Isi 14
Ndị Na-eso Ụzọ Mbụ nke Jisọs
MGBE ọ nọsịrị 40 ụbọchị n’ọhịa, Jisọs lọghachikwutere Jọn onye mere ya baptism. Mgbe ọ na-erute nso, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jọn tụgara aka n’ebe ọ nọ ma na-agwa ndị nọ n’ebe ahụ, sị: “Lee, Nwa Atụrụ nke Chineke, nke na-ebupụ mmehie nke ụwa! Onye a bụ onye mụ onwe m kwuru okwu banyere ya, sị, Otu nwoke na-abịa n’azụ m onye ghọworo onye buru m ụzọ: n’ihi na ọ bụrịị onye mbụ n’ebe m nọ.” Ọ bụ ezie na Jọn tọrọ Jisọs, bụ́ nwa nwanne nne ya, Jọn matara na Jisọs anọworị tupu ya onwe ya dị ka mmụọ n’eluigwe.
Ma, izu ole na ole tupu mgbe ahụ, mgbe Jisọs bịara ka e mee ya baptism, ọ pụtara ìhè na Jọn ejighị n’aka na Jisọs ga-abụ Mesaịa ahụ. Jọn kwetara, na-asị, “Mụ onwe m amaghịkwa ya: ma ka e mee ya ka ọ pụta ìhè nye Israel, n’ihi nke a ka mụ onwe m bịara na-eji mmiri eme baptism.”
Jọn gara n’ihu ịkọwara ndị na-ege ya ntị ihe mere mgbe o mesịrị Jisọs baptism: “Ekiriwo m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efeda ka nduru; o wee nọgide n’ahụ ya. Mụ onwe m amaghịkwa ya: ma onye zitere m ka m were mmiri mee baptism, onye ahụ sịrị m, Onye ọ bụla ị ga-ahụ mmụọ nsọ ka ọ na-efedakwasị ya, na-anọgidekwa n’ahụ ya, onye ahụ bụ onye na-eji mmụọ nsọ eme baptism. Mụ onwe m ahụwokwa, gbaakwa àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
N’echi ya, Jọn na ndị na-eso ụzọ ya abụọ guzo. Ọzọkwa, mgbe Jisọs na-erute nso, ọ sịrị: “Lee, Nwa Atụrụ Chineke!” Ozugbo o kwuru nke a, ndị na-eso ụzọ abụọ ndị ahụ nke Jọn Onye Na-eme Baptism sooro Jisọs. Otu n’ime ha bụ Andru, ọ ga-abụkwa na onye nke ọzọ bụ onye ahụ dekọrọ ihe ndị a, onye a na-akpọkwa Jọn. Jọn nke a, dị ka ihe mere eme na-egosi, bụkwa nwa nwanne nne Jisọs, ebe ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ nwa Salome, bụ́ nwanne Meri.
Mgbe ọ tụgharịrị hụ ka Andru na Jọn na-eso ya, Jisọs jụrụ, sị: “Gịnị ka unu na-achọ?”
Ha wee jụọ ya sị, “Onye ozizi, olee ebe i bi?”
Jisọs zaghachiri ha sị, “Bịanụ, unu ga-ahụkwa.”
Ọ bụ ihe dị ka elekere anya anọ nke ehihie, Andru na Jọn wee nọnyere Jisọs ụbọchị ahụ nile. Mgbe nke a gasịrị, obi tọrọ Andru ụtọ nke ukwuu na ọ gbapụrụ ọsọ ịchọ nwanne ya nwoke, onye a na-akpọ Pita. Ọ gwara ya sị, “Anyị ahụwo Mesaịa anyị.” O wee kpọrọ Pita jekwuru Jisọs. Eleghị anya n’otu oge ahụ, Jọn chọtara nwanne ya bụ Jemes wee kpọtakwara ya Jisọs; ma dị ka o si eme, Jọn edeghị ihe nke a metụtara ya onwe ya n’Oziọma nke ya.
N’echi ya, Jisọs hụrụ Filip onye sitere na Betsaịda, bụ́kwa otu obodo ahụ Andru na Pita si bịa. Ọ kpọrọ ya, sị: “Soo m.”
Mgbe ahụ, Filip chọtara Natanịel, onye a na-akpọkwa Batolomiu, wee sị: “Anyị ahụwo onye Mosis dere ihe banyere ya n’akwụkwọ Iwu, onye ndị amụma dekwara ihe banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.” Natanịel nwere obi abụọ banyere nke a. Ọ jụrụ sị, “Ọ̀ dị ezi ihe ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?”
Filip gwara ya sị, “Bịa lee.” Mgbe ha na-abịakwute Jisọs, Jisọs kwuru banyere Natanịel, sị: “Lee, onye Israel n’ezie, onye aghụghọ na-adịghị ya n’ahụ!”
Natanịel jụrụ sị, “Olee ebe ị maara m?”
Jisọs zara sị, “Mgbe Filip akakpọghị gị, mgbe ị nọ n’okpuru osisi fig, ahụrụ m gị.”
O juru Natanịel anya. O kwuru sị, “Rabaị [nke pụtara Onye ozizi], gị onwe gị bụ Ọkpara Chineke; gị onwe gị bụ Eze Israel.”
Jisọs jụrụ sị, “N’ihi na m sịrị gị, Ahụrụ m gị n’okpuru osisi fig, ì kwere ekwe? Ị ga-ahụ ihe karịrị ihe ndị a ukwuu.” Mgbe ahụ ọ na-ekwe nkwa, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka e megheworo ya, hụkwa ndị mmụọ ozi nke Chineke ka ha na-arịgo na-arịdakwa n’ahụ Nwa nke mmadụ.”
Nwa ntị ntị oge mgbe nke a mesịrị, Jisọs, tinyere ndị na-eso ụzọ o nwetara ọhụrụ, na-ahapụ Ndagwurugwu Jọdan ma na-aga Galili. Jọn 1:29-51.
▪ Olee ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs?
▪ Olee otú e si mee ka Pita, na ma eleghị anya Jemes mata Jisọs?
▪ Gịnị mere ka Natanịel kwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?