Isi 19
Ị̀ Ga-efe Chineke n’Ụzọ nke YA?
1-4. Ònye nọ n’ọnọdụ mbụ nye ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ, n’ihi gịnịkwa ka amamihe na-ejighị dị na nke ahụ?
NA “MGBE ikpeazụ,” ka Bible na-ebu n’amụma, mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.” (2 Timoti 3:1-5) Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị akọwa nke ọma ihe anyị na-ahụ na gburugburu anyị taa?
2 Ee, n’ọnọdụ nile nke ndụ, ụmụ mmadụ na-eme ihe n’ụzọ nke ịsị, “Nke m-godi”—omume ha mgbe ha na-azụ ahịa ma ọ bụ na-akwọ ụgbọ ala, echiche nke ha na-etinye n’uwe oyiyi na ihe e ji achọ mma, na ụdị egwú ha na-agba. Ma ihe ndị a nile ewetabeghị ezi obi ụtọ.
3 Ọbụna na ọtụtụ ndị na-ele okpukpe anya n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha chọrọ ma ọ bụ chee na ọ dị ha mkpa. Lee aha mmehie ihe nke ahụ bụ! Ọ bụghị anyị ka ọ dịịrị ikwu otú e kwesịrị isi fee Chineke. Dị ka Onye Okike na Onye Na-enye Ndụ, Jehova bụ onye ga-ekwu otú a ga-esi fee ya ofufe. (Ndị Rom 9:20, 21) Ihe ọ chọkwara n’aka anyị bụ maka ọdịmma anyị. Ọ na-eweta afọ ojuju ugbu a ma na-eme ka uche na obi anyị dịgidesie ike n’ihe ndị ahụ dị ebube ọ kpadoro maka anyị n’ọdịnihu.—Aịsaịa 48:17.
4 Jehova adịghị eji ememe ndị na-enweghị isi na-ebogbu ndị Kraịst ma ọ bụ na-enye ihe mgbochi ndị na-abaghị uru. Ma Chineke maara na ịnọgide na-adị ndụ dabeere n’ezi mmekọrịta n’ebe ọ nọ, nke ahụkwa dị anyị mkpa iji dị ndụ dị ka ụkpụrụ ya nile si dị na igosi mmetụta maka ndị ọzọ ka anyị wee nweta ezi ọṅụ ná ndụ. Mgbe anyị fere Chineke n’ụzọ o si chọọ, ndụ na-adị mma karị ma nwee nzube.
IME IHE N’ỤZỌ NKE CHINEKE
5, 6. Olee otú Noa na Abraham si dị iche n’ebe ọtụtụ ndị taa nọ?
5 Noa bụ ezi ihe ilereanya nke onye mere ihe n’ụzọ Chineke. Bible na-asị: “Noa bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile: Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” Mgbe Chineke gwasịrị ya ka o wuo ụgbọ a ga-eji chebe ndụ, “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:9, 22) Ime ihe n’ụzọ Chineke chebere ndụ Noa, tinyekwara ndụ ezinụlọ ya, bụ́ ndị rapagidesiri ike n’ebe ọ nọ dị ka onye amụma Chineke n’ụwa.—2 Pita 2:5.
6 Onye ọzọ nke gbasoro ụzọ Chineke bụ Abraham. Chineke gwara ya ka ọ hapụ ala nke aka ya. Ị̀ gaara erube isi? Abraham wee “jee dị ka Jehova gwara ya,” ọ bụ ezie na ‘ọ maghị ebe ọ na-eje.’ (Jenesis 12:4; Ndị Hibru 11:8) N’ihi iji okwukwe na-eme ihe n’ụzọ Chineke, a gụrụ Abraham dị ka “enyi Chineke.”—Jemes 2:23; Ndị Rom 4:11.
ISO N’ETITI NDỊ CHINEKE
7-9. N’oge Israel oge ochie, olee otú Chineke si mesoo ụmụ mmadụ?
7 Ka oge na-aga, Chineke họọrọ isoro otu ìgwè bara ụba mekọọ ihe, bụ́ mba Israel. Ha ghọrọ ‘ndị ya, bụ́ ndị ọ họpụtaworo ịbụrụ ya ihe nke aka ya, karịa ndị nile nọ n’elu ala.’ (Deuterọnọmi 14:2) Otú ọ dị, ọ dị onye Israel ọ bụla mkpa ikpegara Chineke ekpere ma soro ya nwee mmekọrịta onwe onye chiri anya. Ma ha aghaghịkwa ịmata na Chineke na-eduzi otu ọgbakọ; ha aghaghị ịgbaso ụdị ofufe nke e depụtara n’iwu Chineke maka ha dị ka otu ndị. Otú a, ha pụrụ inweta nchebe na ngọzi Chineke nyere maka ọgbakọ ahụ. (Deuterọnọmi 28:9-14) Cheedị echiche banyere ihe ùgwù ọ bụ ịbụ akụkụ nke ndị Onye Pụrụ Ime Ihe Nile kpọrọ “ndị m, bụ́ Israel.”—2 Samuel 7:8.
8 Olee banyere ndị na-abụghị ndị Israel, bụ́ ndị chọrọ ife ezi Chineke ahụ? Ndị dị otú ahụ mejupụtara “ndị gwara ọgwa” bụ́ ndị họọrọ isoro ndị Israel mgbe Mosis duuru mba ahụ pụọ n’Ijipt. (Ọpụpụ 12:38) A sị na ị nọ n’Ijipt, ị̀ gaara eche na ị pụrụ ịnọrọ ma fee Chineke nanị gị n’ụzọ nke gị?
9 Ọbụna mgbe Israel biri n’Ala Nkwa ahụ, ndị ala ọzọ matara Jehova ma chọọ ife ya ofufe pụrụ ime otú ahụ. Otú ọ dị, ha aghaghị ịmata na Chineke so otu ndị e jikọrọ n’otu na-emekọ ihe, nakwa na ebe bụ isi nke ofufe Ya bụ n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem. (1 Ndị Eze 8:41-43; Ọnụ Ọgụgụ 9:14) Chineke agaghị anabata ndị mmadụ ma ọ bụru na ha na-ekwe ka mpako ma ọ bụ ịdabere n’onwe onye kpalie ha ịhọpụta ụzọ nke ha ga-esi na-efe ofufe.
MGBANWE N’ỌGBAKỌ
10-12. Mgbanwe dị aṅaa ka Chineke mere n’ụzọ o si eme ihe?
10 Mgbe Jisọs banyere n’ozi ya n’ụwa, Chineke ka so ndị Israel na-emekọ ihe dị ka otu ndị a raara nye ya. Ya mere ọ dịghị mkpa na onye ọ bụla nabatara Mesaịa ga-esoro Jisọs zukọọ mgbe mgbe ma soro ya mee njem dị ka ndị ozi ahụ mere. (Mak 5:18-20; 9:38-40) Ma mba ahụ n’ozuzu ya jụrụ Mesaịa Jehova, bụ́ nke kpaliri Jisọs ikwu nwa oge tupu ọ nwụọ, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke ma nye ya ndị ga-amịpụta mkpụrụ ya.”—Matiu 21:43, Jerusalem Bible.
11 Olee ndị ga-abụ ndị ọhụrụ nke a, ozugbo a na-achọkwaghị ụzọ ofufe nke e setịpụru n’iwu Chineke nye Israel? (Ndị Kọlọsi 2:13, 14; Ndị Galetia 3:24, 25) N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., a malitere ọgbakọ ndị Kraịst, Chineke mekwara ka o doo ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-ahụ ihe na-emenụ anya na ọ bụ ya na-eme nke a. (Ọrụ 2:1-4, 43-47; Ndị Hibru 2:2-4) Nke mbụ, ndị Juu na ndị ala ọzọ bụ́ ndị nakweere okpukpe ndị Juu, nakwa mgbe e mesịrị, ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị mba ọzọ, ghọọrọ “aha ya otu ndị.” Ugbu a Chineke na-ele ha anya ịbụ “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.”—Ọrụ 15:14-18; 1 Pita 2:9, 10.
12 Ọ bụrụ na ị dịrị ndụ na mgbe ahụ ma chọọ mmekọrịta gị na Chineke, a gaara eduru gị gaa n’ọgbakọ ndị Kraịst. Otú a ka o mere n’ọnọdụ onye Itali ahụ bụ Kọniliọs na ezinụlọ ya. (Ọrụ 10:1-48) Ndị kwere ekwe n’ụwa nile mejupụtara ọgbakọ ndị Kraịst. (1 Pita 5:9) Ọgbakọ dị n’ógbè nile, bụ́ ndị na-ezukọ n’ebe obibi dị iche iche ma ọ bụ n’ụlọ ọha na eze, bụ akụkụ nke otu ọgbakọ nke a Chineke ji na-eme ihe ugbu a.—Ọrụ 15:41; Ndị Rom 16:5.
13-15. Olee otú Chineke si hazie ma duzie ndị Kraịst?
13 N’ihi ịbụ Chineke nke na-eme ihe n’usoro, Jehova dokwara ókè ụfọdụ nke nhazi n’ọgbakọ ndị ahụ. Iji nye ndị ahụ na-efe ofufe n’otu n’otu nlekọta dị mkpa, ọ họpụtara ndị ikom ka ha jee ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ma ọ bụ ndị nlekọta. Ha bụ ndị ikom nwere ahụmahụ, ndị ruru eru bụ́ ndị pụrụ ịkụzi Okwu Chineke ma zụọ ndị òtù nke ọgbakọ ahụ isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible, inye aka n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ikwusa “ozi ọma.”—2 Timoti 2:1, 2; Ndị Efesọs 4:11-15; Matiu 24:14; Ọrụ 20:28.
14 N’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọkwa, ọgbakọ ndị a ga-erite uru site n’aka ndị nlekọta a. Ha agaghị eme ihe n’ụdị nke ikwekọ n’usoro nkà mmụta iwu ma ọ bụ mmegbu. Kama nke ahụ, ọrụ ha bụ iji ịhụnanya nyere ndị Kraịst ibe ha aka iwusiwanye mmekọrịta ha na Chineke ike. (Ọrụ 14:21-23; 1 Pita 5:2, 3) Onye ọ bụla nke nwere nsogbu pụrụ ịgakwuru ndị ikom a meworo okenye n’ụzọ ime mmụọ maka enyemaka obi ọma, nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ. (Jemes 5:13-16; Aịsaịa 32:1, 2) N’ihi na ndị Kraịst ka bụ ndị na-ezughị okè, mgbe ụfọdụ nsogbu pụrụ ibilite n’ime ọgbakọ. Ndị nlekọta ahụ gaje ịmụ anya inyere ndị Kraịst ibe ha aka ma nọrọkwa na nche megide onye ọ bụla nke pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ n’ihe ize ndụ.—Ndị Filipaị 4:2, 3; 2 Timoti 4:2-5.
15 Ọgbakọ ndị ahụ nwetara nduzi dị ha mkpa site n’aka òtù na-achị isi nke ndị Kraịst nke ndị ozi na ndị ikom meworo okenye n’ọgbakọ dị na Jerusalem mejupụtara. Ha lebara anya ma zaa ajụjụ ndị e zitere site n’ọgbakọ dị iche iche. Òtù na-achị isi ahụ zipụkwara ndị nnọchianya ka ha gaa leta ọgbakọ dị iche iche.—Ọrụ 15:1-3.
16. Gịnị ka ụzọ Chineke si emeso ndị Kraịst kwesịrị ịpụta nye gị?
16 Jehova Chineke ka nọgidere na-emeso ndị ya dị ka òtù e jikọrọ ọnụ. N’ụwa nile, e nwere ọtụtụ puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na ị chọrọ isoro ụzọ e si efe Chineke ofufe dị n’otu, nara agbamume ya bụ́ isoro ndị Kraịst ibe gị zukọọ:
“Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, . . . kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.”—Ndị Hibru 10:24, 25.
IFE CHINEKE OFUFE SITE NÁ MKPỤRỤ OBI DUM
17-19. Ịhụnanya maka Chineke kwesịrị ịkpali anyị ime gịnị?
17 Ọ dị mma ịtụgharị uche n’ihe nile Jehova Chineke mewooro gị. Site n’aka ya i nwere ndụ na ihe dị iche iche iji jigide ndụ gị kwa ụbọchị. Tụkwasị na nke ahụ, Chineke zitere Ọkpara ya n’ụwa ịnwụ dị ka àjà. Nke ahụ bụ ngosipụta nke ịhụnanya dị omimi nke Chineke, bụ́ ịhụnanya nke e ji n’aka na nke na-adịgide adịgide. (Ndị Rom 5:8; 8:32, 38, 39) N’ụzọ dị otú ahụ Chineke mere ka o kwe gị omume inweta mgbaghara mmehie nakwa olileanya nke ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ.—Jọn 3:17; 17:3.
18 Olee otú anyị ga-esi zaghachi n’ịhụnanya ya? N’ezie, anyị ekwesịghị ịgbakụta Chineke na ịhụnanya ya azụ. Pita onyeozi gbara ume, sị:
“Ya mere chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee . . . bịa.”—Ọrụ 3:19.
19 Ọ dị anyị nile mkpa ‘ichegharị,’ n’ihi na anyị nile emehiewo, wee ghara iru ụkpụrụ nile nke Chineke n’omume, okwu na echiche anyị. (Ndị Rom 2:4; 7:14-21; Jemes 3:2) Anyị ichegharị pụtara ikweta na anyị bụ ndị mmehie ma kwaa ụta n’ihi ọdịda anyị daworo n’ịdị ndụ kpọmkwem n’ụzọ kwekọrọ n’uche Jehova. Ọ̀ bụ otú ahụ ka o si emetụta gị? Ọzọ, ọ dị anyị mkpa ‘ichigharị,’ ịgbanwe ụzọ ndụ anyị, si ugbu a gaa n’ihu na-agbalị igosipụta àgwà nile nke Jehova na ime ihe n’ụzọ nke ya. Site n’ime nke ahụ, anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi na Chineke ga-agbaghara ma nabata anyị.—Abụ Ọma 103:8-14; 2 Pita 3:9.
20, 21. N’ihi gịnị ka baptism ji bụrụ nzọụkwụ dị mkpa, gịnịkwa ka ọ na-anọchi anya ya?
20 Ịmata na Jisọs guzobere ihe ilereanya ka anyị wee nwee ike ịgbaso ijeụkwụ ya n’ife Chineke ofufe, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike iṅomi ihe ilereanya ya. (1 Pita 2:21) Ndị Hibru 10:7 na-agwa anyị na omume Jisọs bụ: “Lee abịawo m . . . ime ihe ị na-achọ, Chineke.” N’ụzọ yiri nke ahụ, ịhụnanya na ekele anyị maka Chineke kwesịrị ịkpali anyị ịrara ndụ anyị nye ya, ime ihe ọ na-achọ site ná mkpụrụ obi anyị dum. N’ezie, anyị ka ga-anọgide na-eri nri, na-ehi ụra, na-elekọta ma na-ahụ ezinụlọ anyị n’anya, na-enweta ọṅụ n’inwe ntụsara ahụ nke na-atọ ụtọ nakwa ikere òkè n’ụzọ ndị ọzọ n’ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ. Ma ịrara ndụ anyị nye Chineke pụtara na uche ya na ofufe ya kwesịrị ịdị mkpa n’ụzọ bụ isi, nakwa na, n’agbanyeghị ebe anyị nọ ma ọ bụ ihe anyị na-eme, anyị ga-agbalịsi ike itinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ na ịgbaso ihe ilereanya Jisọs setịpụrụ.—Ndị Kọlọsi 3:23, 24.
21 Akwụkwọ Nsọ na-eme ka o doo anya na onye raara ndụ ya nye Chineke kwesịrị igosipụta nke a n’ihu ọha site n’ime baptism. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị:
“Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Matiu 28:19, 20.
Ọ bụrụ na ndị a ga-eme baptism ga-amụ Okwu Chineke ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, mgbe ahụ n’ụzọ doro anya ha abụghị nnọọ ụmụ ọhụrụ. Ọzọ, baptism ha, n’igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke, bụ site n’imikpu ná mmiri kpam kpam, dị ka e mere Jisọs baptism n’Osimiri Jọdan.—Mak 1:9-11; Ọrụ 8:36-39.
22-24. Ị̀ rarawo ndụ gị nye Chineke, ị̀ chọkwara ka e mee gị baptism? Gịnị ka nke a ga-apụtara gị?
22 Gị ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst nke e mere baptism ga-etinye gị n’ọnọdụ maka ndụ obi ụtọ zuru ezu nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ọ bụghị ndụ e ji usoro na-adịghị agwụ agwụ nke mee nke a emela nke a na-achị. Kama nke ahụ, ọ bụ ndụ nke uto na-enye afọ ojuju. Ị pụrụ ịnọgide mgbe nile na-enwe ọganihu n’ụzọ i si ele ihe anya n’ụzọ ime mmụọ na ụzọ i si etinye Okwu Chineke n’ọrụ, nke a na-eweta gị nso mgbe nile n’ihe nlereanya nke Jisọs setịpụrụ.—Ndị Filipaị 1:9-11; Ndị Efesọs 1:15-19.
23 Nke a ga-emetụta echiche na omume gị kwa ụbọchị. Ka ị na-agbaso ụzọ ndị Kraịst, obi ike gị ga-adịwanye omimi na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-ebibi mmebi iwu nile, na-emeghe ụzọ maka ‘eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ha.’ Nke a kwa ga-amụbawanye mkpali gị ịzụlite ọdịdị ndị Kraịst ma gbasoo ụzọ ndụ nke ga-eme ka i nwee ohere ịbanye n’usoro ihe ọhụrụ ahụ na-abịanụ. (Ndị Efesọs 4:17, 22-24) E nyere Pita onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị:
“Cheenụ echiche banyere ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ, ụdị ndụ nke ofufe na nraranye unu kwesịrị ibi! Ebe unu nwere [usoro ihe ọhụrụ] nke a nke unu ga-ele anya ya, meenụ ihe nile unu pụrụ ime ka unu bụrụ ndị a chọtara n’udo n’ebe ọ nọ, ghara inwe ntụpọ na ịta ụta ọ bụla n’ihu ya.”—2 Pita 3:11, 14, New English Bible.
24 Lee aha ngọzi ọ na-abụ mgbe ndụ mmadụ n’ozuzu ya na-egosipụta eziokwu ahụ bụ na ọ na-efe Jehova Chineke! Ọ bụ eziokwu na taa ọtụtụ ndị na-adị ndụ nanị ime ihe ga-atọ onwe ha ụtọ na iji ọchịchọ onwe onye nanị nweta ihe ụtọ nile ha pụrụ inweta, ị pụrụ ịdị ndụ ma fee ezi Chineke ahụ ofufe n’ụzọ nke ya. Nke a bụ ụzọ ndụ nke kachasị mma.