Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
“Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” ka nwoke ahụ bụ́ Job jụrụ eri ogologo oge. (Job 14:14) Ma eleghị anya, gị onwe gị kwa echewo echiche banyere nke a. Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị maara na ọ ga-ekwe omume gị na ndị ị hụrụ n’anya ịnọkọ ọzọ n’elu ala n’ọnọdụ ndị kasị mma?
Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ndị Gị ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ . . . [ha] ga-ebili.” Bible na-ekwukwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 26:19; Abụ Ọma 37:29.
Iji nwee ezi obi ike ná nkwa ndị dị otú ahụ, ọ dị anyị mkpa ịza ajụjụ ụfọdụ ndị bụ́ isi: N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji anwụ anwụ? Olee ebe ndị nwụrụ anwu nọ? Ànyị pụkwara isi aṅaa jide n’aka na ha pụrụ ịdị ndụ ọzọ?
Ọnwụ, na Ihe Na-eme Mgbe Anyị Nwụrụ
Bible na-eme ka o doo anya na Chineke ebughị n’uche ná mmalite ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. O kere di na nwunye mbụ bụ́ Adam na Iv, tinye ha na paradaịs elu ala a kpọrọ Iden ma nye ha iwu ka ha mụọ ụmụ ma gbasaa ebe obibi Paradaịs ha ruo elu ụwa dum. Ha ga-anwụ nanị ma ọ bụrụ na ha enupụ isi ná ntụziaka ya.—Jenesis 1:28; 2:15-17.
Ebe Adam na Iv na-enweghị ekele maka obiọma Chineke, ha nupụrụ isi, e wee nye ha ntaramahụhụ ahụ e kwuru na a ga-enye ha. “Ị ga-alọta n’ala,” ka Chineke gwara Adam, “n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Tupu e kee Adam, ọ dịghị adị; ọ bụ ájá. N’ihi nnupụisi, ma ọ bụ mmehie Adam, a mara ya ikpe ịlaghachi n’ájá, gaa n’ọnọdụ nke adịghị adị.
Ya mere ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị ndụ. Bible na-egosi ọdịiche dị na ha abụọ, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi.” (Ndị Rom 6:23, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Iji gosi na ọnwụ bụ ịnọ n’ọnọdụ nke amatụghị ihe na-emenụ, Bible na-ekwu, sị: “N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe mmadụ nwụrụ, Bible na-akọwa, sị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche)—Abụ Ọma 146:3, 4.
Otú ọ dị, ebe ọ bụ nanị Adam na Iv nupụrụ isi n’iwu ahu n’Iden, n’ihi gịnị ka anyị nile ji anwụ anwụ? Ọ bụ n’ihi na a mụrụ anyị nile mgbe Adam nupụworo isi, n’ihi ya kwa anyị nile ketara mmehie na ọnwụ n’aka ya. Dị ka Bible na-akọwa: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12; Job 14:4.
Ma mmadụ pụru ịjụ, sị: ‘Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị?’ Ọtụtụ ndị akụziwo nke a, ọbụna na-asị na ọnwụ bụ ihe na-eduba n’ụdị ndụ ọzọ. Ma echiche ahụ esiteghị na Bible. Kama nke ahụ, Okwu Chineke na-ezi na ị bụ mkpụrụ obi, na mkpụrụ obi gị bụ gị onwe gị kpọmkwem, gụnyere anụ ahụ na echiche gị nile. (Jenesis 2:7; Jeremaịa 2:34; Ilu 2:10) Ọzọkwa, Bible na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Ọ dịghị ebe Bible na-ezi na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ bụ́ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị.
Otú Ndị Mmadụ Pụrụ Isi Dị Ndụ Ọzọ
Mgbe mmehie na ọnwụ batasịrị n’ụwa, Chineke kpughere na ọ bụ nzube ya ime ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ. N’ihi ya Bible na-akọwa, sị: “Abraham . . . na-agụ na Chineke pụrụ ime ka [ọkpara ya bụ́ Aịsak] si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” (Ndị Hibru 11:17-19) Obi ike Abraham nwere ehieghị ụzọ, n’ihi na Bible na-ekwu banyere onye ahụ bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, sị: “Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ: n’ihi na ọ bụ n’ebe Ọ nọ ka mmadụ nile dị ndụ.”—Luk 20:37, 38.
Ee, ọ bụghị nanị na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile nwere ike ime ya, kama o nwekwara ọchịchọ ịkpọlite ndị ọ na-ahọrọ n’ọnwụ. Jisọs Kraịst n’onwe ya kwuru, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
Oge na-adịghị anya mgbe Jisọs kwusịrị nke a, o zutere ndị na-aga ili ozu ka ha si n’obodo Israel bụ́ Nain na-apụta. Nwa okorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ nanị nwa nke otu nwanyị di ya nwụrụ mụtara. Mgbe ọ hụrụ na ọ na-eru újú nke ukwuu, Jisọs nwere ọmịiko n’ahụ ya. Ya mere, n’ịgwa ozu ahụ okwu, o nyere iwu, sị: “Nwa okorobịa, gị ka M na-asị, Bilie!” Nwoke ahụ wee bilie, Jisọs akpọnye ya nne ya.—Luk 7:11-17.
Dị ka ọ dị n’ihe banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ, e nwere oké ọṅụ mgbe Jisọs jere n’ụlọ Jaịrọs, bụ́ onyeisi oche ụlọ nzukọ ndị Juu. Nwa ya nwanyị dị afọ 12 anwụwọ. Ma mgbe Jisọs bịarutere n’ụlọ Jaịrọs, ọ gara ebe nwa ahụ nwụrụ anwụ nọ ma kwuo, sị: “Nwata nwanyị, bilie!” O wee bilie!—Luk 8:40-56.
E mesịa, enyi Jisọs bụ́ Lazarọs nwụrụ. Mgbe Jisọs bịarutere n’ụlọ ya, Lazarọs anwụworị eri ụbọchị anọ. N’agbanyeghị na nwanne ya nwanyị bụ́ Mata na-eru újú n’ụzọ dị ukwuu, o kwupụtara olileanya ya, na-asị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwu bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Ma Jisọs gara n’ili ahụ, nye iwu ka e nupụ nkume e ji mechie ya, o wee kpọọ òkù, sị: “Lazarọs pụta n’èzí!” O wee pụta!—Jọn 11:11-44.
Ugbu a cheedị banyere nke a: Gịnị bụ ọnọdụ Lazarọs eri ụbọchị anọ ahụ ọ nwụrụlarịị? Lazarọs ekwughị ihe ọ bụla banyere inwe ọṅụ zuru ezu n’eluigwe ma ọ bụ ịnọ n’ọkụ mmụọ ebe ịta ahụhụ, bụ́ nke o doro anya na ọ gaara ekwu ma a sị na ọ gara ebe ahụ. Ee e, Lazarọs amatụghị ihe ọ bụla mgbe ọ nwụrụ, ọ gakwaara anọgide otú ahụ ruo mgbe ọ ga-abịa ná “mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ” ma a sị na Jisọs eweghachighị ya ná ndụ mgbe ahụ.
Ọ bụ ezie na ọrụ ebube ndị a Jisọs rụrụ bara uru ruo nanị nwa oge, ebe ọ bụ na ndị ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ nwụkwara ọzọ. Ka o sina dị, o nyere ihe àmà n’afọ 1,900 gara aga bụ́ nke na-egosi na site n’ike Chineke, ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịdị ndụ ọzọ n’ezie! Ya mere site n’ọru ebube ya nile, Jisọs gosiri n’ụzọ dị nta ihe ga-eme n’ụwa n’okpuru Alaeze Chineke.
Mgbe Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya Nwụrụ
Mgbe onye iro ahụ bụ́ ọnwụ gburu mmadụ, ị pụrụ iru újú n’ụzọ dị ukwuu, n’agbanyeghị na ị pụrụ inwe olileanya ná mbilite n’ọnwụ. Abraham nwere okwukwe na nwunye ya ga-adị ndụ ọzọ, ma anyị na-agụ, sị: “Abraham wee bịa itiri Sera aka n’obi, na ịkwara ya ákwá.” (Jenesis 23:2) Gịnịkwa banyere Jisọs? Mgbe Lazarọs nwụrụ, ọ ‘sụrụ ude n’ime mmụọ Ya, meekwa ka obi Ya lọọ mmiri,’ ngwa ngwa nke ahụ gasịkwara, “anya mmiri pụrụ n’anya” ya. (Jọn 11:33, 35) Ya mere, mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụrụ, ịkwa ákwá adịghị egosi adịghị ike.
Mgbe nwatakịrị nwụrụ, ọ na-esikarịrị nne ya ike. Ya mere Bible na-ekweta na nne pụrụ iru újú n’ụzọ dị ilu. (2 Ndị Eze 4:27) N’ezie, ọ na-esikwara nna nke nwa ahụ nwụru anwụ ike. “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mụ onwe m anwụwo n’ọnọdụ gị,” bụ arịrị Eze Devid kwara mgbe nwa ya bụ́ Absalọm nwụrụ.—2 Samuel 18:33.
Ma, n’ihi na i nwere obi ike ná mbilite n’ọnwụ, ị gaghị anọgide na-eru újú. Dị ka Bible na-ekwu, ọ ‘gaghị ewute gị ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị olileanya.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Kama nke ahụ, ị ga-abịa Chineke nso site n’ekpere, Bible na-ekwekwa nkwa na “ya onwe ya ga-anagidekwa gị.”—Abụ Ọma 55:22.
Ọ gwụlakwa ma e gosịrị nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile sitere na Bible Nsọ nke Union Version na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a.