Isi 5
Ọmụmụ Jisọs—n’Ole Ebe, Ole Mgbekwa?
ONYE ọchịchị nke Alaeze Ukwu Rom, bụ́ Siza Ọgustọs enyewo iwu na onye ọ bụla aghaghị ịlaghachi n’obodo a mụrụ ya ka e deba aha ya n’akwụkwọ. Ya mere, Josef na-aga obodo a mụrụ ya, bụ́ obodo Betlehem.
Ọtụtụ mmadụ nọ na Betlehem ideba aha ha n’akwụkwọ, nanị ebe Josef na Meri pụkwara ịchọta ọnọdụ bụ n’ụlọ anụ. N’ebe a, ebe a na-edebe ịnyịnya ibu na anụ ndị ọzọ, ka a mụrụ Jisọs. Meri wee jiri mpempe ákwà dị iche iche fụchie ya, nyiwe ya n’elu ebe a na-adọbara anụ nri.
N’ezie, ọ bụ site ná nduzi Chineke ka Siza Ọgustọs ji nye iwu ya maka ideba aha n’akwụkwọ. Nke a mere ka o kwe mee ịmụ Jisọs na Betlehem, bụ́ obodo Akwụkwọ nsọ buru ụzọ kwuo mgbe dị anya gara aga na ọ ga-abụ ebe a ga-amụ onye ọchịchị ahụ e kwere ná nkwa.
Lee nnọọ abalị dị mkpa nke a bụ! Ka ha nọ n’ọhịa, ìhè mụkere gburugburu otu ìgwè ndị na-azụ atụrụ. Ọ bụ ebube Jehova! Mmụọ ozi Jehova wee sị ha: “Unu atụla egwu; n’ihi na lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile: n’ihi na taa n’obodo Devid ka a mụrụ nye unu Onye Nzọpụta, nke bụ Kraịst Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwara unu ihe ịrịba ama ya; unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e kere n’ákwà okike, na-edinakwa n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ.” Na mberede, ọtụtụ ndị mmụọ ozi ndị ọzọ pụtara na-abụ abụ, sị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.”
Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ lasịrị, ndị ahụ na-azụ atụrụ wee sịrịta onwe ha: “Ka anyị jee ruo Betlehem ugbu a, hụ ihe a e kwuru nke e meworo, nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] mere ka anyị mara.” Ha wee jee ọsọ ọsọ ma hụ Jisọs kpọmkwem n’ebe mmụọ ozi kwuru na ha ga-achọta ya. Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọrọ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ha, ọ tụrụ ndị nile nụrụ ya n’anya. Meri wee chebe okwu ndị a nile ma nwee mmasị na ha n’ime obi ya.
Ọtụtụ ndị taa kwere na a mụrụ Jisọs na December 25. Ma December bụ oge mmiri ozuzo na oké oyi na Betlehem. Ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha agaghị anọ n’èzí ruo chi ọbụbọ n’oge dị otú ahụ n’ime afọ. Ọzọkwa, o yighị ka Siza nke Rom ọ̀ gaara achọ ka ndị na-achọbu inupụ isi n’okpuru ọchịchị ya jee njem dị otú ahụ n’oge oké oyi iji deba aha ha n’akwụkwọ. Ihe àmà na-egosi na a mụrụ Jisọs ná mmalite oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ ahụ. Luk 2:1-20; Maịka 5:2.
▪ Gịnị mere Josef na Meri ji jee Betlehem?
▪ Ihe ebube dị aṅaa mere n’abalị ahụ a mụrụ Jisọs?
▪ Olee otú anyị si mara na a mụghị Jisọs na December 25?