Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 1
  • Ozi Ndị Sitere n’Eluigwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ndị Sitere n’Eluigwe
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Abụọ Si n’Aka Chineke
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Elizabet Mụrụ Nwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • E Nyeghachiri Ha Ụgwọ Ọrụ n’Ihi Ijegharị n’Ụzọ Ụta Na-adịghị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • A Kwanyeere Jizọs Ùgwù Tupu A Mụọ Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 1

Isi 1

Ozi Ndị Sitere n’Eluigwe

N’EZIE, Bible nile bụ ozi sitere n’eluigwe, ebe ọ bụ Nna anyị nke eluigwe nyere ya maka inye anyị ntụziaka. Otú ọ dị, ọ dị ozi abụọ e ziri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga site n’ọnụ otu mmụọ ozi, onye “na-eguzo n’ihu Chineke.” Aha ya bụ Gebriel. Ka anyị tụlee ọnọdụ metụtara ọbịbịa abụọ ndị ahụ dị mkpa ọ bịara n’ụwa.

Afọ ahụ bụ 3 T.O.A. N’ugwu Judea, ma eleghị anya n’ebe na-adịchaghị anya site na Jerusalem, ka otu onye nchụàjà Jehova a na-akpọ Zekaraịa bi. O mewo agadi, otú ahụ ka ọ dịkwa nwunye ya, bụ́ Elizabet. Ha enweghị ụmụ. Ọ bụ Zekaraịa ka o ruuru ịrụ ọrụ onye nchụàjà n’ụlọ nsọ Chineke dị na Jerusalem. Na mberede, Gebriel pụtara n’akụkụ aka nri nke ebe ịchụ àjà nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.

Zekaraịa tụrụ egwu nke ukwuu. Ma Gebriel mere ka obi dajụọ ya, na-asị, “Atụla egwu, Zekaraịa: n’ihi na a nụrụ arịrịọ gị, nwunye gị Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.” Gebriel gara n’ihu ikwupụta na Jọn “ga-abụ onye ukwu n’anya Onyenwe anyị [“Jehova,” NW]” nakwa na ọ ‘ga-edoziri Jehova otu ndị nke a kwadebeworo.’

Otú ọ dị, Zekaraịa ekweghị ihe ọ nụrụ. O yiri ihe na-apụghị ime eme na ya na Elizabet ga-amụtali nwa n’afọ ndụ ha. N’ihi ya, Gebriel sịrị: “Ị ga-ekpuchi ọnụ, ị gaghị apụkwa ikwu okwu, rue ụbọchị ahụ mgbe ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị okwu m ndị a.”

Ma, mgbe ihe ndị a na-eme, ndị nọ n’èzí nọ na-eche ihe mere Zekaraịa ji anọ ọdụ otú a n’ime ụlọ nsọ ahụ. Mgbe o mesịrị pụta, ọ pụghị ikwu okwu, kama ọ pụrụ nanị imegharị aka ya, ha wee mata na ọ hụwo ihe ebube.

Mgbe Zekaraịa jezuru ozi ya n’ụlọ nsọ ahụ o wee laa. N’oge na-adịghị anya, o mere n’ezie​—⁠Elizabet wee dị ime! Mgbe ọ na-echere ịmụ nwa ya, Elizabet nọpụrụ iche n’ebe ndị mmadụ nọ ruo ọnwa ise.

Ka oge na-aga, Gebriel bịaghachiri ọzọ. Ònyekwa ka ọ na-agwa okwu? Ọ bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di nke a na-akpọ Meri, onye Nazaret. Ozi dị aṅaa ka ọ na-ezi ugbu a? Gee ntị! Gebriel gwara Meri sị, “Chineke meere gị amara. Leekwa, ị ga-atụrụ ime, mụta nwa nwoke, kpọọ aha ya Jisọs.” Gebriel kwukwara, sị: “Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu: . . . Ọ ga-abụkwa eze ụlọ Jekọb ruo mgbe nile ebighị ebi; alaeze ya agaghị agwụkwa agwụ.”

Anyị pụrụ iji n’aka na Gebriel ga-agụworị ya n’ihe ùgwù izite ozi ndị a. Ka anyị na-agụkwa banyere Jọn na Jisọs na-aga n’ihu, anyị ga-ahụ n’ụzọ ka pụta ìhè, ihe mere nnọọ ozi ndị a sitere n’eluigwe ji dị mkpa otú a. 2 Timoti 3:16; Luk 1:​5-33.

▪ Ozi abụọ dị aṅaa ndị dị mkpa ka e si n’eluigwe zite?

▪ Ònye zitere ozi ndị ahụ, oleekwa ndị e ziteere ha?

▪ Gịnị mere o ji sie oké ike ikwere ozi ndị ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya