Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 15 p. 113-120
  • Ikewa Ndị Mmadụ n’Ihe Iseokwu Alaeze ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikewa Ndị Mmadụ n’Ihe Iseokwu Alaeze ahụ
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZE AHỤ NA ỤMỤNNA YA
  • ‘UNU MEERE YA OTU N’IME ỤMỤNNA M’
  • Ị̀ ‘GA-EKETA ALAEZE AHỤ’?
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Na-efe Ezi Ofufe—Olee Ebe Ha Si Bịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 15 p. 113-120

Isi nke 15

Ikewa Ndị Mmadụ n’Ihe Iseokwu Alaeze ahụ

1. N’ihi gịnị ka nkewa banyere ihe iseokwu Alaeze ahụ ji bụrụ okwu dị oké mkpa nye onye ọ bụla n’ime anyị?

MKPEBI siri ike na-eche onye ọ bụla n’ime anyị ihu. Ihe na-ese okwu bụ omume anyị banyere Alaeze Mesaịa Jehova nke dị n’aka Jisọs Kraịst. A na-ekewa ndị mmadụ ugbu a banyere ihe iseokwu ahụ. N’ịdabere n’ụzọ onye ọ bụla si eme omume, a na-etinye ya n’otu n’ime òtù abụọ. Nanị otu n’ime òtù ndị a ga-alanarị mbibi ụwa nke na-abia.—Matiu 24:40, 41.

2. (a) Olee otú Alaeze Mesaịa ahụ si metụta ihe iseokwu nke ọkaaka Jehova? (b) Gịnị ka Alaeze ahụ ga-aghọ n’oge na-adịghị anya, ya mere, gịnịkwa ka anyị kwesịri ịdị na-echesi echiche ike banyere ya?

2 Jehova echiworị Ọkpara ya e tere mmanụ, bụ́ Mesaịa ya, eze n’eluigwe. Ná ngwụsị nke oge mba ọzọ na 1914, Chineke nyere Jisọs Kraịst mba nile dị ka ihe nketa—ụwa nile dị ka ihe onwunwe ya. (Abụ Ọma 2:6, 8) Ọchịchị Mesaịa ahụ, ebe Eze Jehova e tere mmanụ na-anọkwasị n’ocheeze, bụ ụzọ Chineke ga-esi mezuo nzube amamihe na nke ịhụnanya ya banyere ụwa. Ya mere, omume ị na-emeso Alaeze ahụ na-egosịpụta echiche i nwere banyere ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova. N’oge na-adịghi anya, Alaeze Mesaịa ahụ ’ga-etipịa ma mee ka ha gwụsịa,’ bụ́ usoro ọchịchị nile ndị na-achịkwa ihe omume nile nke mmadụ ugbu a, wee bụrụ nanị otu ọchịchị n’elu ụwa dum. (Daniel 2:44; Mkpughe 19:11-21) Mgbe o mere ihe ịgbanwe ụwa ka ọ ghọọ Paradais, ebee ka ị ga-anọ? Ị̀ ga-eso ná ndị ahụ ọ ga-eduru gaa n’inweta izu okè nke ndụ? Jisọs guzobere ihe ndabere nke ndị dị ndụ ugbu a pụrụ iji kere òkẹ̀ n’ọdịnihụ dị otú ahụ.

EZE AHỤ NA ỤMỤNNA YA

3. Na Matiu 25:31-33, gịnị ka Jisọs kọwara?

3 Mgbe ọ na-agwa ndị ozi ya banyere ’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a,’ Jisọs jiri ọtụtụ ilu ma ọ bụ ihe atụ mee ihe. Na nke ikpeazụ, ọ sịrị: Ma mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya: ma n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.—Matiu 24:3; 25:31-33.

4. (a) Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ilu nke a na Daniel 7:13, 14? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka ọ pụrụ ịba uru anyị ịjụ onwe anyị?

4 Rịba ama na n’ebe a, Jisọs kwuru banyere onwe ya dị ka Nwa nke mmadụ, dị ka o meworo ugboro ugboro ná mmalite nke amụma nke a. (Matiu 24:27, 30, 37, 39, 44) Ya iji okwu a na-eme ihe bụ nchetaghachi nke ọhụụ amụma e nyere Daniel ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ isii tupu nke a, nke onye amụma ahụ dere banyere ya, sị: Anọ m na-ahụ n’ọhụụ nile nke abalị, ma, lee, otu onye, nke dị ka Nwa nke mmadụ [Jisọs Kraịst] nọ na-abịa n’igwe oji, ọ bụkwa Onye ochie ahụ [Jehova Chineke] ka ọ bịakwutere, ha wee mee ka ọ bịaruo nso n’ihu ya. Ọ bụkwa ya ka e nyere ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee ya; ọchịchị ya bụ ọchịchị ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga, ọ bụkwa alaeze ya bụ nke a na-agaghị emebi. (Daniel 7:13, 14; Ndị Hibru 2:5-8) E nyeworị Jisọs Kraịst ike nke ịchị isi ahụ. Kemgbe 1914, ọ na-achị site n’ocheeze eluigwe ya. Olee otú i siworo meghachi omume n’onwe gị banyere ịchị isi ahụ? Ụzọ ndụ gi ọ̀ na-enye ihe àmà nke ezi nkwanye ùgwù maka Onye a nke Chineke n’onwe ya meworo Onye na-achị isi nke ụwa nile?

5. Olee ụzọ Kraịst si achọpụta izi ezi nke nzọrọ mmadụ na-eme banyere nrara ọ raara onwe ya nye ya dị ka Eze?

5 Okwu nkịtị ezughị ezu. Ọ dị mfe mmadụ ikwu na ya kweere n’Alaeze Chineke nakwa na ya hụrụ Jisọs n’anya. Ma, n’ilu ya nke atụrụ na ụmụ ewu, Jisọs gosiri na, ebe ọ bụ na a gaghị ahụ ya anya n’eluigwe, isi ihe ọ ga-atụle iji kpebie izi ezi nke nzọrọ mmadụ na-azọrọ ga-abụ otú onye ahụ si emeso ndị ahụ na-anọchite anya Kraịst n’elu ụwa, bụ́ ụmụnna ya.—Matiu 25:40, 45.

6. Olee ndị bụ ụmụnna Kraịst ndị a?

6 Òle ndị ka ha bụ? Ha bụ ndị ahụ Chineke họpụtaworo site n’ụmụ mmadụ ka ha bụrụ ndị sooro Kraịst ketakọọ Alaeze eluigwe ahụ. Ndị a dị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ, nke ihe fọdụrụ n’ime ha ka nọ n’ụwa. (Mkpughe 14:1, 4) N’ihi na a ‘mụwo ha ọzọ’ site n’irụ ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke, ha bụ ụmụ Chineke, n’ihi nke ahụkwa, a na-ekwu banyere ha n’Akwụkwọ nsọ dị ka ụmụnna nke Jisọs Kraịst. (Jọn 3:3; Ndị Hibru 2:10, 11) Jisọs na-agụ ihe ndị mmadụ meere ụmụnna ya ndị a, ọbụna nye nke dịkarịsịrị nta n’ime ha, dị ka ọ bụ ya onwe ya ka e meere ya.

7. N’ihi gịnị ka ụmụnna Kraịst na-abụghị ndị òtù nke chọọchị nile nke Krisendọm?

7 Olee ebe ụmụnna ndị a nke Kraịst nọ n’ụbọchị anyị a? Ị̀ na-achọta ha n’etiti ndị na-aga chọọchị nile nke Krisendọm? Otú ọ dị, gịnị ka Jisọs kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya? Ha esiteghị n’ụwa dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa. (Jọn 17:16) À pụrụ ikwu otú ahụ n’ezie banyere chọọchị nile nke Krisendọm na ndị òtù ha? N’ókè dị ukwuu, omume na àgwà ha na-eyi nnọọ ndị nke a na-ahụkarị n’akụkụ ụwa ebe ha nọ. A maara nke ọma aka nke chọọchị nile na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe a na-edepụta Iwu Na-achị òtù United Nations na 1945, ndị nnọchianya Protestant, Katọlik na ndị Juu nọ nso maka ịtụnye aro. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị popu nke Rom ebuliwo United Nations elu dị ka olileanya ikpeazụ nke ịdị n’otu na udo nakwa nnọkọ kasị elu nke udo na ikpe ziri ezi. Òtù World Council of Churches, nke nwere ihe dị ka 300 òtù okpukpe dị iche iche dị ka ndị òtù ya, enyewo ọbụna ego nke e ji na-akwado mgbanwe ọchịchị dị iche iche. Ma Jisọs Kraịst gwara onyeisi ọchịchị ndị Rom ahụ bụ Paịlet, sị: Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.—Jọn 18:36.

8. (a) Gịnị nyewooro gị aka ịmata ụmụnna Kraịst? (b) Ruo òkè ha aṅaa ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ dị ha mkpa?

8 Ihe mere eme na-egosi na nanị otu òtù guzosiworo ike maka Alaeze ahụ, na-etinye oké mgbalị ịkpọsa ya n’ụwa nile, na-ezerekwa itinye onwe ha n’ụzọ ọ bụla n’ihe gba- sara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa. Òtù ahụ bụ Ndịàmà Jehova. N’etiti ha ka a na-achọta ihe fọdụrụ nke ụmụnna Kraịst. N’iṅomi Onyenwe ha na ndị ozi ya, ha ararawo onwe ha nye n’ịga site n’obodo gaa n’obodo na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-agwa ndị mmadụ ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Luk 8:1; Ọrụ 8:12; 19:8; 20:20, 25) Na 1919, n’otu mgbakọ nke Ndịàmà Jehova (ndị a maara mgbe ahụ dị ka Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile) mere na Cedar Point, Ohio, e chetaghachiiri ndị bịara mgbakọ ahụ na ọkpụkpọ mbụ [ha] bụ, nọgidekwa na-abụ, maka ịkpọsa alaeze Mesaịa ahụ dị ebube nke na-abịanụ. Ná mgbakọ dịkwa otú ahụ na 1922, e mesikwara nke a ike ọzọ, a kwalikwara ha, sị: Kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ, Eze ahụ na alaeze ya. N’iji ụzọ ọ bụla ruru ha aka mee ihe, ha anọgidewo na-eme nke ahụ n’ụwa nile ruo kpọmkwen n’ụbọchị taa. (Matiu 24:14) N’ihi ọrụ ha, e chewo ihe iseokwu Alaeze ahụ n’ihu gị. Gịnị ka i na-eme banyere ya?

‘UNU MEERE YA OTU N’IME ỤMỤNNA M’

9. (a) Olee otú ọnọdụ ndị a kọwara na Matiu 25:35-40 si metụta ozi Alaeze ahụ? (b) Ule dị aṅaa ka e cheworo ndị mmadụ n’ihu n’ebe nile n’ihi nke a?

9 Ụmụnna Kraịst ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ anọwo n’ule siri ike n’ihi ikwusa Alaeze Chineke n’anya ike, ma na-anọpụkwa iche n’ụwa. (Jọn 15:19, 21) Ụfọdụ enwewo ahụmahụ inọ n’agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ na enweghị uwe. Ọtụtụ ahapụwo ebe obibi ha iji jee ozi n’ebe ha bụ ndị ọbịa. Mgbe ha na-eje ozi ha, ha arịawo ọrịa, gaa mkpọrọ, ọbụna nwụọ n’aka ndị mkpagbu. Ahụmahụ ndị a nke ụmụnna Kraịst emewo ka otu ule chee ndị mba nile ihụ. Ịhụnanya ha nwere maka Chineke na Kraịst ọ̀ ga-eme ka ha gbatara ndị nnọchianya Alaeze eluigwe ndị a ọsọ enyemaka? (Matiu 25:35-40; tụlee 2 Ndị Kọrint 5:20.) Ọ bụghị obi ebere nkịtị n’ihi ọmịiko nke mmadụ kama inye enyemaka n’ihi na ha dịịrị Kraịst ka Eze ahụ na-agụ dị ka nke e meere ya onwe ya.—Mak 9:41; Matiu 10:42.

10. (a) Gịnị mere na ngọpụ ndị ahụ bụ ụmụ ewu na-eme ezighị ezi? (b) N’ụzọ dị iche na nke a, olee ọnọdụ ndị ahụ bụ atụrụ wereworo?

10 dị na-enye ụdị enyemaka ahụ ka Jisọs sịrị na ha yiri atụrụ. A na-ezo aka ná ndị jụrụ inyere ụmụnna ya aka dị ka ụmụ ewu n’ilu Jisọs. Ndị ahụ bụ ụmụ ewu pụrụ ịzọrọ na ha ahụghị Jisọs Kraịst. Ma o zigaworo ha ndị ozi ya, ndị a akọwawokwa onwe ha nke ọma. Ọ pụrụ ibụ na ndị ahụ bụ ụmụ ewu akpagbughị ụmụnna Kraịst, ma a kwalighịkwa ha site n’ịhụnanya maka Eze eluigwe ahụ ịbịa nyere ndị nnọchianya ya aka. (Matiu 25:41-45) Ha rapagidesiri ike n’ụwa nke a nke Setan bụ́ Ekwensu bụ onye ọchịchị ya a na-adịghị ahụ anya. Ndị ahụ bụ atụrụ apụghịkwa ịhụ Kraịst anya n’ụzọ nkịtị. Ma, n’ụzọ na-eyighị ndị ahụ bụ ụmụ ewu, ndị a gosipụtara na egwu adịghị atụ ha igosipụta onwe ha n’akụkụ ụmụnna Kraịst, na-akwado ndị mkpọsa ndị a nke Alaeze Chineke. Ndị ahụ bụ atụrụ maara ihe ha na-eme, ha mekwara nhọrọ kwesịrị ekwesị n’akụkụ nke Alaeze Chineke site n’aka Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya kpatara na ihe ha mere bara uru n’anya Eze ahụ.

11. (a) Ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-ezutebeghị otu n’ime ụmụnna Kraịst, à pụrụ isi aṅaa kpee ha ikpe n’ihe a kọwara n’ebe a?

11 Ma, olee otú ọ ga-esi kwe mee ka e kpee ndị nke mba mile ikpe n’ihi nke a? Ọ̀ bụ na Jisọs ekwughị na ụmụnna ya, bụ́ ndị Nna ya ga-enye Alaeze eluigwe ahụ ga-abụ nanị ìgwè atụrụ nta? (Luk 12:32) Ọtụtụ ndị mmadụ ezutebeghị nke ọ bụla n’ime ndị a n’onwe ha. Ọ bụ eziokwu, ma ụmụnna Kraịst mejupụtara ntọala nke òtù zuru ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. Site ná ndị a a haziri ahazi, a na-eche ihe iseokwu Alaeze ahụ dị mkpa n’ihu ndị mmadụ n’ebe ọ bụla. Kraịst na-eduzi ihe ndị a nile site n’ocheeze ya dị n’eluigwe, sitekwa n’enyemaka ndị mmụọ ozi. N’ihe dị ka 210 mba na ìgwẹ̀ agwaetiti dị iche iche gburugburu ụwa—ọbụna n’ebe gọọmenti machibidoro nkwusa nke Alaeze Chineke iwu —ọrụ nkewa nke a na-aga n’ihu n’enweghị mgbochi, oké ìgwè ndị mmadụ na-ewerekwa ọnọdụ ha n’akụkụ Alaeze Chineke.

12. (a) Olee ụzọ atụrụ ahụ si eme ka o doo anya ebe ha kwụ? (b) Gịnị mere ha ji eme ya?

12 Olee otú ha si egosi nke a? Ọ bụ site n’iso ndị ahụ e tere mmanụ na-aga ụkwụ na ụkwụ, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa na Alaeze ahụ na-achị achị, nakwa na mgbe na-adịghị anya ọ ga-eweta usoro ihe nke ụwa nke a ná njedebe. N’ụzọ dị otú a, ha na-egosipụta onwe ha n’ụzọ pụtara ìhè na ha akwụnyeworo Alaeze Mesaịa nke Jehova, jirikwa ịhụnanya na-akwali ndị ọzọ ka ha mee otu ihe ahụ. Ihe dị nnọọ ukwuu karịa ọchịchọ maka nlanarị na-akwali ndị a nwere obi ziri ezi. Ha hụrụ Jehova na ụzọ ya nile n’anya n’ezie. Onyinye o nyere Alaeze ya nke nwere Kraịst dị ka Eze ya na-eme ka ekele jupụta ha obi, ha chọkwara ka ndị ọzọ rite uru site na ya. Ya mere, ha na-ekere òkè n’òkè kasị ukwuu ha nwere ike n’ịgba àmà nke Alaeze ahụ. Dị ka Jisọs ziri ndị na-eso ụzọ ya, ha ’na-ebu ụzọ chọọ Alaeze ahụ,’ ọ bụghị ikwe ka nchegbu banyere ihe onwunwe kwalaa ya n’ọnọdụ nke abụọ. N’ụzọ dị otú a ha na-etinye onwe ha n’ahịrị ịnata ngọzi dị ukwuu.—Matiu 6:31-33.

Ị̀ ‘GA-EKETA ALAEZE AHỤ’?

13. (a) Kemgbe òle mgbe ka Jehova bu n’obi inye ndị ahụ yiri atụrụ ụgwọ ọrụ? (b) Gịnị ka ọ pụtara nye ha ’iketa alaeze ahụ’?

13 Ihe a kwadebeere ndị ahụ gosipụtara na ha bụ atụrụ nke ilu Jisọs dị ebube n’ezie. Site n’ocheeze ya nke eluigwe, ọ na-asị ha: Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa. (Matiu 25:34) Kemgbe a tọrọ ’ntọala ụwa,’ mgbe Adam na Iv mụtara ụmụ ndị pụrụ irite uru site ná ndokwa Chineke maka ịgbapụta ụmụ mmadụ, dị ka Jenesis 3:15, 16 kwuru, Jehova bụ ụgwọ ọrụ n’obi maka ndị ahụ bụ atụrụ. (Tụlee Luk 11:50, 51.) Ọ bụ ohere ha inweta izu okè nke ndụ mmadụ n’ime Paradaịs e weghachiri eweghachi, bụ́ nke Adam tụfuru. Ha ’iketa alaeze ahụ’ apụtaghị na ha ga-eje eluigwe, n’ihi na ilu ahụ gosiri na atụrụ ahụ abụghị otu ihe dị ka ụmụnna Eze ahụ, bụ́ ndị nketa nke Alaeze eluigwe ahụ. Ya mere, atụrụ ahụ aghaghị ịbụ ndị ga-ebi n’elu ụwa nke a nke ọchịchị eluigwe ahụ ga-achi. Akwụkwọ Liddell na Scott dere, bụ́ Greek-English Lericon kwuru na a pụrụ ịghọta okwu Grik bụ basilei’a, nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ alaeze, n’ụzọ nkịtị dị ka mmadụ “ịbụ onye eze na-achị.” O doro anya na ọ bụ n’echiche a ka e ji ya mee ihe n’ebe a.

14. Olee otú ikpe a mara ndị ahụ bụ ụmụ ewu si dị iche n’ihe nketa nke ndị ahụ bụ atụrụ nwetara?

14 Mgbe ndị ahụ bụ ụmụ ewu pụrụ gaa ná ‘mbibi ebighị ebi,’ bụ́ mbibi nke zụrụ ezu dị ka à ga-asi na ọ bụ n’ọkụ, Eze Mesaịa ahụ ga-echebe ndị ahụ bụ atụrụ. (Matiu 25:41, 46; tụlee Mkpughe 21:8.) Ebe ọ na-adịkwaghị mkpa na ha ga-anwụ anwụ, ọ ga-edebe ha ndụ gabiga mkpagbu ukwu ahụ baa n’ime ụwa ọhụrụ dị ebube nke ga-enwere onwe ya pụọ ná mmetụta ọjọọ nile nke Setan na ajọ usoro ihe ya. Ngọzi ahụ ga-abụ nke ha n’ihi na ha na-eme mkpebi nke ziri ezi banyere ihe iseokwu Alaeze ahụ ugbu a.

15. (a) Ànyị si aṅaa mara na ilu ahụ dị irè ugbu a? (b) Ya mere, ọrụ dị aṅaa dị oké mkpa?

15 Ọ ga-abụ oké mmehie ihe iche na, n’ihi na mmebi nke ndị ahụ bụ ụmụ ewu ga-abụ nke ebighị ebi, na ilu ahụ agaghị amalite ịdị irè ruo mgbe oge gasịrị, ma eleghị anya n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. N’ụzọ na-emegide nke ahụ, Jisọs tụrụ ilu ahụ dị ka otu akụkụ nke ihe àmà nke ’ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a.’ (Matiu 24:3) Ihe ọ kọwara na-ewere ọnọdụ mgbe e chisịrị ya eze, ma mgbe ụmụnna ya ka nọ n’anụ ahụ, na-enwekwa ihe isi ike ndị ọ kpọtụrụ uche. Anyi na-ebi n’oge ahụ, ọ na-agwụkwa ngwa ngwa. Ya mere, lee ka o si dị mkpa, ọ bụghị nanị inwe obi ike zuru ezu n’Alaeze ahụ, kama inyere ndị ọzọ aka ịhụ mkpa ọ dị ime otú ahụ ugbu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya