Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 43 p. 305-313
  • Obodo Ọma Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Obodo Ọma Ahụ
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịtụ Obodo ahụ n’Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀
  • Ngwá Ọrụ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
  • Obodo nke Ìhè
  • Ìhè nye Mba Nile
  • Osimiri nke Mmiri nke Ndụ
  • Osisi nke Ndụ
  • Abalị Agaghị Adịkwa Ọzọ
  • Mmezu Obi Ụtọ nke Mkpughe
  • Gịnị Bụ Jeruselem Ọhụrụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ọdịiche Dị n’Etiti Jerusalem Elu Ala na Jerusalem nke Eluigwe
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 43 p. 305-313

Isi nke 43

Obodo Ọma Ahụ

Ọhụụ 16—Mkpughe 21:9–22:5

Isiokwu: Nkọwa nke Jerusalem Ọhụrụ

Oge mmezu ya: Mgbe mkpagbu ukwu ahụ gasịrị, mgbe a tụbakwara Setan n’abyss

1, 2. (a) Olee ebe otu mmụọ ozi kpọọrọ Jọn jee ka ọ hụ Jerusalem Ọhụrụ, oleekwa ọdịiche anyị na-ahụta n’ebe a? (b) N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ mmezu dị ebube nke Mkpughe?

OTU mmụọ ozi akpọrọwo Jọn banye n’ọzara igosi ya Babilọn Ukwu ahụ. Ugbu a, otu n’ime òtù ndị mmụọ ozi ahụ duuru Jọn gaa n’otu ugwu dị oké elu. Lee nnọọ ihe dị iche ọ hụrụ! Ihe ọ hụrụ ebe a abụghị obodo na-adịghị ọcha, nke rụrụ arụ, dị ka Babilọn ahụ bụ akwụna, kama ọ bụ Jerusalem Ọhụrụ—nke dị ọcha, nke ime mmụọ, nke dị nsọ—o sikwa n’eluigwe n’onwe ya na-arịdata.—Mkpughe 17:1, 5.

2 Ọbụna Jerusalem nke elu ala adịghị mgbe o nwere ebube dị ka nke a. Jọn na-agwa anyị, sị: “Otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị nwere ọkwá asaa ahụ, ndị e boro ibu ihe otiti asaa ikpeazụ, wee bịa; o wee kpanyere m ụka, sị, Bịarị, m ga-egosi gị nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ. O wee bupụ m n’ime mmụọ nsọ garuo oké ugwu dị elu, wee gosi m obodo nsọ ahụ, bụ́ Jerusalem, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, site n’ebe Chineke nọ, na-enwe ebube Chineke.” (Mkpughe 21:9-11a) Site n’ọnọdụ dị mma n’elu oké ugwu ahụ, Jọn na-ekiri ọmarịcha obodo ahụ n’akụkụ ya nile mara mma. Ndị nwere okwukwe ejiwo ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya ọbịbịa ya eri ụmụ mmadụ dabara ná mmehie na ọnwụ. O mesịwo bịarute! (Ndị Rom 8:19; 1 Ndị Kọrint 15:22, 23; Ndị Hibru 11:39, 40) Ọ bụ obodo ime mmụọ ahụ dị ebube, nke 144,000 ndị ji ịnọgidesi ike na-eguzosi ike n’ezi ihe mejupụtara, nke mara oké mma n’ịdị nsọ ya, na-egosipụtakwa ebube nke Jehova n’onwe ya. N’ebe a ka e nwere mmezu dị ebube nke Mkpughe ahụ!

3. Olee ụzọ Jọn si kọwaa ịma mma nke Jerusalem Ọhụrụ?

3 Ịma mma nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ anaghị enye ọnụ okwu: “Ìhè ọ na-enye yiri nkume dịkarịsịrị oké ọnụ ahịa, dị ka nkume jasper, dị ka crystal: o nwekwara oké mgbidi dị elu; nweekwa ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ, nweekwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ n’ọnụ ụzọ ámá ahụ; nweekwa aha e dekwasịworo ha, nke bụ aha nke ebo iri na abụọ nke ụmụ Israel: n’akụkụ ọwụwa anyanwụ ọnụ ụzọ ámá atọ dị; n’akụkụ ugwu ọnụ ụzọ ámá atọ dịkwa; n’akụkụ ndịda ọnụ ụzọ ámá atọ dịkwa; n’akụkụ ọdịda anyanwụ ọnụ ụzọ ámá atọ dịkwa. Mgbidi obodo ahụ nwekwara ntọala iri na abụọ, n’elu ha ka e dererịị aha iri na abụọ nke ndị ozi iri na abụọ ahụ nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:11b-14) Lee nnọọ ka o si zie ezị na mmetụta mbụ Jọn dekọrọ bụ nke mgbukepụ na-enwu enwu! N’igbukepụ egbukepụ dị ka nwunye ọhụrụ, Jerusalem Ọhụrụ ahụ bụ onye enyemaka kwesịịrị Kraịst. Ọ na-egbukepụ n’ụzọ dị mma, dị ka o si kwesị ihe okike nke “Nna nke ìhè.”—Jemes 1:17.

4. Gịnị na-egosi na Jerusalem Ọhụrụ abụghị mba Israel anụ ahụ?

4 N’ọnụ ụzọ ámá 12 ya, e dekwasịrị aha nke ebo 12 nke Israel. Ya mere, ihe mejupụtara obodo ihe atụ nke a bụ 144,000 ndị a kara akara “site n’ebo nile ọ bụla nke ụmụ Israel.” (Mkpughe 7:4-8) N’ikwekọ na nke a, nkume ntọala ndị ahụ nwere aha ndị ozi 12 nke Nwa Atụrụ ahụ. Ee, Jerusalem Ọhụrụ abụghị mba nke Israel anụ ahụ, bụ́ nke e guzobere n’elu ụmụ 12 nke Jekọb. Ọ bụ Israel ime mmụọ, nke e guzobere n’elu “ndị ozi na ndị amụma.”—Ndị Efesọs 2:20.

5. Gịnị ka “oké mgbidi dị elu” nke Jerusalem Ọhụrụ, nakwa eziokwu ahụ bụ na e debere ndị mmụọ ozi n’ọnụ ụzọ ọ bụla, na-egosi?

5 Obodo ihe atụ ahụ nwere mgbidi dị oké elu. N’oge ochie, a na-ewu mgbidi nke obodo maka nchebe iji mee ka ndị iro ghara ịbata. “Oké mgbidi dị elu” nke Jerusalem Ọhụrụ gosiri na ọ nọ ná nchebe n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dịghị onye iro ọ bụla nke ezi omume, onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu, nke ga-enwe ike ịbata. (Mkpughe 21:27) Ma nye ndị ahụ e megheere ụzọ ịbata, ịbata n’ime obodo ọma nke a yiri ịbanye na Paradaịs. (Mkpughe 2:7) Mgbe a chụpụsịrị Adam, e guzobere ndị cherub n’ihu Paradaịs nke mbụ ahụ ka ụmụ mmadụ na-adịghị ọcha wee ghara ịbanye. (Jenesis 3:24) N’otu aka ahụ, e debere ndị mmụọ ozi n’ọnụ ụzọ nke ọ bụla nke obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem iji wee hụ maka nchebe ime mmụọ nke obodo ahụ. N’eziokwu, n’ime mgbe ikpeazụ ndị a, ndị mmụọ ozi anọwo na-eche ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ nche, bụ́ nke na-aghọ Jerusalem Ọhụrụ ahụ, pụọ ná mmerụ nke Babilọn.—Matiu 13:41.

Ịtụ Obodo ahụ n’Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀

6. (a) Olee ụzọ Jọn si kọwaa ọ̀tụ̀tụ̀ a tụrụ obodo ahụ, gịnịkwa ka ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ na-egosi? (b) Gịnị pụrụ ikọwa na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ e ji mee ihe bụ “dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmadụ si dị, ya bụ, nke mmụọ ozi”? (Lee nkọwa ala ala peji.)

6 Jọn gara n’ihu n’akụkọ ya, sị: “Onye ahụ nke na-akpanyere m ụka nwekwara ihe ọ̀tụ̀tụ̀, bụ́ amị nke ọlaedo, ka o wee tụọ obodo ahụ, na ọnụ ụzọ ámá ya nile, na mgbidi ya. Obodo ahụ nwekwara nkuku anọ hà nhata, ogologo ya hàkwa ka obodobo ya: o wee were amị ahụ tụọ obodo ahụ, [puku furlong iri na abụọ]: ogologo ya na obodobo ya na elu ya hà. O wee tụọ mgbidi ya, [otu narị cubit na iri anọ na anọ], dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmadụ si dị, ya bụ, nke mmụọ ozi.” (Mkpughe 21:15-17) Mgbe a tụrụ ụlọ nsọ ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, nke a kwere nkwa mmezu nke nzube nile nke Jehova n’ihe banyere ya. (Mkpughe 11:1) Ugbu a, ọ̀tụ̀tụ̀ nke mmụọ ozi ahụ na-atụ Jerusalem Ọhụrụ ahụ gosiri otú nzube Jehova nile banyere obodo nke a dị ebube si bụrụ ihe na-enweghị mgbanwe.a

7. Gịnị bụ ihe kwesịrị ịrịba ama banyere ọ̀tụ̀tụ̀ nile nke obodo ahụ?

7 Lee nnọọ obodo kwesịrị ịrịba ama nke a bụ! Akụkụ anọ hà nhata nke gburugburu ya dị 12,000 furlong (ihe dị ka 2,220 kilomita), nke mgbidi ya dị elu 144 cubit gbara gburugburu, ma ọ bụ 64 mita. Ọ dịghị obodo nkịtị pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị otú ahụ. Ọ ga-anọchi mbara ala nke ihe dị ka okpukpu 14 nke Israel nke oge a, ịdị elu ya ga-erukwa ihe dị ka 560 kilomita banye na mbara igwe! E zitere Mkpughe n’ihe ịrịba ama. Ya mere, gịnị ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a na-agwa anyị banyere Jerusalem Ọhụrụ ahụ nke dị n’eluigwe?

8. Gịnị ka e gosiri site na (a) mgbidi obodo ahụ dị elu 144 cubit? (b) ọ̀tụ̀tụ̀ obodo ahụ nke dị 12,000 furlong? (ch) obodo ahụ ịbụ akụkụ anọ hà nhata?

8 Mgbidi ndị ahụ ịdị elu ha dị 144 cubit na-echetara anyị na ihe mejupụtara obodo ahụ bụ 144,000 ndị e ji mmụọ nabata dị ka ụmụ Chineke. Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ 12 nke dị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ 12,000 furlong nke obodo ahụ—nke ogologo ya, obodobo ya, na ịdị elu ya hà nhata—bụ nke a na-eji eme ihe n’ụzọ ihe atụ n’ihe metụtara nhazi n’amụma Bible. Ya mere, Jerusalem Ọhụrụ bụ nhazi na-enweghị atụ e mere iji wee mezuo nzube ebighị ebi nke Chineke. Jerusalem Ọhụrụ, ya na Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst, bụ nhazi Alaeze nke Jehova. E nwekwara ihe banyere ọdịdị nke obodo ahụ: nke bụ akụkụ anọ hà nhata. N’ụlọ nsọ nke Solomọn, Ebe Kasị Nsọ ahụ, nke nwere ihe nnọchianya nke ọnụnọ Jehova, bụkwa akụkụ anọ hà nhata. (1 Ndị Eze 6:19, 20) Ya mere, lee ka o si kwesị ekwesị na Jerusalem Ọhụrụ, bụ́ nke ebube Jehova n’onwe ya na-enye ìhè, bụ nke a na-ahụ dị ka akụkụ anọ buru ibu nke hà nhata n’ụzọ zuru okè. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ya nile bụ nke a haziri n’ụzọ zuru okè. Ọ bụ obodo nke na-enweghị ihe ndị na-ezughị okè ma ọ bụ ntụpọ.—Mkpughe 21:22.

Ngwá Ọrụ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa

9. Olee ụzọ Jọn si kọwaa ngwá ọrụ ndị e ji wuo obodo ahụ?

9 Jọn gara n’ihu ná nkọwa ya, sị: “Ihe e ji rụọ mgbidi ahụ bụ jasper: obodo ahụ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha, dị ka enyo na-enwu enwu. E werewo nkume nile ọ bụla dị oké ọnụ ahịa chọọ ntọala nke mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala mbụ bụ jasper; nke abụọ bụ sapphire; nke atọ bụ chalcedony; nke anọ bụ emerald; nke ise bụ sardonyx; nke isii bụ sardius; nke asaa bụ chrysolite; nke asatọ bụ beryl; nke iteghete bụ topaz; nke iri bụ chrysoprase; nke iri na otu bụ jacinth; nke iri na abụọ bụ amethyst. Ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ ahụ bụ pearl iri na abụọ; e ji otu pearl mee ọnụ ụzọ ámá ọ bụla n’ime ọnụ ụzọ ámá ahụ nile: ámá obodo ahụ bụ ọlaedo a nụchara anụcha, dị ka enyo na-ahụ ụzọ.”—Mkpughe 21:18-21.

10. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ na e ji jasper, ọlaedo, na “nkume nile ọ bụla dị oké ọnụ ahịa” wuo obodo ahụ na-egosi?

10 Owuwu nke obodo ahụ mara oké mma n’ezie. Kama iji ngwá ọrụ nkịtị ndị a na-enweta n’elu ala dị ka ájá ụrọ ma ọ bụ nkume, anyị na-agụ banyere jasper, ọlaedo a nụchara anụcha, na “nkume nile ọ bụla dị oké ọnụ ahịa.” Lee nnọọ ka ihe ndị a si see onyinyo kwesịrị ekwesị nke ngwá ọrụ ndị si n’eluigwe bịa! Ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ịdị ebube karịa ya. E ji ezi ọlaedo machie igbe ọgbụgba ndụ oge ochie ahụ, n’ime Bible, ihe ndị a na-anọchitekarị anya ihe ndị dị mma, baakwa ezi uru. (Ọpụpụ 25:11; Ilu 25:11; Aịsaịa 60:6, 17) Ma Jerusalem Ọhụrụ ahụ dum, na ọbụna ámá ya, bụ nke e jiri “ọlaedo a nụchara anụcha, dị ka enyo na-enwu enwu” rụọ, na-egosipụta ịma mma na ịdị oké ọnụ ahịa nke dị ịtụnanya.

11. Gịnị na-emesi obi ike na ndị mejupụtara Jerusalem Ọhụrụ ga na-enwu enwu site n’ịdị mma kasị elu nke ịdị ọcha ime mmụọ?

11 Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-agbaze ọlaedo nke pụrụ imepụta ọlaedo ruru mma otú ahụ. Ma Jehova bụ Onye Nnụcha Kasị Ukwuu. Ọ na-anọdụ ala “dị ka onye nnụcha ọlaọcha nke na-eme ka ọ dị ọcha,” ọ na-anụchakwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi so n’Israel ime mmụọ ahụ n’otu n’otu “dị ka ọlaedo na ọlaọcha,” na-ewepụ adịghị ọcha nile site n’ime ha. Ọ bụ nanị ndị a nụchaworo n’ezie, meekwa ka ha dị ọcha ga-emesịa mezuo Jerusalem Ọhụrụ ahụ, n’ụzọ dị otú a kwa, Jehova na-eji ngwá ọrụ iwu ụlọ ndị dị ndụ na-ewu obodo ahụ, bụ́ ndị na-enwu enwu site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị mma kasị elu nke ịdị ọcha ime mmụọ.—Malakaị 3:3, 4.

12. Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na (a) e ji nkume 12 dị oké ọnụ ahịa chọọ ntọala obodo ahụ mma? (b) ọnụ ụzọ ámá nke obodo ahụ bụ pearl?

12 Ọbụna ntọala nile nke obodo ahụ mara mma, ebe e ji nkume 12 dị oké ọnụ ahịa chọọ ha mma. Nke a na-echetara anyị onyeisi nchụàjà ndị Juu oge ochie, bụ́ onye na-eyi ephod n’ụbọchị ememe, nke e ji nkume 12 dị iche iche ndị dị oké ọnụ ahịa chọọ mma, bụ́ ndị yitụrụ ndị a kọwara n’ebe a. (Ọpụpụ 28:15-21) N’ezie nke a abụghị ihe ndaba efu! Kama nke ahụ, ọ na-emesi ike ọrụ onye nchụàjà nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ na-arụ, nke Jisọs, bụ́ Onyeisi Nchụàjà dị ukwuu, bụ “oriọna” ya. (Mkpughe 20:6; 21:23; Ndị Hibru 8:1) Ọ bụkwa site na Jerusalem Ọhụrụ ahụ ka a na-ezitere ihe a kpọrọ mmadụ abamuru nile nke ije ozi Jisọs dị ka onyeisi nchụàjà. (Mkpughe 22:1, 2) Ọnụ ụzọ ámá 12 nke obodo ahụ, nke nke ọ bụla n’ime ha bụ pearl mara oké mma, na-echetara anyị ilu Jisọs nke ji Alaeze ahụ tụnyere pearl nke dị oké ọnụ ahịa. Ọ ga-abụ na ndị nile si n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ gabiga egosiwo ezi nghọta nke uru ihe ime mmụọ.—Matiu 13:45, 46; tụlee Job 28:12, 17, 18.

Obodo nke Ìhè

13. Gịnị ọzọ ka Jọn kwuru banyere Jerusalem Ọhụrụ, n’ihi gịnịkwa ka mkpa ụlọ nsọ nkịtị na-adịghị obodo ahụ?

13 N’oge Solomọn, ihe kasị dịrị mkpa na Jerusalem bụ otu ụlọ nsọ nke e wuru n’ala kasị elu n’Ugwu Moraịa nke dị n’ebe ugwu. Ma gịnị banyere Jerusalem Ọhụrụ? Jọn na-asị: “Ọ dịghịkwa ụlọ nsọ ọ bụla m hụrụ n’ime ya: n’ihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ya na Nwa Atụrụ ahụ, bụ ụlọ nsọ ya. Anyanwụ ma ọ bụ ọnwa adịghịkwa obodo ahụ mkpa, ka ha mụkwasị ya: n’ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna ya bụkwa Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:22, 23) N’eziokwu, ọ dịghị mkpa iwu ụlọ nsọ nkịtị n’ebe a. Ụlọ nsọ ndị Juu oge ochie ahụ bụ nanị ihe atụ, ihe bụkwa ezie nke ihe atụ ahụ, bụ́ oké ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, adịwo adị kemgbe Jehova tere Jisọs mmanụ dị ka Onyeisi Nchụàjà n’afọ 29 O.A. (Matiu 3:16, 17; Ndị Hibru 9:11, 12, 23, 24) Ụlọ nsọ na-egosikwa na e nwere òtù ndị nchụàjà na-achụrụ Jehova àjà n’aha ndị mmadụ. Ma ndị nile so na Jerusalem Ọhụrụ ahụ bụcha ndị nchụàjà. (Mkpughe 20:6) Oké àjà ahụ, bụ́ ndụ mmadụ zuru okè nke Jisọs, abụrụwokwa nke a chụrụ otu ugbo ruo mgbe ebighị ebi. (Ndị Hibru 9:27, 28) Ọzọkwa, onye ọ bụla nke bi n’obodo ahụ pụrụ ijekwuru Jehova n’onwe ya.

14. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị Jerusalem Ọhụrụ mkpa ka anyanwụ na ọnwa wakwasị ya? (b) Olee ihe amụma Aịsaịa kwuru banyere nzukọ eluigwe na ala nke Jehova, oleekwa ụzọ nke a si metụta Jerusalem Ọhụrụ?

14 Mgbe ebube Jehova gabigara n’akụkụ Mosis n’Ugwu Saịnaị, o mere ka ihu Mosis na-enwu enwu ruo n’ókè nke na ọ dị mkpa ka o kpuchie ya pụọ n’anya ndị Israel ibe ya. (Ọpụpụ 34:4-7, 29, 30, 33) Ya mere, ị̀ pụrụ iji echiche gị hụ igbu maramara nke obodo nke e ji ebube Jehova na-enye ìhè mgbe nile? Obodo dị otú ahụ agaghị enwe oge anyasị. Ọ gaghị enwe mkpa ọ bụla maka anyanwụ ma ọ bụ ọnwa nkịtị. Ọ ga-anọgide na-enye ìhè ruo mgbe ebighị ebi. (Tụlee 1 Timoti 6:16.) Oké ìhè dị otú ahụ na-enwu enwu na Jerusalem Ọhụrụ ahụ. N’eziokwu, nwunye ọhụrụ nke a na Di ya onye bụkwa Eze na-aghọ isi obodo nke nzukọ eluigwe na ala nke Jehova—“nwanyị” ya, “Jerusalem nke dị n’elu”—bụ́ nke Aịsaịa buru amụma banyere ya, sị: “Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè ọzọ n’ehihie; ma n’onwu mara mara ọnwa agaghị enye gị ìhè: ma Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi, Chineke gị ga-aghọkwara gị ịma mma gị. Anyanwụ gị agaghị adakwa ọzọ, ọnwa agaghị ewepụkwa onwe ya: n’ihi na Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi, ụbọchị nile nke iru újú gị ewee zuo ezu.”—Aịsaịa 60:1, 19, 20; Ndị Galetia 4:26.

Ìhè nye Mba Nile

15. Okwu dị aṅaa dị ná Mkpughe banyere Jerusalem Ọhụrụ yiri amụma Aịsaịa?

15 Otu amụma ahụ kwukwara, sị: “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu mara mara nke ọwụwa gị.” (Aịsaịa 60:3) Mkpughe gosiri na okwu ndị a ga-agụnye Jerusalem Ọhụrụ: “Mba nile ga-ewerekwa ìhè ya jegharịa: ndị eze nke ụwa na-ewebatakwa ebube ha n’ime ya. A gaghị emechikwa ọnụ ụzọ ámá ya n’ehihie ma ọlị (n’ihi na abalị agaghị adị n’ebe ahụ): ha ga-ewebatakwa ebube na nsọpụrụ nke mba nile n’ime ya.”—Mkpughe 21:24-26.

16. Olee ndị bụ “mba nile” ndị ahụ ga-eje ije site n’ìhè nke Jerusalem Ọhụrụ?

16 Olee ndị bụ “mba nile” ndị a na-ejegharị n’ìhè nke Jerusalem Ọhụrụ? Ha bụ ụmụ mmadụ, ndị bụbu akụkụ nke mba nile nke ajọ ụwa nke a, ndị na-agbaso ìhè ahụ nke e gosiri site n’obodo a dị ebube nke dị n’eluigwe. Ndị mbụ so n’ime ha bụ oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị hapụworo “mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile,” ndị sokwa òtù Jọn ahụ na-efe Chineke ehihie na abalị. (Mkpughe 7:9, 15) Mgbe Jerusalem Ọhụrụ sisịrị n’eluigwe rịdata, mgbe Jisọs jisịkwara mkpịsị ugodi nile nke ọnwụ na Hedis kpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-esonyere ha, bụ́ ndị sibu ná “mba nile,” ndị bịara wee hụ Jehova na Ọkpara ya n’anya, bụ́ Di yiri Nwa Atụrụ nke Jerusalem Ọhụrụ.—Mkpughe 1:18.

17. Olee ndị bụ “ndị eze nke ụwa” ndị ‘na-ewebata ebube ha’ n’ime Jerusalem Ọhụrụ?

17 Ya mere, olee ndị bụ “ndị eze nke ụwa” ndị “na-ewebatakwa ebube ha n’ime ya”? Ha abụghị ndị eze nkịtị nke elu ala dị ka otu òtù, n’ihi na ha na-aga ná mbibi mgbe ha na-ebuso Alaeze Chineke agha n’Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16; 19:17, 18) Ndị eze ndị a hà pụrụ ịbụ ụfọdụ ndị nọ n’ọkwá dị elu ná mba nile, ndị ghọrọ akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ, ka hà bụ ndị eze bilitere n’ọnwụ, ndị doro onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke n’ime ụwa ọhụrụ ahụ? (Matiu 12:42) Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na n’akụkụ ka ukwuu, ebube nke ndị eze dị otú ahụ bụ nke ụwa, ọ dịwokwa anya ọ danyụrụ. Ya mere, “ndị eze nke ụwa” ndị ahụ na-ewebata ebube ha n’ime Jerusalem Ọhụrụ aghaghị ịbụ 144,000 ahụ, ndị ‘a gbatara site n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla’ iso Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst chịa achịa dị ka ndị eze. (Mkpughe 5:9, 10; 22:5) Ha na-ewebata ebube Chineke nyere ha n’ime obodo ahụ iji tụkwasị ihe n’igbu mara mara ya.

18. (a) Olee ndị a ga-agụpụ na Jerusalem Ọhụrụ? (b) Olee ndị nanị ka a ga-ekwe ka ha banye n’obodo ahụ?

18 Jọn gara n’ihu, sị: “Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla e merụrụ emerụ, ma ọ bụ onye na-eme ihe arụ na ụgha, ga-aba n’ime ya ma ọlị: kama ọ bụ nanị ndị e deworo aha ha n’akwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:27) Ọ dịghị ihe ọ bụla usoro ihe nke Setan merụworo nke pụrụ ịbụ akụkụ Jerusalem Ọhụrụ. Ọ bụ ezie na ọnụ ụzọ ámá ya nile na-eghe oghe mgbe nile, ọ dịghị onye ọ bụla nke “na-eme ihe arụ na ụgha” nke a ga-ekwere ka ọ banye. A gaghị enwe ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ime obodo ahụ ma ọ bụ onye òtù ọ bụla nke Babilọn Ukwu ahụ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anwaa imetọ obodo ahụ site n’imerụ ndị gaje ịbụ ndị òtù ya mgbe ha ka nọ n’elu ala ebe a, a ga-eme ka mgbalị ha nile kụọ afọ n’ala. (Matiu 13:41-43) Ọ bụ nanị “ndị e deworo aha ha n’akwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ,” bụ́ 144,000 ahụ, ga-emesịa banye n’ime Jerusalem Ọhụrụ.b—Mkpughe 13:8; Daniel 12:3.

Osimiri nke Mmiri nke Ndụ

19. (a) Olee ụzọ Jọn si kọwaa Jerusalem Ọhụrụ dị ka nke na-ewetara ụmụ mmadụ ngọzi? (b) Olee mgbe “osimiri nke mmiri nke ndụ” ahụ na-eru, ànyị sikwa aṅaa mara?

19 Jerusalem Ọhụrụ ahụ mara oké mma ga-ewetara ụmụ mmadụ nọ n’elu ala ngọzi ndị dị ebube. Nke a bụ ihe ọzọ Jọn matara: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ pụta, n’etiti ámá ya.” (Mkpughe 22:1, 2a) Olee mgbe “osimiri” nke a na-erupụta? Ebe ọ bụ na o si “n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ” na-erupụta, ọ pụrụ ịbụ nanị mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitesịworo na 1914. Nke ahụ bụ oge maka ihe omume ahụ a mara ọkwa ya n’ọfụfụ nke opi nke asaa ahụ nakwa ịma ọkwa ahụ dị ebube nke bụ: “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst ya.” (Mkpughe 11:15; 12:10) N’oge ọgwụgwụ a, mmụọ ahụ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụụ anọwo na-akpọ ndị obi ha ziri ezi ịbịa nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu. Ndị dị otú ahụ ga-anọgide na-enweta mmiri sitere n’osimiri ahụ ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe a, mgbe nke ahụ gasịrị, mmiri ahụ ga-adịgide ruo n’ụwa ọhụụ, mgbe Jerusalem Ọhụrụ ‘siri n’eluigwe rịdata site n’ebe Chineke nọ.’—Mkpughe 21:2.

20. Gịnị na-egosi na e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmiri nke ndụ dị adị ugbu a?

20 Nke a abụghị mbụ e nyere ihe a kpọrọ mmadụ mmiri na-enye ndụ. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs kwuru banyere mmiri na-enye ndụ ebighị ebi. (Jọn 4:10-14; 7:37, 38) Ọzọkwa, n’oge na-adịghị anya Jọn gaje ịnụ òkù ịhụnanya ahụ bụ: “Mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) A na-akpọ òkù a ọbụna ugbu a, na-egosi na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmiri nke ndụ dị adị ugbu a. Ma n’ụwa ọhụrụ ahụ, mmiri ndị ahụ ga-esi n’ocheeze Chineke rupụta site na Jerusalem Ọhụrụ dị ka nnukwute osimiri.

21. Gịnị ka “osimiri nke mmiri nke ndụ” ahụ sere onyinyo ya, oleekwa otú ọhụụ Ezikiel nke osimiri nke a si enyere anyị aka ịmara?

21 Gịnị bụ “osimiri nke mmiri nke ndụ” nke a? Mmiri nkịtị bụ ihe dị mkpa maka ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ erighị nri, ọ pụrụ ịnọ ndụ ruo izu ole na ole, ma ọ bụrụ na ọ ṅụghị mmiri, ọ ga-anwụ n’ihe dị ka otu izu. Mmiri bụkwa ihe a na-eji eme ka ihe dị ọcha, dịkwa mkpa maka inwe ahụ ike. Otú a, mmiri nke ndụ ahụ aghaghị ise onyinyo otu ihe dị mkpa maka ndụ na ahụ ike nke ihe a kpọrọ mmadụ. E nyekwara Ezikiel onye amụma ọhụụ nke “osimiri nke mmiri nke ndụ” nke a, n’ime ọhụụ ya kwa, osimiri ahụ sitere n’ụlọ nsọ rupụta wee sọdaa banye n’ime Osimiri Nnu ahụ. Mgbe ahụ, otu oké ọrụ ebube weere ọnọdụ! Mmiri ahụ nke ihe ọ bụla dị ndụ na-adịghị, nke jupụtakwara n’ọgwụ bụ nke a gbanwere gaa ná mmiri dị mma nke azụ jupụtara! (Ezikiel 47:1-12) Ee, osimiri ahụ a hụrụ n’ọhụụ na-eweghachite ihe nwụburu anwụ ná ndụ, na-emesi eziokwu ahụ ike nke bụ na osimiri ahụ nke mmiri nke ndụ sere onyinyo ndokwa Chineke mere site n’aka Jisọs Kraịst iji weghachitere agbụrụ mmadụ ‘nwụrụ anwụ’ ndụ mmadụ zuru okè. Osimiri nke a “na-enwu dị ka crystal,” na-egosi ịdị ọcha na ịdị nsọ nke ndokwa nile nke Chineke. Ọ dịghị ka “mmiri” nile na-akpata ọnwụ nke ọbara metọworo, nke Krisendọm.—Mkpughe 8:10, 11.

22. (a) Olee ebe osimiri ahụ malitere, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị ekwesị? (b) Gịnị ka mmiri nke ndụ ahụ metụtara, gịnịkwa ka osimiri ihe atụ a gụnyere?

22 Osimiri ahụ malitere “n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ.” Nke a kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na ihe ndabere nke ndokwa na-enye ndụ nke Jehova bụ àjà mgbapụta ahụ, e mekwara nke a n’ihi na Jehova “hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Mmiri nke ndụ ahụ metụtakwara Okwu Chineke, bụ́ nke e kwuru okwu banyere ya dị ka mmiri n’ime Bible. (Ndị Efesọs 5:26) Otú ọ dị, osimiri nke mmiri nke ndụ ahụ gụnyere, ọ bụghị nanị eziokwu ahụ, kamakwa ndokwa nile ọ bụla ọzọ Jehova mere, ndị dabeere n’àjà Jisọs, iji weghachi ụmụ mmadụ na-erube isi site ná mmehie na ọnwụ wee nye ha ndụ ebighị ebi.—Jọn 1:29; 1 Jọn 2:1, 2.

23. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na osimiri nke mmiri nke ndụ ahụ si n’etiti ámá Jerusalem Ọhụrụ na-asọfe? (b) Nkwa dị aṅaa Chineke kwere Abraham ka a ga-emezu mgbe mmiri nke ndụ ahụ rupụtara n’ụba?

23 N’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ, a ga-eji uru nile nke ihe mgbapụta ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu site n’ọrụ ịchụàjà nke Jisọs na 144,000 ndị nchụàjà nọ n’okpuru ya. Ya mere, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, mmiri nke ndụ ahụ na-esi n’etiti ámá nke Jerusalem Ọhụrụ na-asọfe. Ihe mejupụtara nke a bụ Israel ime mmụọ, bụ́ ndị ha na Jisọs mezuru ezi mkpụrụ Abraham ahụ. (Ndị Galetia 3:16, 29) Ya mere, mgbe mmiri nke ndụ ahụ na-asọfe n’ụba gabiga etiti ámá nke obodo ihe atụ ahụ, “mba nile nke ụwa” ga-enwe ohere zuru ezu ịgọzi onwe ha site ná mkpụrụ Abraham. A ga-emezu nkwa ahụ Jehova kwere Abraham n’ụzọ zuru ezu.—Jenesis 22:17, 18.

Osisi nke Ndụ

24. Gịnị ka Jọn na-ahụ ugbu a n’akụkụ abụọ nke osimiri nke ndụ ahụ, gịnịkwa ka ha sere onyinyo ya?

24 N’ọhụụ Ezikiel, osimiri ahụ ghọrọ ọbụna osimiri na-eru oké oruru, onye amụma ahụ hụkwara ka ụdị osisi nile na-amị mkpụrụ na-eto n’akụkụ ya abụọ. (Ezikiel 47:12) Ma gịnị ka Jọn hụrụ? Ọ bụ nke a: “N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:2b) “Osisi nke ndụ” ndị a aghaghị isekwa onyinyo akụkụ ndokwa Jehova iji nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ndụ ebighị ebi.

25. Ndokwa dị aṅaa ka Jehova mere n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu maka ụmụ mmadụ ndị na-aṅa ntị n’ime Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ?

25 Lee nnọọ ndokwa dị ukwuu Jehova mewooro ụmụ mmadụ na-aṅa ntị! Ọ bụghị nanị na ha pụrụ ịṅụ mmiri ahụ na-enye ume ọhụrụ kama ha pụrụ ịghọrọ ụdị mkpụrụ dị iche iche na-akwado ndụ site n’osisi ndị ahụ. Oo, a sị nnọọ na nne na nna anyị mbụ nwere afọ ojuju n’onyinye “a na-achọsi ike” dị otú ahụ nke dị na Paradaịs nke Iden! (Jenesis 2:9) Ma ugbu a, Paradaịs nke zuru ụwa ọnụ abịawo, ọbụna na Jehova na-emekwa ndokwa site n’akwụkwọ nke osisi ihe atụ ndị ahụ maka “ime ka ahụ dị mba nile ike.”c N’ụzọ dị nnọọ mma karịa ụdị ọgwụ ọ bụla, ma nke mkpọrọgwụ ma ọ bụ ụdị ọzọ, nke a na-enye taa, iji akwụkwọ ihe atụ ndị ahụ mee ihe ga-ebuli ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe elu bịa n’izu okè nke ime mmụọ na nke anụ ahụ.

26. Gịnị ka osisi nke ndụ ahụ pụrụ ịgụnye, n’ihi gịnịkwa?

26 Osisi ndị ahụ, nke na-enweta mmiri nke ọma site n’osimiri ahụ, pụrụ ịgụnye 144,000 ndị ahụ mejupụtara nwunye Nwa Atụrụ ahụ. Mgbe ha nọ n’elu ala, ndị a na-aṅụrụkwa ndokwa Chineke maka ndụ site n’aka Jisọs Kraịst dị ka mmiri. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’amụma a kpọkwara ụmụnna Jizọs ndị a e ji mmụọ nsọ mụta “osisi oak nke ezi omume.” (Aịsaịa 61:1-3; Mkpughe 21:6) Ha amịpụtaworị mkpụrụ ime mmụọ dị ukwuu iji wetara Jehova otuto. (Matiu 21:43) N’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ, ha ga-ekerekwa òkè n’ikesa ndokwa nke ihe mgbapụta ahụ maka “ime ka ahụ dị mba nile ike” pụọ ná mmehie na ọnwụ.—Tụlee 1 Jọn 1:7.

Abalị Agaghị Adịkwa Ọzọ

27. Olee ngọzi ndị ọzọ Jọn hotara maka ndị nwere ihe ùgwù nke ịbanye na Jerusalem Ọhụrụ, n’ihi gịnịkwa ka e ji kwuo na “ọbụbụọnụ ọ bụla agaghị adị ọzọ”?

27 Ịbanye n’ime Jerusalem Ọhụrụ—n’ezie a pụghị nnọọ inwe ihe ùgwù dị ebube karịa ya! Cheedị echiche—ndị ahụ bụbu mmadụ ndị dị ala, na-ezughị okè, ga-esoro Jisọs banye n’eluigwe ịghọ akụkụ nke ndokwa a dị ebube! (Jọn 14:2) Jọn na-atụpenyetụ anyị azụ banyere ụdị ngọzi ndị a gaje inweta, na-asị: “Ọbụbụọnụ ọ bụla agaghị adị ọzọ: ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ ga-adịkwa n’ime ya: ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe: ha ga-ahụkwa ihu ya; aha ya ga-adịkwa n’egedege ihu ha.” (Mkpughe 22:3, 4) Mgbe usoro ndị nchụàjà nke Israel ghọrọ ihe e merụrụ emerụ, o nwetara ọbụbụọnụ nke Jehova. (Malakaị 2:2) Jisọs kwupụtara na a gbahapụwo “ụlọ” Jerusalem nke na-enweghị okwukwe. (Matiu 23:37-39) Ma n’ime Jerusalem Ọhụrụ, “ọbụbụọnụ ọ bụla agaghị adị ọzọ.” (Tụlee Zekaraịa 14:11.) E lewo ndị nile bi n’ime ya ule n’ọkụ nke ọnwụnwa n’elu ala ebe a, ebe ha nwewokwara mmeri, ha ‘aghaghị iyikwasịworịị ereghị ure na anwụghị anwụ.’ N’ọnọdụ ha, Jehova maara, dị ka ọ maara banyere Jisọs, na ọ dịghị mgbe ọ bụla ha ga-adapụ. (1 Ndị Kọrint 15:53, 57) N’ịga n’ihu, “ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ” ga-adị n’ebe ahụ, na-eme ka ọnọdụ nke obodo ahụ nọrọ ná nchebe ruo mgbe nile ebighị ebi.

28. N’ihi gịnị ka e ji dekwasị aha Chineke n’egedege ihu nke ndị so na Jerusalem Ọhụrụ, olileanya dịkwa aṅaa nke na-akpali akpali na-eche ha n’ihu?

28 Dị ka Jọn n’onwe ya, ndị nile gaje iso n’obodo eluigwe ahụ bụ “ndị ohu” Chineke. N’ihi nke a, e dekwasịrị aha Chineke n’ebe pụtara ìhè n’egedege ihu ha, na-eme ka a mara ya dị ka Onyenwe ha. (Mkpughe 1:1; 3:12) Ha ga-agụ ya n’ihe ùgwù na-enweghị atụ ijere ya ozi dị nsọ dị ka akụkụ nke Jerusalem Ọhụrụ. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, o kwere ndị dị otú a gaje ịchị achị nkwa na-akpali akpali, na-asị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-ahụ Chineke.” (Matiu 5:8) Lee nnọọ ka ndị ohu ndị a ga-esi nwee obi ụtọ iji anya ha hụ Jehova n’onwe ya, na ife ya ofufe!

29. N’ihi gịnị ka Jọn ji kwuo banyere Jerusalem Ọhụrụ na “abalị agaghị adịkwa ọzọ”?

29 Jọn gara n’ihu, sị: “Abalị agaghị adịkwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwụ adịghịkwa ha mkpa; n’ihi na Onyenwe anyị Chineke ga-enye ha ìhè.” (Mkpughe 22:5a) Jerusalem oge ochie, dịkwa ka obodo ọ bụla dị n’elu ala, dabeere n’ebe anyanwụ dị maka ìhè n’oge ehihie nakwa n’ìhè nke ọnwa na ọkụ ndị a mụnyere amụnye iji nwee ìhè n’abalị. Ma n’ime Jerusalem Ọhụrụ nke dị n’eluigwe, ìhè ndị dị otú ahụ agaghị adị mkpa. Jehova n’onwe ya ga-enye obodo ahụ ìhè. A pụkwara iji “abalị” mee ihe atụ, na-ezo aka n’ihe isi ike ma ọ bụ ịbụ ndị e kewapụrụ n’ebe Jehova nọ. (Maịka 3:6; Jọn 9:4; Ndị Rom 13:11, 12) A pụghị nnọ inwe ụdị abalị nke ahụ n’ebe ahụ dị ebube nke na-enwukwa enwu nke Chineke onye pụrụ ime ihe nile nọ.

30. Olee ụzọ Jọn si mechie ọhụụ ahụ dị ebube, ọ̀ bụkwa gịnị ka Mkpughe na-emesi anyị obi ike banyere ya?

30 Jọn na-emechi ọhụụ nke a dị ebube site n’ikwu banyere ndị ohu Chineke ndị a, sị: “Ha ga na-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 22:5b) N’eziokwu, n’ọgwụgwụ puku afọ ahụ, a ga-ejiworị uru nile nke ihe mgbapụta ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu, Jisọs ga-echekwa agbụrụ mmadụ zuru okè n’ihu Nna ya. (1 Ndị Kọrint 15:25-28) Anyị amataghị ihe Jehova bu n’uche maka Jisọs na 144,000 ndị ahụ mgbe nke a gasịrị. Ma Mkpughe na-emesi anyị obi ike na ihe ùgwù ha nke ijere Jehova ozi dị nsọ ga-anọgide ruo mgbe nile ebighị ebi.

Mmezu Obi Ụtọ nke Mkpughe

31. (a) Ngwụsị dị aṅaa ka ọhụụ nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ kara akara ya? (b) Gịnị ka Jerusalem Ọhụrụ na-emezuru ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi?

31 Mmezu nke ọhụụ nke a nke Jerusalem Ọhụrụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ, bụ mmezu obi ụtọ nke Mkpughe na-ezo aka na ya, o kwesịkwara ekwesị ịdị otú ahụ. Ndị nile ha na Jọn so bụrụ ndị Kraịst n’ime narị afọ mbụ ahụ, bụ́ ndị e bu ụzọ degara akwụkwọ ahụ nwechara olileanya ịbanye n’ime obodo ahụ dị ka ndị bụ mmụọ na-adịghị anwụ anwụ ha na Jisọs Kraịst ga-eso chịa achịa. Ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ ndị ka nọ ndụ n’elu ala taa nwekwara otu olileanya ahụ. Otú a, Mkpughe na-aga n’ihu iru ngwụsị ya dị ebube, mgbe a na-ejikọ nwunye ahụ zuru ezu na Nwa Atụrụ ahụ. Ọzọ, site na Jerusalem Ọhụrụ, a ga-eji uru nile nke àjà mgbapụta Jisọs meere ihe a kpọrọ mmadụ ihe, ka ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi wee mesịa banye ná ndụ ebighị ebi. N’ụzọ dị otú a, nwunye ọhụrụ ahụ, bụ́ Jerusalem Ọhụrụ, dị ka onye nwere obi umeala nke na-enyere Di ya bụkwa Eze aka, ga-ekere òkè n’iwulite elu ụwa ezi omume ruo mgbe ebighị ebi—ihe nile maka otuto nke Eze Onyenwe anyị bụ Jehova.—Matiu 20:28; Jọn 10:10, 16; Ndị Rom 16:27.

32, 33. Gịnị ka anyị mụtaworo site ná Mkpughe, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mmeghachi omume anyị nke sitere n’ala ala obi?

32 Ya mere, lee aha ọṅụ anyị na-enwe ka anyị na-eweta ná njedebe ntụle anyị nke akwụkwọ Mkpughe! Anyị ahụwo ka e mere ka mgbalị ikpeazụ nile Setan na mkpụrụ ya na-eme kụọ afọ n’ala, hụkwa ka e mezuru ikpe ezi omume nile nke Jehova n’ụzọ zuru ezu. Babilọn Ukwu ahụ aghaghị ịkwụsị ịdị adị ruo mgbe ebighị ebi, tinyekwara akụkụ nile ndị ọzọ e merụworo nke ukwuu nke ụwa Setan. A ga-atụba Setan n’onwe ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ime abyss, wee mesịa bibie ha. Jerusalem Ọhụrụ ga-eso Kraịst chịa achịa site n’eluigwe ka mbilite n’ọnwụ na ikpe ikpe ahụ na-aga n’ihu, ihe a kpọrọ mmadụ zuru okè ga-emesịakwa n’ikpeazụ nweta ndụ ebighị ebi n’elu ala Paradaịs. Lee nnọọ ụzọ pụtara ìhè Mkpughe si egosi ihe ndị a nile! Lee ka o si emesi mkpebi anyị ike ‘izisara mba na ebo na asụsụ na ndị nile ọ bụla nọ n’elu ala ozi ọma ebighị ebi ahụ’ taa! (Mkpughe 14:6, 7) Ị̀ na-etinye onwe gị n’ụzọ zuru ezu n’oké ọrụ nke a?

33 Ebe obi anyị jupụtara n’ekele, ka anyị chee ihu n’okwu mmechi nke Mkpughe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Eziokwu ahụ bụ na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a e ji mee ihe bụ “dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmadụ si dị, ya bụ, nke mmụọ ozi” pụrụ imetụta eziokwu ahụ bụ na ihe mejupụtara obodo ahụ bụ 144,000 ndị bụbu mmadụ, ma ndị mesịrị ghọọ ihe okike ndị bụ mmụọ n’etiti ndị mmụọ ozi ahụ.

b Rịba ama na “akwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ” nwere n’ime ya nanị aha nke 144,000 Israel ime mmụọ. Ya mere, ọ dị iche ‘n’akwụkwọ nke ndụ’ nke gụnyere ndị ahụ ga-enweta ndụ n’elu ala.—Mkpughe 20:12.

c Rịba ama na okwu ahụ bụ “mba nile” na-ezokarị aka ná ndị na-esoghị n’Israel ime mmụọ. (Mkpughe 7:9; 15:4; 20:3; 21:24, 26) Iji okwu ahụ mee ihe n’ebe a adịghị atụ aro na a ga-anọgide na-ahazi ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’ìgwè mba dị iche iche n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya