Isi 27
Ọkpụkpọ Òkù A Kpọrọ Matiu
MGBE na-adịghị anya ka ọ gwọsịrị nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, Jisọs hapụrụ Kapanaum wee gaa n’Osimiri Galili. Ọzọ, ìgwè mmadụ bịakwutere ya, o wee malite izi ha ihe. Ka ọ na-ejegharị, ọ hụrụ Matiu, onye a na-akpọkwa Livaị, ka ọ na-anọdụ n’ụlọ ọrụ ndị na-anata ụtụ isi. Jisọs kpọrọ ya òkù sị, “Soo m.”
Ọ pụrụ ịbụ na Matiu amaralarị ihe Jisọs na-akụzi, ọbụna dị ka ọ dị Pita, Andru, Jemes, na Jọn mgbe a kpọrọ ha. Dịkwa ka ha, Matiu mere ngwa isoro Kraịst. O biliri, hapụ ibu ọrụ ya nile nke ịbụ onye na-ana ụtụ isi, wee soro Jisọs.
Mgbe e mesịrị, eleghị anya iji ṅụrịa ọṅụ maka ịza okù ahụ a kpọrọ ya, Matiu kpọrọ oké oriri n’ụlọ ya. Gụnyere Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, ndị ahụ ha na Matiu na-akpakọ ná mbụ bịakwara. Ndị Juu ibe ha na-eledakarị ndị ikom ndị a anya n’ihi na ha na-anakọtara ndị ọchịchị Rom ahụ a kpọrọ asị ụtụ isi. Ọzọkwa, ha na-ejikarị ụzọ aghụghọ na-anara ndị mmadụ ego karịa ihe ha kwesịrị ịkwụ.
N’ịhụ na Jisọs so ndị dị otú a nọrọ n’oriri ahụ, ndị Farịsii jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ihi gịnị ka onye ozizi unu na-eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie ndị a eri ihe?” Mgbe ọ nụrụ ajụjụ ahụ, Jisọs zara, sị: “Mkpa dibịa akpaghị ndị dị ike, kama ọ na-akpa ndị ahụ na-adịghị mma. Ma gaanụ mụta ihe okwu a bụ. Ana m achọ ebere, ọ bụghị àjà: n’ihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama ọ bụ ndị mmehie.”
O doro anya na Matiu kpọrọ ndị ọna ụtụ ndị a n’ụlọ ya ka ha wee nwee ike ịnụrụ ihe Jisọs na-ekwu ma nara ọgwụgwọ ime mmụọ. Ya mere, Jisọs sooro ha nọkọọ iji nyere ha aka inweta ezi mmekọrịta nke ha na Chineke. Jisọs eledaghị ndị dị otú a anya, dị ka ndị Farisii ahụ bụ ndị ezi omume n’anya nke onwe ha mere. Kama nke ahụ, n’ịbụ onye ọmịiko kpaliiri, ọ ghọrọ dibịa ime mmụọ nye ha.
Ya mere, Jisọs igosi ebere n’ebe ndị mmehie nọ abụghị ịnabata mmehie ha, kama ọ bụ igosi otu ụdị mmetụta ọmịiko ahụ nke o nwere n’ebe ndị ọrịa nkịtị nọ. Dị ka ihe atụ, cheta mgbe o jiri ọmịiko setịpụ aka ya wee metụ onye ekpenta, na-asị: “Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” Ka anyị na-egosi ebere n’otu aka ahụ site n’inyere ndị ọ dị mkpa aka, karịsịa site n’inyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Matiu 8:3; 9:9-13; Mak 2:13-17; Luk 5:27-32.
▪ Olee ebe Matiu nọ mgbe Jisọs hụrụ ya?
▪ Gịnị bụ aka ọrụ Matiu, n’ihi gịnịkwa ka ndị Juu ndị ọzọ ji eleda ndị dị otú a anya?
▪ Gịnị ka e kwuru megide Jisọs, ò sikwa aṅaa zaghachi?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji eso ndị mmehie akpakọ?