Isi 40
Ihe Mmụta Banyere Ime Ebere
Ọ PỤRỤ ịbụ na Jisọs ka nọ na Nain, bụ́ ebe ọ ka kpọlitesịrị nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ n’oge na-adịbeghị anya, ma ọ bụ ma eleghị anya, ọ na-aga obodo dị ya nso. Otu onye Farisii aha ya bụ Saịmọn chọrọ ileru onye na-arụ ọrụ ndị a dị ịrịba ama anya nke ọma karị. Ya mere ọ kpọrọ Jisọs òkù ka o soro ya rie nri.
N’ile oge ahụ anya dị ka ohere iji gwa ndị nọ n’ebe ahụ okwu, Jisọs nabatara ịkpọ òkù ahụ, ọbụna dị ka ọ nabatara ịkpọ òkù nke ndị ọna ụtụ na ndị mmehie isoro ha rie nri. Ma, mgbe ọ na-abanye n’ụlọ Saịmọn, e nyeghị Jisọs ụdị nnabata ọma nke a na-enyekarị ndị bụ ọbịa.
Ụkwụ nke nọ n’ime akpụkpọ ụkwụ na-ekpo ọkụ ma ruo inyi n’ihi isi n’okporo ụzọ dị ntụ́ ntụ́ gaa njem, ọ bụkwa ụzọ omenala e si egosipụta ezi nnabata bụ́ iji mmiri oyi saa ụkwụ ndị ọbịa. Ma a saghị ụkwụ Jisọs mgbe ọ na-abịarute. Ọ dịghịkwa onye sutụrụ ya ọnụ iji nabata ya, nke bụ ihe onye ọ bụla na-eme. E teghịkwa isi ya mmanụ otite nke na-egosipụta inwe afọ ọma dị ka omenala si dị.
Mgbe a na-eri nri ahụ, ka ndị ọbịa ahụ na-anọnye n’oche, otu nwanyị a na-akpọghị òkù gbebatara n’ime ụlọ ahụ na nzuzo. A maara ya n’obodo ahụ dị ka onye na-ebi ndụ rụrụ arụ. O yikarịrị ka ọ bụ na ọ nụwo ozizi Jisọs, gụnyere òkù ọ na-akpọ ka ‘ndị nile na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ bịakwute ya ka ha wee zuru ike.’ N’ịbụkwa onye a kwaliri nke ukwuu n’ihi ihe ọ hụworo na ihe ọ nụworo, ọ chọtawo Jisọs ugbu a.
Nwanyị ahụ bịaruru nso n’azụ Jisọs na table ahụ ma gbuo ikpere n’ụkwụ ya. Ka anya mmiri ya na-atasa n’ụkwụ Jisọs, nwanyị ahụ ji agịrị isi ya na-ehicha ya. Ọ wekwaara mmanụ na-esi ísì ụtọ site n’ihe mmanụ ya, ka o sikwa n’ụzọ dị nro na-esutụ ya ọnụ n’ụkwụ ya abụọ, nwanyị ahụ na-awụsa mmanụ ahụ n’elu ha. Saịmọn e jighị mmasị na-ele ihe na-eme. O kwuru n’uche ya sị, “Nwoke a, a sị na ọ bụ onye amụma, ọ ga-amara onye nwanyị a bụ nke na-emetụ ya aka, na aha mmadụ ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.”
N’ịmata ihe ọ na-eche, Jisọs na-asị: “Saịmọn, enwere m okwu m ga-agwa gị.”
Ọ zaghachiri sị, “Onye ozizi, kwuo.”
Jisọs malitere na-asị, “Otu onye nke na-ebinye mmadụ ihe nwere mmadụ abụọ ji ya ụgwọ: otu onye ji ya [narị shilling ise], ibe ya jikwa ya [iri ise]. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eji kwụghachi ya ụgwọ, o weere amara gbaghara ha abụọ. Ònyekwa n’etiti ha abụọ ga-ahụkarị ya n’anya?”
Ma eleghị anya na-egosipụta enweghị mmasị n’ihi ajụjụ ahụ nke yiri ka ọ bụ ihe na-enweghị isi, Saịmọn na-asị “Ọ dị m ka onye o weere amara gbaghara karị.”
Jisọs wee sị, “I kpeziri.” Mgbe ahụkwa, n’iche nwanyị ahụ ihu, ọ na-agwa Saịmọn, sị: “Ị̀ hụrụ nwanyị a? Abatara m n’ụlọ gị, i nyeghị m mmiri iji saa ụkwụ: ma nwanyị a weere anya mmiri ya desa ụkwụ m, werekwa agịrị isi ya hichaa ha. I sutụghị m ọnụ: ma nwanyị a, site na mgbe m batara, ọ hapụghị isutụ ụkwụ m ọnụ nke ukwuu. I weghị mmanụ tee m n’isi: ma nwanyị a weere mmanụ otite tee m n’ụkwụ.”
Otú a, nwanyị ahụ egosiwo ihe àmà nke nchegharị sitere n’obi n’ihi omume ya rụrụ arụ na mbụ. Ya mere Jisọs na-ekwubi, sị: “N’ihi nke a asị m gị, A gbagharawo ya mmehie ya, nke dị ọtụtụ; n’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu: ma onye a gbaghaara ihe nta, onye ahụ na-ahụ n’anya nke nta.”
Jisọs adịghị anakwere ma ọ bụ na-anabata omume rụrụ arụ ma ọlị. Kama nke ahụ, ihe nke a mere na-egosipụta ụzọ ebere o si aghọta ọnọdụ ụmụ mmadụ bụ́ ndị mejọrọ ihe ná ndụ, ndị na-egosipụta na ha nwere mwute n’ihe ndị ahụ, mgbe ahụkwa na-abịakwute Kraịst maka nnapụta. N’inye nwanyị ahụ ezi izu ike, Jisọs na-asị: “A gbagharaworo gị mmehie nile gị. . . . Okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo.” Luk 7:36-50; Matiu 11:28-30.
▪ Olee otú Saịmọn, bụ́ onye kpọrọ Jisọs òkù si nabata ya?
▪ Ònye chọtara ebe Jisọs nọ, n’ihi gịnịkwa?
▪ Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs nyere, oleekwa otú o si kọwaa ya?