịchị ụwa nke ga-ejigide udo, bụ́ nke ndị bi n’ụwa ga-enwe obi ike na ya.”—Editọ Norman Cousins, “Saturday Review.”
Igbe dị na peeji nke 159]
INWE ECHICHE ZIRI EZI BANYERE ỌCHỊCHỊ
“Ngwá agha anyị na mbụ bụ mkpirisi osisi nkịtị, mkpirisi osisi ndị e tere opu, chen na égbè,” ka Stelvio, bụ́ onye keere òkè dị ukwuu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ebe ndịda Europe n’afọ ndị 1970 na-akọ. N’ogige ebe nzuzo ndị dị ka nke ndị agha, ọ mụtawo otú e si ahazi òtù ndị na-eme ihe ike ma na-alụ agha ime obodo.
Ma mgbe afọ ole na ole gasịrị, e nwere mgbanwe. Otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ Stelvio, na-akụzi Bible. Olee mmetụta o nwere? “O meghere anya m ịhụ na ịhụ mba n’anya na ịrọ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekewa ụmụ mmadụ. Amụtara m site na Bible na Chineke sitere n’otu onye kee mba nile nke mmadụ, ka ha biri n’elu ala. (Ọrụ 17:26) Ịmụta nke a bụ ikike nke na-eme ka ihe dị n’otu. O mere ka m nwere onwe m pụọ n’ịkpọ ndị ọzọ asị nanị n’ihi na echiche ha banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche.”
Onye a na-eme ihe ike na mbụ kwukwara, sị: “Anọgidere m na-ajụ onwe m, sị: Olee otú mmadụ pụrụ isi mesịa si na ndọrọ ndọrọ ọchịchị gwọta nsogbu ya dị iche iche, ebe ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’onwe ya akpatawo nkewa nke ihe a kpọrọ mmadụ? Ka ụmụ mmadụ wee zukọta n’otu, ihe ndị na-akpata nkewa aghaghị ịpụ n’anya. Ahụwo m n’etiti Ndịàmà Jehova ka ha na-eme ndị isi ojii na ndị ọcha baptism n’otu mmiri, ndị bụbu ndị Protestant na ndị Katọlik na Ireland kwụsịrị ịkpọ ibe ha asị, ndị Arab na ndị Juu na-ezukọ n’otu n’oge Agha Ụbọchị Isii ahụ. Amụtawo m ịhụ ndị ahụ n’anya, bụ́ ndị m kpọrọ asị na mbụ.
“Ọ dịghị onye pụrụ ịsị na Alaeze Chineke, bụ́ nke Ndịàmà Jehova na-achọsi ike, bụ nanị nrọ nke aka na-apụghị iru, n’ihi na e nweworị òtù nke mba nile e jikọrọ ọnụ n’okpuru Alaeze ahụ. Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ewetawo ihe ndị ọ na-adịbeghị òtù okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọha na eze ọ bụla nke nwetaworo ya.
“Nye ndị na-agbalịsi ike, dị ka mụ onwe m na mbụ, iweta ikpe ziri ezi, udo na ịga n’usoro nke ọha na eze, ana m asị: ‘Nwee echiche ziri ezi ma kweta na mmadụ enwebeghị ike iweta ha. Otú ọ dị, lega anya n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ọ̀ bụ na ha emeribeghị nsogbu ndị metụtara agha, nkewa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịkpa ókè agbụrụ, udo na ịdị n’otu? Ụmụ mmadụ na-atụkwasị ụmụ mmadụ obi ma na-enwe nsogbu. Ndịàmà Jehova na-edo onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke ma gwọta nsogbu ndị bụ isi nke ndụ.’”