Isi 39
Ndị Mpako na Ndị Dị Umeala n’Obi
MGBE ọ kpọtụsịrị uche n’àgwà ọma nile nke Jọn Onye Na-eme Baptism, Jisọs chere ihu n’ebe ndị mpako nọ, bụ́ ndị na-eguzoghị n’otu ihe, ndị nọ ya gburugburu. O kwuru sị, “Ọgbọ a . . . yiri ụmụntakịrị ndị na-anọdụ n’ọma ahịa, ndị na-akpọ ibe ha òkù, sị, anyị gbuuru unu ọjà, ma unu eteghị egwú; anyị kwara akwá, ma unu etighị aka n’obi.”
Gịnị ka Jisọs bu n’uche? Ọ na-akọwa, sị: “Jọn bịara n’erighị ihe oriri n’aṅụghịkwa ihe ọṅụṅụ, ha wee sị, O nwere mmụọ ọjọọ. Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ha wee sị, Lee, onye ori nke ukwuu, na onye oké ọṅụ mmanya; enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie!”
Ọ bụ ihe na-apụghị ikwe omume ime ihe ga-atọ ụmụ mmadụ ụtọ. Ọ dịghị ihe na-amasị ha. Jọn ebiwo ndụ nke ịnapụ onwe ya ihe ụtọ dị ka onye Naziraịt, n’ikwekọ n’ihe ahụ mmụọ ozi kwuru, na “ọ gaghị aṅụkwa mmanya vine na ihe ọṅụṅụ n’aba n’anya ma ọlị.” Ma ụmụ mmadụ sịrị na o nwere mmụọ ọjọọ. N’aka nke ọzọ, Jisọs biri ndụ dị ka ndị ọzọ, n’anapụghị onwe ya ihe n’ụzọ ọ bụla, e bokwara ya ebubo na ọ na-emebiga ihe ókè.
Lee ihe siri ike ọ bụ ime ihe ga-atọ ụmụ mmadụ ụtọ! Ha dị ka ndị òtù egwuregwu, ndị ụfọdụ n’ime ha jụrụ ịgba egwu mgbe ụmụntakịrị ndị ọzọ fụrụ ọjà ma ọ bụ iti aka n’obi mgbe ndị ibe ha bere akwá. Otú o sina dị, Jisọs na-asị: “A gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.” Ee, ihe àmà ahụ—bụ́ ọrụ ndị ahụ—na-eme ka ọ pụta ìhè na ebubo ndị e boro ma Jọn ma Jisọs bụcha ụgha.
Jisọs gara n’ihu ịkpọpụta aha obodo atọ ndị bụ Korazin, Betsaịda, na Kapanaum maka nkọcha, bụ́ ebe ndị ọ rụworo ihe ka ọtụtụ n’oké ọrụ ya dị iche iche. A sị na ọ rụrụ ọrụ ndị ahụ n’obodo Finisia ndị bụ Taịa na Saịdọn, Jisọs na-ekwu na obodo ndị a gaara echegharị n’ákwà mkpe na ntụ. N’ịkọcha Kapanaum, nke yikarịrị ka ọ bụ ebe bụ isi n’oge ozi ya, Jisọs kwupụtara, sị: “Ala Sọdọm ga-anagide okwu n’ụbọchị ikpe karịa gị.”
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs nyere Nna ya nke eluigwe otuto. A kpaliri ya ime otú ahụ n’ihi na Chineke ezobewo eziokwu ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa site n’ebe ndị amamihe na ndị oké agụmakwụkwọ nọ ma kpughee ihe ndị a dị ebube nye ndị dị ala, ndị bụ ụmụntakịrị dị ka a pụrụ isi kwuo ya.
N’ikpeazụ, Jisọs kpọrọ òkù ahụ na-akpali akpali, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”
Olee otú Jisọs si enye ezumike? Ọ na-eme otú ahụ site n’inye inwe onwe site n’omenala ndị na-ejide mmadụ dị ka ohu, bụ́ nke ndị ndú okpukpe jiworo bogbuo ụmụ mmadụ, gụnyere, dị ka ihe atụ, iwu idebe Ụbọchị Izu Ike nke na-egechibido mmadụ. O gosikwara ndị nọ n’okpuru ibu arọ na-anyigbu anyigbu nke ịchịisi ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ndị na-ebu ibu arọ nke mmehie ha site n’inwe akọ na uche e wedara n’ala ụzọ nnapụta. O kpugheere ndị dị otú a e wedara n’ala ụzọ a pụrụ isi gbaghara ha mmehie ha na otú ha pụrụ isi nweta mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa n’ebe Chineke nọ.
Yoke obi ebere nke Jisọs na-enye bụ nke ịrara onwe onye kpamkpam nye Chineke, inwe ike ijere Nna eluigwe anyị nke dị obi ebere ozi. Ibu dị mfe nke Jisọs na-enye ndị na-abịakwute ya bụ irube isi n’ihe ndị Chineke chọrọ maka ndụ, bụ́ iwu Ya dị iche iche ndị e dekọrọ na Bible. Irube isi n’ihe ndị a adịghịkwa arọ ma ọlị. Matiu 11:16-30; Luk 1:15; 7:31-35; 1 Jọn 5:3.
▪ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị mpako, bụ́ ndị na-adịghị eguzo n’otu ihe, ndị biri n’ọgbọ Jisọs si yie ụmụntakịrị?
▪ N’ihi gịnị ka e ji kpalie Jisọs inye Nna eluigwe ya otuto?
▪ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si boo ụmụ mmadụ ibu arọ, nnapụta dịkwa aṅaa ka Jisọs na-enye?