Isi 30
Ịzaghachi Ndị Na-ebo Ya Ebubo Okwu
MGBE ndị ndú okpukpe Juu boro Jisọs ebubo na ọ na-emebi Ụbọchị Izu Ike, ọ zara, sị: “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.”
N’agbanyeghị ihe ndị Farisii kwuru, ọrụ Jisọs abụghị ụdị nke iwu Ụbọchi Izu Ike ahụ gbochiri. Ọ bụ Chineke nyere ya ọrụ nke ikwusa ozi ọma na ịgwọ ọrịa, n’iṅomikwa ihe nlereanya Chineke, ọ nọgidere na-arụ ya ụbọchị nile. Otú ọ dị, azịza ya mere ka ndị Juu jupụta n’ọnụma ọbụna karịa ná mmalite, ha wee chọọ igbu ya. N’ihi gịnị?
Ọ bụ n’ihi na ugbu a, ọ bụghị nanị na ha kwenyere na Jisọs na-emebi Ụbọchị Izu Ike, kama ha wekwaara okwu ahụ Jisọs kwuru na ya bụ Ọkpara Chineke dị ka ikwulu Chineke. Otú ọ dị, Jisọs atụghị egwu ọ bụla, o wee gaakwa n’ihu ịgwa ha maka ọnọdụ ọma dị n’etiti ya na Chineke. O kwuru sị, “Nna m na-ahụ Ọkpara ya n’anya, na-egosikwa ya ihe nile ya onwe ya na-eme.”
Jisọs gara n’ihu na-ekwu sị, “Dị ka Nna m na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, . . . otú a ka Ọkpara ya na-emekwa ka ndị ọ na-achọ dị ndụ.” N’ezie, Ọkpara ahụ anọworị na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ! Jisọs kwuru sị, “Onye na-anụ okwu m, nke na-ekwerekwa onye zitere m, . . . [e]sitewo n’ọnwụ baa ná ndụ.” Ee, o kwukwara, sị: “Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke; ndị nụrụ ga-adịkwa ndụ.”
Ọ bụ ezie na ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe ndekọ gosiri na Jisọs akpọlitewo mmadụ n’ọnwụ n’ụzọ nkịtị, ma ọ gwara ndị ahụ na-ebo ya ebubo na mbilite n’ọnwụ nkịtị ahụ aghaghị ịdị. Ọ sịrị, “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu ya, ha ga-apụtakwa.”
Ruo mgbe ahụ, o doro anya na ọ dịbeghị mgbe Jisọs si otú ahụ gosi n’ihu ọha ihe bụ ọrụ ya ná nzube Chineke n’ụzọ pụtara ìhè, nke onye ọ bụla pụkwara ịmata. Ma ndị na-ebo Jisọs ebubo nwere ihe àmà ndị ọzọ karịa àmà nke ọ gbara n’onwe ya banyere ihe ndị a. Jisọs chetaghachiiri ha sị, “Unu onwe unu ezigaworo Jọn, ọ gbawokwara eziokwu ahụ àmà.”
Nanị afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptism gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu ndị a maka Onye ahụ nke na-abịa n’azụ ya. N’ichetaghachiri ha oké ùgwù ha na-akwanyeburu Jọn, onye nọ n’ụlọ mkpọrọ ugbu a, Jisọs sịrị: “Unu onwe unu chọkwara ka obi tọọ unu ụtọ nke ukwuu n’ìhè ya nwa oge.” Jisọs mere ka nke a bataghachi n’uche ha iji nyere ha aka, ee, iji zọpụta ha. Ma ọ dabereghị n’ịgba àmà Jọn.
“Ọrụ ahụ onwe ha nke m na-arụ [gụnyere ọrụ ebube ọ ka rụrụ mgbe ahụ] na-agbara m àmà, na Nna m ziteworo m.” Ma e wezụga nke ahụ, Jisọs gakwara n’ihu ịsị: “Nna nke zitere m, ya onwe ya agbawokwara m àmà.” Dị ka ihe atụ, Chineke gbara àmà banyere Jisọs mgbe e mere ya baptism, na-asị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya.”
N’ezie, ndị na-ebo Jisọs ebubo enweghị ihe ha ga-asị mere ha ji jụ ya. Akwụkwọ nsọ ahụ ha sịrị na ha na-enyocha gbara àmà banyere ya! Jisọs mechiri okwu ya na-asị, “Ọ bụrụ na unu kwere Mosis, unu ga-ekwe m n’ihi na ya onwe ya dere ihe banyere m n’akwụkwọ. Ma ọ bụrụ na unu ekweghị ihe onye ahụ dere n’akwụkwọ, ùnu ga-esi aṅaa kwere okwu nke m?” Jọn 5:17-47; 1:19-27; Matiu 3:17.
▪ Gịnị mere ọrụ Jisọs na-ejighị bụrụ imebi Ụbọchị Izu Ike?
▪ Olee otú Jisọs si kọwaa ọrụ dị mkpa o nwere ná nzube Chineke?
▪ Iji gosi na ya bụ Ọkpara Chineke, ịgba àmà ònye ka Jisọs na-ezo aka na ya?