Isi 34
Ịhọrọ Ndị Ozi Ya
O RUOLA ihe dị ka otu afọ na ọkara kemgbe Jọn Onye Na-eme Baptism mesịrị ka a mara Jisọs dị ka Nwa Atụrụ Chineke, Jisọs wee malitekwa ozi ihu ọha ya. N’oge ahụ, Andru, Saịmọn Pita, Jọn, na ma eleghị anya Jemes (nwanne Jọn), tinyekwara Filip na Nataniel (onye a na-akpọkwa Batolomiu), aghọworị ndị mbụ na-eso ụzọ ya. Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị ọzọ sonyeere ha n’iso Kraịst.
Ugbu a, Jisọs ejikerewo ịhọpụta ndị ozi ya. Ndị a ga-abụ ndị ya na ha na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya, ndị ọ ga-enye ọzụzụ pụrụ iche. Ma tupu ọ họpụta ha, Jisọs rịgoro n’otu ugwu, nọrọkwa n’ebe ahụ ogologo abalị nile na-ekpe ekpere, ọ ghaghị ịbụ na ọ na-arịọ maka amamihe na ngọzi Chineke. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya, sitekwa n’etiti ha họpụta mmadụ 12. Otú ọ dị, ebe ha ka nọgidere na-abụ ndị mmụta Jisọs, a nọgidekwara na-akpọ ha ndị na-eso ụzọ ya.
Mmadụ isii ndị Jisọs họpụtara, ndị a kpọtụrụ aha n’elu ebe a bụ ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. A họpụtakwara Matiu, onye Jisọs kpọrọ site n’ebe ọ na-ana ụtụ. Mmadụ ise ndị ọzọ a kpọkwara bụ Judas (onye a na-akpọkwa Tadiọs), Judas Iskarịọt, Saịmọn onye Kenan, Tọmas, na Jemes nwa Alfịọs. A na-akpọkwa Jemes nke a Jemes Onye Nta, eleghị anya n’ihi na ọ bụ obere mmadụ ma ọ bụ bụrụ na ọ dị ala n’afọ ndụ karịa onyeozi nke ọzọ bụ Jemes.
Ruo ugbu a, mmadụ 12 ndị a anọnyeworo Jisọs ruo oge ụfọdụ, ọ makwaara ha nke ọma. N’ezie, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ikwu ya. O doro anya na Jemes na nwanne ya bụ Jọn bụ ụmụ nwanne nne Jisọs. Ọ pụkwara ịbụ na Alfịọs bụ nwanne Josef, bụ́ onye nọ dị ka nna Jisọs. Ya mere, nwa Alfịọs bụ́ Jemes onyeozi ga-abụkwa nwa nwanne nna Jisọs.
N’ezie, o sighịrị Jisọs ike icheta aha ndị ozi ya. Ma ị̀ pụrụ icheta ha? Nanị cheta na e nwere abụọ ndị a kpọrọ Saịmọn, abụọ ndị a kpọrọ Jemes, na abụọ ndị a kpọrọ Judas, na Saịmọn nwekwara nwanne nwoke bụ Andru, Jemes nwekwara nwanne bụ Jọn. Nke ahụ bụ ihe ga-enye aka icheta ndị ozi asatọ. Anọ ndị ọzọ gụnyere onye ọna ụtụ (Matiu), otu onye nke mesịrị rụọ ụka (Tọmas), onye a kpọrọ mgbe ọ nọ n’okpuru osisi (Nataniel), na enyi ya bụ Filip.
Iri na otu n’etiti ndị ozi ahụ sitere Galili, bụ́ obodo Jisọs. Nataniel si Kena. Filip, Pita na Andru bụ ndị Betsaịda, e mesịa Pita na Andru kwalaa Kapanaum ebe o yiri ka ọ bụ ebe Matiu biworo. Jemes na Jọn na-arụ ọrụ ịkụ azụ, o yikwara ka ha bi nso Kapanaum. O yiri ka Judas Iskarịọt, onye mesịrị rara Jisọs nye, ọ bụ nanị onyeozi si Judia. Mak 3:13-19; Luk 6:12-16.
▪ Olee ndị ozi ga-abụworị ndị ikwu Jisọs?
▪ Olee ndị bụ ndị ozi Jisọs, oleekwa otú ị pụrụ isi cheta aha ha?
▪ Site n’ógbè dịgasị aṅaa ka ndị ozi ahụ si bịa?