Isi 35
Ozizi A Kasị Mara Amara E Zitụworo
ỌNỌDỤ ihe omume ahụ bụ otu n’ime ndị a kasị na-echeta n’akụkọ ihe mere eme nke Bible: Jisọs na-anọdụ n’akụkụ ugwu, na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama. Ebe ahụ dị nso Osimiri Galili, eleghị anya na nso Kapanaum. Mgbe ọ nọsịworo ogologo abalị ahụ nile n’ekpere, Jisọs ka họpụtasịrị nnọọ mmadụ 12 n’etiti ndị na-eso ụzọ ya ịbụ ndị ozi. Mgbe ahụ, ya na ha nile sooro na-agbadata n’ebe a dị larịị n’elu ugwu.
Ị pụrụ iche na ka ọ dị ugbu a, ike ga-agwụwo Jisọs nke ukwuu, na ọ ga-achọkwa ihitụ ụra. Ma oké ìgwè mmadụ abịawo, ụfọdụ n’ime ha sirịị Judia na Jerusalem bịa, bụ́ ebe dị 60 ruo 70 maịlụ. Ndị ọzọ esitewo n’akụkụ osimiri nke Taịa na Saịdọn nke dị n’ebe ugwu bịa. Ha abịawo ịnụrụ ihe Jisọs na-ekwu, ka a gwọọkwa ha ọrịa ha. E nwere ọbụna ndị ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ajọ ndị mmụọ ozi Setan, na-enye nsogbu.
Ka Jisọs na-agbadata, ndị ahụ na-esighị ike bịarutere nso ibitụ ya aka, ọ gwọkwara ha nile. Mgbe nke ahụ gasịrị, o doro anya na Jisọs rịgoro n’ebe katụ elu n’ugwu ahụ. Ọ nọdụrụ ala n’ebe ahụ wee malite izi ìgwè mmadụ ahụ nọjuru n’ebe ahụ dị larịị n’ihu ya ihe. Chee nnọọ echiche banyere ya! Ugbu a, ọ dịghị ọbụna otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ nile nke na-arịa ajọ ọrịa ọ bụla!
Ọ na-agụsi ndị ahụ ike ịnụrụ ihe onye ozizi ahụ nke nwere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a dị egwu ga-ekwu. Otú ọ dị, n’ụzọ bụ isi, Jisọs ziri ozizi ya maka abamuru nke ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị o yiri ka hà nọ ya nso karịsịa. Ma, ka anyị wee nwee ike iritekwa uru, ma Matiu ma Luk edekọwo ya.
Ihe ndekọ nke Matiu nyere banyere ozizi ahụ toro ogologo karịa nke Luk ihe ruru okpukpu anọ. Ọzọkwa, akụkụ nke ihe Matiu dekọrọ, Luk kwuru ha dị ka ihe Jisọs kwuru n’oge ọzọ mgbe ọ na-eje ozi ya, dị ka anyị pụrụ ịhụta site n’iji Matiu 6:9-13 tụnyere Luk 11:1-4, na Matiu 6:25-34 tụnyere Luk 12:22-31. Ma, nke a ekwesịghị iju anya. O doro anya na Jisọs kụziri otu ihe ahụ ihe karịrị otu ugbo, Luk họkwaara idekọ ụfọdụ n’ime ozizi ndị a n’ọnọdụ dị iche.
Ihe mere ka ozizi Jisọs bụrụ ihe bara oké uru abụghị nanị ịdị omimi nke ihe ime mmụọ dị na ya, kama ọ bụ ịdị mfe na ido anya nke o ji wepụta eziokwu ndị a. O ji ihe ndị na-eme eme na ihe ndị mmadụ maara nke ọma mee ihe, ma si otú a na-eme ka ọ dịrị ndị nile na-achọ ndụ ka mma n’ụzọ nke Chineke mfe ịghọta ihe o bu n’uche.
Òle Ndị Nwere Obi Ụtọ n’Ezie?
Onye ọ bụla chọrọ inwe obi ụtọ. N’ịghọta nke a, Jisọs malitere Ozizi Elu Ugwu ya site n’ịkọwa ndị ahụ nwere obi ụtọ n’ezie. Dị ka anyị pụrụ iche, nke a dọọrọ mmasị ìgwè ndị na-ege ya ntị ozugbo ahụ. Ma n’agbanyeghị nke a, okwu mmeghe ya aghaghị iyi ndị na-emegiderịta onwe ha n’echiche ọtụtụ ndị.
N’iche okwu ya ihu n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, Jisọs malitere, site n’ịsị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu, bụ́ ndị ogbenye: n’ihi na alaeze Chineke bụ nke unu. Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a: n’ihi na afọ ga-eju unu. Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu ndị na-akwa ákwá ugbu a: n’ihi na unu ga-achị ọchị. Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị unu, mgbe ọ bụla mmadụ ga-akpọ unu asị, . . . Ṅụrịanụ ọṅụ n’ụbọchị ahụ, wụliekwanụ elu n’ihi ọṅụ: n’ihi na lee, ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.”
Nke a bụ ihe ndekọ Luk nke okwu mmeghe ozizi Jisọs. Ma, dị ka ihe ndekọ nke Matiu si dị, Jisọs kwukwara na ndị dị nwayọọ n’obi, ndị ebere, ndị dị ọcha n’obi, na ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo bụ ndị obi ụtọ. Dị ka Jisọs kwuru, obi ụtọ na-adịrị ndị a n’ihi na ha ga-eketa ala, a ga-emere ha ebere, ha ga-ahụ Chineke, a ga-akpọkwa ha ụmụ Chineke.
Otú ọ dị, ihe Jisọs bu n’obi mgbe ọ na-asị na ha bụ ndị obi ụtọ abụghị nanị na ha na-emesapụ ihu ma ọ bụ na-enwe ihu ọchị dị ka mgbe mmadụ na-eme ihe na-enye ya obi ụtọ. Ezi obi ụtọ karịrị nke ahụ, ọ na-ezo aka n’ịbụ onye ihe zuuru, inwe afọ ojuju na inwezu ihe ndị dị mkpa ná ndụ.
Ya mere, Jisọs gosiri na ndị ahụ nwere obi ụtọ n’ezie bụ ndị ghọtara mkpa nke ihe ime mmụọ ha, ndị ọnọdụ mmehie ha na-ewute, ndị bịakwara ịmara Chineke, na ife ya ofufe. N’ihi ya, a sịgodi na a kpọrọ ha asị ma ọ bụ sogbuo ha n’ihi ime ihe Chineke na-achọ, ha na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha maara na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ha ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya nke ịdị ndụ ebighị ebi.
Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-ege Jisọs ntị, dịkwa ka ụfọdụ ndị taa, kwere na mmadụ ịbụ onye ihe na-agara nke ọma nakwa inweta ihe ụtọ dị iche iche bụ ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Jisọs maara na ọ bụghị otú ahụ. N’igosi ihe dị iche nke na-aghaghị ịtụ ọtụtụ ndị na-ege ya ntị n’anya, ọ sịrị:
“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ọgaranya: n’ihi na unu na-enwezu nkasi obi unu. Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị afọ juworo ugbu a: n’ihi na agụụ ga-agụ unu. Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị na-achị ọchị ugbu a: n’ihi na unu ga-eru újú kwaakwa ákwá. Ahụhụ ga-adịrị unu, mgbe ọ bụla mmadụ nile ga-ekwu okwu ọma banyere unu: n’ihi na otú ahụ ka ndị bụ nna ha mere ndị amụma ụgha.”
Gịnị ka Jisọs bu n’uche? Gịnị mere ịbụ ọgaranya, iji ọchị na-achụso ihe ụtọ dị iche iche, na-enwetakwa ịja mma nke mmadụ ga-eji weta ahụhụ? Ọ bụ n’ihi na mgbe mmadụ nwetara ihe ndị a, na-ejikwa ha dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, mgbe ahụ, a na-agụpụ ijere Chineke ozi, nke bụ nanị ihe na-eweta ezi obi ụtọ, ná ndụ ya. N’otu mgbe ahụ, Jisọs adịghị asị na mmadụ ịbụ ogbenye, onye agụụ na-agụ, na onye na-eru újú bụ ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Otú ọ dị, mgbe mgbe, ndị dị otú ahụ ihe na-agazighịrị pụrụ ịnakwere ozizi Jisọs, wee bụrụ ndị a gọziri site n’ime ka ha nwee ezi obi ụtọ.
Ọzọkwa, n’ịgwa ndị na-eso ụzọ ya okwu, Jisọs sịrị: “Unu onwe unu bụ nnú nke ụwa.” Ma, ọ dịghị ekwu na ha bụ nnú n’ụzọ nkịtị. Kama nke ahụ, nnú na-echekwa ihe. A wụsara ikpó nnú buru ibu n’akụkụ ebe ịchụ àjà n’ụlọ nsọ Jehova, ndị nchụaja na-eje ozi na-ejikwa ya echekwa àjà ha.
Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ “nnú nke ụwa,” n’ihi na ha nwere mmetụta na-echebe ndị mmadụ. N’ezie, ozi ha na-ekwusa ga-echebe ndụ nke ndị nile nabatara ya! Ọ ga-ewetara ndụ nke ndị dị otú ahụ àgwà nke ịdịgide adịgide, iguzosi ike, na ikwesị ntụkwasị obi, na-egbochi ire ure ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ na omume n’ime ha.
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa.” A naghị amụnye oriọna wee dọba ya n’okpuru nkata, kama a na-adọba ya n’elu ihe ndọba oriọna, ya mere Jisọs sịrị: “Otú a, meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ.” Ndị na-eso ụzọ Jisọs na-eme nke a site n’ịgba àmà ihu ọha ha, nakwa site n’ezi ihe nlereanya nke ezi ibi obi nke kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible.
Ụkpụrụ Dị Elu nye Ndị Na-eso Ụzọ Ya
Ndị ndú okpukpe na-ele Jisọs anya dị ka onye na-emebi Iwu Chineke, gbaakwa izu n’oge na-adịbeghị anya igbu ya. Ya mere, ka Jisọs na-aga n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya, ọ kọwara, sị: “Unu echela na abịara m imebi iwu Chineke ma ọ bụ ndị amụma ya: abịaghị m imebi, kama imezu ya.”
Jisọs na-asọpụrụ Iwu Chineke karịa ihe ọ bụla ọzọ, gbaakwa ndị ọzọ ume ịsọpụrụ ya n’otu aka ahụ. N’ezie, ọ sịrị: “Ya mere onye ọ bụla nke ga-emebi otu n’ime ihe ndị a dịkasịrị nta nke e nyere n’iwu, nke ga-ezikwa mmadụ otú ahụ, a ga-akpọ ya onye dịkasịrị nta n’alaeze eluigwe,” nke pụtara na onye dị otú ahụ agaghị abanye n’ime Alaeze ahụ ma ọlị.
N’abụtụghị ileghara Iwu Chineke anya, Jisọs katọrọ ọbụna omume ndị na-eme ka mmadụ mebie ya. Mgbe o kwusịrị na Iwu ahụ sịrị, “Egbula mmadụ,” Jisọs kwukwara: “Ma mụ onwe m sị unu, na onye ọ bụla nke na-ewe iwe megide nwanne ya ga-enye onwe ya n’aka ikpe.”
Ebe ọ bụ na mmadụ ịnọgide na-eweso enyi ya iwe dị njọ otú a, eleghị anya ọbụna nwee ike iduba n’igbu ọchụ, Jisọs kọwara ókè mmadụ ga-emeru ihe iji mee ka udo dị. O nyere ndụmọdụ, sị: “Ya mere ọ bụrụ na ị na-eche onyinye [ịchụ àjà] gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụ àjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụ àjà, laba, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.”
N’ikwu banyere nke asaa n’ime Iwu Iri ahụ, Jisọs kwukwara, sị: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Akwala iko.” Otú ọ dị, Jisọs katọrọ ọbụna ịnọgide na-eme omume nke na-eduje n’ịkwa iko. “Mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasowo ya iko n’obi ya ugbu a.”
Jisọs adịghị ekwu okwu n’ebe a banyere echiche ọjọọ ụfọdụ pụrụ ịbata n’obi mmadụ nwa mgbe, kama ọ bụ banyere ‘ịnọgide na-ele anya.’ Ilegide anya n’ụzọ dị otú ahụ na-akpali agụụ mmekọahụ, nke na ọ pụrụ iduba n’ịkwa iko ma ọ bụrụ na ohere adapụta. Olee otú mmadụ pụrụ isi gbochie nke a ime? Jisọs kọwara otú ọ pụrụ isi dị mkpa ka e mesie ihe ike banyere nke a, na-asị: “Ugbu a, ọ bụrụ na anya aka nri gị ahụ na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya ma si n’ebe ị nọ tụfuo ya. . . . Ọ bụrụkwa na aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, bepụ ya ma si n’ebe ị nọ tụfuo ya.”—NW.
Ndị mmadụ na-adịkarị njikere igbubipụ aka nkịtị nke bu ajọ ọrịa iji wee chebe ndụ ha. Ma dị ka Jisọs si kwuo, ọ dị mkpa ọbụna karị ‘ịtụfu’ ihe ọ bụla, ọbụna ihe dị oké ọnụ dị ka anya ma ọ bụ aka, iji zere echiche na omume rụrụ arụ. Jisọs kọwara na ma ọ bụghị otú ahụ, a ga-atụba ndị dị otú ahụ n’ime Gehena (ebe a na-esure ihe na-abaghị uru n’ọkụ, nke dị nso Jerusalem), nke na-anọchi anya mbibi ebighị ebi.
Jisọs kwukwara okwu banyere otú a ga-esi emeso ndị na-akpata mmerụ ahụ na mmejọ. Ọ dụrụ ọdụ sị, “Eguzogidela onye bụ ajọ onye: kama onye ọ bụla na-ekpu gị ụra ná ntị aka nri, tụgharịakwara ya ntị [nke] ọzọ.” Jisọs adịghị ekwu na mmadụ ekwesịghị ichebe onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya ma ọ bụrụ na a wakpo ha. Ihe e ji ama mmadụ ụra abụghị ka e wee merụọ ya ahụ nkịtị, kama ọ bụ iji kparịa ya. Ya mere, ihe Jisọs na-ekwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ anwaa ịkpali ọgụ ma ọ bụ arụmarụ ụka, eleghị anya site n’ịsaghepụ aka maa mmadụ ụra n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ site n’iji okwu mkparị kwujọọ mmadụ, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi imegwara.
Mgbe ọ kpọtụsịrị uche n’iwu Chineke nyere ịhụ onye agbata obi mmadụ n’anya, Jisọs kwuru: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.” N’ikwu otu ọkpụrụkpụ ihe mere a ga-eji mee nke a, o kwukwara, sị: “Ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nke bi n’eluigwe: n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ.”
Jisọs mechiri akụkụ nke a nke ozizi ya site n’ịdụ ọdụ, sị: “Ya mere unu onwe unu ga-ezu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” Ihe Jisọs na-ekwu apụtaghị na mmadụ ga-ezucha okè n’akụkụ nile. Kama, site n’iṅomi Chineke, ha pụrụ ịgbasawanye ịhụnanya ha ka o ruo ọbụna ndị iro ha. Ihe ndekọ Luk nke kwekọkwara na nke a dere okwu Jisọs otú a: “Nweenụ obi ebere, dị ka Nna unu nwere obi ebere.”
Ekpere, na Ịtụkwasị Chineke Obi
Ka Jisọs na-aga n’ihu n’ozizi ya, ọ katọrọ ihu abụọ nke ụmụ mmadụ ndị na-eme ngosipụta nke ihe e chere na ọ bụ nsọpụrụ Chineke. O kwuru sị, “Mgbe ọ bụla ị na-arụ ọrụ ebere, afụla opi n’ihu gị, ọbụna dị ka ndị ihu abụọ na-eme.”
Jisọs gara n’ihu sị, “Mgbe ọ bụla unu na-ekpekwa ekpere, unu agaghị adị ka ndị ihu abụọ ahụ: n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ unu na nkuku ámá unu ikpe ekpere, ka ha wee were onwe ha gosi mmadụ.” Kama ọ kụziri, sị: “Mgbe ọ bụla ị na-ekpe ekpere, baa n’ime ụlọ nta gị, mgbe ị mechisịkwara ụzọ gị, kpeere Nna gị nke dị na nzuzo.” Jisọs n’onwe ya kpere ekpere dị iche iche n’ihu ọha, ya mere, ọ dịghị akatọ ndị a. Ihe ọ na-akatọ bụ ekpere ndị e kpere ka ha tọọ ndị na-ege ntị ụtọ ma dọta okwu ọma ha.
Jisọs gara n’ihu inye ndụmọdụ, sị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu, dị ka ndị mba ọzọ na-eme.” Jisọs adịghị asị na ikwughachi okwu dị njọ n’onwe ya. N’otu mgbe, ya onwe ya jiri “okwu nkwukwasị” mee ihe mgbe ọ na-ekpe ekpere. Ma ihe ọ na-akagbu bụ ikwu okwu ndị e bu n’isi “ugbo ugbo” (NW), bụ́ otú ndị ahụ na-eji mkpụrụ aka na-agụ mkpụrụ ayọrọ na-eme, ka ha na-ekwughachi ihe ha bu n’isi.
Iji nyere ndị na-ege ya ntị aka ikpe ekpere, Jisọs na-enye ekpere ihe nlereanya nke gụnyere arịrịọ asaa. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, atọ ndị mbụ na-amata ọkaaka Chineke na nzube ya nile. Ha bụ arịrịọ ka e doo aha Chineke nsọ, ka Alaeze ya bịa, ka e meekwa uche ya. Anọ ndị ọzọ bụ arịrịọ ndị metụtara onwe onye, ya bụ, maka nri ụbọchị, mgbaghara mmehie, igbochi inwa ọnwụnwa karịa ihe mmadụ pụrụ ịnagide, na nnapụta pụọ n’aka ajọ onye ahụ.
N’ịga n’ihu, Jisọs na-ekwu okwu banyere ọnyà nke ilekwasị anya n’ụzọ na-ezighị ezi n’ebe ihe onwunwe dị. Ọ gbara ume, sị: “Unu akpadola akụ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi.” Ọ bụghị nanị na akụ ndị dị otú a na-ebibi ebibi, kama ha adịghị ewulite inweta ihu ọma Chineke.
N’ihi nke a, Jisọs na-asị: “Kama kpadoonụ akụ n’eluigwe nye onwe unu.” A na-eme otú a site n’itinye ozi Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị. Ọ dịghị onye ọ bụla nke pụrụ iweghara ihu ọma Chineke nke e si otú a nweta ma ọ bụ ụgwọ ọrụ dị ebube nke ọ na-enyeghachi. Mgbe ahụ Jisọs kwukwara, sị: “Ebe akụ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”
N’ikwu okwu gaa n’ihu banyere ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, Jisọs nyere ihe ịma atụ ahụ bụ: “Oriọna nke ahụ bụ anya: ya mere ọ bụrụ na anya gị elee otu ebe, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ìhè. Ma ọ bụrụ na anya gị jọrọ njọ, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ọchịchịrị.” Anya nke na-arụ ọrụ nke ọma bụ oriọna nke a mụnyere n’ebe gbara ọchịchịrị nye ahụ. Ma iji hụ ụzọ nke ọma, anya aghaghị ịdị na-elegide n’otu ihe. Ilepụ anya n’ihe na-eduje n’ime atụmatụ ndị na-ezighị ezi, na idebe nchụso ihe onwunwe n’ọnọdụ mbụ tupu ozi Chineke, na-akpatara ‘ahụ dum’ ịnọ n’ọchịchịrị.
Jisọs kwuzuru okwu nke a site n’inye ihe atụ siri ike, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ.”
Mgbe o nyesịrị ndụmọdụ nke a, Jisọs na-emesi ndị na-ege ya ntị obi ike na ọ dịghị ha mkpa ichegbu onwe ha banyere mkpa ihe onwunwe ha ma ọ bụrụ na ha etinye ozi Chineke n’ihe mbụ. “Leenụ anụ ufe nke eluigwe,” ka ọ sịrị, “na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi, ha adịghị ekpokọtakwa ihe baa n’ọba; ma Nna unu nke eluigwe na-azụ ha.” Mgbe ahụ ọ jụrụ, sị: “Unu onwe unu àbụghị ihe oké ọnụ ahịa karịa ha?”
Ọzọ, Jisọs zoro aka n’ebe urodi nke ọhịa dị ma kwuo na “ọbụna Solomọn n’ebube ya nile, e gbokwasịghị ya ákwà dị ka otu n’ime ndị a.” Ọ gara n’ihu sị, “Ma ọ bụrụ na Chineke eyikwasị ahịhịa nke ubi uwe otú a, . . . ọ́ gaghị eyikwasịkarị unu uwe nke ukwuu, unu ndị okwukwe nta?” Ya mere Jisọs kwubiri, sị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? . . . n’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”
Ụzọ nke Na-eduje Ná Ndụ
Ụzọ nke na-eduje ná ndụ bụ ịgbaso ozizi Jisọs. Ma nke a adịghị mfe ime. Dị ka ihe atụ, ndị Farisii na-eyi ka ha na-eji anya ọkụ na-ekpe ndị ọzọ ikpe, o yikarịkwara ka ọtụtụ ndị à na-eṅomi ha. Ya mere ka Jisọs gara n’ihu n’Ozizi Elu Ugwu ya, o nyere ndụmọdụ nke a, sị: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na ikpe unu ji kpee ka a ga-eji kpee unu.”
Ọ bụ ihe ize ndụ ịgbaso nduzi nke ndị Farisii na-emekarị nkatọ. Dị ka ihe ndekọ Luk si kwuo, Jisọs gosipụtara ihe ize ndụ nke a site n’ikwu, sị: “Onye ìsì ọ̀ pụrụ idu onye ìsì? Ha abụọ ágaghị adaba n’olulu?”
Ịkatọkarị ndị ọzọ, na-eme ka adịghị ike ha dị ukwuu karịa otú ọ dị n’ezie ma na-enyogharị ha, bụ oké mmehie. Ya mere Jisọs na-ajụ, sị: “Ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, Kwe ka m tụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya gị: ma lee, ntụhie ahụ dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ, buru ụzọ tụpụ ntụhie ahụ n’anya nke gị; mgbe ahụ ka ị ga-elegide anya ịtụpụ irighiri ahịhịa ahụ n’anya nwanna gị.”
Nke a apụtaghị na ndị na-eso ụzọ Jisọs agaghị eji nghọta mee ihe n’ebe ndị ọzọ nọ, n’ihi na o kwuru, sị: “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụdakwala pearl unu n’ihu ezì.” Eziokwu ndị sitere n’Okwu Chineke dị nsọ. Ha dị ka nkume pearl ihe atụ. Ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị, bụ́ ndị dị ka nkịta ma ọ bụ ezì aghara igosi mmasị ọ bụla maka eziokwu ndị a dị oké ọnụ ahịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị ịhapụ ndị ahụ ma chọpụta ndị na-anabata eziokwu ahụ karị.
Ọ bụrịị eziokwu na Jisọs ekwuwo okwu banyere ekpere ná mmalite nke Ozizi Elu Ugwu ya, ọ na-emesi ike ugbu a, mkpa ọ dị ịnọgide na ya. Ọ na-agba ume sị, “Rịọnụ, a ga-enyekwa unu.” Iji gosipụta njikere nke Chineke dị ịza ekpere, Jisọs jụrụ, sị: “Olee mmadụ dị n’etiti unu, onye, ma ọ bụrụ na nwa ya ga-arịọ ya ogbe achịcha, ga-enye ya nkume? . . . Ya mere, ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke bi n’eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị ezi ihe nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya?”
Mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs nyere ihe ghọworo ụkpụrụ omume a ma ama, bụ́ nke a na-akpọkarị Ụkpụrụ Ọma ahụ. O kwuru, sị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a unu onwe unu.” Ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nke a gụnyere iwere nzọụkwụ pụtara ìhè n’imere ndị ọzọ ihe ọma, na-emeso ha otú ị chọrọ ka e si mesoo gị.
E gosipụtara na ụzọ nke ndụ adịghị mfe ịgbaso na ndụmọdụ Jisọs, bụ: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”
Ihe ize ndụ nke ịbụ onye e duhiere dị ukwuu, ya mere, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ.” Ọbụna dị ka a pụrụ ịmata ezi osisi na osisi ọjọọ site ná mkpụrụ ha, Jisọs mere ka a mata na a pụrụ ịmata ndị amụma ụgha site n’omume na ozizi ha.
N’ịga n’ihu, Jisọs kọwara na ọ bụghị nanị ihe mmadụ kwuru na-eme ka mmadụ bụrụ onye na-eso ụzọ Ya kama ihe ọ na-eme. Ụfọdụ ndị na-asị na Jisọs bụ Onyenwe ha, ma ọ bụrụ na ha adịghị eme uche Nna ya, o kwuru, sị: “M ga-ekwupụtara ha, sị, ọ dịghị mgbe ọ bụla m maara unu: si n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”
N’ikpeazụ, Jisọs nyere nkwubi okwu dị ịrịba ama n’ozizi ya. Ọ na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, na-emekwa ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee makwasị ụlọ ahụ; ma ọ daghị: n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume ahụ.”
N’aka ndị ọzọ, Jisọs kwupụtara, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, ma ọ dịghị eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nke bụ onye nzuzu, onye wuru ụlọ ya n’elu ájá: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee tikwasị ụlọ ahụ; o wee daa: ọdịda ya dịkwa ukwuu.”
Mgbe Jisọs zisịrị ozizi ya, ibubo nwụrụ oké ìgwè mmadụ ahụ n’ụzọ o si ezi ihe, n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị ndú okpukpe ha. Luk 6:12-23; Matiu 5:1-12; Luk 6:24-26; Matiu 5:13-48; 6:1-34; 26:36-45; 7:1-29; Luk 6:27-49.
▪ Ebee ka Jisọs nọ mgbe o ziri ozizi ahụ a kasị echeta, oleekwa ndị bịara, gịnị bu ụzọ mee tupu ọ malite izi ozizi ya?
▪ Gịnị mere na ọ bụghị ihe ijuanya na Luk dekọrọ ụfọdụ n’ime ozizi ndị ahụ n’ọnọdụ dị iche?
▪ Gịnị mere ozizi Jisọs ji baa uru nke ukwuu?
▪ Òle ndị nwere obi ụtọ n’ezie, n’ihi gịnịkwa?
▪ Òle ndị ga-enweta ahụhụ, n’ihi gịnịkwa?
▪ Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs si bụrụ “nnu nke ụwa” na “ìhè nke ụwa”?
▪ Olee otú Jisọs si na-egosipụta nsọpụrụ dị ukwuu maka Iwu Chineke?
▪ Ndụmọdụ ndị dị aṅaa ka Jisọs na-enye iji wepụ ihe ndị na-akpata igbu ọchụ na ịkwa iko?
▪ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o na-ekwu okwu banyere ịtụgharị ntị nke ọzọ?
▪ Olee otú anyị pụrụ isi zuo okè dị ka Chineke zuru oké?
▪ Ndụmọdụ dị aṅaa banyere ekpere ka Jisọs nyere?
▪ N’ihi gịnị ka akụ nke eluigwe ji dị elu karị, oleekwa otú e si enweta ha?
▪ Ihe atụ ndị dị aṅaa ka e nyere iji nyere mmadụ aka izere ịhụ ihe onwunwe n’anya?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo na ọ dịghị mkpa inwe nchegbu?
▪ Gịnị ka Jisọs na-ekwu banyere ikpe ndị ọzọ ikpe; ma olee otú o si na-egosi na ọ dị ndị na-eso ụzọ ya mkpa iji nghọta mee ihe n’ebe ndị ọzọ nọ?
▪ Gịnị ka Jisọs gara n’ihu ikwu banyere ekpere, ụkpụrụ omume dị aṅaa ka ọ na-enyekwa?
▪ Olee otú Jisọs si gosi na ụzọ nke ndụ agaghị adị mfe na e nwekwara ihe ize ndụ nke ịbụ onye e duhiere?
▪ Olee otú Jisọs si na-emechi ozizi ya, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọ na-enwe?