Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 14 p. 152-162
  • Nsọpụrụ Maka Onyinye nke Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsọpụrụ Maka Onyinye nke Ndụ
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịsọpụrụ Ndụ nke Nwa A Na-amụbeghị Amụ
  • Nsọpụrụ maka Ndụ nke Onwe Gị
  • Iji Ọgwụ Na-eme Ihe
  • Iji Ụtaba na Ihe Ndị Yiri Ya Na-eme Ihe
  • Nsọpụrụ maka Ndụ nke Ọbara bụ Ihe Nnọchianya Ya
  • Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ọgwụ Ọjọọ—Olee Ndị Na-eji Ha Eme Ihe?
    Teta!—2001
  • Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe—Ngwọta Ya Dị!
    Teta!—2001
  • Ọgwụ Ọjọọ—Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eji Ha Eme Ihe?
    Teta!—2001
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 14 p. 152-162

Isi 14

Nsọpụrụ Maka Onyinye nke Ndụ

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji gosi nsọpụrụ dị omimi maka onyinye nke ndụ?

NSỌPỤRỤ miri emi maka onyinye nke ndụ bụ ntọala nke ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ma ọ dị mwute na ụdị nsọpụrụ nke a kọrọ ụkọ taa. Ọ marawo ndị mmadụ ahụ iwepụ ndụ, ma ọ dịghị n’ime ha nke nwere ike iweghachi ndụ mgbe ọ pụrụ.

2 Nsọpụrụ maka ndụ bụ ụgwọ dị nsọ nke e ji Onye Na-enye ndụ, bụ́ Jehova Chineke. Banyere ya ọbụ abụ ahụ sịrị: “N’ebe ị nọ ka isi iyi ndụ dị.” (Abụ Ọma 36:9) Ndụ anyị sitere n’aka Chineke, ọ bụghị nanị n’ihi na o kere mmadụ kamakwa na o kwewo ka ihe a kpọrọ mmadụ na-adị ruo ugbu a ma nyekwa ihe e ji akwado ndụ. (Ọrụ 14:16, 17) Karịa nke ahụ, o dokwara ka Ọkpara ya bụrụ Onye Nzụtaghachi, ma ọ bụ Onye Mgbapụta nke ezinụlọ mmadụ, na-eji ọbara ndụ ya na-azụrụ ya. (Ndị Rom 5:6-8; Ndị Efesọs 1:7) N’ihi nke a, ọ na-esetịpụ ugbu a ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ ya nke ezi omume nye ndị nile ga-anakwere ya. N’ihi ihe ndị a nile, ànyị pụrụ isi aṅaa gosi nsọpụrụ anyị miri emi na ekele maka onyinye Chineke nke ndụ?

3. Olee otú ikiri ime ihe ike dị ka ihe ntụrụ ndụ si emetụta omume mmadụ n’ebe ndụ dị?

3 Otu ihe bụ na ọ bụrụ na anyị ji igosi nsọpụrụ maka ndụ kpọrọ ihe, anyị agaghị anọ n’etiti ndị ahụ na-eji ihe ntụrụ ndụ ndị na-egosi ime ihe ike na-azụ echiche ha, nanị maka ihe ọchị. Ịnakwere ime ihe ike dị ka “ihe ntụrụ ndụ” emewo ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị obi tara mmiri, gharakwa ịdị na-enwe mmetụta n’ahụhụ na ntụfu nke ndụ ndị mmadụ. Ma ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ịdị mma Chineke na olileanya nke ọ na-enye, anyị ga-ajụ ụdị mmụọ ahụ. Anyị ga-azụlite mmasị maka ndụ dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Nke a ga-emetụta ụzọ anyị si eji ndụ nke onwe anyị eme ihe, ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ, ọbụna ụzọ anyị si ele ndị ahụ a na-amụbeghị amụ anya.

Ịsọpụrụ Ndụ nke Nwa A Na-amụbeghị Amụ

4. (a) Olee mgbe a na-enyefe nwa ọhụrụ ndụ?(b) Gịnị na-egosi ma Chineke ò nwere mmasị ná ndụ mmadụ tupu ọmụmụ ya?

4 Ike nke inyefe ndụ bụ ihe ùgwù dị ukwuu nke Chineke nyere. A na-enyefe ndụ ahụ, ọ bụghị n’ọmụmụ, kama na mgbe a na-atụrụ ime. Dị ka Encyclopœdia Britannica si kwuo, ọ bụ mgbe ahụ ka “akụkọ ndụ nke onye ahụ, dị ka onye dị iche na onye dị adị, na-amalite.” O kwukwara, sị: “A na-ekepụta mmadụ ọhụrụ mgbe ihe ọrụ nke ọbara ọcha dị ike jikọrọ n’àkwà nwa kara aka.”60 N’otu aka ahụ, mmasị Chineke n’ebe ndụ mmadụ dị na-amalite tupu ọmụmụ. Onye ọbụ abụ bụ Devid dere, na-agwa Chineke: “Ị na-akpa m n’afọ nne m dị ka e si akpa ákwà. . . . Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ ka ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ.”—Abụ Ọma 139:13-16; Eklisiastis 11:5.

5. N’ihi gịnị ka arụmarụ ndị a na-ewelite ná mgbalị ime ka isikwopụ ime zie ezi enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ?

5 A na-akpachara anya na-akwụsị ndụ nke ọtụtụ nde ụmụaka ndị a na-amụbeghị amụ kwa afọ site n’ikwopụ ime. Nke a ọ̀ bụ omume ziri ezi? Ụfọdụ na-asị na nwa a na-amụbeghị amụ adịghị ndụ na o nweghịkwa ike ịnọgide ndụ ma e wezuga n’akpa nwa. Ma nke ahụ bụkwa nnọọ eziokwu banyere nwa a mụrụ ọhụrụ. Mgbe a mụrụ ya ọ maghị ihe ndụ pụtara, ọ pụghịkwa ịnọgide ndụ ma e lekọtaghị ya anya mgbe nile. Mkpụrụ ndụ nke e mepụtara na mgbe a tụụrụ ime na-aghọ nwa dị otú a ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e mere ya. Ya mere, ọ bụrụ na e lee iwepụ ndụ nke nwa ọhụrụ anya dị ka ihe ọjọọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile, na-emekwa oké mgbalị iji zọpụta ọbụna ụmụ ndị a mụkworo amụkwo, mgbe ahụ, gịnị mere na ọ bụghịkwa ihe ọjọọ iwepụ ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ? Gịnị mere a ga-eji lee ndụ anya dị ka ihe dị nsọ nanị mgbe ọ hapụrụ akpa nwa ma ọ bụghịkwa otú ahụ mgbe ọ ka dị n’akpa nwa?

6. Bible si aṅaa egosi echiche Chineke banyere ịkpachara anya wepụ ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ?

6 Ihe dị mkpa abụghị nanị otú ụmụ mmadụ si ele ihe anya kama ihe Chineke, bụ́ Onye Na-enye ndụ nwere ikwu. Nye Jehova ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ dị oké ọnụ ahịa, ọ bụghị ihe a ga-eji gwurie egwu. O nyere ndị Israel oge ochie iwu nke ga-echekwa ndụ ahụ kpọmkwem. Ọ bụrụ na ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, wee merụọ nwanyị dị ime ahụ ma ọ bụ ime apụọ ya, iwu ahụ setịpụrụ ntaramahụhụ dị ilu. (Ọpụpụ 21:22, 23) Ịkpachara anya wepụ ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ ga-adị njọ karị. Dị ka iwu Chineke si kwuo, a ga-ama onye kpachara anya wepụ ndụ mmadụ ikpe ọnwụ dị ka ogbu mmadụ. (Ọnụ Ọgụgụ 35:30, 31) Chineke ka nwekwara otu ụzọ ile ihe anya ahụ dị elu banyere ndụ ugbu a.

7. Megide gịnị ka e chebeworo anyị mgbe anyị na-asọpụrụ uche Chineke metụta ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ?

7 Nsọpụrụ miri emi maka uche Chineke metụta ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ na-aba uru n’ezie. Site n’ime ka ndị mụrụ ụmụ nwee oké ibu ọrụ maka ndụ ahụ, Jehova na-egbochi mmekọahụ a na-akparaghị ókè na mmetụta ọjọọ ya nile. Ndị a gụnyere ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, ịtụrụ ime a na-achọghị, ụmụ ndị a kwatara n’iko, ndakpọ ezinụlọ, na mmebi echiche nke akọ na uche na-adịghị ọcha. Ya mere, nsọpụrụ maka ndụ pụrụ itinyekwu ihe n’udo nke ezinụlọ ugbu a, bụrụkwa ihe dị mkpa maka anyị inweta ngọzi nke ọdịnihu.

Nsọpụrụ maka Ndụ nke Onwe Gị

8. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji gosi nsọpụrụ maka uche Chineke n’ụzọ anyị si emeso ahụ nke onwe anyị?

8 Gịnị banyere ụzọ anyị si emeso ndụ nke onwe anyị? Ọtụtụ ndị na-asị: ‘Arịọghị m ka a mụọ m. Ya mere ihe m ji ndụ m na-eme gbasara m. Aga m eme ihe ọ bụla m chọrọ ime.’ Ma ọ̀ bụ nanị mgbe a rịọtara onyinye arịọta ka onye e nyere ya ga-enwe mmasị na ya? A pụghị ịrụ ụka na ndụ n’onwe ya bụ ihe dị mma. Ọ bụ nanị ezughị okè na arụrụala nke mmadụ na-anapụ ndụ ọtụtụ ihe ụtọ ya. A pụghị ịta Jehova Chineke ụta maka nke ahụ. O kwewokwa nkwa imezi ya site n’ọchịchị Alaeze ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ibi ndụ nke o nyere anyị n’ụzọ na-egosi nsọpụrụ nye uche na nzube ya.—Ndị Rom 12:1.

9. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere iribiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè?

9 Otu ụzọ anyị pụrụ isi gosi ekele dị otú ahụ bụ site n’iri ihe na ịṅụ mmanya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Chineke megidere oké nri na ịṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:20, 21) Ọzọkwa, dị nnọọ ka iri ihe n’ókè kwesịrị ekwesị dị mma otú ahụ ka ọ dịkwa n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe n’ókè kwesịrị ekwesị. Ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ gosiri nke a.—Deuterọnọmi 14:26; Aịsaịa 25:6; Luk 7:33, 34; 1 Timoti 5:23.

10. (a) Onye aṅụrụma si aṅaa egosi enweghị nsọpụrụ maka ndụ? (b) Dị ka e gosiri na 1 Ndị Kọrint 6:9, 10, gịnị mere o ji dị mkpa izere ịṅụbiga mmanya ókè?

10 Ya mere, ọ bụghị ịṅụ mmanya ka a machibidoro iwu n’ime Bible. Ọ bụ iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. E nwekwara ezi ihe kpatara ya, n’ihi na nke ahụ na-emebi ahụ, na-eme ka ndị aṅụrụma mee omume dị ka ndị nzuzu, ọbụna mee ka ha bụrụ ihe ize ndụ nye ndị ọzọ. (Ilu 23:29-35; Ndị Efesọs 5:18) Na United States nanị, ọ dịkarịa ala 10 nde ndị mmadụ na-ahụ ahụhụ n’ihi mmanya ogbugbu, otu ihe ọ na-arụpụta bụ ọnwụ nke ihe karịrị 30,000 ndị mmadụ kwa afọ site n’ọrịa cirrhosis nke imeju. Òtù National Council on Alcoholism kwuru, sị: “Ihe ọ na-efu mba a bụ ihe fọrọ nke nta ka o ruo 43 nde dollar kwa afọ n’ihi ịgha ọrụ, ije ozi ahụ ike na nke ọdịmma ọha na eze, mmebisi nke ihe onwunwe na mmefu nke ịgwọ ọrịa. . . . N’ihe ọghọm nile kpatara ọnwụ n’okporo ụzọ taa, 50% metụtara ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Ihe karịrị 80% nke ndị nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba, 65% nke mmiri ịgbagbu mmadụ, 22% nke ihe ọghọm ebe obibi, 77% nke ịda ada, 36% nke ihe ọghọm ndị ji ụkwụ aga na 55% nke ndị nile e jidere ejide bụ n’ihi ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Ihe ruru 44% nke ndị na-anya ụgbọ elu nwere ihe ọghọm anọwo na-aṅụ mmanya. Ime ihe ike n’ihi ịṅụ mmanya na-aba n’anya na-akpata ihe dị ka 65% nke igbu ọchụ, 40% nke imerụ mmadụ ahụ, 35% nke idina nwanyị n’ike, 30% nke imempụ ndị ọzọ nke mmekọahụ, 30% nke igbu onwe onye, 55% nke ịlụ ọgụ ma ọ bụ imerụ mmadụ ahụ n’ebe obibi na 60% nke imetọ ụmụaka.”61 A pụghị ịgụkọta ihe ọ na-efu ná ndakpọ ezinụlọ, ndụ ndị a lara n’iyi, na ahụhụ nke ụmụ mmadụ na-ata. N’ihi ya ọ bụghị ihe ijuanya na Okwu Chineke na-asị: “Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, . . . ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

11. Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya mmadụ ịnwa ịgbanarị nsogbu dị iche iche nke onwe ya site n’ịṅụ oké mmanya?

11 N’eziokwu, ọnọdụ na-egbu mmụọ nke dị n’ụwa na-emetụta ụfọdụ n’ụzọ miri emi. Agha nile, imempụ, ụkọ nri, ịda ogbenye, ihe isi ike na mmegide ya nile na-ebutekwa nsogbu nye mmadụ. Ma ọ dịghị uru a na-erite site n’ịgbanarị ihe ndị a site n’ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ na-emerụ ahụ. Nke a nanị na-ewetakwuru mmadụ na ndị ọzọ nsogbu, mgbe nke a na-agakwa, ọ na-emebi ùgwù mmadụ nwere, nzube nke ịdị ndụ, na nguzo ya n’ebe Chineke nọ.

Iji Ọgwụ Na-eme Ihe

12. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-echigharịkwuru ọgwụ ọjọọ dị iche iche?

12 N’ihi ịchọ ịgbanarị nsogbu nke ndụ, ọtụtụ mmadụ echigharịkwuruwo ọgwụ ndị na-egbu ka mmanya. Ndị na-eji ụdị ọgwụ ndị a eme ihe na-eji ihe ndị na-eme eme gbanwere mmetụta nke ịrọ nrọ ma ọ bụ ọnọdụ nke iro ụra. Ọtụtụ na-eji ọgwụ ndị dị ike dị ka heroin na cocaine eme ihe. Ụfọdụ na-aṅụ ókè dị ukwuu nke ọgwụ dị iche iche n’ụdị mkpụrụ ọgwụ. Olee otú o si emetụta ndụ ha?

13. Mmetụta dịgasị aṅaa ka ụfọdụ ọgwụ ndị a na-enwe n’ahụ onye na-eji ha eme ihe, Bible sikwa aṅaa adọ aka ná ntị banyere ihe ndị a?

13 Ha iji ọgwụ ndị a na-eme ihe na-edubakarị n’enweghị njide onwe onye, na-arụpụta ụdị mmetụta ndị ahụ a na-ahụ ná ndị na-aṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:29-34) Amatawokwa n’ebe nile na ọgwụ ndị a pụrụ ịbụ ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, na New York City, iri ahụ nke heroin bụ isi ihe na-ebute ọnwụ n’etiti ndị nọ n’agbata 18 na 35 afọ. Lee oké nlelị ọ bụ maka onyinye nke ndụ!

14, 15. N’ihi gịnị ka ndị na-ese wii wii na-adịghị egosi nsọpụrụ maka onyinye nke ndụ?

14 Ma gịnị banyere ọgwụ ahụ dị nro nke bụ wii wii? Ya onwe ya pụkwara ịbụ ihe ize ndụ n’ụzọ dị iche iche. A na-ekpughekarị ndị na-eji wii wii eme ihe nye ọgwụ ndị dị ike karị site ná mmekọrịta ha na ndị na-ere ọgwụ ọjọọ na ndị ọzọ na-eji ya eme ihe. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị na-adabere n’ọgwụ a na-egbu egbu, na-ekwetakwa na ọ ga-akwụsị ihe mgbu na ịda mbà, na-adabakarị n’ọgwụ ndị dị ike karị.

15 Ma ọbụna ma a sị na nke a emeghị, ise wii wii dị ize ndụ. O nwere ihe ndị na-ebutekarị ọrịa cancer karịa siga, ọ na-ebibikwa akpa ikuku karị. Ịnọgide na-eji ya eme ihe pụrụ ịkpata mmebi nke imeju, ọrụsị n’ụmụ ọhụrụ, na mmebi nke ụbụrụ. Ụlọ ọrụ Addiction Research Foundation nke Canada kwuru na wii wii “bụ ọgwụ dị ike nke nwere ọtụtụ ihe ize ndụ nye ahụ ike.”62 Onyeọkà maka ọgwụ ndị na-egbu egbu kwuru, sị: “Wii wii bụ ọgwụ dị oké njọ. N’ihe karịrị 10 afọ gara aga, ndị ọkà mmụta sayensi ebiwo ihe dị ka 10,000 akwụkwọ na-ezo aka n’ihe ize ndụ ya nye ahụ ike.” O kwuru na e nwere “ihe ize ndụ miri emi dị oké njọ ná ndị na-eto eto ịgbalị icheta ihe,” n’ihi na ọ na-eme ka ike gwụ ụbụrụ icheta ihe ma mebiekwa ike mmadụ nwere itinye uche n’otu ihe. Banyere onye na-eji wii wii eme ihe, ọ sịrị: “Ọ pụghị ịnya ụgbọ ala nke ọma, ma ọ bụ jiri ígwè typewriter mee ihe. Iji ya mee ihe ogologo oge na-akpata mmebi dị oké njọ nye usoro ichekwa ahụ nke na-alụ ọgụ n’ime ahụ megide ọrịa.”63 Ụmụ nwanyị ndị na-aṅụ wii wii n’oge ha dị ime nwere ihe ize ndụ ka ukwuu nke inwe ụmụ ndị ụbụrụ ha mebiri emebi. N’ihi ihe ndị a nile, à pụrụ ikwu na iji wii wiii mee ihe na-egosi nsọpụrụ maka onyinye nke ndụ?

16. Nye ihe ize ndụ ọzọ dị aṅaa nke dị oké njọ ka iji ọgwụ eme ihe na-ekpughe mmadụ, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta ụzọ anyị si ele okwu a anya?

16 E nwere ihe ọzọ siri ike mere a ga-eji zere iji ọgwụ ọjọọ mee ihe. Ha pụrụ imeghe ụzọ maka mmadụ ịbanye ná nchịkwa nke ndị mmụọ ọjọọ. Njikọ nke a nke ọgwụ ọjọọ dị iche iche na anwaansị abụghị ihe ọhụrụ ma ọlị. Ndị mgbaasị n’oge gara aga jikwa ọgwụ ndị na-egbu egbu mee ihe. Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere kwuru, sị: “Ná mgbaasị, iji ọgwụ na-egbu egbu mee ihe, ma ọ̀ dị nro ma o siri ike, bụ nke a na-ejikọkarị ya na ịgọ mmụọ na inwe mmasị n’ike nke anwaansị.” Okwu ndị a kwekọrọ n’okwu ndị Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “ịgwọ nsị” (phar·ma·kiʹa, nke pụtara n’ụzọ nkịtị, “ịṅụ ọgwụ”) dị ná Ndị Galetia 5:20. (Leekwa Mkpughe 9:21; 18:23.) N’ihi ya, ọgwụ ọjọọ pụrụ ime ka mmadụ daba ná mmetụta nke ndị mmụọ ọjọọ. Olee otú onye nke nwere nsọpụrụ maka Onye Na-enye ya ndụ pụrụ isi kpughee onwe ya nye ihe ize ndụ ahụ nanị n’ihi ihe ụtọ nke nwa oge?

17, 18. (a) Mkpụrụ ọjọọ ọzọ dị aṅaa ka a na-ejikọ ya na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe? (b) Ya mere, olee otú ndị Kraịst bụ Ndịàmà Jehova si ele iji ọgwụ ọjọọ eme ihe anya?

17 Ọ bụ ihe a maara nke ọma na imempụ na ndakpọ nke omume ziri ezi n’ọha ka e jikọrọ ha na ịṅụ ọgwụ ọjọọ dị iche iche. Ire ọgwụ ọjọọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị bụ ụzọ bụ isi nke e si enweta ego maka imempụ a haziri ahazi. Ọtụtụ ndị ịṅụ ọgwụ ọjọọ riworo ahụ na-ezu ohi iji kwado àgwà ha. Ndị ọzọ na-amalite ịgba akwụna. Ezinụlọ na-etisasị mgbe otu onye òtù ya ghọrọ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ. Ndị nne dị ime na-enyefe ụmụ ha ụdị iri ahụ nke a, bụ́ ndị na-anwụ mgbe ụfọdụ mgbe ha na-ata ahụhụ nke nsepụ aka. N’ala ụfọdụ, ọ bụkwa ihe iwu na-akwadoghị inweta na iji ọgwụ ọjọọ ndị a eme ihe ma ọ bụghị n’ihi ịgwọ ọrịa.—Matiu 22:17-21.

18 Ị̀ ga-achọ itinye aka n’omume nke a e jikọtara ya na mkpụrụ ọjọọ nile ndị a? Ndịàmà Jehova adịghị achọ! Ha achọghị akụkụ ọ bụla nke ọgwụ ọjọọ dị iche iche maka mkpali ma ọ bụ maka ịgbapụ n’ihe na-eme eme. Ha nwere nsọpụrụ dị ukwuu maka ndụ, na-achọkwa iji ya mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke.

Iji Ụtaba na Ihe Ndị Yiri Ya Na-eme Ihe

19. N’ihi gịnị ka nsọpụrụ maka onyinye nke ndụ ji metụta otú mmadụ si ele iji ụtaba, mkpụrụ betel na akwụkwọ osisi coca eme ihe, anya?

19 Nke na-ewukarị ewu taa bụ iji ụtaba eme ihe, nakwa n’ala ụfọdụ, mkpụrụ betel na akwụkwọ coca. Nke ọ bụla n’ime ha na-emebi ahụ, mgbe ụfọdụkwa, uche. Ndị gọọmenti adọwo aka ná ntị banyere njikọ nke ụtaba na ọrịa ndị dị ka cancer nke akpa ume, ọrịa dị iche iche nke obi, ụkwara ume ọkụ, na ọrịa emphysema. Ọ̀ na-egosi nsọpụrụ maka onyinye nke ndụ iji ụdị ihe ndị dị otú ahụ na-eri ahụ ma na-emerụ ahụ na-eme ihe?

20, 21. (a) Eziokwu ahụ bụ na Bible amachibidoghị ụdị omume ndị a iwu kpọmkwem ọ̀ pụtara na ha nile ziri ezi? (b) Olee ụkpụrụ Bible ndị na-egosi na ụdị àgwà ndị a enweghị ọnọdụ ná ndụ nke ohu Chineke?

20 Mmadụ pụrụ ịsị na ihe ndị a nile bụ ihe ndị Chineke kere. N’eziokwu, otú ahụ ka ọ dịkwa ero. Ma, ụfọdụ n’ime ha na-akpata ọnwụ ma e rie ha. Onye ọzọ pụrụ ikwu na Bible amachibidoghị omume ndị dị otú ahụ iwu kpọmkwem. Ee e, ma dị ka anyị hụworo, e nwere ọtụtụ ihe ndị a na-amachibidoghị iwu kpọmkwem n’ime Bible ndị o doro anya na ha dị njọ. O nweghị kpọmkwem n’ime Bible ebe megidere ikpofu ahịhịa n’azụ ụlọ onye agbata obi gị. Ma iwu ya nke bụ ‘hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị’ ezuwo nye onye ọ bụla n’ime anyị ịmata ụzọ nke ahụ pụrụ isi dị njọ. N’otu aka ahụ, ise ụtaba na-egosi enweghị ịhụnanya, ebe ọ bụ na anwụrụ ya nwere ike ịgbasazu ndị ọzọ ahụ, ọ pụkwara imebi ọnọdụ ahụ ike ha.—Matiu 22:39.

21 Na 2 Ndị Kọrint 7:1 Okwu Chineke na-agwa anyị ka anyị “sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.” Ka ihe wee dị “nsọ” pụtara ya ịdị “ọcha, inwupụ dị ka ìhè, emerụghị emerụ.” Jehova na-edobe onwe ya ọcha pụọ ná mmerụ, n’ewedaghị onwe ya ala mgbe ọ bụla ime ihe n’ụzọ na-adịghị nsọ. N’izi ezi ọ tụrụ anya ka anyị nọgide “na-emezu ịdị nsọ” ruo n’ókè ọ ga-ekwe ihe a kpọrọ mmadụ omume. (Ndị Rom 12:1) Ọzọkwa, ọ na-atụ anya n’aka anyị ‘ịhụ ya n’anya site n’obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum.’ Ma olee otú mmadụ pụrụ isi mee nke a ma ọ bụrụ na ọ na-etinye aka n’omume ndị na-emerụ ahụ ya, na-emebi ahụ ike ya, na-emekwa ka ndụ ya dị mkpirikpi?—Mak 12:29, 30.

22. Gịnị pụrụ inyere mmadụ aka ịkwụsị ịbụ ohu nye ụdị àgwà ọjọọ ndị dị otú ahụ?

22 Ọ bụ ezie na otu n’ime àgwà ndị dị otú a ma ọ bụ ọzọ nwere ike iyi ihe jidere mmadụ aka ọjọọ, ọ pụrụ imeri ya ma nwere onwe ya. Ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya nile na-enye mkpali siri ike maka ime otú ahụ. A pụrụ ime ka mmadụ ‘bụrụ onye ọhụrụ n’ike nke na-achịkwa uche ya.’ (Ndị Efesọs 4:23) Nke a ga-emeghe ụzọ ọhụrụ nke ndụ nke na-eweta afọ ojuju nye mmadụ na otuto nye Chineke.

Nsọpụrụ maka Ndụ nke Ọbara bụ Ihe Nnọchianya Ya

23. (a) Olee nanị otu ụzọ nke Chineke kwadoro n’iwu o nyere Israel nke iji ọbara mee ihe? (b) Olee ihe mere ihe àjà ndị ahụ pụtara ga-eji kpalie anyị ịtụle nke ọma ihe bụ uche Chineke n’okwu a?

23 E kwesịkwara ịtụle ọbara anyị mgbe anyị na-ekwu okwu maka ndụ. Chineke ahọrọla ma ọbara mmadụ ma nke anụmanụ dị ka ihe nnọchianya nke ndụ. Nke a pụtara ìhè n’iwu o nyere Noa mesịakwa nye mba Israel. Nanị ụzọ a nakweere iji ọbara mee ihe bụ n’ịchụ àjà. (Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:10-14) Àjà nile ndị ahụ sere onyinyo nke otu àjà Jisọs, nke o ji wụfuo ọbara nke ndụ ya n’ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 9:11-14) Nke a n’onwe ya kwesịrị ịkpali anyị inyocha ihe bụ uche Chineke n’okwu a nke ọma.

24. Gịnị ka Ọrụ 15:28, 29 na-ekwu metụta ụzọ ile ihe anya nke ndị Kraịst kwesịrị inwe n’ebe iji ọbara eme ihe dị?

24 Mgbochi Chineke metụta iji ọbara eme ihe ọ̀ ka dị irè maka ezi ndị Kraịst? Ee, dị ka e gosiri ya n’okwu ahụ nke ndị ozi na ndị okenye ndị ọzọ nke narị afọ mbụ nke ọgbakọ ndị Kraịst kwuru. N’okpuru nduzi nke mmụọ Chineke, ha dere, sị: “N’ihi na ọ dị mmụọ nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma, ka anyị ghara ibo unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa: ka unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu [ya bụ, nke e gbupụghị ọbara] na ịkwa iko; ọ bụrụ na unu edebe onwe unu ghara imetụ ihe ndị a aka, ọ ga-adịrị unu mma.”—Ọrụ 15:28, 29.

25. Site n’omume ndị dịgasị aṅaa ka ụwa si egosi enweghị nsọpụrụ maka uche Chineke banyere iji ọbara eme ihe?

25 Ọtụtụ ndị mmadụ na-elelị uche Chineke metụta ọbara. Ha na-eji ya eme ihe n’ihe oriri, maka iji gwọọ ọrịa, ọbụna ná ngwa ahịa dị iche iche. Ma nke a ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na ụwa na-egosi nsọpụrụ dị nnọọ ala maka onyinye nke ndụ n’onwe ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị matara ịdị oké ọnụ ahịa nke ndụ nakwa ajụjụ anyị na-aghaghị ịza Chineke banyere ya, anyị agaghị eleda uche ya anya ma ọ bụ nye ya mkparị site n’imebi iwu ya nile.

26, 27. N’ihi gịnị ka mgbalị nile nke mmadụ na-eme ichebe ndụ ọ dị ugbu a site n’inupụrụ Chineke isi adịghị egosi nsọpụrụ nye ya?

26 Ya mere, ọ bụ ezie na anyị ga-echegbu onwe anyị banyere ahụ ike anyị, chọọkwa ichebe ndụ anyị, e nwere ebe a na-aghaghị ịkwụsị. Jisọs mere ka nke a pụta ìhè mgbe ọ sịrị: “Onye na-ahụ ndụ ya n’anya na-atụfu ya; onye na-akpọkwa ndụ ya asị n’ụwa nke a ga-edebe ya ruo ndụ ebighị ebi.”—Jọn 12:25.

27 A bịa n’ihe banyere iche ọnwụ ihu n’ihi irubere Chineke isi ma ọ bụ inupụrụ ya isi iji gbanarị ọnwụ, ohu nke Chineke ga-ahọrọ ọnwụ karịa inupụ isi. Jisọs gaara agbanarị ọnwụ site n’inupụrụ Chineke isi. Ma o meghị nke ahụ. Mmadụ ndị dịrị ndụ tupu ya egosiwokwa nraranye dị otú ahụ nke a na-ekewaghị ekewa nye Chineke. (Matiu 26:38, 39, 51-54; Ndị Hibru 11:32-38) Ha ekweghị ka ndụ ha dị mgbe ahụ guzochiere ha ụzọ nke iru eru ha maka ndụ ebighị ebi.

28. Site n’ịzụlite mmasị n’echiche Bible maka ndụ, gịnị ka anyị na-akwadebe maka ya?

28 Ọ̀ bụ otú ahụ ka gị onwe gị sikwa ele ndụ anya? Ị̀ na-aghọta nke ọma na ka ndụ wee nwee ezi nzube, ị ghaghị ibi ya n’ikwekọ n’uche Chineke? Ịzụlite echiche ahụ ugbu a bụ otu akụkụ nke ime nkwadebe maka ndụ n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke. Lee ụdị ịnọ ná ntụkwasị obi na nchebe anyị ga-enwe mgbe ahụ n’ebe ọ bụla na ná mgbe nile, na-amara na ndị nile bi n’ụwa bụ ndị nwere ezi nsọpụrụ maka onyinye Chineke nke ndụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya