Isi 41
Onye Na-akpatakarị Ihe Ise Okwu
NWA obere oge mgbe e lekọtasịrị ya n’ụlọ Saịmọn, Jisọs na-amalite ime njem nkwusa nke abụọ gaa Galili. Na njem mbụ ọ gara n’ókèala ahụ, ndị na-eso ụzọ mbụ ya, bụ́ Pita, Andru, Jemes, na Jọn sooro ya. Ma ugbu a ndị ozi 12 ahụ, tinyere ndị inyom ụfọdụ, na-esonyere ya. Ndị a gụnyere Meri Magdalini, Susana, na Joana, onye di ya bụ onye isi n’okpuru Eze Herọd.
Ka ozi Jisọs na-agbasawanye, otú a kwa ka ihe ise okwu banyere ọrụ ya na-agbasa. A kpọtaara Jisọs otu nwoke mmụọ ọjọ ji aka onye kpukwara ísì, nke na-adịghịkwa ekwu okwu. Mgbe Jisọs gwọrọ ya, nke na o nweere onwe ya pụọ ná nduzi nke mmụọ ọjọọ ma nweekwa ike ikwu okwu na ịhụ ụzọ, ìgwè mmadụ ahụ ahụghị ọnụ okwu. Ha malitere ikwu, sị: “Nwoke a, ọ̀ ga-abụ Nwa Devid?”
Ìgwè mmadụ gbakọtara n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu gburugburu ụlọ ahụ Jisọs nọ na ya nke na ya na ndị na-eso ụzọ ya apụghị ọbụna iri nri. Tụkwasịkwa ná ndị na-eche na ọ pụrụ ịbụ “Nwa Devid” ahụ e kwere ná nkwa, e nwere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị si ebe dị anya dị ka Jerusalem bịa ịkatọ ya. Mgbe ndị ikwu Jisọs nụrụ banyere ọgba aghara ahụ nke e nwere n’ebe ọ nọ, ha bịara ịkpụrụ ya. N’ihi gịnị?
Otú ọ dị, ọbụna ụmụnne nke Jisọs ekwetabeghị na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ọzọkwa, oké ọgba aghara na ise okwu n’ihu ọha nke ọ kpataworo ekwekọghị nnọọ ma ọlị n’àgwà ha ji mara Jisọs mgbe ọ ka na-etolite etolite na Nazaret. Ya mere, ha kweere na ọ ghaghị ịbụ na isi adịghị Jisọs mma. Ha kwubiri sị, “Anya adịghị ya mma,” ma gaakwa ijide ya na ịkpụrụ ya pụọ.
Ma ihe àmà ahụ pụtara ìhè na Jisọs gwọrọ onye mmụọ ọjọọ ji aka. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii maara na ha apụghị ịgọnahụ izi ezi nke a. Ya mere iji katọọ Jisọs, ha gwara ndị mmadụ, sị: “Nwoke a adịghị achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ma ọ bụghị n’ike Beelzebul onye isi ndị mmụọ ọjọọ.”
N’ịmata ihe ha na-eche, Jisọs na-akpọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii òkù na-asị: “Alaeze ọ bụla nke kewara megide onwe ya, a na-eme ya ka ọ tọgbọrọ n’efu; obodo ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla nke kewakwara megide onwe ya agaghị eguzo: ọ bụrụkwa na Setan achụpụ Setan, o kewara megide onwe ya; alaeze ya ga-esikwa aṅaa guzo?”
Lee ezi echiche doro anya ọ bụ! Ebe ndị Farisii na-ekwu na ụfọdụ n’etiti ha achụpụwo ndị mmụọ ọjọọ, Jisọs na-ajụkwa, sị: “Ọ bụrụ na mụ onwe m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’ike Beelzebul, n’ike ònye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha?” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe ha na-ekwu megide Jisọs kwesịrị nnọọ ikwekọ n’ọnọdụ nke ha. Mgbe ahụ Jisọs na-adọ aka ná ntị, sị: “Ma ọ bụrụ na mụ onwe m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’ike mmụọ nke Chineke, ya mere alaeze Chineke ruru unu arụ [“agaferewo unu n’ezie,” NW].”
Iji gosipụta na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ bụ ihe àmà nke ike o nwere n’ebe Setan nọ, Jisọs na-asị: “Mmadụ ga-esi aṅaa pụọ ịba n’ụlọ onye dị ike, na ịpụnara ya ihe ya nile, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee onye ahụ dị ike agbụ? Mgbe ahụ ọ ga-apụnarakwa ya ihe dị n’ụlọ ya. Onye na-adịghị n’akụkụ m na-emegide m; onye na-adịghị esokwa m ikpokọta ihe na-achụsa achụsa.” O doro anya na ndị Farisii ahụ na-emegide Jisọs, na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị ozi Setan. Ha na-achụsasị ndị Israel ka ha ghara ịbịa n’ebe ọ nọ.
N’ihi nke a, Jisọs na-adọ ndị mmegide a yiri Ekwensu aka ná ntị na “a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.” Ọ na-akọwa, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya; ma onye ọ bụla nke ga-ekwu megide mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya, ọ bụghị n’oge a, ọ bụghịkwa n’oge nke gaje ịbịa.” Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ emewo mmehie nke a a na-apụghị ịgbaghara agbaghara site n’iji obi ọjọọ na-asị na ọ bụ Setan mere ihe o doro anya na ọ bụ ọrụ ebube nke mmụọ nsọ Chineke. Matiu 12:22-32; Mak 3:19-30; Jọn 7:5.
▪ Olee otú njem nke ugbo abụọ Jisọs jere Galili si dị iche na nke mbụ?
▪ N’ihi gịnị ka ndị ikwu Jisọs ji nwaa ijide ya?
▪ Olee otú ndị Farisii si gbalịa ịkatọ ọrụ ebube Jisọs, oleekwa otú Jisọs si gbaghaa ha?
▪ Ikpe gịnị mara ndị Farisii ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?