Isi 2
A Sọpụụrụ Ya Tupu A Mụọ Ya
MGBE mmụọ ozi Gebriel gwasịrị nwa aghọghọ ahụ bụ Meri na ọ ga-amụta nwa nwoke, onye ga-aghọ eze ruo mgbe ebighị ebi, Meri jụrụ, sị: “Ihe a ga-esi aṅaa mee, ebe ọ dịghị nwoke m maara?”
Gebriel kọwara, na-asị, “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu ga-ekpuchikwa gị: n’ihi nke a, ihe dị nsọ nke ị dị ime ya, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.”
Iji nyere Meri aka ikwere n’ozi ya, Gebriel gara n’ihu ikwu: “Leekwa, Elizabet onye ikwu gị, ya onwe ya atụrụwokwa ime nwa nwoke n’agadi ya: nke a bụkwa ọnwa nke isii ya, bụ́ onye a na-akpọ nwanyị àgà. N’ihi na ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị ìrè.”
Meri nabatara okwu Gebriel. Gịnịkwa bụ nzaghachi ya? O kwupụtara sị, “Lee, abụ m ohu nwanyị nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW]; ya dịrị m ka okwu gị si dị.”
N’oge na-adịghị anya ka Gebriel lasịrị, Meri jikeere gaa ileta Elizabet, bụ́ onye ya na di ya, bụ Zekaraịa bi n’obodo ugwu ugwu bụ Judia. Site n’ụlọ Meri dị na Nazaret, nke a bụ ogologo njem nke ma eleghị anya ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ.
Mgbe Meri mesịrị rute n’ụlọ Zekaraịa, ọ banyere ma kelee ekele. Mgbe ahụ Elizabet wee jupụta ná mmụọ nsọ, wee sị Meri: “Gị onwe gị bụ onye a gọziri agọzi n’etiti ndị inyom, ọ bụkwa onye a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị [bụ]. Òle ebe ka nke a sikwa ruo m, na nne Onyenwe m ga-abịakwute m? N’ihi na lee, mgbe olu ekele gị ruru ná ntị m, nwa m wụliri n’afọ m n’obi ụtọ.”
Ka ọ nụrụ nke a, Meri ji ekele sitere n’ala ala obi zaghachi, sị: “Mkpụrụ obi m na-eme ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] dị ukwuu, ọ na-atọkwa mmụọ m ụtọ nke ukwuu na Chineke, bụ Onye Nzọpụta m. N’ihi na o lere ọnọdụ dị ala nke ohu ya nwanyị anya: n’ihi na lee, site n’ugbu a ọgbọ nile ga-akpọ m onye ngọzi [“obi ụtọ,” NW] dịrị. N’ihi na Onye dị ike emewo m ihe ukwu dị iche iche.” Ma, n’agbanyeghị amara nke e gosiri ya, Meri duziri otuto nile gaa n’ebe Chineke nọ. Ọ sịrị “Aha ya dịkwa nsọ. Ebere ya dịkwara ndị na-atụ egwu ya ruo ọgbọ na ọgbọ.”
Meri nọgidere jiri abụ amụma ndị sitere n’ike mmụọ nsọ na-eto Chineke, na-ekwusa: “O werewo ogwe aka ya gosi ike; ọ chụsawo ndị mpako n’echiche nke obi ha. O wedawo ndị dị ike pụọ n’ocheeze ha, weliekwa elu ndị ọnọdụ ha dị ala. O werewo ezi ihe nile nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ; zipụkwa ndị ọgaranya n’aka efu. O nyeworo Israel nwa ya aka, ka o wee cheta ebere (dị ka ọ gwara nna anyị ha) n’ebe Abraham na mkpụrụ ya nọ rue mgbe ebighị ebi.”
Meri nọnyeere Elizabet ihe dị ka ọnwa atọ, obi abụọ adịghịkwa ya na ọ bụ nnukwu onye inyeaka n’izu ikpeazụ ndị a nke afọ ime Elizabet. Ọ bụ nnọọ ihe dị mma na ndị inyom abụọ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, ndị bu afọ ime site n’enyemaka Chineke, pụrụ ịnọkọta n’otu ebe n’oge a a gọziri agọzi nke ndụ ha!
Ị̀ chọpụtara nsọpụrụ ahụ e nyere Jisọs ọbụna tupu a mụọ ya? Elizabet kpọrọ ya “Onyenwe m,” nwa ya a na-amụbeghị amụ wụlikwara elu n’ọṅụ ozugbo Meri batara. N’aka nke ọzọ, ndị ọzọ mesịrị mesoo Meri na nwa ọ gaje ịmụ n’ụzọ na-adịghị egosi nsọpụrụ dị ka anyị ga-ahụ. Luk 1:26-56.
▪ Gịnị ka Gebriel kwuru iji nyere Meri aka ịghọta ụzọ ọ ga-esi dị ime?
▪ È si aṅaa nye Jisọs nsọpụrụ tupu a mụọ ya?
▪ Gịnị ka Meri kwuru n’abụ amụma ọ bụrụ iji nye Chineke otuto?
▪ Ogologo oge ha aṅaa ka Meri nọnyeere Elizabet, gịnịkwa mere o ji kwesị ekwesị na Meri ga-anọnyere Elizabet n’oge a?