Isi 3
A Mụwo Onye Ndozi Ụzọ ahụ
Ọ FỌDỤRỤ nke nta ka Elizabet mụọ nwa ya. Kemgbe ọnwa atọ ndị a gara aga, Meri anọnyeworo ya. Ma ugbu a oge eruwo mgbe Meri ga-ahapụ ya ịga ogologo njem ịlaghachi ụlọ ya na Nazaret. N’ihe dị ka ọnwa isii, ya onwe ya ga-amụkwa nwa.
Nwa oge mgbe Meri lasịrị, Elizabet mụrụ nwa. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ mgbe ịmụ nwa ahụ gara nke ọma, Elizabet na nwa ọhụrụ ahụ anọrọkwa n’ahụ ike! Mgbe Elizabet ziri ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya nwa ọhụrụ ahụ, ha nile sooro ya ṅụrịa ọṅụ.
N’ụbọchị nke asatọ a mụsịrị ya, dị ka Iwu Chineke si dị, aghaghị ibi nwa nwoke a mụrụ n’Israel úgwù. Maka emume nke a, ndị enyi na ndị ikwu bịara ileta ya. Ha sịrị na a ga-akpọ nwa ahụ aha nna ya, bụ́ Zekaraịa. Ma Elizabet kwuru okwu. Ọ na-asị, “Ee e; kama a ga-akpọ ya Jọn.” Cheta na nke ahụ bụ aha mmụọ ozi Gebriel sịrị na a ga-akpọ nwa ahụ.
Otú ọ dị, ndị enyi ha jụrụ, na-asị: “Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti ndị ikwu gị nke a na-akpọ aha nke a.” Mgbe ahụ, site n’ifegharị aka, ha jụrụ ihe nna ya chọrọ ka a kpọọ nwa ahụ. N’ịrịọ ka e nye ya ihe e ji ede ihe, n’ịbụkwa ihe ijuanya nye mmadụ nile, Zekaraịa dere: “Aha ya bụ Jọn.”
Mgbe ahụ e mere ka Zekaraịa nweghachi ike ikwu okwu n’ụzọ ọrụ ebube. Ị ga-echeta na o nweghịkwa ike ikwu okwu mgbe ọ rụrụ ụka n’ọkwà mmụọ ozi ahụ mara na Elizabet ga-amụ nwa. Otú ọ dị, mgbe Zekaraịa kwuru okwu, ọ gbara ndị nile bi gburugburu gharịị ha wee na-asị n’onwe ha: “Aha mmadụ gịnịkwa ka nwatakịrị a ga-abụ?”
Ugbu a Zekaraịa jupụtara ná mmụọ nsọ, ọ malitekwara inye otuto, na-asị: “Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ, bụ́ Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], Chineke nke Israel; n’ihi na o letawo ndị ya, rụkwaara ha ọrụ mgbapụta, o weliwokwara anyị mpì nke nzọpụta n’ụlọ onye na-ejere ya ozi, bụ́ Devid.” “Mpì nke nzọpụta” nke a bụ, n’ezie, Onyenwe anyị Jisọs, bụ́ onye a ka gaje ịmụ amụ. Zekaraịa kwuru na site na ya, Chineke ‘ga-ekwenyere anyị, ebe adọpụtaworo anyị n’aka ndị iro anyị, ka anyị na-ekpere ya n’atụghị egwu, n’obi ọcha na ezi omume n’ihu ya ụbọchị anyị nile.’
Mgbe ahụ Zekaraịa buru amụma banyere nwa ya bụ Jọn: “Ọzọkwa, gị onwe gị, nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu: n’ihi na ị ga-aga n’ihu Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] idozi ụzọ ya nile; ime ndị nke ya ka ha mara nzọpụta n’ime mgbaghara mmehie nile ha, n’ihi obi ebere nke Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ nke sitere n’elu ga-eleta anyị n’ime ya, ịmụkwasị ndị nọ n’ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ ìhè; iduzi ụkwụ anyị baa n’ụzọ udo.”
N’oge a Meri, onye o doro anya na ọ ka bụ nwanyị na-alụbeghị di, alaruwo ụlọ ya na Nazaret. Gịnị ka ọ ga-apụtara ya mgbe ọ pụtara ìhè na ọ dị ime? Luk 1:56-80; Levitikọs 12:2, 3.
▪ Oge ha aṅaa ka Jọn ji tọọ Jisọs?
▪ Ihe ndị dị aṅaa mere mgbe Jọn dị ụbọchị asatọ?
▪ Olee otú Chineke siworo chee ihu n’ebe ndị ya nọ?
▪ Ọrụ dị aṅaa ka e buru n’amụma na Jọn ga-arụ?