Isi nke 2
Ihe Iseokwu Ndị Na-ekpebi Ọdịnihu Anyị
1. (a) Ihe iseokwu ndị dị aṅaa na-echegbu ọtụtụ mmadụ n’oge a, oleekwa ebe ha si na-ele anya ngwọta? (b) Gịnị ka ha na-elefurukarị anya ịtụle?
N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya, e bokwasịwo anyị ọtụtụ ihe iseokwu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ ndị metụtara ọdịnihu anyị. Ọnọdụ jọrọ oké njọ otú a nke na ụmụ mmadụ n’ebe nile na-achọsi nnapụta ike. Eleghị anya ha kweere na Chineke, ma ọ pụrụ ịdị ha ka a sị na ọnọdụ n’elu ala ebe a ga-adị mma kara, na ọ bụ ụmụ mmadụ ga-eme nke ahụ. Ụfọdụ na-agbalị ime ya site n’ọchichị ndị dị adị ma ọ bụ site ná mkpu ìgwè mmadụ na-eti megide mkpebi dị iche iche nke ọchịchị ndị a. Ndị ọzọ kwere na mgbanwe ọchịchị bụ nanị ụzọ dịnụ. Ha na-eche na ịgbanwe iwu, ịgbanwe ndị na-achị achị ma ọ bụ ọbụna ọchịchị dị iche iche kpam kpam ga-emerịrị ka ọnọdụ dị mma kara. Ma gịnị ka ihe ndị mere eme gosiri? Ka ha gbalịsịrị ruo ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ ewepụtabeghị ọbụna otu ọchịchị nke wetarala ikpe ziri ezi, ezi ntụkwasị obi na obi ụtọ na-adịte anya nye ndị nile ọ na-achị. Gịnị kpatara nke a?
2. N’ihi gịnị ka ọnọdụ dị n’uwa ji dị oké njọ otú a?
2 N’agbanyeghị otú nzube nile nke ndị nọ n’ọchịchị si magbuo onwe ha ná mma, ihe na-akwagharị ọchịchị dị iche iche karịrị ike ndị na-achị achị. Olee ndị na-enugharị ha? Ọ bụ ndị mmụọ ka mmadụ ike. Setan bụ Ekwensu na ndị ajọ mmụọ ya. N’eziokwu, Ọtụtụ mmadụ na-akwa emo banyere nkweta ná ndị mmụọ ọjọọ dị otú ahụ. Ma Jisọs emeghị otú ahụ. Ọ matara n’onwe ya mmalite nke Setan, kwuokwa banyere ya dị ka “onyeisi ụwa nke a.” (Jọn 12:31) N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, Bible kọwara usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị zuru ụwa ọnụ dị ka anụ ọhịa, kpugheekwa na “dragọn ahụ [bụ Setan nyere] ya [anụ ọhịa ahụ] ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchị isi.” (Mkpughe 13:1, 2; tụlee Daniel 7:2-8, 12, 23-26.) Banyekwara oge anyị a, Bible buru amụma mmụba nke “ahụhụ [nye] ụwa . . . n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu.” (Mkpughe 12:12) Ọ dịghị ihe ọzọ nke ọ pụrụ ịbụ ya n’ezie kpatara ọgba aghara nke e nubaworo ọha ụmụ mmadụ n’ime ya. Ma olee otú o si mee? Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nweta nnapụta.
IHE ISEOKWU NKE ỊBỤ ỌKAAKA
3. Gịnị ka Jenesis 2:16, 17 gosiri banyere ọnọdụ mmadụ kwesịrị inwe n’ebe Chineke nọ?
3 Isiakwụkwọ ndị mbụ nke Bible na-agwa anyị na mgbe Jehova kere mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ Adam na Iv, wee tinye ha n’ubi Iden, o ziri ha ihe banyere ọnọdụ ha nwere n’ebe ọ nọ. Ọ bụ Nna ha, Onye na-egbo mkpa ha n’afọ ofufo, nakwa Ọkaaka nke eluigwe na ala. Maka ọdịmma nke ha, ọ dị ha mkpa ịghọta na ndịgide nke ndụ ha dabeere n’irubere Chineke isi.—Jenesis 2:16, 17; tụlee Ọrụ 17: 24, 25.
4. (a) Ebee ka Setan si bịa? (b) Ọchịchọ ọjọọ dị aṅaa ka o kwere ka o tolite?
4 N’oge ahụ ihe nile e kere eke zuru okè. N’adịghị ka ụmụ anụmanụ, ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ nwere ikike nke ikpebi ihe ha ga-eme. Ma n’oge na-adịghị anya ka okike mmadụ gasirị, otu n’ime ndị mmụọ ozi, n’iji ike ahụ dị ịtụnanya nke ime mkpebi onwe onye mee ihe na-ezighị ezi, nupụrụ isi megide ịchị isi Jehova. O si otú a mee onwe ya onyeiro, ma ọ bụ onye nguzogide, nke bụ n’ụzọ nkịtị ihe aha ahụ bụ Setan pụtara. (Tụlee Jemes 1:14, 15; Mkpughe 12:9.) N’ịbụ onye oké ọchịchọ kpaliri, Setan chọrọ ụzọ ịrafu mmadụ abụọ mbụ ahụ pụọ n’ebe Jehova Chineke nọ, wee webata ha n’okpuru nduzi nke ya onwe ya. Ọ hụrụ n’ime ha na o kwere omume inwe ụwa nke ụmụ mmadụ ndị na-asọpụrụ ya dị ka chi ha jupụtara. (Tụlee Aịsaịa 14: 12-14; Luk 4:5-7.) Akụkọ nke ihe mere n’Iden abụghị akụkọ ifo efu. Jisọs zoro ya aka dị ka akụkọ ihe mere eme bụ eziokwu.—Matiu 19:4, 5.
5. (a) Ihe iseokwu ndị dị aṅaa ka e welitere n’Iden? (b) Òle ndị ka ha metụtara?
5 Jisọs kwuru banyere Ekwensu, sị: “O guzoghịkwa n’ezi- okwu . . . ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44) Ụgha mbụ nke Ekwensu e dekọrọ edekọ bụ gwa Iv, mgbe ọ rụrụ ụka banyere ịbụ onye eziokwu nke Chineke. Ọ gbara ya ume ịjụ iwu Chineke, rụọkwa ụka na ọ ga-abara onye ọ bụla uru iguzobe ụkpụrụ nke aka ya ná ndụ. (Jenesis 3:1-5; tụlee Jeremaịa 10:23.) E si otú a maa ịchị isi nke Jehova aka n’ebe ahụ n’Iden. Dị ka ihe ndị megasịrị n’ikpeazụ gosiri, e webatakwara n’esemokwu ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke nke ihe nile e kere eke ndị nwere uche. Hà na-efe Chineke ofufe n’ihi na ha hụrụ ya n’anya n’ezie ka à pụrụ ịkpali ha ịgbakụta ya azụ? (Job 1:7-12; 2:3-5; Luk 22:31) Ihe iseokwu ndị a ga-emetụta ndị nile n’eluigwe na n’elu ala. Gịnị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala ahụ mere?
6. N’ihi gịnị ka Jehova na-ebibighị ndị nnupụisi ahụ ozugbo?
6 Kama ibibi ndị nnupụisi ahụ ozugbo, Jehova ji amamihe kwere ka ogologo oge gabiga ka e wee dozie esemokwu ahụ otu mgbe nanị. Nke a ka Chineke mere, ọ bụghị iji nwapụtara onwe ya ihe ọ bụla; kama iji kwe ka ihe e kere eke ndị nwere ike nke ikpebi ihe ha ga-eme hụta n’onwe ha mkpụrụ ọjọọ nke nnupụisi megide ịchị isi ya mịpụtara, nakwa iji nye ha ohere igosipụta ebe ha kwụ n’otu n’otu n’okwu ndị a dị mkpa. Mgbe e dozisịrị ihe iseokwu ndị a, a gaghị ekwekwa onye ọ bụla ọzọ imebi udo.
7. (a) Olee otú ọchịchị mmadụ si malite? (b) Ụdị ihe ndekọ dị aṅaa ka ha meworo?
7 Ebe Jehova Chineke bụ Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, o kwesịkwara ekwesị na ọ ga-abụ Onye Ọchịchị ha. (Mkpughe 4:11) Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, Setan na ndị aịọ mmụọ ya malitere ịkpali n’ime ụmụ mmadụ ọchịchọ nke, ọ bụghị nanị iguzobere onwe ha ụkpụrụ nke ezi ihe na ihe ọjọọ, kamakwa ịchị mmadụ ibe ha. Nimrọd bụ onye mbụ mere onwe ya eze, na-achị obodo dị iche iche na Mesopotamia. Ọ bụ “dike n’Ịchụ ntá [ma anụmanụ ma mmadụ] n’ihu Jehova.” (Jenesis 10:8-12) Site n’oge Nin rọd ruo ugbu a, a nwalewo ụdị ọchịchị mmadụ nile kwere omume. Ma ihe ndekọ nile, dị ka onye mmụta ọ bụla nke akụkọ ihe mere eme maara, abụrụla nke ịrụ arụ na nkwafu ọbara.—Eklisiastis 8:9.
8. N’ihi gịnị ka Jisọs ji ịụ itinye aka n’usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa?
8 Mgbe Jisọs Kraist nọ n’elu ala, Setan gbalịrị iwebata ọbụna ya onwe ya n’okpuru ike nduzi ya. O chere n’ihu Jisọs “alaeze nile nke elu [ala] dum mmadụ bi” ma ọ bụrụ na ọ kpọọ isiala nye ya. Jisọs jụrụ ajụ. (Luk 4:1-13) E mesịa, ndị mmadụ chọrọ ime ya eze, ma Jisọs wezụgara onwe ya. (Jọn 6:15) Ọ matara ihe usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa bụ, ọ matakwara na ọ bụghị uche Chineke maka ya ịgba mbọ imeziwanye ya.
9. (a) lji gwọta nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, gịnị ka a na-aghaghị ime, nke ọ bụ nanị Alaeze Chineke pụrụ ime ya? (b) Gịnị bụ Alaeze ahụ?
9 Jisọs gosipụtara ikwesị ntụkwasị obi zuru ezu nye Jehova, bụ Chineke na Nna ya. Ọ hụrụ ụzọ nile nke Nna ya n’anya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ mgbe nile. (Jọn 8:29) Ọ maara na ngwọta nke nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-abịa site n’Alaeze Chineke, ọchịchị bụ ezie nke ga-esi n’eluigwe na-achị, nke ga-ewetakwa nduzi ezi omume na nke ịhụnanya nke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa. Ọ bụ nanị Alaeze ahụ pụrụ iwepụ ike mmetụta nke Setan na ndị ajọ mmụọ ya. Nanị ya pụrụ ijikọta ndị nke agbụrụ nile na mba nile ịbụ otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, ndị na-ebi n’udo. Nanị ya pụrụ ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ n’agbụ nke mmehie na ọnwụ. Nanị ya pụrụ iwetara ihe a kpọrọ mmadụ obi ụtọ na-adịte anya. Alaeze a abụghị ndokwa efu nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị guzobcre, nke ndị ụkọchukwu gọzikwara. Ezi ndị Kraịst adịghị echigharịkwuru ngwá agha nke agha anụ ahụ iji mee ka ọdịmma ya gaa n’ihu. Ọ bụ ọchịchị nke Chineke n’onwe ya, nke nwere Eze eluigwe zuru okè nke Chineke n’onwe ya tinyere n’ocheeze. Nke a bụ Alaeze ahụ nke Jisọs kwusara banyere ya, nke o zikwara ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya.—Daniel 2:44; Mkpughe 20:1, 2; 21:3, 4.
OLEE AKỤKỤ NKE Ị GA-AHỌRỌ?
10. (a) Gịnị bụ oké ihe iseokwu ahụ nke onye ọ bụla n’ime anyị na-aghaghị iche ihu? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme banyere ya?
10 Ihe iseokwu ahụ nke ị na-aghaghị iche ihu bụ nke a: Ị̀ matara na Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ala, bụkwa Ọkaaka nke kwesịrị ịchị ya, Onye Ọchịchị ya Kasị Elu? Ị̀ wepụtawo oge iji mụta nzube ya na ihe dị iche iche ọ na-achọ n’aka mmadụ dị ka e depụtara ha n’ime Bible? N’ihi nsọpụrụ i nwere maka ọnọdụ ya na obi ekele maka ụzọ ya nile, ị̀ na-egosipụta onwe gị onye ji ịhụnanya na-erubere ya isi?—Abụ Ọma 24:1, 10; Jọn 17:3; 1 Jọn 5:3.
11. Gịnị mere na ịhọrọ ụzọ dị iche adịghị eweta obi ụtọ?
11 Ụmụ mmadụ ndị họọrọ ụzọ ọzọ dị iche hà na-enwe obi ụtọ karị? Gịnị siworo n’ịrụ ụka Setan nke bụ na ụmụ mmadụ ga-erite uru site n’inwere onwe ha kama ige Chineke ntị pụta? Ịjụ ikweta na Chineke nwe elu ala na ihe nile a kpọrọ mmadụ, dị ka ndị si ná mmadụ abụọ mbụ ahụ pụta, ndị kwesịrị ịbụ ụmụnne, edubawo n’ogbugbu nke ihe dị ka otu narị nde ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka n’agha dị iche iche a lụworo n’ime narị afọ a nanị. Ịghara iji ụkpụrụ omume ọma nke Bible na-eme ihe arụpụtawo ezinụlọ ndị dakpọrọ adakpọ, ntiwapụ nke ọrịa mmekọahụ dị iche iche, mmebi nke ahụ ike site n’ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ, na imempụ aka ike. Ọbụna ndị gbanarịrị ọnwụ ike na-ezute ọnwụ n’ihi mmehie e ketara n’aka Adam. Ihe àmà nile na-egosi na nanị ihe mmadụ na-eme bụ imerụ onwe ha na ndị nọ ha gburugburu ahụ mgbe ha lefuuru ihe nile Onye Okike ha ji amamihe na ịhụnanya na-achọ n’aka mmadụ. (Ndị Rom 5:12; tụlee Aisaia 48:17, 18.) O doro anya na nke ahụ abụghị ụdị ndụ ị chụrọ. Ị pụrụ ịhọrọ ihe ka mma nke ukwuu.
12. (a) Òkù dị aṅaa ka Bible na-akpọ anyị? (b) Mgbe anyị na-aga n’ihu na-etinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị, gịnị ka anyị ga-ahụta?
12 Bible na-akpọsi òkù ike, sị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma; onye [obi ụtọ] ka ọ bụ, bụ nwoke nke na-agbaba n’ime ya.” (Abụ Ọma 34:8) Iji mee nke ahụ, ị ghaghị ịmara Jehova, tinyekwa ndụmọdụ ya n’omume. Ka ị na-eme otú ahụ, ndụ gị ga-aghọ ihe bara uru. Kama ịchụsi ike inweta oge ndị dị mkpirikpi nke ihe ụtọ nke pụrụ inyere gị aka ichefu nsogbu gị ruo nwa oge ma na-ewetakarị obi mgbu n’ikpeazụ, ị ga-amụta ụzọ ị ga-esi nwee ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ihe isi ike nile nke ndụ na ụzọ ị pụrụ isi nwee ọṅụ na-adịgide adịgide. (Ilu 3:5, 6; 4:10-13; 1:30-33) Ị ga-enwekwa olileanya nke ikere òkè ná ngọzi nile dị ịtụnanya ndị ga-abịa site n’Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na nke a bụ ụdị ndụ ị na-achọsi ike, ọ dị mkpa ime ihe ugbu a. N’ihi gịnị?
MBA NILE NA-AZỌ IJE IRU AMAGEDỌN
13. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iguzosi ike n’akụkụ Jehova ugbu a?
13 Jehova agaghị anagide ruo mgbe ebighị ebi ụmụ mma- dụ na òtù dị iche iche ndị ji nlezianya ma ọ bụ enweghị mmasị na-eso idu ndú Setan. A gaghị ekwe ka ha nọgide na-eleda iwu Chineke anya, na-eji ala eme ihe n’ụzọ na- ekwesịghị ekwesị, na-emebikwara ndị ọzọ ndụ. Ha na-eche ụbọchị ikpe ihu n’ihe Bible kpọrọ “oké ụbọchị Jehova.”—Zefanaịa 1:2, 3, 14-18.
14. Gaa na gịnị ka a na-achịkọta mba nile ugbu a?
14 N’otu mkpughe nke ihe ndị ga-eme n’ụbọchị ndị ikpe- azụ nke usoro ihe dị ugbu a, Jisọs Kraist mere ka ọ pụta ìhè na “mmụọ ndị mmụọ ọịọọ” gaje ‘ịpụkwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ịchịkọta ha gaa n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.’ Dị ka mkpughe ahụ gosiri, “ha wee mee ka ha zukọọ n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn [ma ọ bụ Amagedọn].” Nchịkọta ahụ na-aga n’ihu ugbu a!—Mkpughe 16: 14, 16.
15, 16. (a) Gịnị bụ Amagedọn? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa?
15 Amagedọn ahụ nke Bible na-ekwu maka ya abụghị ihe a pụrụ izere site n’ịkwụsị ịkpụpụta ngwá agha nuklia. Mgbarịta izu nke mba dị iche iche agaghị akwazụga ya. O doro anya na e si n’obodo ochie nke Megido nweta aha ahụ, ma o metụtara ihe dị ukwuu karịa otu ebe dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. N’ịbụ ndị “onyeisi ụwa nke a’’ nke a na-adịghị ahụ anya na-akpali, a na-achịkọta mba nile, n’agbanyeghị echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha dị iche iche, ruo ọnọdụ zuru ụwa ọnụ nke na-egosi mmegide ha na-eme- gide Jehova Chineke. A na-eme ka “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” tinyere ndị nile na-eso ha, were ọnọdụ ha. Nso nso tupu Amagedọn, mmegide ha na-emegide Alaeze Chineke na ndị nile na-ekwusa ya ga-ekpowanye ọkụ gburugburu ụwa. Ma hà kwetara n’ịdị adị nke Setan ma ọ bụ na ha ekwetaghị, “ụwa dum na-atọgbụkwa n’aka aịọ onye ahụ,” dị ka Okwu Chineke na-ekwu. Ajọ ụwa nile nke a na ndị nile na-etinye ntụkwasị obi ha n’ime ya, ee, ndị nile na-enomi ụzọ ya nile, aghaghị ịpụ n’anya.— 1 Jọn 5:19; 2:15-17.
16 Site n’isi ruo n’ọdụdụ, ụwa nke a jupụtara ná mmerụ. Ọ bụghị nanị ndị omekome a ma ama, kama ụmụ amaala n’ọha na-egosipụta enweghị nsọpụrụ jọgburu onwe ya maka iwu na enweghị mrnetụta maka onwe na ihe onwunwe mmadụ ibe ha. Nke kasịnụ, ha na-ajụ ịmata ihe Chineke n’onwe ya kwuru n’ime Okwu ya, bụ Bible. Ha adịghị asọpụrụ ịbụ ọkaaka ya. Ọ dị mkpa ka Chineke mee ihe iji hichapụ aha ya ịta ụta nke e bokwasịworo ya, nakwa iji kwadebe ụzọ maka ime ka ala ghọọ Paradaịs ebe ndị hụrụ ezi omume n’anya ga-enwe ike ịnọ n’ezi udo na ntụkwasị obi.
17. (a) Ruo ókè ha aṅaa ka mbibi ahụ ga-adị ukwuu? (b) Ònye ga na-eduzi ihe ga-esi n’ime ya pụta?
17 Mgbe mbibi bịara, obi abụọ agaghị adị ya na o si n’aka Jehova. Ịtọgbọrọ n’efu ga-ezu ụwa nile ọnụ. Mba nile ga-amata na ọ bụ Jehova na-eme ihe mgbe ike mbibi ihe ya malitere ọrụ. Mgbe ike ọchịchị dị iche iche na-adakpọsị, aka mmadụ ọ bụla ga-echigharị imegide ibe ya. Site n’eluigwe, Ọkpara Chineke onwe ya ga-eduzi ihe ga-esi n’ime ya pụta.—Mkpughe 6:16, 17; 19:11-13; Zekaraịa 14:13.
18. Olee ndị ga-abụ ndị ahụ lanarịrị?
18 N’adịghị ka ihe na-esi n’agha nuklia nke ụmụ mmadụ na-ebu apụta, mbibi nke a agajeghị ịbụ aghara aghara. Ma olee ndị ga-abụ ndị ahụ lanarịrị? Hà ga-abụ ndị nile na-asị na ha nọ n’otu ụdị okpukpe ma ọ bụ eleghị anya ndị nile na-azọrọ na ha bụ ndị Kristian? Jisọs kpọrọ “ọtụtụ” ndị dị otú ahụ “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:21-23) Ndị ahụ ga-alanarị baa n’ime “ụwa ọhụrụ” ga-abụ nanị ndị zụliteworo n’ezie mmekọrịta chiri anya ha na Chineke na Ọkpara ya bụ eze, Kraist Jisọs. Site n’ụzọ ndụ ha na ịgba àmà ha banyere Alaeze ahụ, ha ga-egosipụtaworị na ha ‘matara Chineke,’ na ha ‘na-aṅakwa ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.’ Ị̀ na-egosipụta onwe gị ịbụ onye dị otú ahụ?—2 Ndị Tesalọnaịka 1:8; Jọn 17:3; Zefanaịa 2:2, 3.