Isi 16
Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ofufe Jehova
ỤMỤNNE Jisọs ndị nwoke—bụ́ ụmụ ndị ikom ndị ọzọ Meri mụrụ—bụ Jemes, Josef, Saịmọn, na Judas. Tupu ndị a nile esoro Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gaa Kapanaum, bụ́ obodo dị nso n’Osimiri Galili, ma eleghị anya ha kwụsịrị n’ụlọ ha dị na Nazaret ka ezinụlọ ahụ wee nwee ike ịkwakọta ihe ndị ga-adị ha mkpa.
Ma gịnị mere Jisọs ji jee Kapanaum kama ịga n’ihu n’ozi ya na Kena, na Nazaret, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ n’ugwu Galili? Otu ihe bụ na obodo Kapanaum dị n’ebe a ma ama karị, o dokwara anya na ọ bụ obodo buru ibu karị. Ọzọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eso ụzọ Jisọs nwetara ọhụrụ bi na Kapanaum ma ọ bụ na gburugburu ya, n’ihi ya kwa, ọ gaghị adị ha mkpa ịhapụ ụlọ ha ije nara ọzụzụ n’aka ya.
N’oge ọnụnọ ya na Kapanaum, Jisọs rụrụ ọrụ ndị dị ebube, dị ka ya onwe ya gosiri mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị. Ma n’oge na-adịghị anya, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bilikwara ije ọzọ. Ọ bụ oge opupu ihe ubi, ha nọ n’ije ha iru Jerusalem, ka ha wee gaa Ememe Ngabiga nke afọ 30 O.A. Mgbe ha nọ n’ebe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya hụrụ otu ihe banyere Jisọs nke ọ pụrụ ịbụ na ha ahụtụbeghị na mbụ.
Dị ka Iwu Chineke si dị, a chọrọ ka ndị Israel na-achụ àjà ụmụ anụmanụ. Ya mere, ka o wee dịrị ha mfe, ndị ahịa nọ na Jerusalem na-ere anụmanụ ma ọ bụ ụmụ nnụnụ maka nzube nke a. Ma ha nọ kpọmkwem n’ime ụlọ nsọ ahụ na-ere ya, ha na-aghọgbukwa ndị mmadụ site n’ịna ha oké ọnụ.
N’ịbụ onye oké iwe jupụtara obi, Jisọs jiri ụdọ mee ụtarị wee chụpụsịa ndị ahụ na-ere ahịa. Ọ wụfusịrị ego nke ndị ahụ na-agbanwe ego, kpuokwa table ha ihu n’ala. O tiri mkpu gwa ndị ahụ na-ere nduru sị, “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a; unu emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa!”
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs hụrụ nke a, ha chetara amụma ahụ nke na-ekwu banyere Ọkpara Chineke, sị: “Ekworo ụlọ gị ga-eripịa m.” Ma ndị Juu jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ ihe ịrịba ama gịnị ka ị na-egosi anyị, ebe ị na-eme ihe ndị a?” Jisọs zara, sị: “Kwatuonụ ụlọ nsọ a, n’ụbọchị atọ m ga-ewulikwa ya elu.”
Ndị Juu ahụ chere na Jisọs na-ekwu banyere ụlọ nsọ nkịtị, ha wee jụọ, sị: “[Iri afọ anọ na isii] ka e ji wuo ụlọ nsọ a, gị onwe gị ị̀ ga-ewulikwa ya n’ụbọchị atọ?” Otú ọ dị, Jisọs na-ekwu banyere ụlọ nsọ nke ahụ ya. N’afọ atọ n’ihukwa, ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu nke a o kwuru mgbe o si n’ọnwụ bilie. Jọn 2:12-22; Matiu 13:55; Luk 4:23.
▪ Mgbe agbamakwụkwọ ahụ na Kena gasịrị, olee ebe Jisọs jegasịrị?
▪ Gịnị kpasuru Jisọs iwe, gịnịkwa ka o mere?
▪ Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs chetara mgbe ha hụrụ ihe o mere?
▪ Gịnị ka Jisọs kwuru banyere “ụlọ nsọ a,” gịnịkwa ka o bu n’uche?