Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • T-15 p. 2-5
  • Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo
  • Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Chineke
  • Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Rutere Gị
  • Dịrị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Elu Ụwa Paradaịs
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ihe Ndị E Buru n’Amụma na Ha Ga-eme n’Oge Na-adịghị Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya
    Teta!—1998
  • Ụzọ Isi Laghachi Paradaịs
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo
T-15 p. 2-5

Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo

Mgbe i lere anya n’ihe osise dị na mpempe akwụkwọ a, olee otú o si emetụta gị? Ọ̀ bụ na udo, obi ụtọ na ihe ịga nke ọma a na-ahụ na ya adịghị agụ obi gị agụụ? Ọ na-eme otú ahụ n’ezie. Ma ọ̀ bụ nanị nrọ, ma ọ bụ echiche efu, ikwere na ọnọdụ ndị a ga-adị adị n’ụwa?

O yiri ka ihe ka ọtụtụ n’etiti ndị mmadụ chere otú ahụ. Ihe ndị na-eme eme n’oge a bụ agha, imempụ, ọrịa, ịka nká—ka a kpọtụ nanị ole na ole aha. Ma e nwere ihe mere a ga-eji nwee olileanya. Mgbe ọ na-ekwu banyere ọdịnihu, Bible kwuru na “dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13; Aịsaịa 65:17.

“Eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ” nke a, dị ka ha dị na Bible, abụghị eluigwe ọhụrụ nke nkịtị na ụwa ọhụrụ nke nkịtị. E kere ụwa na eluigwe nkịtị n’izu okè, Bible gosikwara na ha ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 89:36, 37; 104:5) “Ụwa ọhụrụ” ahụ ga-abụ ọha mmadụ nke ezi omume ndị bi n’ụwa, “eluigwe ọhụrụ” ahụ ga-abụkwa alaeze ma ọ bụ ọchịchị eluigwe nke zuru okè nke ga-achị ọha mmadụ nke a n’ụwa. Ma ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na ọ ga-ekwe mee inwe “ụwa ọhụrụ” ma ọ bụ ala ọhụrụ e mere ka ọ dị ebube?

Ọ dị mma, buru n’uche eziokwu ahụ bụ na ọnọdụ ọma ndị dị otú ahụ bụ akụkụ nke nzube mbụ Chineke nwere maka ụwa. O tinyere nwoke na nwanyị mbụ na Paradaịs elu ụwa n’Iden ma nye ha ọrụ dị ebube: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Ee, nzube Chineke bụ ka ha nwee ụmụ, mgbe oge na-agakwa ka ha gbasaa Paradaịs ha n’elu ụwa nile. Ọ bụ ezie na ha mesịrị họrọ inupụrụ Chineke isi, wee si otú ahụ na-egosi na ha erughị eru ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi, nzube mbụ nke Chineke agbanweghị. Ọ ghaghịkwa imezu n’ụwa ọhụrụ!—Aịsaịa 55:11.

N’ezie, mgbe ị na-ekpe Ekpere Onyenwe Anyị, ma ọ bụ Nna Anyị Bi n’Eluigwe, na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa, ị na-ekpe ekpere ka ọchịchị eluigwe ya kpochapụ mmebi iwu dị n’ụwa wee bụrụ ihe na-achị ụwa ọhụrụ nke a. (Matiu 6:9, 10) Anyị kwesịkwara inwe obi ike na Chineke ga-aza ekpere ahụ, ebe Okwu ya kwere nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Chineke

Alaeze Chineke ga-eweta ụwa ọtụtụ uru ndị na-enweghị atụ nye ụwa, na-emezu ihe ọ bụla dị mma nke Chineke zubeworo na mbụ ka ndị ya nụ ụtọ ha n’ụwa. Ịkpọasị na mmegbu agaghị adịkwa ọzọ, e mesịakwa onye ọ bụla bi n’ụwa ga-abụ ezi enyi nye onye ọ bụla ọzọ. Na Bible, Chineke kwere nkwa na ya ‘ga-eme ka agha kwụsị ruo ná nsọtụ nile nke ụwa.’ “Mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:4.

Nwayọọ nwayọọ a ga-eme ka ụwa nile dịrị n’ọnọdụ ubi a gbara ogige. Bible na-ekwu, sị: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa dị ka rose . . . N’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara ná mmiri.”—Aịsaịa 35:1, 6, 7.

A ga-enwe ihe ga-eme ka e nwee obi ụtọ n’ụwa Paradaịs ahụ. Ụmụ mmadụ agakwaghị anọ agụụ n’ihi enweghị nri. “Ala [ga-eme] ihe omume ya,” ka Bible kwuru. (Abụ Ọma 67:6; 72:16) Mmadụ nile ga-anụ ụtọ nke ihe si ná ọrụ ha pụta, dị ka Onye Okike anyị kwere nkwa, sị: “Ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. . . . ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.”—Aịsaịa 65:21, 22.

N’ụwa ọhụrụ nke Chineke, ụmụ mmadụ agaghị ejubigakwa ókè n’ime ụlọ ndị buru ibu, ma ọ bụ kpokọjuo n’obere ụlọ dị iche iche ndị na-adakasị adakasị, n’ihi na Chineke ezubewo na: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha . . . Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie.” Bible kwekwara nkwa, sị: “Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.” (Aịsaịa 65:21-23) N’ihi ya, ndị mmadụ ga-enwe ọrụ na-arụpụta ihe, bụ́ nke na-eju afọ. Ndụ agaghị abụ ihe ike ọgwụgwụ.

Mgbe oge na-aga, Alaeze Chineke ga-eweghachi ọbụna mmekọrịta udo nke dịbu n’ogige Iden n’etiti ụmụ anụmanụ, na n’etiti ụmụ anụmanụ na mmadụ. Bible kwuru, sị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha.”—Aịsaịa 11:6-9; Hosea 2:18.

Cheedị nnọọ echiche ihe ọ ga-abụ, n’ime ụwa Paradaịs ahụ, a ga-agwọpụkwa ọrịa na nkwarụ nile! Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Rutere Gị

Ọ ghaghị ịbụ nnọọ na a kpaliri obi gị site ná nkwa nile nke Chineke banyere ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume. Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ iwere ịdị adị nke ngọzi ndị dị otú a dị ka ihe dị oké mma nke na ọ gaghị ekwe omume, ọ dịghị oké mma nke na ọ gaghị ekwe omume isite n’aka onye okike anyị na-ahụ n’anya.—Abụ Ọma 145:16; Maịka 4:4.

Otú ọ dị, e nwere ihe ndị a chọrọ anyị n’aka ka anyị wee dị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs nke na-abịa. Jisọs gosipụtara otu nke bụ́ isi mgbe ọ na-ekpeku Chineke ekpere, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ibi n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta uche Chineke ma mee ya. N’ihi na ihe a bụ eziokwu: “Ụwa [nke a] na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi” na-anụ ụtọ ngọzi nile nke Onye Okike anyị na-ahụ n’anya ga-awụkwasị ruo mgbe ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.

Nhota Bible nile sitere na Union Igbo Bible, ọ gwụla ma e gosiri nsụgharị ọzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya