Isi 13
Ịmụta Ihe Site n’Ọnwụnwa Ndị Jisọs Zutere
OZUGBO e mesịrị ya baptism, mmụọ Chineke duuru Jisọs banye n’ọhịa Judia. O nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eche echiche banyere ha, n’ihi na mgbe ọ na-eme baptism, “e meghere eluigwe” nke mere na ọ hụrụ ihe dị iche iche nke eluigwe. N’ezie, o nwere ọtụtụ ihe ọ ga-atụgharị uche na ha!
Jisọs nọrọ n’ọhịa 40 ụbọchị ehihie na abalị n’erighị ihe ọ bụla. Mgbe agụụ na-agụsi Jisọs ike, Ekwensu bịakwutere ya ịnwa ya ọnwụnwa, na-asị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, kwuo ka nkume ndị a ghọọ ogbe achịcha.” Ma Jisọs maara na o zighị ezi iji ikike ọrụ ebube ya gboo mkpa nke onwe ya. Ya mere ọ jụrụ ịbụ onye a nwatara.
Ma Ekwensu akwụsịghị. Ọ nwakwara ụzọ ọzọ dị iche. Ọ mara Jisọs aka ka o si n’elu ụlọ ukwu Chineke wụdaa n’ala ka ndị mmụọ ozi napụta ya. Ma a nwataghị Jisọs ime oké ihe nkiri dị otú ahụ. N’ihota ihe e dere n’Akwụkwọ nsọ, Jisọs gosiri na o zighị ezi ka ọ nwaa Chineke ọnwụnwa n’ụzọ dị otú ahụ.
N’ọnwụnwa nke atọ, Ekwensu gosiri Jisọs alaeze nile nke ụwa n’ụzọ ọrụ ebube wee sị: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị, ma ọ bụrụ na ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m.” Ma Jisọs jụkwara ịbụ onye a nwatara ime ihe ọjọọ, kama ọ họọrọ ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke.
Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ọnwụnwa ndị a nke Jisọs. Ha na-egosi, dị ka ihe atụ, na Ekwensu abụghị àgwà ọjọọ nkịtị dị ka ụfọdụ ndị na-asị, kama na ọ bụ onye dị adị n’ezie nke a na-adịghị ahụ anya. Ọnwụnwa nke Jisọs gosikwara na ọchịchị nile nke ụwa bụcha nke Ekwensu. N’ihi na olee otú onyinye nke Ekwensu na-enyefe ha n’aka Jisọs ga-esiworị bụrụ ọnwụnwa n’ezie ma ọ bụrụ na ha abụghị nke ya?
Cheekwa echiche maka nke a: Ekwensu sị na ya dị njikere inye Jisọs onyinye ma ọ bụrụ na ọ kpọọ isiala nye ya, ọbụna inye ya alaeze nile nke ụwa. Ekwensu pụkwara ịnwa anyị n’ụzọ dị otú ahụ, eleghị anya na-eche n’ihu anyị ohere na-adọrọ adọrọ iji nweta akụ na ụba ụwa, ọkwá, ma ọ bụ ọnọdụ. Ma lee ihe amamihe ọ bụụrụ anyị iṅomi ihe ilereanya Jisọs site n’ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ihe ọnwụnwa ahụ pụrụ ịbụ! Matiu 3:16; 4:1-11; Mak 1:12, 13; Luk 4:1-13.
▪ Olee ihe ndị ọ na-aghaghị ịbụworị na Jisọs na-atụgharị uche banyere ha n’oge ọ nọrọ 40 ụbọchị n’ọhịa?
▪ Olee otú Ekwensu si gbalịa ịnwa Jisọs?
▪ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọnwụnwa ndị Jisọs zutere?