Isi nke 12
À Kawo Gị Akara Maka Mbibi Ka Ọ Bụ Nlanarị?
1. Ajụjụ dị aṅaa ka ihe mmụta nke a na-agba anyị ume ịtụle?
Ọnọdụ okpukpe nke dị taa chọrọ n’aka anyị igosipụta ihe dị anyị n’obi n’ezie. Ànyị hụrụ Jehova na uzọ ya nile n’anya n’ezie? Ànyi dị ka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, onye e kwuru banyere ya, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị”? (Ndị Hibru 1:9) Ànyị dị njikere igosipụta nke a n’ihu ọha ka ndị ọzọ wee mara ebe anyị kwụ? Ihe ndekọ Bible banyere Jehu na Jehonadab nwa Rekab na-enyere anyị aka inyocha ọnọdụ anyị.
2. Ònye bụ Jehu, ònye bụkwa Jehonadab?
2 N’ime narị afọ nke iri T.O.A., a họputara Jehu ịbụ eze nke alaeze ebo iri nke Israel, nke isi obodo ya dị na Sameria. E kenyere ya ọru nke ibibi ndị nile bụ ndị ezinụlọ mmebi iwu nke Eze Ehab, tinyere Eze Nwanyị bụ Jezebel, onye mere ka ofufe Beal gaa n’ihu n’lsrael, gbalịakwa ikpochapụ ofufe Jehova. O doro anya na Jehonadab, onye Kenait, (nke pụtara na ọ bụghị onye Israel), maara ihe banyere ọrụ mkpochapụ nke Jehu mgbe o jere izute Jehu. Ma, ruo ókè ha aṅaa ka Jehonadab hụrụ Jehova n’anya? Ọ̀ ga-egosipụta onwe ya n’ihu ọha dị ka onye kwesịrị ike na ọ bụ nanị Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ, kwesịrị ka e fee ya ofufe?
“OBI GỊ Ò ZIRI EZI N’EBE M NỌ?”
3. Olee otú Jehonadab si mee ka ọha na eze mara ọnọdụ ya banyere ofufe Jehova?
3 Mgbe ndị ikom abụọ ahụ kelerịtasịrị onwe ha, Jehu kpọkuru Jehonadab ka o mee ka a mara ebe ọ kwụ. ‘Obi gị ò ziri ezi n’ebe m nọ,’ ka Jehu jụrụ ya, “dị ka obi m dị n’ebe obi gị dị?” N’atụfughị oge, Jehonadab zaghachiri, sị: “Otú a ka ọ dị.” Jehu wee zaghachi ya, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị otú a, nye m aka gị.” O wee kpọgote Jehonadab n’elu ụgbọ ala ya, wee sị: “Jesoo m, lee ekworo m na-ekworo Jehova.” Jehonadab ejighị ụjọ laghachi azụ.—2 Ndị Eze 10:15, 16; lee Deuterọnọmi 6:13-15.
4, 5. (a) Olee otú Jehu si mee ka ndị na-efe Beal gosipụta onwe ha? (b) Mgbe ahụ, gịnị ka Jehu mere, oleekwa ebe Jehonadab nọ? (ch) Ì si aṅaa emeghachi omume banyere mbibi e bibiri ndị na-efe Beal?
4 Mgbe ha rutere Sameria, Jehu mere ihe n’ụzọ chọrọ ka ndị nile na-efe Beal gosipụta onwe ha. Ọ kpọkuru ndị amụma, ndị nchuaja, na ndị nile na-efe Beal ịbịa n’oké ememe nke ịchụ àjà n’ụlọ Beal. Ọ gwara ha na a ga-egbu ndị ọ bula na-abịaghị. Jehu nyere ntụziaka ka e nye ndị nile na-efe Beal uwe ha ga-eyi ka e wee mara ha n’ụzọ doro anya. E sikwa otú a mee ka ndị nile na-efe Jehova gosipụta onye ha na-efe n’ezie. O yiri ka ọ bụ oge awa dị ebube nye Beal, nyekwa Setan bụ Ekwensu, onye chi ụgha bụ Beal nọchiri anya ya n’ezie.
5 Ebe a abụghị ebe kwesịrị ezi ndị na-efe Jehova ịnọ. E mere nnyocha ka e wee jide n’aka na ọ bu nanị ndịna-efe Beal nọ n’ebe ahụ Mgbe ahụ a gara n’ihu ime ememe ahụ. Ndị ikom jikere ejike nọ n’ezi n’oge ahụ, ozugbo Jehu nyekwara ha ihe àmà, ha malitere ọru. O nyere ha iwu, sị: “Tigbuo ha; ekwela ka nwoke ọ bula puọ.” E tigburu onye ọ bula na-efe Beal. E tikpọkwara ụlọ Beal. “Jehu wee kpochapu Beal n’Israel.” Jehonadab nọ n’akụkụ Jehu ikiri ihe omume nile ndị a. (2 Ndị Eze 10:18-28) Olee otú gị onwe gị si emeghachi omume banyere ihe ndị a mere? Ọ bụ ezie na ọ dịghi onye ọ bụla n’ime anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ọnwụ nke ndị ọzọ, ọbụna n’ọnwụ nke ndị ajọ omume, ma, ànyi ghọtara ihe mere o ji dị mkpa na ihe mere e ji dekọọ ihe omume ahụ n’ime Bible ka anyị wee gụọ ya taa!—Tụlee Ezikiel 33:11.
6. (a) Olee otú a ga-esi ebibi Babilọn Ukwu ahụ? (b) Mgbe ọ nọ n’ụwa, olee otú Jisọs si gosi na o kwooro ofufe Jehova ekworo?
6 Ihe ndekọ a adịghi enye anyị ikike ibibi ulọ okpukpe nke ndị òtù okukpe ma ọ bu ibibi ndị na-efe ofufe ụgha. Jehova ahọputawo, ọ bụghị ndịàmà ya nke oge a, kama Jisọs Kraịst, onye e meworo ebube, dị ka Jehu ka Ukwuu, iji mezuo ikpe ezi omume Ya nile. Site n’ikwenye ka ike ọchịchị nile e jikọtara ọnu gosipụta ịkpọasị ha n’ahụ Babilọn Ukwu ahụ, Eze eluigwe ahụ ga-eweta mbibi nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 6:2; 17:16; 19:1, 2) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs jụrụ ime ọbụna otu omume nke ofufe nke ga-enye Ekwensu nsọpụrụ. Ọ katọrọ mwezụga e wezụgara Okwu Jehova n’ihi omenala ndị mmadụ na iji ofufe Chineke na-agba mgbere maka uru ahịa. O kworo ekworo n’ihi ofufe Jehova.—Luk 4:5-8; Matiu 15:3-9; 21:12, 13.
7. (a) Gịnị bụ ụfọdụ n’ihe ndị e ji mara ofufe Beal nke oge a? (b) N’ihi gịnị ka Kraịst, dị ka Eze, ji kwe ka ihe ndị a dịgide?
7 Ya mere, n’ihi gịnị ka Kraịst, onye na-achị achị ugbu a n’etiti ndị iro ya, ji kwe ka ofufe Beal nke oge a yie ihe na-enwe ọganihu? N’ihi gịnị ka o ji kwe ka ndị mmadụ na-aga n’ihu n’enweghị nsogbu ọ bula site n’ife chi nke oge a, site n’ịgbakụta ihe nile Jehova chọrọ ha n’aka azụ? Gịnị mere o ji gbachi nkịtị n’omume ha na-eme dị ka à ga-asi na Chineke akpọghị omume ịkwa iko ha asi, otuto ha na-enye ụzọ ndụ nke nchụso akụ, mmikpu ha mikpuru n’ofufe ndị ajọ mmụọ mgbe ha na-asị na ha bụ ndị Kraịst, na nkụzi ha na-akụzi ozizi nile nke Babilọn dị ka à ga-asị na ha bụ okwu Chineke? Ihe ndị ahụ mere n’oge ochie gosiri na nke a bụ iji tinye ndị mmadụ n’ule, ka ha wee gosipụta n’ụzọ doro anya, onye ha na-efe, sikwa otú ahụ gosipụta ma ò kwesịrị ka e chebe ndụ ha ma ọ bu laa ha n’iyi.
8. Ajụjụ dịgasị aṅaa dị oké mkpa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
8 Ụzọ dị aṅaa ka ị họrọworo? Ị̀ hapụwo omume nile ndị pụrụ igosi na ị bụ onye na-efe Beal nke oge a? Ì kewapụwo onwe gị n’ụwa wee were ọnọdụ gị dị ka onye na-efe Jehova?—2 Ndị Kọrint 6:17.
9. (a) Ọ bụrụ na anyị dị ka Jehonadab n’ezie, gịnị ka anyị ga na-eme? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka akụkụ akwukwọ nsọ ndị e hotara n’ebe a si kwusie okwu ike banyere ịdị mkpa nke ihe ndị a?
9 Jehonadab, dị ka onye na-abụghị onye Israel nke na-efe Jehova, sere onyinyo “atụrụ ọzọ,” ndị a na-achịkọta ugbu a, ndị nwekwara olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Ì nwere ụdị mmụọ nke Jehonadab? Ị̀ dị njikere igosipụta onwe gị n’ihu ọha na ị kwụ n’akụkụ Jehu ahụ ka Ukwuu na n’akụkụ ụmụazụ ya e tere mmanụ nọ n’ụwa, ndị na-akpọsa “ụbọchị ịbọ Ọbò Chineke anyị nwere,” bụ́ nke dị nso? Ì so ha na-ekere òkè n’ọrụ ahụ dị oké ngwa? (Aịsaịa 61:1, 2; Luk 9:26; Zekaraịa 8:23) Ì ji obi gị dum na-efe Jehova, n’ekweghi ka ihe ọ bula nọchie ọnọdu nke Jehova kwesiri ịnọ n’obi gị? (Matiu 6:24; 1 Jọn 2:15-17) Ndụ gị ọ̀ na-egosipụta na mmekọrịta nke gị na ya bụ ihe kachasị dị oké ọnụ ahịa i nwere, na ihe ọ bụla ọzọ na-adaberezi na ya?—Abụ Ọma 37:4; Ilu 3:1-5.
Ì NWERE AKARA AHỤ?
10. N’uzọ dị aṅaa ka Bible si gosi na ọ bu nanị ndị na-efe Jehova ga-alanarị?
10 Ọ ga-abụ ajọ ihie ụzọ ikpebi na ọ bụrụ na mmadụ anwaa ike ya ibi “ezi” ndụ, zerekwa okpukpe nile na-eme ihe ndị o doro anya na Okwu Chineke mara ha ikpe, na ọ dịghịzi ihe ọzọ a chọrọ ya n’aka. Ndị nile na-atụ anya ịlanarị baa n’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ aghaghịkwa igosipụta onwe ha n’ụzọ doro anya dị ka ndị na-efe Jehova. (Mkpughe 14:6, 7; Abụ Ọma 37:34; Joel 2:32) E kwupụtara ozi nke a n’ọhụụ nke e nyere onye amụma bụ́ Ezikiel tupu e bibie Jerusalem na 607 T.O.A.
11. (a) Kọwaa ọhụụ nke e dekọrọ n’Ezikiel 9:1-11. (b) Gịnị bụ ihe dị mkpa maka nlanarị?
11 Ezikiel nụrụ mgbe Jehova kpọkọtara ndị ahụ a họpụtara ibibi Jerusalem nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi na ndị bi n’ime ya. Ọ hụrụ ndị ikom isii ji ihe agha maka ntipịa, nakwa otu nwoke ọzọ yi ákwà ọcha, nweekwa mpì ink odeakwukwọ n’ùkwù ya. Jehova bu ụzọ gwa nwoke a yi ákwà ọcha okwu, sị: “Gabiga n’etiti obodo a, n’etiti Jerusalem, kaa akara n’egedege ihu nke ndị ahụ ndị na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme n’etiti ya.” E mesịa, ọ sị ndị ikom isii ndị nke ọzọ ahụ: “Soonu ya gabiga n’obodo a, tigbuokwa: anya unu emela ebere, unu emekwala ọmiko: gbusịsịanụ okenye na okorobịa na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke na umuntakịrị na ndị inyom: ma unu abịarula nso onye ọ bụla nke akara ahụ dị ya n’ihu; ma n’ebe nsọ m ka unu ga-esi malite.” Ezikiel hụrụ n’ọhụụ, mbibi nke sochirinụ—ọ dị nnọọ ukwuu ruo na o yiri ka ọ̀ bụ ndị Israel nile bi n’ala ahụ ka e gbusịsịrị. (Ezikiel 9:1-11) Gịnị bụ ihe mere ka mmadụ lanarị? Ọ bụ akara ahụ nwoke ahụ ji mpì ink odeakwukwọ kara mmadụ n’egedege ihu.
12. (a) Gịnị bụ ihe arụ nke ndị a kara akara ‘na-eze ume, na-asukwa ude’ banyere ha? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji wee iwe megide ụdị ihe ndị ahụ?
12 Ọ bụ nanị mmadụ ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile” a na-eme na Jerusalem bụ ndị a kara akara maka nlanarị. Gịnị bụ “ihe arụ” ndị ahụ? E depụtara ise n’ime ha: (1) “Ihe oyiyi nke ekworo” nke dị n’ọnụ ụzọ mbata nke ogige ime ime nke ulọ nsọ Jehova. N’agbanyeghị ụdị ọ bụla ọ dị, ndị Israel nyere ihe oyiyi a ofufe nke ha kwesịrị inye Jehova. (1 Ndị Eze 14:22-24) (2) Ihe ọkpụkpụ nke anụ na-akpụ akpụ na anụ ọhịa dị iche iche ná mgbidi, na-esurere ha àjà nsure ọku na-esi ísì ụtọ, kpọmkwem n’ime ogige ulọ nsọ ahụ. (3) Ndị inyom na-akwa ákwà n’ihi ọnwụ nke chi Tammus, bụ́ aha ọzọ nke Nimrọd, onye nnupụisi ahụ na-emegide Jehova. (Jenesis 10:9) (4) Ndị ikom na-egosi enweghị nsọpụrụ jọgburu onwe ya site n’ịgbakụta ụlọ ukwu Jehova azụ ma na-akpọ isiala nye anyanwụ. (Deuterọnọmi 4:15-19) (5) Dị ka mkparị kasị ukwuu, ndị mmadụ imejupụta ala ahụ n’ihe ike na isetịpụkwa “alaka,” nke pụrụ ịbụ ihe oyiyi nke mmekọahụ, n’ihu Jehova. Ị̀ pụrụ ịghọta ihe mere Jehova ji wesoo ha iwe?—Ezikiel 8:5-17.
13. (a) N’iwere ha n’otu n’otu, kọwaa omume dị iche iche nke oge a, ndị a pụrụ iji tụnyere “ihe arụ” ndị ahụ. (b) Gịnị ka i chere banyere omume ndị a?
13 Olee otú ị na-esi emeghachi omume n’ihi ọtụtụ omume nke Krisendọm na-eme n’oge a, ndị a pụrụ iji tụnyere “ihe arụ nile” ndị a? (1) N’ime ọtụtụ ụlọ chọọchị ya, e nwere ọtụtụ ihe oyiyi nke ndị mmadụ na-akpọ isiala n’ihu ha, n’agbanyeghị na Bible dọrọ aka ná nti megide omume ahụ. (1 Ndị Kọrint 10:14; tulee 2 Ndị Eze 17:40, 41.) (2) Ọ na-agakwa n’ihu n’omume nke ijiri ozizi nke bụ́ na mmadụ sitere n’anụmanụ pụta dochie anya okike nke Chineke kere mmadụ; Ọzọkwa, ọ na-ekere òkè n’igosipụta ofufe sitere n’obi n’ihu ihe oyiyi nke anụmanụ na anụ ufe e ji mere ihe nnọchianya nke mba dị iche iche. (3) Ọ na-eji obé eme ihe n’ofufe ya, bụ́ ihe nnọchianya okpukpe nke Tammuz eri oge ochie, ọ na-esonyekwa n’ememe nke iruru ndị nwụrụ n’agha mwụfu ọbara újú, nke na-egosipụta ụdị mmụọ nke Nimrọd. (Ma lee Jọn 17:16, 17.) (4) Ọ na-agbakụtakwa ihe Chineke kwuru n’ime Okwu ya azụ, ma họrọ “ihe ọmụma” nke sayensị nke oge a na ọkà amamihe nke ndị mmadụ na-eche ya n’ihu. (1 Timoti 6:20, 21; tụlee Jeremaịa 2:13.) (5) Dị ka à ga-asi na nke ahụ ezubeghị, ọ na-akwado nkwatu ọchịchị n’ebe dị iche iche, na-agụkwa ịkwa iko dị ka ihe na-adịghị oké njọ, na-asịkwa na ọ na-ekwu okwu n’aha Chineke. (2 Pita 2:1, 2) Ụfọdụ ndị na-ele omume ndị a anya dị ka inwe echiche na-anabata ihe. Ọ pụrụ ịbụ na ha ekwenyeghị n’omume ahụ nile, ma ha pụrụ ikere òkè n’omume ndị ọzọ ma ọ bụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ghara ịkatọ ha. Olee ihe i chere banyere ụdị omume asọpụrụghị Chineke ndị a, nke na-eme ka ndị mmadụ gbakụta Onye Kere ha azụ?
14. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na eziokwu ahụ bụ na mmadụ enweghị mmasị na chọọchi adịghị egosi na ọ ga-alanarị?
14 Ọtụtụ ndị amatawo aghụghọ dị na chọọchi dị iche iche, ha adịghị ejekwa nke ọ bụla. Ha pụkwara inwe mwute banyere ihe ike na ekwughị eziokwu dị n’ụwa. Ma, nke ahụ adịghị egosikebe na a kawo ha akara maka nlanarị. ‘Nwoke ahụ ji mpì ink odeakwukwọ’ aghaghị ika ha akara. Ihe na-eme eme na-egosi na òtù “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-arụ ọrụ ịka akara ahụ taa.—Matiu 24:45-47.
15. (a) Gịnị bụ akara ahụ? (b) Olee otú mmadụ si enweta ya?
15 Ndị nile chọrọ ka a kaa ha akara dị ka ndị Chineke nwapụtara, aghaghị ịnara ndụmọdụ nke Jehova na-enye site n’aka òtù “ohu” ahụ, ghọọkwa ezi ndị na-efe Jehova ofufe. Ha agaghị abụ ndị na-asọpụrụ Jehova nanị n’egbugbere ọnụ ha, ma bụrụ ndị hụrụ ụzọ nile nke ụwa n’anya n’ezie. (Aịsaịa 29:13, 14; 1 Jọn 2:15) Ha aghaghị ịhụ Jehova na ukpụrụ ya nile n’anya, nweekwa mwute dị ukwuu n’obi ha, ‘na-eze ume, na-asụkwa ude’ n’ihi ozizi na omume ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ọ dịghị onye ga-akakwasị akara ink nkiti n’egedege ihu ha. Ma, mgbe a kara ha akara ihe atụ ahụ, ọ ga-edo mmadụ nile anya na, dị ka ndị Kraist raaraworo onwe ha nye, ndị e mekwara baptism, na ha eyikwasịwo “mmadụ ọhụrụ” ahụ a kọwara ná Ndị Efesọs 4:24. Ha nwere okwukwe dị ndụ. Ma n’ihu ọha ma na nzuzo, ha na-agbalị ime ihe ga-enye Jehova nsọpụrụ. Ọ bụghị nanị ndị si na Krisendọm pụta, kama mmadụ nile, n’agbanyeghị ụdị ọzụzụ ha nwere, bụ́ ndị na-atụ anya ịlanarị baa n’ime “uwa ọhụrụ” ahụ dị ka ndị enyi nke òtù ahụ e tere mmanụ, aghaghị inwe akara nke a.
16. N’ihi gịnị ka ọhụụ nke a ji dị mkpa n’ụzọ pụrụ iche nye ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha?
16 Otu eziokwu pụtara nnọọ ìhè bụ na a gwara ndị na-arụrụ Jehova ọrụ mbibi, na afọ ndụ, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ịbụ ndị na-alụbeghị di ma na nwunye na nkekọ alụmdi na nwunye, abụghị ihe ga-eme ka a hapụ onye ọ bụla mehiere megide Jehova. Onye nke ọ bụla n’etiti di na nwunye aghaghị inwe akara nke ya iji wee dị ndụ. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ egbochie ime ka ụmụ ha nweta akara ahụ, ma ọ bụ ghara ịzụlite ụmụ ha dị ka ndị ohu Jehova, ha aghaghị ịza ajụjụ banyere ihe mere ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ bụ ezie na Jehova na-agụ ụmụ na-erubere nne na nna ndị na-asọpụrụ Chineke isi dị ka ndị dị “nsọ,” ọ dịghị agụnye ụmụ nnupụisi. (1 Ndị Kọrint 7:14; Abụ Ọma 102:28; Ilu 20:11; 30:17) Ọ bụrụ na ụmụntakịrị etoruwo ịghọ ndị Kraịst mere baptism ma ha achọghị imezu ihe a chọrọ ha n’aka, ma è mere ha baptism ma ọ bụ na e meghị ha, afọ ndụ ha agaghị eme ka a hapụ igbu ha. N’ihi ya, lee ka o si dị oké mkpa, ka a kaa onye ọ bụla ruworo afọ ndụ nke ịza ajụjụ akara n’ụzọ doro anya dị ka onye raara onwe ya nye Chineke, na-emekwa uche ya!
17. Gịnị ka anyị mụtaworo n’ebe a banyere obi ebere Jehova?
17 Jehova egosiwo ụmụ mmadụ obi ebere dị ukwuu site n’izite ndịàmà ya ịdọ ha aka ná nti banyere mbibi nke na-abịa na igosi ha ụzọ mgbapụ. Ma, ọ maara ihe ndekọ nke okpukpe ụgha nke ọma na mkpụrụ rere ure ọ mipụtaworo. Mgbe a ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ, a gaghị emere onye ọ bụla nke nọgidere na-arapara na ya ebere. Iji lanarị mmezu ikpe Chineke nke na-abịanụ, e kwesịrị ịgbaso nzọụkwụ Jisọs Kraịst dị ka ezi ndị na-efe Jehova, bú Onye Kere eluigwe na ụwa.
[Foto dị na peeji nke 95]