Isi 15
Ọrụ Ebube Mbụ nke Jisọs
Ọ GAFEWO nanị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ kemgbe Andru, Pita, Jọn, Filip, Nataniel na ma eleghị anya, Jemes, ghọrọ ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs. Ndị a nọ n’ụzọ ugbu a ịlaghachi n’ógbè Galili, bụ́ ebe ha nile sicha bịa. Ebe ha na-eje bụ Kena, bụ́ obodo Nataniel, nke dị n’ebe ugwu, n’ebe na-adịghị anya site na Nazaret ebe Jisọs n’onwe ya nọ tolite. A kpọrọ ha òkù ịbịa oriri agbamakwụkwọ na Kena.
Nne Jisọs bịakwara agbamakwụkwọ ahụ. Dị ka enyi nke ezinụlọ ndị ahụ na-alụ di na nwunye, o yiri ka Meri ò so na-eje ozi ilekọta ọtụtụ ndị ọbịa bịaranụ. N’ihi ya, ọ dị ngwa ịhụta ihe kọrọ ụkọ, nke ọ kọọrọ Jisọs: “Ha enweghị mmanya vine.”
Ya mere, mgbe Meri si otú a tụọ aro ka Jisọs mee ihe banyere ụkọ mmanya ahụ, na mbụ, Jisọs emeghị ihe ngwa ngwa. Ọ jụrụ sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ?” Dị ka Eze nke Chineke họpụtara, ọ gaghị abụ onye ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi ya na-eduzi n’ọrụ ya. N’ihi ya, Meri ji amamihe hapụrụ nwa ya nwoke okwu ahụ, wee gwa ndị ahụ na-eje ozi: “Ihe ọ bụla ọ sị unu mee, meenụ ya.”
Otú ọ dị, e nwere ite mmiri ukwu isii e ji nkume kpụọ, nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ịnagide galọn iri. Jisọs wee gwa ndị ahụ na-eje ozi: “Were mmiri gbajuo ite mmiri ndị a.” Ndị ahụ na-eje ozi wee gbajupụta ha n’ọnụ. Jisọs wee sị: “Kupụtanụ ugbu a, bugara onye isi oriri.”
Ụtọ nke mmanya ahụ masịrị onye isi oriri ahụ, n’amataghị na e mepụtara ya n’ụzọ ọrụ ebube. Mgbe ọ kpọrọ onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ, ọ sịrị: “Onye ọ bụla na-ebu ụzọ adọba mmanya vine ọma; mgbe ọ bụla mmadụ ṅụbigasịrị mmanya ókè o wee dọba nke jọkarịrị njọ: gị onwe gị edebewo mmanya vine ọma ruo ugbu a.”
Nke a bụ ọrụ ebube mbụ Jisọs rụrụ, mgbe ha hụkwara ya, okwukwe nke ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ siwanyere ike. Mgbe e mesịrị, ha na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke wee jee obodo Kapanaum nke dị nso Osimiri Galili. Jọn 2:1-12.
▪ Òle mgbe n’oge ozi Jisọs ka e nwere agbamakwụkwọ ahụ na Kena?
▪ Gịnị mere Jisọs ji jụ aro nke nne ya tụrụ?
▪ Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jisọs rụrụ, oleekwa mmetụta o nwere n’ebe ndị ọzọ nọ?